Ụmụ Gị Hà Ejikerela?
1. Gịnị mere o ji dị mkpa ka ụmụ akwụkwọ jikere ejikere?
1 Oge eruwela mgbe ụlọ akwụkwọ ji emepe. O doro anya na ọnwụnwa na nsogbu ụfọdụ ụmụ gị na-enwetụbeghị ga-abịara ha. Nke a ga-enye ha ohere ọzọ ha ga-eji “gbaara eziokwu àmà.” (Jọn 18:37) Hà ejikerela?
2. Ka ụmụ gị nwee ike ijikere nke ọma, gịnị ka ha kwesịrị ịma?
2 Ụmụ gị hà amatala ihe ọ ga-abụ mmadụ mee, ya abụrụ na onye ahụ so na-eto mba ya ma ọ bụkwanụ na onye ahụ na-eme ememme ndị ọgọ mmụọ? Hà ma ihe mere Onye Kraịst ekwesịghị ime ihe ndị ahụ? Hà ma ihe ha kwesịrị ime ma a gwa ha ka ha gbaa mbọ banye mahadum ma ọ bụkwanụ ma onye na-abụghị nwoke ibe ha ma ọ bụ nwaanyị ibe ha nyewe ha nsogbu ka ha kpawa? Hà ma ihe ha kwesịrị ime ma mmadụ nye ha sịga ma ọ bụ mmanya na-aba n’anya? Ha ekwesịghị ikwu na chọọchị ha sị ha emela ha. Kama, ha kwesịrị ịma ihe Baịbụl kwuru gbasara ha, marakwa otú ha ga-esi akọwara ha mmadụ.—1 Pita 3:15.
3. Olee otú ndị nne na nna ga-esi jiri oge Ofufe Ezinụlọ jikere ụmụ ha ịga akwụkwọ ma ụlọ akwụkwọ mepee?
3 Jiri Oge Ofufe Ezinụlọ Nyere Ha Aka: Nke bụ́ eziokwu bụ na ka ha na-aga akwụkwọ, o nwere ihe ndị ha ga-ewelite unu na ha ga-ekwurịta. Ma, ọ bụrụ na unu na ha eburu ụzọ kwurịta nsogbu ndị ha nwere ike inwe n’ụlọ akwụkwọ, obi ga-esi ha ike ịga akwụkwọ ma ụlọ akwụkwọ mepee. Í cheghị na ọ ga-adị mma ma unu jiri otu n’ime mgbede unu ji enwe Ofufe Ezinụlọ ma ọ bụkwanụ mgbede abụọ kwurịta ihe ndị ahụ? Unu nwere ike jụọ ha, sị: ‘Ugbu a ụlọ akwụkwọ na-achọ imepe, olee ihe ọ na-abụ unu cheta gbasara ụlọ akwụkwọ unu ụjọ abịa unu?’ Ha nwere ike kwulite ihe unu na ha kwurula mbụ. Ya dị otú ahụ, unu ka nwere ike kwurịta ya ọzọ ebe ọ bụ na ha etolitekwuola ugbu a, marakwa ihe karịa mgbe ahụ. (Ọma 119:95) Unu nwere ike mụgharịa ihe ha nwere ike ime ma nsogbu bịara ha n’ụlọ akwụkwọ. Unu nwere ike mee ka ùnu bụ ndị nkụzi ha ma ọ bụ ụmụ akwụkwọ ibe ha ma jụọ ha otu ihe ka ha zaa unu ya. Kụzierenụ ụmụ unu otú ha ga-esi jiri Baịbụl zaa mmadụ ihe a jụrụ ha na otú ha ga-esi jiri akwụkwọ bụ́ Ndịàmà Jehova na Agụmakwụkwọ na akwụkwọ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ na-eme nchọnchọ. E nwere otu nwanna ji oge ya na ụmụ ya ji amụgharị ihe kụziere ha otú ha ga-esi agwa onye nkụzi ọhụrụ ọ bụla ga-akụziri ha ihe n’afọ na ha bụ Ndịàmà Jehova.—Gụọ Ụlọ Nche Disemba 15, 2010, peeji nke 3-5.
4. Gịnị ka ndị nne na nna anya ruru ala kwesịrị ime?
4 Ọnwụnwa ndị na-eto eto bụ́ Ndị Kraịst ga-enwe n’oge ikpeazụ a ga ‘na-atakwu akpụ.’ (2 Tim. 3:1) Ndị nne na nna anya ruru ala kwesịrị ijikere ụmụ ha tupu nsogbu ndị ahụ abịara ha. (Ilu 22:3) Tupu ụlọ akwụkwọ emepee, meenụ ihe niile unu nwere ike ime ka ụmụ unu jikere ejikere.