Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
SEPTEMBA 3-9
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
ihe ụfọdụ a kọwara na Jọn 1:1, nwtsty
Okwu ahụ: Ma ọ bụ “Logos.” Na Grik, ho loʹgos. N’amaokwu a ọ bụ utu aha. Ọ bụkwa okwu a ka a sụgharịrị na Jọn 1:14 nakwa ná Mkpu. 19:13. Jọn kọwara na ọ bụ Jizọs nwe utu aha a. A kpọrọ Jizọs Okwu ahụ mgbe ọ nọ n’eluigwe dị ka mmụọ tupu ya abịa n’ụwa, mgbe ọ na-eje ozi n’elu ụwa dị ka mmadụ zuru okè, nakwa mgbe e buliri ya n’ọkwá n’eluigwe. Jizọs bụ ọnụ na-ekwuru Chineke n’ihi na ọ na-esi n’aka ya agwa ma ndị mmụọ ozi ma ụmụ mmadụ ndị o kere eke okwu. N’ihi ya, ọ dabara adaba ikwu na tupu Jizọs abịa n’ụwa, Jehova si n’aka ya na-agwa ụmụ mmadụ okwu. Ọ bụ ya bụ Mmụọ ozi na-ekwuchite ọnụ Jehova.—Jen. 16:7-11; 22:11; 31:11; Ọpụ. 3:2-5; Ikpe 2:1-4; 6:11, 12; 13:3.
nọkwa: N’amaokwu a, okwu Grik bụ́ pros gosiri ihe nọ ezigbo nso na imekọ ihe ọnụ. Ọ na-egosikwa na Jizọs, ya bụ, Okwu ahụ, dị iche n’ebe ezi Chineke ahụ nọ.
Okwu ahụ bụkwa chi: Ma ọ bụ Okwu ahụ “dị ka chi.” Ihe a Jọn kwuru na-akọwa “Okwu ahụ” (Na Grik, ho loʹgos; lee ihe a kọwa gbasara Okwu ahụ n’amaokwu a), ya bụ, Jizọs Kraịst. Ihe mere e ji akpọ Okwu ahụ “chi; onye dị ka chi” bụ na ọ bụ Ọkpara Chineke bu ụzọ mụọ, onye o si n’aka ya kee ihe ndị ọzọ niile. Ma ọtụtụ ndị nsụgharị Baịbụl na-asụgharị amaokwu a ka ọ bụrụ “Okwu ahụ bụkwa Chineke,” na-eme ka Jizọs na Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile hara. Ma, e nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji ekwu na ihe Jọn na-ekwu ebe a abụghị na “Okwu ahụ” bụ Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile. Nke mbụ bụ na okwu bu ya ụzọ kwuru na “Okwu ahụ” na “Chineke nọkwa,” nke na-esote ya ekwuokwa na “Onye a na Chineke nọ.” Ihe ọzọkwa bụ na okwu Grik bụ́ the·osʹ pụtara ugboro atọ n’amaokwu nke mbụ na nke abụọ. N’ebe nke mbụ na nke atọ, e nwere okwu Grik e dere tupu the·osʹ nke gosiri na ọ bụ Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ka a na-ekwu maka ya, mana, ọ dịghị n’ebe nke abụọ. Ọtụtụ ndị ọkà mmụta Baịbụl kwetara na otú o si pụta na nke abụọ dị nnọọ iche. O gosiri na the·osʹ nke mbụ na nke atọ ahụ na-ekwu gbasara Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile. Ma, nke abụọ na-egosi ọrụ “Okwu ahụ” na-arụ. N’ihi ya, ụfọdụ Baịbụl dị n’asụsụ Bekee, French na Jaman sụgharịrị amaokwu a otú Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ si sụgharịa ya, nke na-egosi na “Okwu ahụ” bụkwa “chi; onye dị ka chi.” Nsụgharị Baịbụl ochie nke Oziọma Jọn dị n’asụsụ Sahidic na Bohairic nke ndị Kọpt kwadoro ihe a. O nwere ike ịbụ na e bipụtara ha n’ihe dị ka otu puku na narị afọ isii ma ọ bụ asaa gara aga. Otú ha si sụgharịa ebe mbụ the·osʹ pụtara na Jọn 1:1 dị iche n’otú ha sị sụgharịa ya n’ebe nke abụọ ọ pụtara. Otú a e si sụgharịa ya kọwara ụdị onye “Okwu ahụ” bụ, ya bụ na ọ dị ka Chineke, ọ bụghị na ya na Nna ya bụ́ Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile hà. Ihe a dabara n’otú Ndị Kọlọsi 2:9 si kọwaa Kraịst dị ka onye nwere “izu ezu niile nke ọdịdị Chineke.” 2 Pita 1:4 kwudịrị na ndị ha na Kraịst ga-eso chịa “ga-eso nwee ọdịdị Chineke.” Ihe ọzọkwa abụrụ na na Baịbụl Septuagint, okwu Grik bụ́ the·osʹ na okwu Hibru a na-asụgharị “Chineke,” ʼel na ʼelo·himʹ pụtara otu ihe. A na-ekwukarị na ha pụtara “Dike; Onye Dị Ike.” A na-eji okwu Hibru ndị a akọwa Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, chi ndị ọzọ, nakwa ụmụ mmadụ. (Gụọ ihe a kọwara na Jọn 10:34.) Ịkpọ Okwu ahụ “chi” ma ọ bụ “onye dị ike,” dabara n’amụma e buru n’Aịzaya 9:6, ebe kwuru na a ga-akpọ Mesaya ahụ “Chineke nke bụ́ Dike” (ọ bụghị “Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile”) nakwa na ọ ga-abụ “Nna Mgbe Ebighị Ebi” nke ndị niile ọ ga-achị. Ekworo Nna ya bụ́ “Jehova nke ụsụụ ndị agha” ga-emezu ihe a.—Aịza. 9:7.
ihe a kọwara na Jọn 1:29, nwtsty
Nwa Atụrụ Chineke: Mgbe e mechara Jizọs baptizim, Ekwensu anwachaakwa ya, Jọn Onye Na-eme Baptizim gwara ndị mmadụ na ọ bụ “Nwa Atụrụ Chineke.” Ọ bụ naanị n’amaokwu a nakwa na Jọn 1:36 ka a kpọrọ ya aha a. (Gụọ sgd-IB isi nke 4.) Ọ dabara adaba na e ji Jizọs tụnyere nwa atụrụ. Na Baịbụl, a na-eji nwa atụrụ achụ àjà maka mmehie nakwa iji nweta ihu ọma Chineke. Ọ nọchiri anya àjà Jizọs ga-eji ndụ ya zuru okè chụọ maka ụmụ mmadụ. Anyị nwere ike ịhụ ihe dị iche iche okwu ahụ bụ́ “Nwa Atụrụ Chineke” pụtara n’ọtụtụ ebe n’Akwụkwọ Nsọ. Ebe Jọn Onye Na-eme Baptizim ma Akwụkwọ Nsọ Hibru nke ọma, ihe o kwuru nwere ike ịpụta otu n’ime ihe ndị a ma ọ bụ karịa: ebule ahụ Ebreham ji chụọ àjà kama iji nwa ya nwoke bụ́ Aịzik (Jen. 22:13), nwa atụrụ Ememme Ngabiga ndị Izrel chụrụ n’àjà n’Ijipt ka a ghara igbu nwa mbụ ha (Ọpụ. 12:1-13) ma ọ bụ nwa ebule a na-achụ n’àjà n’ebe ịchụàjà Chineke na Jeruselem kwa ụtụtụ na anyasị (Ọpụ. 29:38-42). O nwekwara ike ịbụ na ihe Jọn bu n’uche bụ amụma Aịzaya buru, ebe kwuru na onye Jehova kpọrọ “Ohu m” ka ‘a kpụụrụ dị ka atụrụ a gaje igbu egbu.’ (Aịza. 52:13; 53:5, 7, 11) N’akwụkwọ ozi mbụ Pọl onyeozi degaara Ndị Kọrịnt, ọ kpọrọ Jizọs “nwa atụrụ ememme ngabiga anyị.” (1 Kọr. 5:7) Pita onyeozi kwuru na ‘ọbara Kraịst nke dị oké ọnụ ahịa, dị ka nke nwa atụrụ na-enweghị mmerụ, nke na-enweghịkwa ntụpọ.’ (1 Pita 1:19) N’akwụkwọ Mkpughe, a kpọrọ Jizọs e mere ka ọ dị ebube “Nwa Atụrụ ahụ” ihe karịrị ugboro iri abụọ na ise.—Ụfọdụ n’ime ebe ndị ahụ bụ: Mkpu. 5:8; 6:1; 7:9; 12:11; 13:8; 14:1; 15:3; 17:14; 19:7; 21:9; 22:1.
SEPTEMBA 10-16
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JỌN 3-4
“Jizọs Ezie Nwaanyị Sameria Ozi Ọma”
ihe a kọwara na Jọn 4:6, nwtsty
ebe ike gwụrụ Jizọs: Ọ bụ naanị ebe a ka Akwụkwọ Nsọ kwuru na “ike gwụrụ” Jizọs. Ọ bụ n’ihe dị ka n’elekere iri na abụọ nke ehihie. N’ụtụtụ ụbọchị ahụ, ọ ga-abụ na Jizọs mere njem si na ndagwurugwu Jọdan dị na Judia gaa obodo Saịka dị na Sameria, rịakwa ugwu fọrọ obere ka ogo ya bụrụ otu kilomita.—Jọn 4:3-5; gụọ Gụọ sgd-IB isi nke 4.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
ihe a kọwara na Jọn 3:29, nwtsty
enyi nke nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ: N’oge ochie, enyi nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ na-aghọrọ ya onye nnọchiteanya iwu kwadoro. Ọ na-anọkwa n’isi na-ahụ na a haziri ihe niile maka alụmdi na nwunye ahụ. A na-ele ya anya ka onye jikọtara nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ na nwaanyị ahụ ọ na-alụ ọhụrụ. N’ụbọchị agbamakwụkwọ ahụ, ndị enyi nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ ga-esoro ya gaa n’ụlọ nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ ma ọ bụ na nke nna nwoke ahụ, bụ́ ebe a ga-anọ eme ememme agbamakwụkwọ ahụ. N’oge agbamakwụkwọ ahụ, enyi nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ na-enwe ezigbo obi ụtọ ma ọ nụ olu nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ ka ya na nwaanyị ọ na-alụ ọhụrụ na-akparịta ụka, n’ihi na obi ya ga-agwa ya na ya arụzuola ọrụ ya nke ọma. Jọn Onye Na-eme Baptizim ji onwe ya tụnyere “enyi nke nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ.” N’amaokwu a, ọ bụ Jizọs bụ nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ, ndị na-eso ụzọ ya nọchikwara anya nwaanyị ọ na-alụ ọhụrụ. Jọn Onye Na-eme Baptizim doziri ụzọ maka Mesaya ahụ, ma gosi Jizọs Kraịst ndị mbụ so na ‘nwaanyị ahụ ọ na-alụ ọhụrụ.’ (Jọn 1:29, 35; 2 Kọr. 11:2; Efe. 5:22-27; Mkpu. 21:2, 9) Ọ bụrụ na “enyi nke nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ” gosichaa ya nwaanyị ahụ ọ na-alụ ọhụrụ, ọrụ ya agwụla; ọ ga-enyezi ohere ka nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ mewezie ihe ndị nke fọrọnụ. Ọ bụkwa ya mere Jọn ji kwuo gbasara Jizọs, sị: “Onye ahụ ga na-eto eto, ma mụ onwe m ga na-atalata atalata.”—Jọn 3:30.
(Jọn 4:10) Jizọs zara ya, sị: “A sị na ị maara onyinye Chineke na-enye n’efu na onye na-asị gị, ‘Nye m mmiri ka m ṅụọ,’ ị gaara arịọ ya, ọ gakwaara enye gị mmiri na-enye ndụ.”
ihe a kọwara na Jọn 4:10, nwtsty
mmiri na-enye ndụ: Okwu Grik a a sụgharịrị “mmiri na-enye ndụ” pụtara n’ụzọ nkịtị mmiri na-asọ asọ ma ọ bụ mmiri na-agbapụta n’okwute. Ụdị mmiri a dị iche ná mmiri si n’olulu nke dọọrọ n’otu ebe. Na Levitikọs 14:5, okwu Hibru a sụgharịrị “mmiri iyi” pụtara n’ụzọ nkịtị “mmiri na-enye ndụ.” Na Jeremaya 2:13 nakwa Jeremaya 17:13, a kọwara Jehova ka “isi iyi nke mmiri na-enye ndụ,” ya bụ, na ọ bụ Jehova na-enye mmiri ihe atụ nke na-enye ndụ. Mgbe Jizọs na nwaanyị Sameria na-akparịta ụka, o ji “mmiri na-enye ndụ” meere ya ihe atụ. Ma, o yiri ka nwaanyị ahụ ọ̀ ghọtara na ọ na-ekwu banyere mmiri nkịtị.—Jọn 4:11; lee ihe a kọwara na Jọn 4:14.
SEPTEMBA 17-23
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JỌN 5-6
“Buru Ezi Ihe n’Obi Na-eso Jizọs”
ihe a kọwara na Jọn 6:10, nwtsty
ndị ikom ahụ nọdụrụ ala iri nri, ha dị ihe dị ka puku ise: Ọ bụ naanị Matiu tinyere “ma e wezụga ndị inyom na ụmụntakịrị” mgbe ọ na-akọ banyere ọrụ ebube a Jizọs rụrụ. (Mat. 14:21) O nwere ike ịbụ na ndị e ji ọrụ ebube ahụ nye nri karịrị puku mmadụ iri na ise.
ihe a kọwara na Jọn 6:14, nwtsty
onye amụma: Ọtụtụ ndị Juu n’oge ndịozi Jizọs nọ na-atụ anya na onye amụma dị ka Mozis nke e kwuru banyere ya na Diut. 18:15, 18 ga-abụ Mesaya ahụ. N’amaokwu a, o yiri ka okwu ahụ bụ́ ga-abịa n’ụwa na-ekwu banyere mgbe Mesaya ahụ ga-abịa. Ọ bụ naanị Jọn dekọrọ ihe ndị mere n’amaokwu a.
ihe ụfọdụ a kọwara na Jọn 6:27, 54, nwtsty
nri nke na-ala n’iyi . . . nri na-adịgide adịgide nke na-eduga ná ndụ ebighị ebi: Jizọs ghọtara na ọtụtụ ndị na-esogharị ya na ndị na-eso ụzọ naanị n’ihi ihe ha ga-erite n’aka ya. Ọ bụ eziokwu na nri nkịtị na-enyere mmadụ aka ịdị ndụ kwa ụbọchị, ma “nri” si n’Okwu Chineke ga-eme ka mmadụ dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Jizọs gwara ìgwè mmadụ ahụ ka ha rụọ ọrụ iji nweta “nri na-adịgide adịgide nke na-eduga ná ndụ ebighị ebi,” ya bụ, ka ha gbaa mbọ bute ihe gbasara ofufe Chineke ụzọ nakwa ka ha nwee okwukwe n’ihe ha na-amụta.—Mat. 4:4; 5:3; Jọn 6:28-39.
na-eri anụ ahụ́ m ma na-aṅụ ọbara m: Ihe ebe a na-ekwu bụ na otú ha ga-esi eri anụ ahụ́ Jizọs Kraịst ma ṅụọ ọbara ya bụ inwe okwukwe n’ebe ọ nọ. (Jọn 6:35, 40) Jizọs kwuru ihe a n’afọ 32 Oge Ndị Kraịst, n’ihi ya, ọ naghị ekwu gbasara Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, bụ́ nke o guzobere n’afọ sochiri ya. O kwuru ihe a obere oge tupu “ememme ngabiga, bụ́ ememme ndị Juu” (Jọn 6:4), n’ihi ya, ọ ga-abụ na o chetaara ndị na-ege ya ntị ememme ahụ ha na-achọ ime nakwa uru ọbara nwa atụrụ e ji eme ya bara n’ịgbapụta ndị Izrel n’Ijipt n’abalị ahụ a gbapụtara ha n’Ijipt (Ọpụ. 12:24-27). Jizọs na-eme ka ha mata na ọbara ya ga-emekwa ka ndị na-eso ụzọ nwee olileanya inwe ndụ ebighị ebi.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
ihe a kọwara na Jọn 6:44, nwtsty
ma ọ bụrụ na Nna m, . . . adọtaghị ya: Ọ bụ eziokwu na okwu Grik a sụgharịrị “dọta” na-ekwu banyere ụgbụ e ji adọta azụ̀ (Jọn 21:6, 11), ọ pụtaghị na Chineke na-adọrọ ndị mmadụ ma hà chọrọ ya ma hà achọghị ya. O nwekwara ike ịbụ na Jizọs na-ekwu banyere ihe e dere na Jeremaya 31:3, ebe Jehova gwara ndị ya n’oge ochie, sị: “M ji . . . obiọma dọta gị.” (Septuagint dekwara otu okwu Grik a n’amaokwu a.) Jọn 12:32 gosikwara na Jizọs na-adọtara onwe ya ụdị mmadụ niile. Akwụkwọ Nsọ gosiri na Jehova kere ụmụ mmadụ otú ha ga-enwere onwe ha ime nhọrọ. Ọ bụ onye ọ bụla ga-ekpebi ma ọ̀ ga-efe Chineke ma ọ bụ na ọ gaghị efe ya. (Diut. 30:19, 20) Chineke na-eji nwayọọ adọtara onwe ya ndị nwere ezi obi. (Ọma 11:5; Ilu 21:2; Ọrụ 13:48) Ọ na-eji Okwu ya bụ́ Baịbụl na mmụọ nsọ ya eme ya. Amụma e buru n’Aịzaya 54:13, nke e hotara na Jọn 6:45 na-ekwu gbasara ndị Jehova bụ́ Nna, dọtara.—Gụọkwa ihe e dere na Jọn 6:65.
ihe ụfọdụ a kọwara na Jọn 6:64, nwtsty
Jizọs maara . . . onye ahụ nke ga-arara ya nye: Jizọs na-ekwu gbasara Judas Iskarịọt. Jizọs kpere ekpere abalị niile tupu ya ahọrọ ndịozi iri na abụọ ya. (Luk 6:12-16) Ná mbido, Judas kwesịrị ntụkwasị obi. Ma, Jizọs ma na e buru n’amụma n’Akwụkwọ Nsọ Hibru na otu n’ime ndị ya na ha dị ná mma ga-arara ya nye. (Ọma 41:9; 109:8; Jọn 13:18, 19) Mgbe Judas malitere ime ihe ọjọọ, Jizọs matara, ebe o nwere ike ịma ihe dị mmadụ n’obi na ihe mmadụ na-eche. (Mat. 9:4) Chineke ji ikike o nwere ịma ihe ga-eme n’ọdịnihu mara na otu n’ime ndị ha na Jizọs dị ná mma ga-arara ya nye. Ma, ọ pụtaghị na Jehova bu n’obi na ọ ga-abụ Judas, n’ihi na ọ ga-apụta na ọ kaala ọdịnihu ya akaa. Nke ahụ adabaghịkwa n’ihe e ji mara Chineke na otú o si eme ihe.
site ná mmalite: Ihe a anaghị ekwu gbasara mgbe a mụrụ Judas ma ọ bụ mgbe Jizọs kpechara ekpere abalị niile họọrọ ya ịbụ onyeozi. (Luk 6:12-16) Kama, ọ na-ekwu banyere mgbe Judas malitere ịghọ aghụghọ, bụ́kwanụ nke Jizọs matara ozugbo. (Jọn 2:24, 25; Mkpu. 1:1; 2:23; lee ihe a kọwara na Jọn 6:70; 13:11.) Ihe a gosikwara na Judas chebaara ihe o mere echiche ma kpaa nkata ya, ọ bụghị ihe nọkatara gbata ya n’obi ozugbo, ya emee ya. Okwu bụ́ “mmalite” (Grik, ar·kheʹ) na-apụta ihe dị iche iche n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst dabere n’ihe a na-ekwu. Dị ka ihe atụ, na 2 Pita 3:4, “mmalite” dị ebe ahụ bụ mmalite okike. Ma ọtụtụ mgbe, ọ naghị ekwu banyere mgbe a malitere ike ihe. Dị ka ihe atụ, Pita kwuru na mmụọ nsọ dakwasịrị ndị mba ọzọ “dị nnọọ ka ọ dakwasịkwara anyị ná mmalite.” (Ọrụ 11:15) Pita anaghị ekwu banyere mgbe a mụrụ ya ma ọ bụ mgbe a kpọrọ ya ka ọ bụrụ onyeozi. Kama, ọ na-ekwu banyere ụbọchị Pentikọst afọ 33 Oge Ndị Kraịst, ya bụ, oge a ‘malitere’ ịwụkwasị ndị mmadụ mmụọ nsọ maka ọrụ pụrụ iche. (Ọrụ 2:1-4) Na Luk 1:2; Jọn 15:27 nakwa na 1 Jọn 2:7, okwu bụ́ “mmalite” pụtara ihe dị iche iche dabere n’ihe a na-ekwu maka ya.
SEPTEMBA 24-30
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
ihe a kọwara na Jọn 8:58, nwtsty
mụ onwe m adịrịla ndụ: Ndị Juu na-emegide Jizọs chọrọ ịtụ ya nkume n’ihi na o kwuru na ya ‘ahụwo Ebreham,’ n’agbanyeghị na dị ka ha kwuru, Jizọs ‘erubeghị afọ iri ise.’ (Jọn 8:57) Ihe Jizọs zara ha bụ iji gwa ha na ya bụ mmụọ dị ike n’eluigwe tupu a mụọ Ebreham. Ụfọdụ ndị na-ekwu na amaokwu a na-egosi na Jizọs bụ Chineke. Ha na-ekwu na ọ bụ otu okwu Grik e dere ebe a bụ́ e·goʹ ei·miʹ ka e dekwara na Septuagint n’Ọpụpụ 3:14. (Gụọ ihe a kọwara na Jọn 4:26.) Ma n’amaokwu a, okwu Grik bụ́ ei·miʹ na-egosi na Jizọs adịwala ndụ “tupu a mụọ Ebreham,” ma ka dịrịkwa ndụ ruo n’oge ahụ. N’ihi ya, o nweghị ihe dị njọ ịsụgharị ya “mụ onwe m adịrịla ndụ.” Ụfọdụ nsụgharị Baịbụl ndị oge a na ndị merela ochie dekwara ya ihe dị ka “mụ onwe m adịrịla ndụ.” Ihe ọzọkwa bụ na ihe Jizọs kwuru na Jọn 8:54, 55 gosiri na ọ naghị achọ ime onwe ya ka ya na Nna ya hà bụ otu onye.
ihe a kọwara na Jọn 10:34, nwtsty
chi: Ma ọ bụ “ndị dị ka chi.” Jizọs na-ekwughachi ihe e dere n’Abụ Ọma 82:6, ebe e ji okwu Grik bụ́ ʼelo·himʹ (chi) kwuo okwu banyere ụmụ mmadụ ndị na-ekpe ikpe n’Izrel. A kpọrọ ha “chi” n’ihi na ha na-arụ ọrụ dị ka ndị nnọchiteanya ma ọ bụ ọnụ na-ekwuchitere Chineke. A gwakwara Mozis na ọ ga-abụrụ Erọn na Fero Chineke.—Ọpụ. 4:16; 7:1.
ihe a kọwara na Jọn 6:70, nwtsty
onye nkwutọ: Ma ọ bụ “ekwensu.” Okwu Grik bụ́ di·aʹbo·los a na-ejikarị akọwa Ekwensu pụtara “onye nkwutọ.” A sụgharịrị ya “ndị nkwutọ” na 2 Timoti 3:3; 1 Timoti 3:11 nakwa na Taịtọs 2:3 ebe ndị a na-anaghị ekwu banyere Ekwensu. Na Grik, ọ bụrụ na e ji ya na-akọwa Ekwensu, e nwere okwu a na-etinyekarị n’ihu ya iji gosi na ọ bụ ya ka a na-ekwu. Jizọs ji okwu a kọwaa Judas n’amaokwu a n’ihi na ọ malitela ịkpa àgwà ọjọọ. Ọ ga-abụ na Jizọs achọpụtala na Judas akpawala àgwà ga-eduga ya n’ime ihe ọjọọ, bụ́ nke mechara mee ka Setan jiri ya kpaa nkata otú e si gbuo Jizọs.—Jọn 13:2, 11.
ihe a kọwara na Jọn 13:11, nwtsty
ọ maara: Ebe Jizọs nwere ike ịma ihe ndị nọ ya nso na-eche ma ọ bụ ihe dị ha n’obi, o doro anya na Judas abụghị onye ọjọọ n’oge Jizọs họọrọ ya ka ọ bụrụ otu n’ime ndịozi ya. (Mat.9:4; Mak 2:8; Jọn 2:24, 25) Ma, mgbe Judas mechara kpawa àgwà ọjọọ, Jizọs matara, si otú ahụ mara onye ga-arara ya nye. N’agbanyeghị na Jizọs ma na Judas ga-arara ya nye, ọ sara ụkwụ ya.—Gụọ ihe ụfọdụ a kọwara na Jọn 6:70.