Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Julaị 4
IZU NA-AMALITE NA JULAỊ 4
Abụ nke 85 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 6 ¶1-8, igbe dị na p. 44 (Nkeji 25)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Abụ Ọma 60-68 (Nkeji 10)
Nke 1: Abụ Ọma 62:1–63:5 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Olee Otú Anyị Si Soro Na-emezu Ihe E Dere na Hagaị 2:7? (Nkeji 5)
Nke 3: Ọ̀ Bụ Pita Bụ “Oké Nkume” ahụ?—td 8B (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 10: Ọ Bụrụ na Mmadụ Asị: ‘Enwere M Okpukpe nke M.’ Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ, nke si n’akwụkwọ nta bụ́ Nkwurịta Okwu Bible, peeji nke 10, paragraf nke 3, ruo peeji nke 11, paragraf nke 4. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ihe ndị ọzọ ha gwarala onye kwuru ụdị ihe ahụ n’ozi ọma, ya emechaa kwe ka e zie ya ozi ọma. Mee otu ihe ngosi ma ọ bụ ihe ngosi abụọ ndị ga-egosi otú e nwere ike isi mee ihe a tụrụ aro ha n’akwụkwọ ahụ.
Nkeji 10: Gịnị Ka Anyị Mụtara? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kpọọ ụfọdụ ndị ná ndị na-ege ntị ka ha gụpụta Luk 9:57-62 na Luk 14:25-33. Tụleenụ otú amaokwu ndị a ga-esi enyere anyị aka n’ozi anyị.
Nkeji 10: Mkpa ọgbakọ.
Abụ nke 124 na Ekpere