Echela na Ị Gaghị Amụliri Mmadụ Baịbụl
1. Gịnị mere o ji esiri ụfọdụ ndị nkwusa ike ịgwa mmadụ ka ha na ya mụwa Baịbụl?
1 Ọ̀ na-esiri gị ike ịgwa mmadụ ka gị na ya mụwa Baịbụl? Ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike, ihe kpatara ya ọ̀ bụ na i chere na ị gaghị amụliri mmadụ Baịbụl? N’oge ochie, o nwere mgbe ndị fere Chineke chere na ha agaghị arụli ọrụ o nyere ha. Mmadụ abụọ n’ime ha bụ Mozis na Jeremaya. (Ọpụ. 3:10, 11; 4:10; Jere. 1:4-6) N’ihi ya, ọ bụghị gị bụ onye mbụ. Gịnị ga-enyere gị aka ịkwụsị iche na ị gaghị amụliri mmadụ Baịbụl?
2. Gịnị mere na mkpa anyị ekwesịghị ịbụ naanị ịga ozi ọma ụlọ n’ụlọ ma hapụ ndị ọzọ ka ha na-amụrụ ndị mmadụ Baịbụl?
2 Anyị kwesịrị icheta na Jehova agaghị agwa anyị mee ihe anyị na-agaghị emeli. (Ọma 103:14) Jizọs gwara anyị ka anyị mee ndị mmadụ ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya, ‘na-ezikwa ha’ ka ha na-edebe ihe o nyere n’iwu. Anyị ga-emeli ihe a ọ gwara anyị. (Mat. 28:19, 20) Jehova nyere anyị niile ọrụ a ma ọ̀ dịla anya anyị ziwere ndị mmadụ ozi ọma ma ànyị ka malitere amalite, ma ànyị gụrụ akwụkwọ ma anyị agụghị. (1 Kọr. 1:26, 27) N’ihi ya, mkpa anyị ekwesịghị ịbụ naanị ịga ozi ọma ụlọ n’ụlọ ma hapụ ndị ọzọ ka ha na-amụrụ ndị mmadụ Baịbụl.
3. Olee otú Jehova si eme ka anyị ruo eruo ịmụrụ ndị mmadụ Baịbụl?
3 Jehova Na-eme Ka Anyị Ruo Eru: Ọ bụ Jehova na-eme ka anyị ruo eruo ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. (2 Kọr. 3:5) O ji ọgbakọ ya na-akụziri anyị eziokwu dị na Baịbụl. Ọtụtụ ndị gụrụ akwụkwọ n’ụwa amaghịdị eziokwu a. (1 Kọr. 2:7, 8) Na Baịbụl, e dere ụzọ ụfọdụ Jizọs si kụziere ndị mmadụ ihe. Nke a ga-enyere anyị aka ịma otú anyị ga-esi na-akụziri ndị mmadụ Baịbụl. Jehova jikwa ọgbakọ ya na-akụziri anyị otú anyị ga-esi na-amụrụ ndị mmadụ Baịbụl. O nyekwala anyị ihe ndị anyị ga-eji na-amụrụ ndị mmadụ Baịbụl. Otu n’ime ha bụ akwụkwọ Bible Na-akụzi. Otú e si dee ya na-eme ka ọ dịrị mmadụ mfe ịghọta eziokwu dị na Baịbụl nke ọma. Ị̀ hụlanụ na ịmụrụ ndị mmadụ Baịbụl nwere ike ghara isiri anyị ike otú anyị chere?
4. Olee ihe mere obi ji sie anyị ike na Jehova ga-enyere anyị aka?
4 Jehova nyeere Mozis na Jeremaya aka, ha arụọ ọrụ o nyere ha. (Ọpụ. 4:11, 12; Jere. 1:7, 8) Anyịnwa nwekwara ike ịrịọ Jehova ka o nyere anyị aka. Ị manụ na ọ bụrụ na anyị ana-amụrụ mmadụ Baịbụl, ihe anyị na-eme bụ ịkụziri onye ahụ eziokwu gbasara Jehova. Obi na-adịkwa Jehova ụtọ mgbe anyị na-eme nke a. (1 Jọn 3:22) N’ihi ya, gbalịa soro na-akụziri ndị mmadụ Baịbụl. Ọ bụ ya bụ ọrụ kacha baa uru ma na-enye obi ụtọ n’ozi anyị.