Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Bekee Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
ỌGỌST 7-13
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | EZIKIEL 28-31
“Jehova Kwụrụ Mba Na-ekpere Arụsị Ụgwọ”
it-2-E 1136 ¶4
Taya
Mbibi Taya. N’ihi ọtụtụ afọ Nebukadneza nọchibidoro obodo Taya, okpu ndị agha ya kpu n’isi ruo ogologo oge ‘kwọchara’ isi ha, ubu ha niile ‘echihịakwa’ n’ihi na ha ji ya buo ọtụtụ ngwá ọrụ ha ji rụọ ihe ndị ha ji nọchibido Taya. Ma, Nebukadneza enwetaghị “ụgwọ ọrụ” maka ọrụ ọ rụụrụ Jehova, ya bụ, mbibi ahụ o bibiri Taya. N’ihi ya, Jehova kwere nkwa iji akụnụba ndị Ijipt kwụọ ya ụgwọ. (Ezik. 29:17-20) Otu ọkọ akụkọ ihe mere eme aha ya bụ Josifọs kwuru n’otu akwụkwọ o dere (Against Apion, I, 156 [21]) na ndị Babịlọn nọchibidoro Taya ruo afọ iri na atọ, nakwa na o furu ha ọtụtụ ihe. Akụkọ ihe mere eme dị iche iche ekwughị otú Nebukadneza gbaruru ná mbọ ma ọ bụ otú mbibi ahụ o bibiri Taya dịruru ná njọ. Ma, o doro anya na mmadụ na ihe ndị ọzọ e bibiri na Taya karịrị akarị.—Ezik. 26:7-12.
it-1-E 698 ¶5
Ijipt, Ndị Ijipt
O nwere ihe ndị Babịlọn dere, nke e kwuru na e dere n’afọ nke iri atọ na asaa (ya bụ n’afọ 588 T.O.N.K.). Ihe ahụ e dere kwuru na o nwere mgbe ndị Babịlọn busoro ndị Ijipt agha. Anyị amaghị ma ọ̀ na-ekwu banyere otu mmeri ndị Babịlọn meriri ndị Ijipt ka ọ̀ na-ekwu banyere agha ọzọ ndị Babịlọn busoro ndị Ijipt. Nke ọ bụla ọ bụ, ihe doro anyị anya bụ na Jehova ji akụnụba ndị Ijipt kwụọ Nebukadneza ụgwọ maka mbibi ha bibiri Taya, bụ́ ndị na-emegide ndị Chineke.—Ezik. 29:18-20; 30:10-12.
g86-E 11/8 27 ¶4-5
Ọ̀ Bụ Iwu na Mmadụ Ga-atụ Ụtụ Isi Niile?
Iji zaa ajụjụ a, anyị nwere ike iji otú Chineke n’onwe ya si kwụọ ndị Babịlọn ụgwọ maka ọrụ ha rụụrụ ya mara ihe anyị ga-eme. Iwe ezi omume mere ka Jehova nye iwu ka e bibie obodo Taya oge ochie. Chineke ji Eze Nebukadneza na ndị agha ya bibie Taya. Ọ bụ eziokwu na ndị Babịlọn meriri ndị Taya, mana o furu ha ọtụtụ ihe. Ọ bụ ya mere Jehova ji kpebie na ya ga-akwụ ha ụgwọ maka ọrụ ha rụụrụ ya. Jehova kwuru n’Ezikiel 29:18, 19, sị: “Nwa nke mmadụ, Nebukadreza, bụ́ eze Babịlọn, mere ka ndị agha ya lụso Taya agha dị ukwuu. . . . Ma ọ dịghị ụgwọ ọ bụla Taya kwụrụ ya na ndị agha ya maka agha o busoro ya. Ya mere, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Lee, m ga-enyefe Nebukadreza bụ́ eze Babịlọn ala Ijipt, ọ ga-eburu akụ̀ ya, meekwa ka ọ bụrụ ihe nkwata buru ibu, bukọrọkwa ihe dị ukwuu na ya; ọ ga-aghọkwa ụgwọ ọrụ nke ndị agha ya.’”
Ndị na-agụ Baịbụl maara na Nebukadneza bụ́ onye ọchịchị dị mpako, na-achọkarị ọdịmma nke naanị onwe ya. Ọ naghịkwa efe Chineke. A makwa Babịlọn na ndị agha ya ka ndị na-emekpọ ndị ha dọọrọ n’agha ọnụ. N’agbanyeghị na Jehova anaghị anabata ụdị àgwà ndị a, ọ kwụrụ ha ụgwọ ihe ha meere ya, kwụzuokwa ha ya akwụzu.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2-E 604 ¶4-5
Izu Okè
Onye mbụ mere mmehie na eze Taya. Ihe Jizọs kwuru na Jọn 8:44 na ihe e kwuru na Jenesis isi nke atọ na-egosi na e nwere otu mmụọ mere mmehie ghọọ onye na-ezughị okè tupu ụmụ mmadụ emee mmehie ghọọ ndị na-ezughị okè. N’agbanyeghị na ọ bụ “eze Taya” ka a bụụrụ abụ iru uju ahụ dị n’Ezikiel 28:12-19, ihe e kwuru ebe ahụ kọwakwara àgwà otu mmụọ ozi Chineke kpara mere o ji bụrụ onye mbụ mere mmehie. Ihe ebe ahụ kwuru gbasara mpako “Eze Taya,” otú o si na-eme onwe ya ‘chi,’ na “cherọb” a kpọrọ ya, nakwa aha a kpọtụrụ ‘Iden, bụ́ ubi Chineke’ n’amaokwu ahụ dabara n’ihe ndị Baịbụl kwuru gbasara Setan. Baịbụl kwuru na Setan bụ́ Ekwensu bụ́ onye mpako na-afụli onwe ya elu. Ọ bụkwa yanwa bụ agwọ ahụ nọrọ n’Iden; a kpọkwara ya “chi nke usoro ihe a.”—1 Tim. 3:6; Jen. 3:1-5, 14, 15; Mkpu. 12:9; 2 Kọr. 4:4.
Eze Taya a, a na-agwaghị anyị aha ya, onye bi n’obodo ‘zuru okè n’ịma mma,’ bụ́ onye “jupụtara n’amamihe, zuokwa okè [okwu Hibru bụ, ka·lalʹ] n’ịma mma.” O “zuru okè [okwu Hibru bụ, ta·mimʹ]” n’ụzọ ya, malite n’ụbọchị e kere ya ruo mgbe a hụrụ ajọ omume n’ime ya. (Ezik. 27:3; 28:12, 15) E nwere ike ikwu na ndị mbụ ihe e kwuru n’abụ iru uju ahụ dị n’Ezikiel mezuru n’isi ha kpọmkwem bụ ndị eze niile chịrị Taya, ọ bụghị n’isi otu eze. (Tụlee amụma e buru na Aịza. 14:4-20 gbasara “eze Babịlọn” a na-agwaghị anyị aha ya.) Ọ bụrụ otú ahụ, ọ pụtara na ihe ụfọdụ e kwuru gbasara Taya ga-abụ ihe ndị mere n’oge ndị mbụ, mgbe Eze Devid na Sọlọmọn na-achị. Ha na ndị eze chịrị Taya dịịrị ná mma, na-emekọkwa ihe. Taya nyedịrị aka rụọrọ Jehova ụlọ nsọ n’Ugwu Moraya. Ná mbụ, o nweghị ihe ọjọọ ọ bụla Taya mere ndị Jehova bụ́ Izrel. (1 Eze 5:1-18; 9:10, 11, 14; 2 Ihe 2:3-16) Ma, ndị eze mechara chịwa Taya, si ‘n’izu okè’ ha dachapụ, nke mere ka ndị amụma Chineke bụ́ Joel, Emọs na Ezikiel buo amụma na-aga ala ha n’iyi. (Joel 3:4-8; Emọs 1:9, 10) Amụma Ezikiel a anaghị egosi naanị otú ihe “eze Taya” mere si yie ihe Setan bụ́ onye iro bụ́ isi nke Chineke mere, kama amụma a na-egosikwa na e kwuo mgbe ụfọdụ na ihe ‘zuru okè’ ma ọ bụ na ihe ‘enweghị ntụpọ,’ ọ pụtaghị na ihe ahụ zuru okè ruo n’isi.
ỌGỌST 14-20
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | EZIKIEL 32-34
“Nnukwu Ọrụ Dịịrị Onye Nche”
it-2-E 1172 ¶2
Onye Nche
Nke E ji Ama Atụ. Jehova họpụtara ndị amụma ọrụ ha yiri nke ndị nche na-eche mba Izrel nche. (Jere. 6:17) Ndị amụma ndị a nwekwara mgbe ha kwuru na ọrụ ha na-arụ yiri nke onye nche. (Aịza. 21:6, 8; 52:8; 62:6; Hos. 9:8) Ọrụ ndị amụma a na-arụ ọrụ ndị nche na-arụ bụ ịdọ ndị ajọ omume aka ná ntị maka mbibi ga-abịakwasị ha. Ọ bụrụ na ha ajụ ịdọ ndị ọjọọ a aka ná ntị, ha ga-aza ajụjụ maka ya. Ma, ọ bụrụ na ndị a dọrọ aka ná ntị a agbaa isi akwara ma jụ ichegharị, ọbara ha ga-adị ha n’isi. (Ezik. 3:17-21; 33:1-9) Onye amụma na-anaghị arụ ọrụ ya abaghị uru, otú ahụ onye nche kpuru ìsì ma ọ bụ nkịta dara ogbi na-abaghị uru ọ bụla.—Aịza. 56:10.
w88 1/1 28 ¶13
Nọgidenụ Na-ekwusa Ozi Alaeze
Izere Ikpe Ọmụma Ọbara
13 A pụrụ iji ibu ọrụ ịdọ ndị mmadụ aka ná ntị nke Ndịàmà Jehova raara onwe ha nye nwere tụnyere nke ahụ Ezikiel nwere n’oge ya. E nyere ya ọrụ nke ịbụ onyenche ụmụ Israel. Ọrụ e nyere ya bụ ịdọ ndị Israel aka ná ntị na mbibi ga-abịakwasị ha ma ọ bụrụ na ha a kwụsịghị ụzọ ọjọọ ha nile. Ọ bụrụ na ya onwe ya dị ka onyenche ahapụ ịkpọsa ịdọ aka ná ntị ahụ, mbibi ahụ aghaghị ịbịakwasị ndị ajọ mmadụ ahụ, ma a ga-ajụta ọbara ndị ahụ n’isi onye nche ahụ leghaara ọrụ ya anya. Na nke a Jehova gosiri otú o si eme omume banyere iweta ikpe mbibi: “Ọnwụ nke onye na-emebi iwu adịghị atọ m ụtọ ma ọlị; kama ọ na-atọ m ụtọ mgbe onye na-emebi iwu si n’ụzọ ya chegharịa, wee dị ndụ: chegharịanụ, sinụ n’ụzọ ọjọọ nile unu chegharịa; ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka unu ga-anwụ, ụlọ Israel?”—Ezikiel 33:1-11.
ỌGỌST 21-27
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
w88 9/15 24 ¶11
“Ha Ga-amarakwa Na Mụ Onwe M Bụ Jehova”
11 Mgbe ihe fọdụrụ lọghachitasịrị na Juda, e meghachịrị ala ahụ tọgbọrọ n’efu ka ọ ghọọ “ubi Iden a gbara ogige” nke na-amị mkpụrụ. (Gụọ Ezikiel 36:33-36.) N’ụzọ yiri nke ahụ, eri 1919 Jehova agbanwewo ala ahụ tọgbọrọ n’efu ná mbụ nke ihe fọdụrụ e tere mmanụ ịbụ Paradaịs ime mmụọ nke na-amị mkpụrụ, nke ha na “oké ìgwè mmadụ” nọ ugbu a na-ekekọ. Ebe ọ bụ na e jiriwo ndị dị nsọ bijupụta Paradaịs ime mmụọ nke a, ka onye Kraịst ọ bụla raara onwe ya nye rụọ ọrụ iji debe ya ọcha.—Ezikiel 36:37, 38.
ỌGỌST 28–SEPTEMBA 3
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
w89 8/15 14 ¶20
Imeghe Ụzọ nke Ga-edujeghachi na Paradaịs
20 Ma, gịnị banyere ngwá agha nke mba nile ga-ahapụ n’elu ala? N’iburu n’uche ogologo oge ihe atụ ọ ga-ewe iji kpochapụsịa akụkụ ha ndị na-akpata mbibi, ọ ga-abụ nnọọ ihe buru ibu. (Ezikiel 39:8-10) ndị dịrị ndụ gabiga Amagedọn pụrụ inwe ike iji akụkụ dị iche iche nke ngwá agha mba nile ndị fọdụrụnụ mee ihe ndị ga-aba uru.—Aịsaia 2:2-4.