Ebe ụmụnna na-anabata onye bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs
Ihe Gị na Mmadụ Nwere Ike Ikwurịta
●○○ MKPARỊTA ỤKA NKE MBỤ
○●○ NLETAGHACHI NKE MBỤ
Ajụjụ: Gịnị mere Jizọs ji nwụọ?
Amaokwu Baịbụl: Mat. 20:28
Ajụjụ A Ga-aza n’Oge Ọzọ: Olee otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka àjà mgbapụta Jizọs?
○○● NLETAGHACHI NKE ABỤỌ
Ajụjụ: Olee otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka àjà mgbapụta Jizọs?
Amaokwu Baịbụl: Jọn 17:3
Ajụjụ A Ga-aza n’Oge Ọzọ: Olee otú ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova na-adị?
OTÚ ANYỊ GA-ESI AKPỌ NDỊ MMADỤ KA HA BỊA NCHETA ỌNWỤ JIZỌS (Mach 23–Eprel 19):
Anyị na-akpọ gị ka ị bịa otu nnọkọ dị mkpa anyị ga-enwe n’abalị iri na itoolu n’ọnwa Eprel. Nke a bụ akwụkwọ ịkpọ òkù nke gị. N’ụbọchị ahụ, ọtụtụ nde mmadụ n’ụwa niile ga-ezukọ iji cheta ọnwụ Jizọs Kraịst. Ị ga-ahụ oge na ebe anyị ga-anọ eme ya n’akwụkwọ a. Anyị na-akpọkwa gị maka okwu Baịbụl a ga-ekwu n’izu bu ya ụzọ, nke isiokwu ya bụ: “Gbalịa Nweta Ndụ Ahụ nke Bụ́ Ndụ n’Ezie.”
Ajụjụ A Ga-aza n’Oge Ọzọ: Gịnị mere Jizọs ji nwụọ?