Magazin Anyị Na-abara Ndị Dị Iche Iche Uru
1. Olee otú ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche si na-eme ka Pọl onyeozi?
1 Mgbe Pọl onyeozi na-ekwusara ndị mmadụ ozi ọma, ọ na-agbanwe ihe ọ na-ekwu ka o nwee ike nyere “ụdị mmadụ niile” aka ịmụta Okwu Chineke. Taakwa, ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, na-eji magazin anyị akụziri ndị dị iche iche Baịbụl. (1 Kọr. 9:22, 23) Ka anyị nwee ike iji Ụlọ Nche na Teta! ndị a zie ndị mmadụ ozi ọma nke ọma, anyị kwesịrị ịma ụdị ndị e bu n’obi na-ebipụta ha.
2. Olee ndị e bụ n’obi ebipụta Teta!?
2 Teta!: Ndị e bụ n’obi ebipụta magazin a bụ ụdị ndị ahụ Pọl onyeozi gwara okwu mgbe ọ na-ezi “ndị Atens” ozi ọma. (Ọrụ 17:22) Ndị Atens abụghị Ndị Kraịst, ha amaghịkwa ihe ọ bụla Akwụkwọ Nsọ na-akụzi. Taakwa, ndị e bụ n’obi na-ebipụta Teta! bụ ndị na-amaghị ihe Baịbụl na-akụzi. O nwere ike ya abụrụ na o nweghị ihe ọ bụla ha ma Ndịàmà Jehova na-akụzi, nweekwa ike bụrụ na okpukpe agwụla ha ike. Ndị ahụ nwekwara ike ịbụ ndị na-amaghị na Baịbụl nwere ike ịbara mmadụ uru n’oge a. Ihe bụ́ isi Teta! na-akụziri ndị mmadụ bụ na e nwere onye bụ́ ezi Chineke. Ọ na-enyere ndị mmadụ aka ịtụkwasị Baịbụl obi, na-emekwa ka ha ghọta na Ndịàmà Jehova adịghị ka okpukpe ndị ọzọ juru n’ụwa a.
3. Olee ndị e bu n’obi na-ebipụta ma Ụlọ Nche nke ọhaneze ma nke a na-amụ amụ?
3 Ụlọ Nche: Ndị e bu n’obi na-ebipụta Ụlọ Nche nke ọhaneze bụ ndị matụ Chineke ma na-agụtụ Baịbụl. Ha ma ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru, ma ha anaghị aghọtacha ihe ọ na-akụzi. Ha dị ka ndị ahụ Pọl kwuru na ha “na-atụ egwu Chineke.” (Ọrụ 13:14-16) Ndị bụ́ isi ekwo ebipụta Ụlọ Nche a na-amụ amụ bụ Ndịàmà Jehova. Pọl weere na ndị niile na-agụ akwụkwọ ozi ọ na-ede ma ihe Akwụkwọ Nsọ na-ekwu nakwa na ha ma eziokwu ndị dị na Baịbụl. (1 Kọr. 1:1, 2) Taakwa, ndị e bụ n’obi ebipụta isiokwu ndị ahụ na-agba n’Ụlọ Nche a na-amụ amụ bụ ndị na-abịa ọmụmụ ihe anyị na ndị ma asụsụ Ndịàmà Jehova na ihe ndị ha kweere.
4. Olee ihe mere anyị ji kwesị ịma ihe magazin ndị anyị ji aga ozi ọma na-ekwu?
4 Anyị nyewe ndị mmadụ magazin, anyị na-enyekọta ha Ụlọ Nche na Teta! Ma, ọ bụ otu n’ime ha ka anyị kwesịrị ikwu okwu gbasara ya. N’ihi ya, gbalịa mara ihe nke ọ bụla n’ime ha na-ekwu. I mee otú a, ị ga-enwe ike ịma ihe ga-amasị onye ọ bụla ị chọrọ inye ya.