Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Jenụwarị 9
IZU NA-AMALITE NA JENỤWARỊ 9
Abụ nke 53 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 15 ¶8-12, igbe dị na p. 118 (Nkeji 25)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Aịzaya 29-33 (Nkeji 10)
Nke 1: Aịzaya 30:15-26 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ife Ihe Oyiyi Ofufe Wetaara Mba Izrel Ọnwụ—td 17B (Nkeji 5)
Nke 3: Olee Otú Ụmụ Mmadụ Na-ezughị Okè Nwere Ike Isi Doo Aha Jehova Nsọ?—Mat. 6:9 (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa. Kwuo ihe e dere n’igbe “Akụkọ Ozi.” Jaa ọgbakọ mma maka mbọ ha gbara, nke mere e ji nwee akụkọ ozi ahụ mara mma n’ọnwa Ọgọst 2011. Mmadụ niile kwesịrị ịgba mbọ hụ na ha na-enye akụkọ ozi ha n’oge.
Nkeji 10: Zie Ndị Ị Na-anaghị Anụ Asụsụ Ha Ozi Ọma. Okwu. Kọwaa otú e nwere ike isi jiri akwụkwọ nta bụ́ Good News for People of All Nations zie mmadụ ozi ọma. Mee ihe ngosi.
Nkeji 10: Ihe Gosiri na E Ji Ike Mmụọ Nsọ Dee Baịbụl. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ, nke si na broshọ bụ́ Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, peeji nke 10-16.
Nkeji 10: “Mee Ka Mbọ Ị Na-agba n’Ozi Ọma Ghara Ịbụ na Nkịtị.” Ajụjụ na azịza. Mgbe unu na-atụle paragraf nke 2, jiri nkeji ole na ole gbaa onye nlekọta ije ozi ajụjụ ọnụ. Jụọ ya ebe e nwere ike ịhụ ndị mmadụ zie ha ozi ọma nakwa oge e nwere ike ịhụ ha.
Abụ nke 115 na Ekpere