Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Julaị 18
IZU NA-AMALITE NA JULAỊ 18
Abụ nke 98 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 6 ¶17-24, igbe dị na p. 48 (Nkeji 25)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Abụ Ọma 74-78 (Nkeji 10)
Nke 1: Abụ Ọma 77:1-20 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ụzọ Ndị Anyị Ga-esi Guzogide Ekwensu—Jems 4:7 (Nkeji 5)
Nke 3: Ụbọchị Ndị E Ji Kee Ihe Hà Bụ Ụbọchị nke Awa Iri Abụọ na Anọ?—td 35B (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 15: Gịnị Ka Anyị Mụtara? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Unu gụọ Jọn 4:3-24 ma kwurịta ihe e kwesịrị ịmụta na ya. Tụleenụ otú anyị nwere ike isi ṅomie Jizọs mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma. Unu mechazie, mee ihe ngosi ebe onye nkwusa na-agba àmà n’oge ọ na-anọghị n’ozi. Ihe ngosi a ga-eme kwesịrị ịbụ ụdị ihe nwere ike ime n’ókèala unu.
Nkeji 15: “Ụmụ Gị Hà Ejikerela?” Ajụjụ na azịza. Gwa ndị nne na nna na ndị na-eto eto ka ha kwuo nsogbu ụfọdụ Ndịàmà Jehova na-enwe n’ụlọ akwụkwọ. Unu tụlechaa paragraf nke 3, mee ihe ngosi ebe nna ezinụlọ na nwa ya na-amụgharị ihe nwa ya nwere ike ịza onye nkụzi ya n’ụlọ akwụkwọ. Nna ahụ ga-anọ ka onye nkụzi ma gwa nwa ya ka o soro ụmụ akwụkwọ ibe ya mee otu ihe Ndịàmà Jehova na-anaghị eme. Nwa ya ga-agwa ya ihe mere ọ gaghị eso mee ihe ahụ a sị ya mee.
Abụ nke 91 na Ekpere