AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 1 TIMOTI 1-3
Gbalịa Ruo Eru Ịrụ Ezi Ọrụ
Ọ na-akacha mma ka ụmụnna nwoke malite mgbe ha ka na-eto eto na-agbalị iru eru maka ịrụ ezi ọrụ. Ọ ga-eme ka a zụọ ha, ha egosikwa na ha ruru eru ka a họpụta ha ịbụ ndị ohu na-eje ozi ma ha too. (1 Tim. 3:10) Olee otú nwanna nwoke nwere ike isi ruo eru? Ime ihe ndị a ga-enyere ya aka:
Ịna-ewepụta onwe ya na-enye aka.—km 7/13 2-3 ¶2
Iji ofufe Jehova kpọrọ ihe.—km 7/13 3 ¶3
Iji ọrụ e nyere ya kpọrọ ihe.—km 7/13 3 ¶4