OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Mụrụ Anya ma Na-anụ Ọkụ n’Obi n’Ofufe Jehova n’Oge Ihe Gbanweere Gị
Anyị agaghị egbochili mgbanwe, karịchaa n’oge ikpeazụ a. (1 Kọr. 7:31) Ma, ànyị tụrụ anya n’ihe ga-agbanwe ma ọ bụ na anyị atụghị anya ya, ụdị mgbanwe ọ bụla bịaara anyị ma nke ọma ma nke ọjọọ, nwere ike ịkpa ofufe anyị aka ọjọọ ma ọ bụ mebie adịm ná mma anyị na Jehova. Olee ihe ga-enyere anyị aka ịmụrụ anya na ịna-anụ ọkụ n’obi ma ihe gbanweere anyị? Leenụ vidio bụ́ Otú Okwukwe Anyị Ga-esi Bụrụ A Kwaa Akwụrụ Ma Anyị Kwagawa Ebe Ọzọ, zaakwanụ ajụjụ ndị a:
Olee ihe otu nwanna gwara nna ezinụlọ ahụ?
Olee otú ihe e dere na Matiu 7:25 si nyere ezinụlọ ahụ aka ịma ihe ha ga-eme?
Olee ihe ezinụlọ ahụ mere iji kwadebe maka ịkwaga ebe ahụ, oleekwa otú o si nyere ha aka?
Gịnị nyeere ha aka ime ka ahụ́ ruo ha ala n’ọgbakọ ọhụrụ ha na n’ókèala ọhụrụ ha?
Olee ihe ndị gbanwere na ndụ m na nso nso a?
Olee otú m ga-esi mee ihe m mụtara na vidio a?