Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Jun 27
IZU NA-AMALITE NA JUN 27
Abụ nke 123 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 5 ¶17-22 (Nkeji 25)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Abụ Ọma 52-59 (Nkeji 10)
Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke (Nkeji 20)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Ịma ọkwa. “Awa Ole Ka M Kwesịrị Ịgụrụ?” Okwu okenye ga-ekwu. I kwuchaa okwu a, jiri ihe e dere na peeji nke 4 mee ihe ngosi otú e nwere ike isi malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl na Satọdee mbụ n’ọnwa Julaị. Gbaa mmadụ niile ume ka ha pụta ozi ọma n’ụbọchị ahụ.
Nkeji 10: Jikere Inye Ndị Mmadụ Magazin n’Ọnwa Julaị. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jiri otu nkeji ma ọ bụ nkeji abụọ kwuo isiokwu ụfọdụ dị na magazin ndị ahụ. Họrọzie isiokwu abụọ ma ọ bụ atọ n’ime ha ma gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ajụjụ ha nwere ike ịjụ ndị nwe ụlọ ma ha chọọ iji otu n’ime isiokwu ndị ahụ nye ha magazin ndị ahụ. Ha kwuokwa amaokwu Baịbụl ha nwere ike ịgụrụ ha. Mee ihe ngosi otú e nwere ike isi nye ndị mmadụ magazin nke ọ bụla.
Nkeji 15: Jiri Akọ Na-ezi Ozi Ọma. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ, nke si n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 197-199. Mee ihe ngosi ebe onye nkwusa na-ejighị akọ zaghachi onye nwe ụlọ mgbe ọ gwara ya otu n’ime ihe ndị mmadụ na-agwa Ndịàmà Jehova ma ọ bụrụ na ha achọghị ige ha ntị. Mezie ihe ngosi ọzọ ebe onye nkwusa ji akọ zaghachi onye nwe ụlọ gwara ya ihe ahụ onye nke mbụ gwara onye nkwusa nke mbụ ahụ.
Abụ nke 92 na Ekpere