Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu na-amalite na Jun 27, 2011. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi a, bụ́ nke ga-ewe nkeji iri abụọ. Ihe ndị a ga-atụle ga-abụ ihe ndị a mụrụ n’izu Mee 2 ruo n’izu Jun 27, 2011.
1. Gịnị ka ekpere Jehova gwara Job ka o kpeere ndị enyi ya mehiere ya na-akụziri anyị? (Job 42:8) [w98 8/15 p. 30 para. 5]
2. Gịnị bụ “àjà ezi omume” Ndị Kraịst na-achụ taa? (Ọma 4:5) [w06 5/15 p. 18 para. 9]
3. Olee otú akụrụ Devid si gbazie Devid? (Ọma 16:7) [w04 12/1 p. 14 para. 9]
4. Olee otú o si bụrụ na “eluigwe na-akọsa ebube Chineke”? (Ọma 19:1) [w04 10/1 p. 10 para. 8]
5. Olee otú Abụ Ọma 27:14 si gosi na e nwere ihe jikọrọ olileanya na obi ike? [w06 10/1 p. 26-27 para. 3, 6]
6. Olee otú ihe e kwuru n’Abụ Ọma 37:21 ga-esi enyere anyị aka n’otú anyị si emeso ụmụnna anyị ihe? [w88 8/15 p. 17 para. 8]
7. Olee otú ahụmahụ otu onye Livaị a dọọrọ n’agha gaa mba ọzọ ga-esi enyere anyị aka ịmụta inwe ekele? (Ọma 42:1-3) [w06 6/1 p. 9 para. 4]
8. Gịnị nwere ike inyere anyị aka ịhụ ezi omume n’anya na ịkpọ ajọ omume asị? (Ọma 45:7) [cf p. 58-59 para. 8-10]
9. Gịnị mere e ji kpọọ Jeruselem “ebe mma ruru gwụ”? (Ọma 50:2) [w06 6/1 p. 9 para. 3]
10. Olee otú anyị ga-esi adị ka osisi oliv n’ụlọ Chineke? (Ọma 52:8) [w00 5/15 p. 29 para. 6]