Mee Ka Mbọ Ị Na-agba n’Ozi Ọma Ghara Ịbụ na Nkịtị
1. Olee otú ihe e kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 9:26 ga-esi enyere anyị aka n’ozi anyị?
1 Pọl onyeozi kwuru, sị: “Otú m si agba ọsọ abụghị ihe a na-ejighị n’aka; otú m si eti ọkpọ bụ ka m wee ghara ịdị na-eti ikuku.” (1 Kọr. 9:26) Ihe Pọl na-ekwu bụ na ya anaghị ekwe ka ihe ọ bụla mee ka mbọ ya na-agba n’ozi Jehova fuo ọhịa. Ihe a o kwuru nwekwara ike inyere anyị aka n’ozi ọma anyị na-ekwusa. Anyị kwesịrị ịgba mbọ hụ na “ọkpọ” anyị na-eti abụghị na nkịtị. Ị manụ na ozi ọma anyị na-ekwusara ndị mmadụ bụ ọkpọ ahụ anyị na-eti taa. Gịnị ka anyị ga-eme ka ọ ghara ịbụ na nkịtị?
2. Gịnị ka Pọl na Ndị Kraịst narị afọ mbụ mere? Oleekwa otú anyị ga-esi ṅomie ha?
2 Anyị Kwesịrị Ịga Ebe A Ga-enweta Ndị Mmadụ: Mgbe Pọl na Ndị Kraịst narị afọ mbụ na-ekwusa ozi ọma, ha na-aga ebe ha bu n’obi inweta ndị mmadụ. (Ọrụ 5:42; 16:13; 17:17) N’ihi ya, ọ bụrụ na ndị bi n’ókèala anyị na-anọkarị n’ụlọ ná mgbede, ọ ga-akacha mma ka anyị jiri oge ahụ na-aga ozi ụlọ n’ụlọ. Ya bụrụkwa na ndị bi n’ókèala anyị na-aga ọrụ n’isi ụtụtụ ma na-alọta ná mgbede, ọ ga-adị mma ma anyị jiri oge ahụ na-agba àmà okporo ámá. Anyị nwekwara ike gaa zie ndị mmadụ ozi ọma n’ọma ahịa n’ụbọchị ahịa na-azụ n’ókèala anyị. Anyị na-eme otú a, mbọ anyị na-agba izi ndị mmadụ ozi ọma agaghị abụ na nkịtị.
3. Gịnị ka anyị kwesịrị ime iji hụ na anyị na-arụ ókèala anyị nke ọma?
3 Anyị Kwesịrị Ịrụ Ókèala Anyị nke Ọma: Anyị kwesịrị ilezi anya n’otú anyị si arụ ókèala anyị. Dị ka ihe atụ, kama anyị ikworo n’ìgwè banye n’ụlọ ndị mmadụ, ọ ga-aka mma ka e nye ndị nke ọ bụla ókèala ebe ha ga-arụ. E mee otú ahụ, a ga-arụ ókèala ọgbakọ nke ọma, rụchaakwa ya ngwa ngwa. Ọ ga-emekwa ka ndị pụtara ozi ọma ghara ịna-eso ibe ha n’azụ, ụmụnna agaghịkwa na-ekwo ekwo n’okporo ụzọ. Anyị nwekwara ike nata ókèala dị nso, na-ekwusa ozi ọma ebe ahụ, kama ịgawa n’ókèala dị anya.
4. Gịnị ga-enyere anyị aka ịbụ ezigbote ndị ọkụ ma akụta mmadụ?
4 Jizọs kpọrọ ndị na-ekwusa ozi ọma “ndị na-akụta mmadụ.” (Mak 1:17) Ihe onye na-akụ azụ̀ na-ebu n’obi aga ná mmiri bụ ka ọ kụta azụ̀. N’ihi ya, ọ na-aga n’ebe ọ ma na ya ga-egbute azụ̀, gaakwa ebe ahụ mgbe ọ ma na azụ̀ ga-adị ya. Ya rute, ọ na-ebido ịkụ azụ̀ ozugbo. Nke a na-eme ka mbọ ọ gbara pụta ije ahụ ghara ịbụ nke nkịtị. Ka anyị gbalịa gosi na anyị dị uchu otú ahụ ndị na-akụ azụ̀ dị. Anyị mee otú ahụ, mbọ anyị na-agba n’ozi agaghị abụ na nkịtị.—Hib. 6:11.