Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na n’Ọktoba 1
IZU NA-AMALITE N’ỌKTOBA 1
Abụ nke 103 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 27 ¶10-18 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Daniel 4-6 (Nkeji 10)
Nke 1: Daniel 4:18-28 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ihe Mere Ezigbo Ndị Kraịst Ga-eji Ezere Ime Mgbaasị (Nkeji 5)
Nke 3: A Kaghị Ọdịnihu Mmadụ Aka—td 39A (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl na Satọdee Mbụ n’Ọnwa Ọktoba. Jiri ihe dị n’ebe ahụ e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu” mee ihe ngosi otú e nwere ike isi malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl na Satọdee mbụ n’ọnwa Ọktoba. Gbaa mmadụ niile ume ka ha bịa ozi ọma n’ụbọchị ahụ.
Nkeji 15: Olee Otú Anyị Si Mee n’Afọ Ije Ozi Gara Aga? Okwu onye nlekọta ije ozi ga-ekwu. Kwuo otú ọgbakọ unu si jee ozi n’afọ ije ozi gara aga. Lekwasị anya n’ihe dị mma unu rụpụtara ma jaa ọgbakọ unu mma. Gbaa otu onye nkwusa ma ọ bụ ndị nkwusa abụọ nwere ahụmahụ ndị tọrọ ụtọ ajụjụ ọnụ. Kwuo otu ebe ma ọ bụ ebe abụọ ọgbakọ unu ga-agbalị imekwu nke ọma n’afọ ije ozi ọhụrụ a anyị banyere, tụọkwara ha aro ga-enyere ha aka imekwu nke ọma n’ebe ndị ahụ.
Nkeji 10: Otú E Nwere Ike Isi Nye Ndị Mmadụ Magazin n’Ọnwa Ọktoba. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jiri ọkara nkeji ma ọ bụ otu nkeji kwuo isiokwu ụfọdụ ga-amasị ndị bi n’ókèala unu. Gwazie ụmụnna ka ha kwuo ajụjụ ha ga-ajụ mmadụ na amaokwu Baịbụl ha ga-agụrụ ya ma ha chọọ iji isiokwu ndị dị na peeji nke 3-8 n’Ụlọ Nche Ọktoba 1 nye ya magazin ahụ. Ha kwuokwa ajụjụ ha ga-ajụ mmadụ na amaokwu Baịbụl ha ga-agụrụ ya ma ha chọọ iji isiokwu ndị dị na peeji nke 3-9 na Teta! Ọktoba–Disemba nye ya magazin ahụ. Ọ bụrụkwa na oge ka dị, họrọ otu isiokwu ọzọ n’Ụlọ Nche ahụ ma ọ bụ na Teta! ahụ ma jụọ ha otu ihe ahụ. Mezie ihe ngosi otú e nwere ike isi nye mmadụ Ụlọ Nche ahụ na Teta! ahụ.
Abụ nke 85 na Ekpere