Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite n’Ọgọst 1
IZU NA-AMALITE N’ỌGỌST 1
Abụ nke 31 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 7 ¶9-13, igbe dị na p. 56 (Nkeji 25)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Abụ Ọma 87-91 (Nkeji 10)
Nke 1: Abụ Ọma 89:26-52 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ihe Mere Ndị Ji Ikwesị Ntụkwasị Obi Na-efe Jehova Ji Enwe Obi Ụtọ (Nkeji 5)
Nke 3: Ndị Kraịst Hà Kwesịrị Ife Obe Ofufe?—td 34B (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Ịma ọkwa. Jiri ihe dị ebe ahụ e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu,” bụ́ nke dị na peeji a, mee ihe ngosi otú e nwere ike isi malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl na Satọdee mbụ n’ọnwa Ọgọst. Gbaa mmadụ niile ume ka ha pụta ozi ọma n’ụbọchị ahụ.
Nkeji 10: Jiri Ihe Atụ Ndị A Ga-amụta Ihe na Ha Na-ezi Ihe. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ, nke si n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 240-243. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ihe atụ ndị ha jirila mee ka onye nwe ụlọ ma ọ bụ onye ha na-amụrụ ihe ghọta ihe ha na-akụziri ya.
Nkeji 15: Mkpa ọgbakọ. Okwu okenye ruru eru ga-ekwu. Ọ ga-eji ihe ndepụta isiokwu ya bụ́ “Ihe Ndị Nne na Nna Nwere Ike Ime Iji Hụ na A Mịnyeghị Ụmụ Ha Ọbara” kwuo ya.
Abụ nke 129 na Ekpere