Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Bekee Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
JULAỊ 10–16
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | EZIKIEL 15-17
w88 9/15 17 para. 8
Amụma Ndị E Buru Banyere Ọmụma Ikpe Jerusalem
8 Mgbe nke a gasịrị, e jiri ndị isi nke Babịlọn na Ijipt tụnyere ugo ndị buru ibu. Otu gbajipụrụ ọnụ ọnụ osisi cedar site n’iwepụ eze Jehoakin ma jiri Zedekaịa dochie ya. Ọ bụ ezie na Zedekaịa ṅụrị iyi ikwesị ntụkwasị obi nye Nebukadneza, o mebiri ya, na-achọ enyemaka ndị agha nke ọchịchị Ijipt bụ́ ugo ukwu nke ọzọ ahụ, ọ bụrụ na Zedekaịa kpọkuru aha Chineke n’ịṅụ iyi ya, imebi ya wetaara aha Jehova nkọcha. Echiche nkịtị nke iwetara aha Jehova nkọcha kwesịrị igbochi anyị pụọ n’emezughị okwu anyị mgbe ọ bụla. Ihe ùgwù ka ọ bụụrụ anyị n’ezie ịza aha Chineke dị ka Ndịàmà Jehova!—Ezikiel 17:1-21.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
w88 9/15 17 para. 7
7 N’ihi ndị obibi ya na-ekwesịghị ntụkwasị obi, e jidị Juda tụnyere osisi vine ọhịa na-enweghị ezi mkpụrụ nke kwesịrị naanị ka a tụba ya n’ọkụ. (Ezikiel 15:1-8) E jikwa ya tụnyere nwa nne ya gbahapụrụ nke Chineke zọpụtara site n’aka ndị Ijipt ma zụlite ya iru ogo nwanyị. Jehova weere ya dị ka nwunye ya, ma o chịgharịkwuuru chi ụgha dị iche iche, ọ ga-atakwa ahụhụ mbibi maka ịkwa iko ime mmụọ ya. Ma, Chineke ga-ejiri ndị kwesịrị ntụkwasị obi ‘guzobe ọgbụgba ndụ ebighị ebi’—ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nke ya na Israel ime mmụọ.—Ezikiel 16:1-63; Jeremaịa 31:31-34; Ndị Galetịa 6:16.
JULAỊ 31–ỌGỌST 6
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | EZIKIEL 24-27
si-E 133 ¶4
Akwụkwọ Baịbụl nke 26—Ezikiel
4 Ihe ọzọ gosiri na ihe akwụkwọ Ezikiel kwuru bụ eziokwu bụ na ihe o kwuru banyere mba ndị dị ka Taya, Ijipt, na Idọm mezuchara otú ahụ o si kwuo ya. Dị ka ihe atụ, Ezikiel buru amụma na a ga-ala Taya n’iyi. Amụma a bidoro imezu mgbe Nebukadneza nọchibidoro Taya afọ iri na atọ, ma mechaa merie ya. (Ezik. 26:2-21) Ma, a laghị Taya n’iyi kpamkpam mgbe ahụ. Mana, Jehova kwuru na a ga-ebibi Taya kpamkpam. O si n’ọnụ Ezikiel kwuo, sị: “M ga-ekpopụ ájá dị na ya, meekwa ka ọ bụrụ elu nkume nke na-akwọ mụrụmụrụ. . . . Ha ga-awụnye nkume gị na osisi e ji wuo gị na ájá gị n’ime mmiri.” (26:4, 12) Ihe ndị a niile mezuru mgbe ihe karịrị narị afọ abụọ na iri ise gachara, mgbe Alegzanda Onye Ukwu busoro agwaetiti Taya agha. Ndị agha Alegzanda buuru nkume, ájá na ihe ndị ọzọ dị n’isi obodo Taya e bibiri ebibi wụba n’ime mmiri, jiri ha rụọ ụzọ dị ihe dị ka otu kilomita n’ogologo, ka ha si na ya banye n’agwaetiti ahụ. Ha rụrụ ihe ndị dị ịtụnanya ha ji rịgoro mgbidi obodo ahụ dị ihe dị ka mita iri anọ na isii n’ịdị elu ma merie obodo ahụ n’afọ 332 T.O.N.K. E gburu ọtụtụ puku mmadụ, reekwa ọtụtụ ndị ka ha gbawa ohu. Dị ka Ezikiel kwuru, Taya mechara bụrụ ‘elu nkume nke na-akwọ mụrụmụrụ na ebe a na-agbasa ụgbụ ka ọ kọọ.’ (26:14) N’akụkụ nke ọzọ nke Ala Nkwa ahụ, e kpochapụkwara ndị Idọm dị ka Ezikiel buru n’amụma. (25:12, 13; 35:2-9) Amụma ndị Ezikiel buru banyere mbibi Jeruselem na mweghachi a ga-eweghachi Izrel mezukwara otú ahụ o si buo ha.—17:12-21; 36:7-14.
ce-E 216 ¶3
Baịbụl Ò Si n’Ike Mmụọ Nsọ Chineke n’Eziokwu?
3 Taya bụ obodo a ma ama na Finishia. O nwekwara ọdụ ụgbọ mmiri. Ndị Taya rụsara ndị agbata obi ha bụ́ ụmụ Izrel na-efe Jehova arụrụala. Jehova si n’ọnụ Ezikiel buo amụma na a ga-ebibi Taya kpamkpam ihe karịrị narị afọ abụọ na iri ise tupu ya emee. Jehova kwuru, sị: “M ga-akpọtakwa ọtụtụ mba ka ha buso gị agha . . . Ha ga-ala mgbidi Taya n’iyi, kwatuokwa ụlọ elu ya niile, m ga-ekpopụ ájá dị na ya, meekwa ka ọ bụrụ elu nkume nke na-akwọ mụrụmụrụ. Ebe a na-agbasa ụgbụ ka ọ kọọ ka ọ ga-aghọ n’etiti oké osimiri.” Tupu ihe a emee, Ezikiel kpọrọ aha mba nke mbụ ga-anọchibido Taya na aha eze mba ahụ. Ọ sịrị: “M ga-esi n’ebe ugwu kpọta Nebukadreza eze Babịlọn.”—Ezikiel 26:3-5, 7.
it-1-E 70
Alegzanda
Kama Alegzanda ga-achụwa ndị Peshia o meriri ugbo abụọ doro anya n’Eshia Maịnọ (o meriri ha nke mbụ n’Osimiri Granịkọs, merie ha nke abụọ na Mbara Ala Isus, ebe ha nọ nyụọ ihe dị ka narị puku ndị agha Peshia ise ịkpakwụ), ọ laghachiri gaa buso agwaetiti Taya agha. Ọtụtụ narị afọ tupu ihe a emee, e buru amụma na a ga-akwatu mgbidi na ụlọ ndị dị na Taya, kpokọrọ ya na ájá ya wụba n’osimiri. (Ezik. 26:4, 12) Ọ dị ezigbo ịtụnanya na Alegzanda mechara buru ihe ndị e mebisịrị n’obodo ahụ Nebukadneza bibiri jiri ha rụọ ụzọ dị ihe dị ka otu kilomita n’ogologo si n’isi obodo Taya ruo n’agwaetiti ahụ. Ndị agha mmiri Alegzanda na ọkpọka ngwá agha ya dị iche iche lara obodo a na-anya isi n’iyi na Julaị afọ 32 T.O.N.K.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
w88 9/15 21 para. 24
O Juru Ndị Ihu Abụọ Anya
Mgbe nke a gasịrị, Ezikiel ga-eme omume n’ụzọ dị ịtụnanya. (Gụọ Ezikiel 24: 15-18.) N’ihi gịnị ka onye amụma ahụ na-agaghị eji gosi mwute mgbe nwunye ya nwụrụ? Nke a bụ iji gosi otú ndị Juda ga-esi nọrọ n’ịtụnanya ná mbibi nke Jerusalem, ndị obibi ya na ụlọ nsọ ya. Ezikiel ekwuwo okwu ruo ókè o kwesịrị banyere ụdị ihe ndị ahụ, ọ gaghị ekwukwa okwu nke ozi Chineke ọzọ ruo mgbe a ga-akọrọ ya akụkọ banyere ọdịda Jerusalem. N’ụzọ yiri nke a, ọ ga-eju Krisendọm na ndị okpukpe ihu abụọ ya anya n’oge mbibi ha. Mgbe “mkpagbu ukwu” ahụ malitesịrị, ihe òtù onyenche ahụ e tere mmanụ kwuworo banyere ọgwụgwụ ya ga-ezuwo. (Matiu 24:21) Ma mgbe “mma agha” Chineke dakwasịrị Krisendọm, ndị okpukpe ahụ na ndị ọzọ nọ n’ịtụnanya ‘ga-amara na ya onwe ya bụ Jehova.’—Ezikiel 24:19-27.