Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Septemba 29
IZU NA-AMALITE SEPTEMBA 29
Abụ nke 69 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 13 ¶19-23, igbe dị na peeji nke 137 (Nkeji 30 min)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ọnụ Ọgụgụ 33-36 (Nkeji 10)
Nke 1: Ọnụ Ọgụgụ 33:24-49 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: E Kwesịrị Ịna-asọpụrụ Njikọ Alụmdi na Nwunye—td 3A (Nkeji 5)
Nke 3: Anyị Pụrụ Isi n’Ọnwụ Bilie!—lr isi nke 35 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl na Satọdee Mbụ n’Ọnwa. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. A ga-eji ihe dị n’ebe e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu” mee ihe ngosi otú e nwere ike isi malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl na Satọdee mbụ n’ọnwa Ọktoba. Gbaa mmadụ niile ume ka ha pụta ozi ọma n’ụbọchị ahụ.
Nkeji 10: Gịnị Ka Anyị Mụtara? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gụọnụ Ọrụ Ndịozi 4:13 na 2 Ndị Kọrịnt 4:1, 7. Tụleekwanụ otú amaokwu Baịbụl ndị ahụ ga-esi enyere anyị aka n’ozi ọma.
Nkeji 10: Gbaa Onye Na-ahaziri Ndị Okenye Ọrụ Ajụjụ Ọnụ. Olee ihe ndị ị na-arụ n’ọgbakọ? Olee ihe ndị ị na-echebara echiche mgbe ị na-eke ihe omume a ga-eme ná Nzukọ Ije Ozi? Gịnị mere na e kwesịghị ịna-ele onye na-ahaziri ndị okenye ọrụ anya ka onyeisi ndị okenye ndị ọzọ ma ọ bụ onyeisi ọgbakọ?
Abụ nke 4 na Ekpere