Ndị Na-eto Eto, Ùnu Na-agbalị Ka Unu Ruo Eru Ịrụ Ọrụ n’Ọgbakọ?
1. Olee mgbe nwanna nwoke na-eto eto kwesịrị ịmalite mewe ihe a Baịbụl kwuru na 1 Timoti 3:1?
1 Baịbụl kwuru na ọ bụrụ na mmadụ na-agbalị ka o ruo eruo, agụụ ezi ọrụ na-agụ ya. (1 Tim. 3:1) Ihe a Baịbụl kwuru na-agba ụmụnna nwoke ume ka ha gbaa mbo ruo eruo ije ozi n’ọgbakọ. Ọ̀ bụ naanị ndị torola eto ka ihe a Baịbụl kwuru gbasara? Mbanụ. Ọ ka mma ka mmadụ malite na nwata gbalịwa ka o ruo eru. Ọ bụrụ na mmadụ malite na nwata, ọ ga-egosi na onye ahụ ga-achọ ịbụ ohu na-eje ozi ma ya too. Ndị okenye ga-enwekwa ike ịzụ onye ahụ. (1 Tim. 3:10) Ọ bụrụ na ị bụ onye na-eto eto merela baptizim, olee otú ị ga-esi na-agbalị iru eru ije ozi n’ọgbakọ?
2. Gịnị ga-enyere anyị aka ịna-ewepụta onwe anyị inyere ndị ọzọ aka? Oleekwa otú anyị nwere ike isi na-enyere ụmụnna anyị aka?
2 Na-ewepụta Onwe Gị: Cheta na ihe ị na-agba mbọ ya bụ ka i ruo eru ịrụ ezi ọrụ, ọ bụghị ka i nweta ọkwá. N’ihi ya, gbaa mbọ na-enyere ụmụnna gị aka. Ihe ga-enyere gị aka bụ ichebara ihe ndị Jizọs mere echiche. (Mat. 20:28; Jọn 4:6, 7; 13:4, 5) Rịọ Jehova ka o nyere gị aka ka ihe gbasara ndị ọzọ na-emetụ gị n’obi. (1 Kọr. 10:24) I nwere ike ịna-enyere ndị merela agadi ma ọ bụ ndị ahụ́ na-adịghị nọ n’ọgbakọ unu aka. I nwekwara ike iwepụta onwe gị soro na-asụ ahịhịa ma ọ bụ na-asa Ụlọ Nzukọ Alaeze unu. Ihe ọzọ i nwere ike ime bụ ime ihe omume n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke ma ọ bụrụ na onye kwesịrị ime ya abịaghị ọmụmụ ihe. Ị ga na-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na ị na-enyere ndị ọzọ aka.—Ọrụ 20:35.
3. Gịnị mere o ji dị mkpa ka i jiri ife Chineke kpọrọ ihe? Oleekwa ihe ga-enyere gị aka?
3 Jiri Ife Chineke Kpọrọ Ihe: Ọ bụrụgodị na isi na-aghọ ohu na-eje ozi nkọ, ihe ka mkpa bụ iji ife Chineke kpọrọ ihe. Onye ji ife Chineke kpọrọ ihe kwesịrị ịna-ele ihe anya otú Jehova na Jizọs si ele ya anya. (1 Kọr. 2:15, 16) Otú o si akpa àgwà kwesịkwara igosi na o nwere “mkpụrụ nke mmụọ nsọ.” (Gal. 5:22, 23) O kwesịkwara ibu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke, jirikwa ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma. (Mat. 6:33) Ịna-amụchi ihe anya ga-enyere gị aka ka i jiri ife Chineke kpọrọ ihe. Ọ pụtara na ị ga na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị, na-agụkwa Ụlọ Nche na Teta! ọ bụla e bipụtara. Ị ga na-akwado ọmụmụ ihe niile ma na-agachi ha anya. (Ọma 1:1, 2; Hib. 10:24, 25) Pọl onyeozi gbara Timoti ume ka o mee ka ọganihu ya pụta ìhè. Ihe ọzọ ọ gwara ya bụ: “Na-elezi . . . ozizi gị anya.” (1 Tim. 4:15, 16) N’ihi ya, mgbe ọ bụla i nwere ihe omume n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, gbaa mbọ mụọ ya nke ọma. Tupu ị gaa ozi ọma, buru ụzọ kwadoo ihe ị ga-ekwu. Na-agachikwa ozi ọma anya. I nwere ike ikpebi na ị ga-abụ ọsụ ụzọ, ma ọ bụ na ị ga-aga Betel ma ọ bụkwanụ na ị ga-aga Ụlọ Akwụkwọ Ọmụmụ Baịbụl Maka Ụmụnna Na-alụbeghị Nwaanyị. Gbasiekwa mbọ ike ka i mee ihe ndị a i kpebiri. Ọ bụrụ na i ji ife Chineke kpọrọ ihe, ị ga-enwe ike izere ọnwụnwa ndị na-abịara ndị na-eto eto.—2 Tim. 2:22.
4. Gịnị mere o ji dị mma ka mmadụ jiri ọrụ e nyere ya n’ọgbakọ kpọrọ ihe?
4 Ejila Ọrụ E Nyere Gị Egwu Egwu: Ndịozi Jizọs họpụtara ụmụnna asaa ga na-ekere ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha n’ọgbakọ nri. Ha echegbuweghị onwe ha ma ụmụnna ndị ahụ hà ga-arụtakwa ọrụ ahụ n’ihi na ha tụkwasịrị ha obi. Ọrụ a ha nyere ha mere ka hanwa nwee efe na-eme ihe ndị ọzọ ka mkpa n’ọgbakọ. (Ọrụ 6:1-4) N’ihi ya, mgbe ọ bụla e nyere gị ọrụ n’ọgbakọ, gbalịa ka ị na-arụ ya nke ọma. Mgbe Jehova gwara Noa ka ọ rụọ ụgbọ, o mere ihe niile ọ gwara ya. I kwesịrị ịna-eme ka Noa. (Jen. 6:22) Ọ bụrụ na mmadụ anaghị eji orụ e nyere ya n’ọgbakọ egwu egwu, o gosiri na onye ahụ kwụsịrị ike n’ọgbakọ. Jehova hụkwara ndị dị otú ahụ n’anya.—1 Kọr. 4:2; gụọ igbe bụ́ “Ịzụ Ndị Na-eto Eto Bara Uru.”
5. Gịnị mere ụmụnna ndị na-eto eto ji kwesị ịna-agba mbo ka ha ruo eru ịrụ ọrụ n’ọg̣bakọ?
5 Aịzaya buru amụma na onye nta ga-aghọ otu puku mmadụ. Jehova na-eme ka amụma ahụ mezuo n’ọge anyị a. (Aịza. 60:22) Kwa afọ, a na-eme ihe dị ka narị puku mmadụ abụọ na puku mmadụ iri ise baptizim. Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị ọhụrụ na-abata n’ọgbakọ, e kwesịrị inwe ụmụ nwoke ndị ruru eru ga na-arụ ọrụ dị iche iche n’ọgbakọ. E nwere ọtụtụ ọrụ a na-arụ ugbu a n’ọgbakọ Jehova. (1 Kọr. 15:58) Ụmụnna ndị na-eto eto, na-agbasinụ mbọ ike ka unu ruo eru ịrụ ọrụ n’ọgbakọ. Ọ bụrụ na ị na-eme otú ahụ, agụụ ezi ọrụ na-agụ gị.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 2]
Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị ọhụrụ na-abata n’ọgbakọ, e kwesịrị inwe ụmụ nwoke ndị ruru eru ga na-arụ ọrụ dị iche iche n’ọgbakọ
[Igbe dị na peeji nke 3]
Ịzụ Ndị Na-eto Eto Bara Uru
Ọ bụrụ na ndị okenye enye ndị na-eto eto ọrụ n’ọgbakọ ma mechaa kụziere ha otú ha ga-esi arụ ya, ọ ga-eme ka ha na-arụsi ọrụ ike n’ọgbakọ. Otu onye nlekọta sekit kwuru ihe mere mgbe ọ na-eleta otu ọgbakọ. Ọ sịrị na mgbe ya na otu nwanna na-akpa nkata n’ikpo okwu mgbe a gbasara ọmụmụ ihe, otu nwata nwoke bịara guzo ha n’akụkụ. Mgbe ọ jụrụ ya ma ọ̀ chọrọ ịhụ ya, nwata ahụ kwuru na ya na-eche ka ha kwuchaa ihe ha na-ekwu ka ya zaa ebe ahụ, n’ihi na ọ bụ ya na-aza ebe ahụ ma a gbasaa ọmụmụ ihe. Onye nlekọta ahụ kwuru na nne na nna nwa ahụ achọwala ịla, ma nwa ahụ achọghị iso ha lawa n’ihi na ọ rụbeghị ọrụ e nyere ya. Ihe a nwatakịrị ahụ kwuru tọrọ ya ụtọ, ya enyere ya efe ka ọ zaa ebe ahụ. Onye nlekọta sekit ahụ mechara kwuo, sị: “Ndị okenye ọgbakọ a na-azụ ndị na-eto eto ka ha ruo eruo, ọ bụ ya mere ha ji enye ha ọrụ n’ọgbakọ. Ọ naghị eju m anya mgbe ọ bụla m bịara ileta ha ma ha tụọ aro ka a họpụta nwanna na-eto eto ka ọ bụrụ ohu na-eje ozi.”