Febụwarị 15-21
NEHEMAYA 9-11
Abụ nke 84 na Ekpere
Okwu Mmeghe (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Ndị Ji Obi Ha Niile Na-efe Jehova Na-akwado Ihe Niile Gbasara Ofufe Ya”: (Nkeji 10)
Nehe. 10:28-30—Ha kwere nkwa na ha na ndị mba ọzọ agaghị alụrịta di na nwunye (w98 10/15 21 ¶11)
Nehe. 10:32-39—Ha kpebiri ịkwado ofufe Chineke n’ụzọ dị iche iche (w98 10/15 21 ¶11-12)
Nehe. 11:1, 2—Ha ji obi ha niile kwado nhazi pụrụ iche e mere gbasara ofufe Chineke (w06 2/1 11 ¶6; w98 10/15 22 ¶13)
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 8)
Nehe. 9:19-21—Olee otú Jehova sirila gosi na ya na-enye ndị ya ihe ndị dị ha mkpa? (w13 9/15 9 ¶9-10)
Nehe. 9:6-38—Gịnị ka anyị mụtara n’aka ndị Livaị gbasara ekpere? (w13 10/15 22-23 ¶6-7)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a gbasara Jehova?
Olee ihe ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a nke ị ga-eji zie ndị mmadụ ozi ọma?
Ọgụgụ Baịbụl: Nehe. 11:15-36 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Ozi Ụlọ n’Ụlọ: (Nkeji 2 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Ihe ngosi. Jiri isiokwu bụ́ “Otú Di na Nwunye Ga-esi Kwụsị Ịna-esekarị Okwu” nke dị na Teta! Nke 1, 2016 zie mmadụ ozi ọma. Gwakwa onye ahụ ihe unu ga-atụle n’oge ọzọ.
Nletaghachi: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) A ga-eme ihe ngosi otú a ga-esi gaa nletaghachi na nke onye ahụ natara Teta! ahụ. Gwakwa ya ihe unu ga-atụle n’oge ọzọ.
Ọmụmụ Baịbụl: (Nkeji 6 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) A ga-eme ihe ngosi ebe e ji akwụkwọ Baịbụl Na-akụziri Anyị, isi nke 3, paragraf nke 13 na nke 14 amụrụ mmadụ ihe.
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
“Ndụ Kacha Mma Mmadụ Nwere Ike Ibi”: (Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. A ga-ebu ụzọ kpọnye vidio a. E lechaa ya, a jụzie ụmụnna ajụjụ ndị dị n’isiokwu a. Gbaa otu onye nkwusa ajụjụ ọnụ na-agaghị egbu oge. O nwere ike ịbụ onye lụrụla di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụkwanụ onye na-alụghị. Ọ ga-abụkwa onye ji ọtụtụ afọ jeere Jehova ozi n’oge ọ na-alụghị di ma ọ bụ nwunye. (1 Kọr. 7:35) Olee uru otú ahụ o si jee ozi n’oge ahụ baara ya?
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: ia isi nke 9 ¶1-13 (Nkeji 30)
Ịchịkọta ihe a mụrụ n’ọmụmụ ihe na ikwu ihe a ga-amụ n’izu ọzọ (Nkeji 3)
Abụ nke 76 na Ekpere