Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
ỌGỌST 6-12
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | LUK 17-18
“Na-ekele Onye Meere Gị Ihe”
ihe ụfọdụ a kọwara na Luk 17:12, 14, nwtsty
ndị ekpenta iri: N’oge ochie, ndị ekpenta na-ebikọtakarị ọnụ ma ọ bụ na-anọkọta ọnụ, ka ha nwee ike ịna-enyere ibe ha aka. (2 Eze 7:3-5) Iwu Chineke kwuru na ndị ekpenta kwesịrị ibipụ iche. Iwu ahụ kwukwara na onye ekpenta kwesịrị ịna-eti mkpu, sị, “Adịghị m ọcha, adịghị m ọcha!” iji gwa ndị ọzọ na ya na-abịa. (Lev. 13:45, 46) Iji mee ihe Iwu ahụ kwuru, ndị ekpenta ahụ guzoro n’ebe dị anya n’ebe Jizọs nọ.
gosi ndị nchụàjà onwe unu: Ebe Jizọs nọ n’okpuru Iwu Mozis n’oge ọ nọ n’ụwa, ọ gwara ndị ekpenta ahụ ọ gwọrọ ka ha gaa gosi ndị nchụàjà si n’ezinụlọ Erọn onwe ha, n’ihi na ọ ghọtara na Iwu ahụ kwadoro ọrụ ha na-arụ. (Mat. 8:4; Mak 1:44) Iwu Mozis kwuru na ọ bụ onye nchụàjà ga-ele onye ekpenta ma kwuo na ahụ́ adịla ya mma. Onye ekpenta ahụ a gwọrọ ga-eji nnụnụ abụọ dị ndụ bụ́ ndị dị ọcha, osisi sida, ákwà na-acha uhie uhie, na ahịhịa hisop gaa n’ụlọ nsọ ka e jiri ha mee ka ọ dị ọcha.—Lev. 14:2-32.
ihe a kọwara na Luk 17:10, nwtsty
na-abaghị uru ọ bụla: Ma ọ bụ “na-abaghị n’ihe; na-enweghị isi na ọdụ.” Ihe Jizọs na-ekwu n’ihe atụ a abụghị na ndị ohu ahụ, ya bụ, ndị na-eso ụzọ ya, kwesịrị ilewe onwe ha anya ka ndị na-abaghị uru. N’ebe a, okwu bụ́ “na-abaghị uru ọ bụla” pụtara na ndị ohu ahụ kwesịrị ịdị umeala n’obi, ha ekwesịghịkwa ịchọ ka e towe ha ma ọ bụ ka a na-akwanyere ha ùgwù pụrụ iche. Ụfọdụ ndị ọkachamara na-ekwu na otú ọzọ e nwere ike isi kọwaa okwu a bụ, “anyị bụ naanị ndị ohu a na-ekwesịghị ịkwanyere ùgwù pụrụ iche.”
ihe a kọwara na Luk 18:8, nwtsty
okwukwe: Ma ọ bụ, “ụdị okwukwe a.” N’asụsụ Grik, ọ pụtara “okwukwe ahụ,” nke gosiri na ihe Jizọs na-ekwu n’ebe a abụghị gbasara okwukwe niile, kama, otu ụdị okwukwe, dị ka nke nwaanyị ahụ di ya nwụrụ o ji mee ihe atụ nwere. (Luk 18:1-8) Mmadụ inwe okwukwe n’ike ekpere na-akpa nakwa inwe okwukwe na Chineke ga-emeli ka ndị ya nweta ikpe ziri ezi sokwa na ya. Ọ ga-abụ na ihe mere Jizọs azaghị ajụjụ ahụ ọ jụrụ banyere okwukwe bụ na ọ chọrọ ka ndị na-eso ụzọ ya chebara otú okwukwe ha siruru n’ike echiche. Ihe atụ ahụ Jizọs mere banyere ekpere na okwukwe dabara nnọọ adaba n’ihi na ọ ka kwupụrụ banyere ọnwụnwa ndị ga-abịara ndị na-eso ụzọ ya.—Luk 17:22-37.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
ihe a kọwara na Luk 19:43, nwtsty
ga-eji osisi pịrị ọnụ wuo ogige: Ọ bụ naanị n’ebe a ka okwu Grik bụ́ khaʹrax pụtara n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Ọ pụtara “osisi pịrị ọnụ e ji agba ihe ogige; osisi pịrị ọnụ a na-akpọnye n’ala.” O nwekwara ike ịpụta “ebe ndị amị ji osisi pịrị ọnụ gbaa ogige.” Okwu Jizọs a mezuru n’afọ 70 Oge Ndị Kraịst, mgbe ọchịagha ndị Rom aha ya bụ Taịtọs, dunyere ndị agha Rom ka ha gaa jiri osisi pịrị ọnụ, gbaa ogige gburugburu Jeruselem. E nwere ụzọ ihe atọ mere Taịtọs ji mee ihe a: Nke mbụ ka ndị Juu ghara ịgbapụ, nke abụọ, ka ha chịliere ya aka elu, nakwa nke atọ, ka agụụ nyụọ ha ịkpakwụ, ha chịliere ya aka elu. Iji nweta osisi ha ga-eji gbaa ogige a, ndị agha Rom gbukpọrọ osisi niile dị n’ọhịa dị gburugburu Jeruselem.
ihe a kọwara na Luk 20:38, nwtsty
n’ihi na n’ebe ọ nọ, ha niile dị ndụ: Ma ọ bụ, “n’ihi na n’anya ya, ha niile dị ndụ.” Baịbụl gosiri na ndị dị ndụ, ha na Chineke na-adịghị ná mma, nwụrụ anwụ n’anya ya. (Efe. 2:1; 1 Tim. 5:6) Otú ahụkwa ka ndị niile ha na Chineke dị ná mma, nwụrụ anwụ, ka dị ndụ n’anya ya, n’ihi na e ji n’aka na ọ ga-akpọlite ha n’ọnwụ.—Rom 4:16, 17.
ỌGỌST 20-26
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
ihe ụfọdụ a kọwara na Luk 21:33, nwtsty
Eluigwe na ụwa ga-agabiga: Ebe ndị ọzọ na Baịbụl gosiri na eluigwe na ụwa ga-adịru mgbe ebighị ebi. (Jen. 9:16; Ọma 104:5; Ekli. 1:4) E nwere ike ikwu na Jizọs ji okwu a na-eme ka anyị mata na ọ bụrụgodị na ihe na-agaghị ekwe omume, dị ka eluigwe na ụwa ịgabiga, emee, ihe o kwuru ka ga-emezukwa. (Tụlee Mat. 5:18.) Eluigwe na ụwa a na-ekwu maka ya n’ebe a nwekwara ike ịbụ eluigwe na ụwa ihe atụ ahụ dị ná Mkpughe 21:1, nke a kpọrọ “eluigwe mbụ na ụwa mbụ.”
okwu m agaghị agabiga ma ọlị: Ma ọ bụ, “okwu m emekataghị gabiga.” Okwu Grik abụọ pụtara ekwetaghị ihe, dị n’okwu Jizọs a, mere ka o doo anya na okwu Jizọs a aghaghị imezu.
ỌGỌST 27–SEPTEMBA 2
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
ihe a kọwara na Luk 23:31, nwtsty
mgbe osisi dị ndụ, . . . mgbe ọ kpọnwụrụ akpọnwụ: Ọ dị ka ọ̀ bụ mba Izrel ka Jizọs na-ekwu banyere ya n’ebe a. Mba ahụ dị ka osisi na-achọ ịkpọnwụ akpọnwụ nke ka nwere mmiri n’ahụ́ ya, n’ihi na ma Jizọs ma ụfọdụ ndị Juu nwere okwukwe na ya, ka nọ ná mba ahụ. Ma n’oge na-adịghị anya, a ga-egbu Jizọs, a ga-ejikwa mmụọ nsọ tee ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi mmanụ, ha esoro n’Izrel nke Chineke. (Rom 2:28, 29; Gal. 6:16) Mgbe ahụ, mba Izrel ga-aghọ mba nwụrụ anwụ n’anya Chineke, dịzie ka osisi kpọnwụrụ akpọnwụ.—Mat. 21:43.
ihe e ji kọwaa Luk 23:33, nwtsty
Ntú A Kụnyere n’Ọkpụkpụ Ikiri Ụkwụ
Ihe a bụ foto ọkpụkpụ ikiri ụkwụ mmadụ a kpọnyere ntu ígwè dị ihe dị ka inch anọ na ọkara n’ogologo. Ọ bụ n’afọ 1968 ka e gwupụtara ọkpụkpụ a n’ebe ugwu Jeruselem. Ọ ga-abụ n’oge ndị Rom na-achị ka a kpọnyere ntụ n’ọkpụkpụ a. Ọkpụkpụ a na-egosi na ọ ga-abụrịrị na ndị oge ahụ na-eji ntu akpọgide ndị a mara ikpe ọnwụ n’osisi. O nwekwara ike ịbụ ụdị ntu a ka ndị agha Rom ji kpọgide Jizọs n’osisi. A hụrụ ọkpụkpụ a n’otu igbe e ji nkume rụọ. A na-ejikarị igbe nkume a etinye ọkpụkpụ ndị nwụrụ anwụ ma ahụ́ ha rechaa, ọkpụkpụ ha a kpọọkwa nkụ. Ihe a na-egosi na e nwere ike ili onye a kpọgidere n’osisi eli.