AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | EZIKIEL 46-48
Ngọzi Ndị Izrel A Kpọghachiri n’Ala Ha Ga-enweta
Ọhụụ ụlọ nsọ Ezikiel mere ka obi sie ndị Izrel a dọọrọ n’agha ike, gosikwa na amụma ndị e buru gbasara nlọghachi ha n’ala ha ga-emezu. Ofufe dị ọcha ga-abụ ihe kacha mkpa ná ndụ ndị Jehova gọziri.
Ọhụụ ahụ kwuru na a ga-enwe nhazi ndị dị mma, ịdị n’otu na nchebe n’etiti ndị Chineke
Ala ha ga na-emepụta ihe
Ezinụlọ ọ bụla ga-enwe ihe nketa
Tupu e kenye ezinụlọ ndị ahụ ala, a ga-ewepụta ala a ga-enye Jehova ‘n’onyinye’
Olee otú m ga-esi gosi na m weere ofufe Jehova ka ihe mbụ ná ndụ m? (w06 4/15 27-28 ¶13-14)