Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Nọvemba 4
IZU NA-AMALITE NA NỌVEMBA 4
Abụ nke 116 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
jl Isiokwu nke 3 na nke 4 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Taịtọs 1-3–Faịlimọn 1-25(Nkeji 10)
Nke 1: Taịtọs 2:1-15 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ụbọchị Ndị E Ji Kee Ihe Ọ̀ Bụ Ụbọchị nke Awa Iri Abụọ na Anọ?—td 35B (Nkeji 5)
Nke 3: Ihe Mere na Anyị Ekwesịghị “Ịṅa Ntị n’Akụkọ Ụgha”—1 Tim. 1:3, 4; 2 Tim. 4:3, 4 (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Otú E Nwere Ike Isi Nye Ndị Mmadụ Magazin n’Ọnwa Nọvemba. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jiri ọkara nkeji ma ọ bụ otu nkeji kwuo ihe mere magazin ndị ahụ ga-eji amasị ndị bi n’ókèala unu. Gwazie ụmụnna ka ha kwuo ajụjụ ha ga-ajụ mmadụ ma ha chọọ iji isiokwu ndị dị na peeji nke 3-7 n’Ụlọ Nche Nọvemba 1 nye ya magazin ahụ. Ha kwuchaa, gị ajụọ ha amaokwu Baịbụl ha ga-agụrụ ya. Jụọkwa ha ajụjụ ha ga-ajụ mmadụ ma ha chọọ iji isiokwu ndị dị na peeji nke 12-15 na Teta! Nọvemba–Disemba nye ya magazin ahụ. Ha kwuchaa, gị ajụọkwa ha amaokwu Baịbụl ha ga-agụrụ ya. Ọ bụrụkwa na oge ka dị, họrọ otu isiokwu ọzọ n’Ụlọ Nche ahụ ma ọ bụ na Teta! ahụ, jụọkwa ha ajụjụ ndị ahụ ị jụrụ ha mbụ. Mezie ihe ngosi otú e nwere ike isi nye mmadụ Ụlọ Nche ahụ na Teta! ahụ.
Nkeji 10: Mkpa ọgbakọ.
Nkeji 10: Okwu Chineke Na-akpa Ike. (Hib. 4:12) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ ga-esi n’Akwụkwọ Mgbaafọ nke 2013, peeji nke 57, paragraf nke 1, ruo na peeji nke 60, paragraf nke 1. Gwa ụmụnna ka ha kwuo ihe ha mụtara n’ebe ahụ.
Abụ nke 114 na Ekpere