Ndị Na-eto Eto—Olee Ihe Unu Ga-eji Ndụ Unu Eme? (Nkebi nke Abụọ)
N’akwụkwọ Ekliziastis isi iri na abụọ amaokwu mbụ, a gwara ndị na-eto eto ka ha ‘cheta Onye Okike Ukwu ha n’oge ha bụ okorobịa.’ Ụzọ kacha mma i nwere ike isi jiri ndụ gị mee ihe bara uru bụ iji ya jeere Jehova ozi. Ma, ị ga-eburịrị ụzọ ruo eruo tupu gị jewere Chineke ozi. Olee ihe ga-eme ka i ruo eruo? Olee otú ị ga-esi jiri ndụ gị na-ejere Chineke ozi? Anyị ga-aza ajụjụ ndị a ka anyị na-atụle paragraf ndị fọrọ n’isiokwu ahụ anyị tụlere n’izu gara aga.
Mgbe ụfọdụ, ọrịa, ụkọ ego, na ịkpa afọ ezinụlọ nwere ike ime ka mmadụ ghara ijechara Jehova ozi otú onye ahụ chọrọ. Ma, Onye Kraịst ọ bụla e mere baptizim kwesịrị ime ihe Jizọs kwuru nke dị na Matiu 22:37. Ọ sịrị: “Jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.” Jehova chọrọ ka i jeere ya ozi otú ike hà gị. N’ihi ya, gbalịa ka ijere Jehova ozi bụrụ ihe mbụ ná ndụ gị. Kpebie ụdị ozi ị ga-achọ iji ndụ gị jeere ya. Ọ bụrụ na ‘i cheta Onye Okike Ukwu gị n’oge a ị bụ okorobịa,’ Jehova ga-eme ka ị dị ndụ ebighị ebi.