Dị Irè n’Ozi Gị
1 Ihu igwe na-agbawanye ọchịchịrị, ụda na-atụ ụjọ na-adasiwanyekwa ike ruo n’ókè na-adachi nti. Urukpuru yiri anwụrụ ọkụ agbadata. Ọ̀ bụ gịnị? Ọtụtụ nde igurube na-abịa ibibi ala ahụ kpam kpam! Ọnọdụ a nke Joel onye amụma kọwara na-enwe mmezu taa n’ọrụ ime nkwusa nke ndị ohu Chineke e tere mmanụ na ndị òtù ha, bụ́ oké ìgwè mmadụ ahụ.
2 Ụlọ Nche nke May 1, 1998, peji nke 11, paragraf nke 19, kwuru, sị: “Usuu igurube Chineke nke oge a agbawo àmà zuru ezu ‘n’obodo’ Krisendọm. (Joel 2:9) . . . Ha ka na-arịfe ihe mgbochi nile, na-abanye n’ọtụtụ nde ụlọ, na-ejekwu ndị mmadụ n’okporo ámá, na-agwa ha okwu na fon, na-agakwu ha n’ụzọ ọ bụla o kwere omume ka ha na-akpọsa ozi Jehova.” Ọ́ bụghị ihe ùgwù dị ebube ikere òkè n’ọrụ a sitere n’aka Chineke?
3 N’adịghị ka igurube nkịtị, ndị nzube ha bụ nanị ịzụ onwe ha, anyị dị ka ndị ohu Jehova na-enwe oké nchegbu maka ndụ nke ndị anyị na-emere nkwusa. Anyị chọrọ inyere ndị ọzọ aka ịmụta eziokwu dị ebube ndị dị n’Okwu Chineke na ịbụ ndị a kpaliri ime ihe ndị ga-eduga ha ná nzọpụta ebighị ebi. (Jọn 17:3; 1 Tim. 4:16) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịdị irè n’otú anyị si eje ozi anyị. N’agbanyeghị ụzọ ọ bụla nke ime nkwusa anyị ji na-eme ihe, anyị kwesịrị ịtụle ma anyị ji ya na-eme ihe n’ụzọ na n’oge a ga-akasị arụpụta ihe. Ebe “ụwa nke a, ka e si ahụ ya anya [na-agbanwe agbanwe, NW],” ọ bụ ihe ezi uche dị na ya anyị inyocha ụzọ ndị anyị ji na-eme ihe na ụzọ njekwu anyị iji jide n’aka na anyị na-emeri ihe ịma aka nke ịbụ ndị na-arụpụta ihe ruo n’ókè o kwere mee.—1 Kọr. 7:31.
4 Ọ bụ ezie na anyị na-agbalị n’ọtụtụ ụzọ ịgakwuru ndị mmadụ, ọrụ ụlọ n’ụlọ ka bụ ụzọ bụ́ isi n’ozi anyị. Ị̀ na-achọpụta na ọtụtụ mgbe ndị mmadụ adịghị anọ n’ụlọ mgbe ị gara? Lee ka o si bụrụ ihe na-akụda mmụọ, ebe ị na-enweghị ike isoro ha kerịta ozi ọma ahụ! Olee otú ị pụrụ isi merie ihe ịma aka a?
5 Na-eme Mgbanwe ma Nwee Ezi Uche: N’Israel nke narị afọ mbụ, ndị ọkụ azụ̀ na-arụ ọrụ ịkụ azụ̀ ha n’abalị. Gịnị mere ọ ga-eji bụrụ n’abalị? Ọ bụ ezie na nke a abụghị oge kasị dịrị ha mma, ọ bụ oge kasị mma iji gbute azụ̀ kasị ukwuu. Ọ bụ oge a kasị egbute azụ̀. N’ikwu okwu banyere omume a, Ụlọ Nche nke June 15, 1992, kwuru, sị: “Anyị onwe anyị kwesịkwara ịmụ otú ókèala anyị dị, ka anyị wee nwee ike ịga gbuo azụ, dị ka a pụrụ ikwu ya, mgbe ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ nọ n’ụlọ ma na-egekwa ntị.” Nchọpụta e ji nlezianya mee banyere àgwà ọha na eze egosiwo na n’ọtụtụ ógbè ndị na-emepebeghị emepe na ógbè bụ́ maka ụlọ obibi, ndị mmadụ adịghị anọ n’ụlọ mgbe anyị gara n’oge ụfọdụ. Ma eleghị anya ha nile agawala ahịa, ubi ha, ma ọ bụ ebe ọzọ. Ọ bụrụ na ọ dị otú a n’ógbè unu, ùnu pụrụ ịgbanwe oge unu na-eji aga ịbụ mgbe oge gatụkwuru n’ehihie ma ọ bụ ọbụna ná mgbede? Nke a bụ ụzọ dị mma isi mee ka ozi anyị dị irè karị nakwa ụzọ isi gosi nchebara echiche maka ndị agbata obi anyị, nke bụ́ ihe àmà nke ezi ịhụnanya ndị Kraịst.—Mat. 7:12.
6 Ná Ndị Filipaị 4:5, Pọl onyeozi na-echetara anyị na anyị kwesịrị ‘ime ka mmadụ nile mara obiọma anyị.’ N’ikwekọ ná nduzi a sitere n’ike mmụọ nsọ, anyị kwesịrị inwe ezi nguzozi na ezi uche n’ụzọ ndị anyị ji na-eme ihe ka anyị ji ịdị uchu na ịnụ n’ọkụ n’obi na-arụ ọrụ ime nkwusa anyị. Anyị achọghị ‘ịghara izi ihe n’ihu ọha na n’ụlọ n’ụlọ,’ ma anyị chọrọ ijide n’aka na anyị na-eje ozi ụlọ n’ụlọ anyị n’oge ndị ezi uche dị na ha, mgbe ndị a na-arụpụtakwa ihe. (Ọrụ 20:20) Dị ka ndị ọkụ azụ̀ ahụ nọ n’Israel nke narị afọ mbụ, ihe dị anyị mkpa bụ ‘ịkụ azụ̀’ n’oge anyị pụrụ ịrụpụta ihe karịsịa, ọ bụghị n’oge ndị kasị dịịrị anyị mma.
7 Olee mgbanwe ndị a pụrụ ime? Ihe ka n’ọtụtụ mgbe, a na-enwe nzukọ ije ozi ubi n’elekere 8:30 ma ọ bụ 9:00 nke ụtụtụ na Saturday na Sunday, e mesịa ìgwè ahụ agawa n’ụlọ n’ụlọ ozugbo n’ókèala ahụ. Otú ọ dị, ụfọdụ òtù ndị okenye emewo ndokwa ka ìgwè ahụ kere òkè mgbe oge gatụkwuru n’ụtụtụ ma ọ bụ mgbe oge gatụkwuru n’ehihie ma ọ bụrụ na a chọpụta na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ anọghị n’ụlọ nakwa na ha agaghị anọ n’ụlọ ruokwa n’ehihie ma ọ bụ ná mgbede. Ọgbakọ ndị ọzọ etinyewo oge nzukọ ozi ubi ịbụ ma oge gatụkwuo n’ụtụtụ—n’elekere 10:00 nke ụtụtụ, 11:00 nke ụtụtụ, ma ọ bụ n’elekere 12:00 nke ehihie. Mgbe e mesịrị, ìgwè ahụ na-agawa kpọmkwem n’ọrụ ụlọ n’ụlọ ma nọgide n’ozi ruo ná mmalite oge ehihie. N’ókèala ụfọdụ, ehihie ma ọ bụ mgbede, ihe dị ka n’elekere 4:00 nke ehihie, kama ịbụ n’ụtụtụ, pụrụ ịbụ oge kasị mma izukọ maka ozi ubi. Mgbanwe ndị dị otú ahụ pụrụ nnọọ ịtụnye ụtụ n’ịrụpụtakwu ihe n’ọrụ ụlọ n’ụlọ.
8 Na-egosi Nghọta ma Dị Akọ: Ka anyị na-akpọtụrụ ndị mmadụ site n’ụlọ ruo n’ụlọ, anyị na-enweta mmeghachi omume dị iche iche n’ebe ozi anyị dị. Ụfọdụ ndị nwe ụlọ na-ege ntị, ndị ọzọ adịghị enwe mmasị, ole na ole pụkwara ịdị na-arụ ụka ma ọ bụ na-ese okwu. N’ihe banyere ndị ikpeazụ ahụ, na peji nke 7 na Reasoning From the Scriptures, a na-echetara anyị na anyị adịghị achọ “‘imeri n’arụmụka’ nke e so ndị na-enweghị nkwanye ùgwù maka eziokwu ahụ na-enwe.” Ọ bụrụ na onye nwe ụlọ enweghị omume enyi, ọ kasị mma ka anyị pụwa. Anyị ekwesịghị ịkpasu ndị mmadụ iwe mgbe ọ bụla site n’isi ọnwụ ka ha soro anyị kwurịta okwu ma ọ bụ nakwere echiche anyị. Anyị adịghị amanye ndị mmadụ ịnara ozi anyị. Nke ahụ agaghị abụ ihe ezi uche dị na ya, ọ pụkwara ịkpata nsogbu nye Ndịàmà ndị ọzọ na nye ọrụ ahụ n’ozuzu ya.
9 Tupu a na-amalite ịrụ otu ókèala, ọ bụ ihe amamihe dị na ya inyocha kaadị ókèala maka adres ndị e deturu, ebe ndị bi na ha gwaworo anyị ka anyị ghara ịbịa. Ọ bụrụ na e nwere adres ndị dị otú ahụ, e kwesịrị ịgwa onye nkwusa ọ bụla na-arụ okporo ámá ahụ ebe ọ na-agaghị aga. Ọ dịghị onye ọ bụla kwesịrị ikpebi n’onwe ya ịga n’ebe obibi ndị a n’abụghị site ná ntụziaka nke onye nlekọta ije ozi.—Lee Ozi Alaeze Anyị nke June 1994, Igbe Ajụjụ.
10 Anyị pụrụ ịdịwanye irè site n’igosi nghọta ka anyị na-arụ ọrụ site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Na-eleru anya ala ka ị na-ejeru n’ebe obibi. È mechiri ọnụ ụzọ na windo nile emechi? É nweghị ụda na-egosi na ọ dị ndị nọ n’ụlọ? Nke a pụrụ igosi na onye bi n’ebe ahụ bụ onye oge ọrụ ya na-agbanwe agbanwe ma nọrọ n’ụra. Ikekwe, anyị na onye nwe ụlọ ga-enwe mkparịta ụka ga-arụpụta ihe karị ma anyị gaghachi mgbe e mesịrị. Ma eleghị anya ọ ga-akasị mma ịgafere ụlọ a ugbu a, na-edetu nọmba ụlọ ahụ n’akwụkwọ. Ị pụrụ ịgaghachi n’ụlọ ahụ ọzọ tupu i si n’ókèala ahụ laa ma ọ bụ detuo ya na ị ga-agaghachi n’oge ọzọ.
11 A ka pụkwara inwe mgbe anyị ga-akpọte mmadụ n’ụra ma ọ bụ nye ya nsogbu n’amaghị ụma. Ọ pụrụ ọbụna iyi onye a kpasuru iwe. Olee otú anyị kwesịrị isi meghachi omume? Ilu 17:27 na-adụ ọdụ, sị: “Onye mmụọ ya jụụrụ ajụrụ bụ onye nghọta.” Ọ bụ ezie na anyị adịghị arịọ mgbaghara maka ije ozi anyị, anyị pụrụ ikwupụta n’ezie otú o si wute anyị na anyị bịara n’oge na-adabaghị adaba. Anyị pụrụ iji olu ọma jụọ ma oge ọzọ ọ̀ ga-adaba adaba karị ma kwuo na anyị ga-alaghachi. Ikwupụta nchegbu onwe onye sitere n’obi n’olu dị nwayọọ na-emekarị ka onye dị otú ahụ dajụọ. (Ilu 15:1) Ọ bụrụ na onye nwe ụlọ agwa anyị na ya na-arụ ọrụ abalị, a pụrụ idetu ya na kaadị ókèala ka e wee nwee ike ịga n’oge dabara adaba n’ọdịnihu.
12 Nghọta kwesịkwara ekwesị ka anyị na-agbalịsi ike ịrụzu ókèala anyị nke ọma. Ebe ọtụtụ ndị na-adịghị anọ n’ụlọ mgbe mbụ anyị gara, ọ dị anyị mkpa imekwu mgbalị ịkpọtụrụ ha iji soro ha kerịta ozi nzọpụta ahụ. (Rom 10:13) Akụkọ na-egosi na mgbe ụfọdụ ndị nkwusa na-aga n’otu ụlọ ọtụtụ ugboro n’otu ụbọchị n’ịgbalị inweta ndị ahụ n’ụlọ. Ndị agbata obi na-ahụ nke a. A pụrụ inye echiche na-adịghị mma na Ndịàmà Jehova ‘na-abịa mgbe nile’ n’okporo ámá ha. Olee otú a pụrụ isi zere nke a?
13 Jiri nghọta mee ihe. Mgbe a na-agaghachi na nke onye na-anọghị n’ụlọ, è nwere ihe àmà na-egosi na ọ dị onye nọ n’ụlọ ugbu a? Ọ bụrụ na akwụkwọ ozi sepụtara isi n’igbe akwụkwọ ozi, o yiri ka onye ahụ alọtabeghị, ịkụwakwu aka n’ọnụ ụzọ agaghị arụpụta ihe ọ bụla n’oge a. Ọ bụrụ na a pụghị inweta onye ahụ n’ụlọ mgbe e mesịrị mgbalị ole na ole n’oge dị iche iche n’ụbọchị, dị ka ná mgbede, a pụrụ iji akọ tinye traktị ma ọ bụ akwụkwọ ịkpọ òkù n’ọnụ ụzọ ya, karịsịa ma ọ bụrụ na a na-arụzu ókèala ahụ ọtụtụ ugboro n’ụzọ ezi uche dị na ya. Ọ pụrụ ịbụ nnọọ na a pụrụ inweta onye ahụ mgbe ọzọ a ga-arụ ókèala ahụ.
14 Anyị kwesịrị izere inwe ogologo mkparịta ụka n’ọnụ ụzọ mgbe onye nwe ụlọ pụtara n’oge mmiri na-ezo. Mgbe a kpọbatara anyị n’ime ụlọ, lezie anya ka ị ghara imetọ ala ụlọ. Jiri nghọta mee ihe mgbe nkịta na-agbọ gị ụja. Mgbe ị na-arụ ọrụ na flat dị iche iche, na-ekwu okwu n’olu dị ala, emekwala mkpọtụ nke ga-enye ndị bi n’ụlọ ahụ nsogbu ma mee ka a mara na ị nọ ya.
15 Dị n’Usoro ma Nwee Ùgwù: Site n’ime ezi nhazi anyị pụrụ izere inwe ìgwè buru ibu, ndị a pụrụ ịhụ nke ọma, ndị na-ezukọta n’ókèala. Ụfọdụ ndị nwe ụlọ pụrụ iche na ha nọ n’ihe ize ndụ mgbe ìgwè ndị nkwusa buru ibu bịara n’ihu ụlọ ha. Anyị achọghị inye echiche na anyị “na-awakpo” ógbè bụ́ maka ụlọ obibi. Ọ na-akasị mma ime ndokwa maka ịrụzu ókèala ná nzukọ ije ozi ubi. Ìgwè ndị nkwusa dị nta, dị ka otu ezinụlọ, adịghị emenyekebe ndị nwe ụlọ ụjọ, ọ naghịkwa adịkebe mkpa ịhazigharị ihe ka a na-arụ ókèala ahụ.
16 Ime ihe n’usoro na-achọ ka ndị mụrụ ụmụ jiri nlezianya na-eleru anya n’akparamàgwà ụmụ ha mgbe a na-arụ ọrụ n’ókèala. Ụmụaka kwesịrị ịdị na-akpa àgwà dị mma mgbe ha so ndị toworo eto na-aga n’ọnụ ụzọ. E kwesịghị ikwe ka ndị na-eto eto na-egwuri egwu ma ọ bụ na-awagharị, na-adọrọ uche ndị bi n’ebe ahụ ma ọ bụ nke ndị na-agafenụ n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị.
17 Inwe echiche ziri ezi dịkwa mkpa n’okwu banyere ntụrụndụ na ezumike maka nri ehihie. Ọ bụ ezie na ịkwụsịtụ maka ntụrụndụ bụ okwu aka mmadụ, akwụkwọ Ozi Anyị, peji nke 104, paragraf nke 1, na-ekwu, sị: “Oge ozi ubi gị kwesịrị ịmalite mgbe i bidoro ọrụ ịgba àmà gị kwụsịkwa mgbe i mesịrị nleta ikpeazụ gị n’oge ịgba àmà ọ bụla. Ị gaghị agụ oge e ji tụrụ ndụ ma ọ bụ rie nri n’ime oge ozi ubi. Ndị ọsụ ụzọ inyeaka, ndị ọsụ ụzọ oge nile na ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, tinyere ndị ozi ala ọzọ, nwere hour ole a chọrọ ka ha rụzuo. N’otu aka ahụ a na-agba ndị nkwusa ọgbakọ ume itinye ọdịmma Alaeze n’ọkwá mbụ ma dọgbuo onwe ha n’ọrụ n’ozi ahụ iji rụzuo ihe nile ha nwere ike n’ubi ahụ dị ka ọnọdụ ha dị iche iche si dị. Ndị ohu Jehova nile raara onwe ha nye na-agbalị iji obi ha nile na-eme ihe n’ozi ahụ. (Kọl. 3:23)”
18 Ọtụtụ arụpụtawo ihe ndị dị mma site n’ịgakwuru ndị mmadụ n’ebe ọ bụla a pụrụ ịchọta ha—n’okporo ámá, n’ebe ndọba ụgbọala, na n’ebe ndị ọzọ ọha na eze na-anọ. N’ebe a kwa, anyị kwesịrị ịgba àmà dị mma, ọ bụghị nanị site n’okwu ọnụ anyị kamakwa site n’ezi uche anyị. Ndị nkwusa nọ n’ọgbakọ ọ bụla kwesịrị ịhụ na ha adịghị agafere ókèala ha ka ha wee ghara ịdị na-ejekwubiga ndị ji ụkwụ na-agafe n’ógbè achụmnta ego ma ọ bụ ndị e were n’ọrụ n’ụlọ ọrụ achụmnta ego dị iche iche ókè, dị ka n’ebe a na-ere mmanụ ụgbọala. Iji hụ na anyị jezuru ozi anyị n’ụzọ dị n’usoro, nke dị ùgwù, anyị ga-arụ ọrụ nanị n’ókèala nke anyị ọ gwụla ma e mewo ndokwa ụfọdụ kpọmkwem site n’aka Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ nke ọgbakọ ọzọ, ka e nyetụrụ ha aka.—Tụlee 2 Ndị Kọrint 10:13-15.
19 Ọgbakọ ụfọdụ ndị nwere ọtụtụ ógbè ebe a pụrụ ịgba àmà ihu ọha ahaziwo ndị a ịghọ ókèala dị iche iche. Mgbe ahụ a na-enye otu onye nkwusa ma ọ bụ ìgwè kaadị ókèala. Nke a na-eme ka a rụzukwuo ókèala n’ụzọ dị irè karị ma na-eme ka a ghara inwe ndị nkwusa gabigara ókè na-arụ ọrụ n’otu ógbè ahụ n’otu oge ahụ, n’ikwekọ n’ụkpụrụ dị ná 1 Ndị Kọrint 14:40: “Ka e mee ihe nile n’ụzọ dị mma n’anya, na n’usoro.”
20 Ọdịdị anyị kwesịrị inwe ùgwù mgbe nile ma bụrụ ihe atụ nke otú ndị ozi na-aza aha Jehova kwesịrị ịdị. O kwesịkwara ịbụ otu ihe ahụ banyere ihe ndị anyị ji na-eme ihe. Akpa akwụkwọ kara nká na Bible dọkasịrị adọkasị ma ọ bụ ndị ruru unyi na-ewetu ozi Alaeze ahụ ala. E kwuwo na uwe na ejiji “bụ ụzọ nzirịta ozi dị ngwa nke na-agwa ndị mmadụ nọ gburugburu ụdị onye ị bụ na ihe ị bụ na ebe i kwekọrọ n’usoro ihe dị iche iche.” Ya mere, ọdịdị anyị ekwesịghị ịdị nkịkara ma ọ bụ bụrụ nke ruru unyi, o kwesịghịkwa ịbụ nke gabigara ókè, kama nke “kwesịrị ozi ọma” ahụ mgbe nile.—Fil. 1:27; tụlee 1 Timoti 2:9, 10.
21 Ná 1 Ndị Kọrint 9:26, Pọl onyeozi na-ekwu, sị: “Mụ onwe m na-agba ọsọ otú a, dị ka onye na-adịghị agba na-eleghị anya ihe; otú a ka m na-esu ọkpọ, dị ka onye na-adịghị apịa ifufe.” N’iṅomi Pọl, anyị kpebisiri ike ije ozi dị irè, nke na-arụpụta ihe. Ka anyị ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekere òkè n’ọrụ ịgba àmà ahụ dị ka ndị so “n’usuu igurube” Jehova taa, ka anyị jiri ezi uche na nghọta ndị Kraịst na-eme ihe n’iji ozi nzọpụta ahụ gakwuru ndị nile nọ n’ókèala anyị.