AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ABỤ ỌMA 74-78
Na-echeta Ihe Niile Jehova Mere
Anyị kwesịrị ịna-atụgharị uche n’ihe niile Jehova mere
Ichebara ihe anyị na-agụ na Baịbụl echiche na-eme ka ihe ahụ ruo anyị n’obi, obi adịkwa anyị ụtọ maka ihe Chineke na-akụziri anyị
Ịna-eche gbasara Jehova ga-eme ka anyị na-echeta ihe ndị dị́ ịtụnanya o merela nakwa ihe ndị ọ ga-emere anyị n’ọdịnihu
Ihe ndị so n’ihe Jehova mere bụ:
Ihe ndị o kere
Ịmatakwu banyere ihe ndị Jehova kere ga-eme ka anyị na-akwanyekwuru ya ùgwù
Ndị okenye ọgbakọ
Anyị kwesịrị ịna-erubere ndị Jehova ji na-eduzi ọgbakọ ya isi
Otú Jehova si anapụta ndị ya
Ịna-echeta otú Jehova si anaputa ndị ya ga-eme ka obi sikwuo anyị ike na ọ ga na-elekọta anyị