OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Nsọpụrụ Chineke na Mmega Ahụ́, Olee nke Ka Mma?
Mmega ahụ́ ọ̀ bara uru? Ee, mana, uru ọ bara dị ntakịrị ma e jiri ya tụnyere uru ife Chineke bara. (1 Tim. 4:8) N’ihi ya, Ndị Kraịst ekwesịghị ikwe ka mmega ahụ́ gbochie ha ime ihe ka mkpa.
LEENỤ VIDIO BỤ́ IHE I KWESỊRỊ ỊMA GBASARA MMEGA AHỤ́, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
1. Olee ihe ụfọdụ anyị nwere ike ịmụta n’ime egwuregwu?
2. Olee ihe atọ anyị ga-eji mata ma egwuregwu anyị chọrọ ile ma ọ bụ nke anyị chọrọ ime ọ̀ dị mma?
3. Olee otú ihe dị n’Abụ Ọma 11:5 ga-esi nyere anyị aka ikpebi ụdị egwuregwu anyị ga-ele ma ọ bụ nke anyị ga-eme?
4. Olee otú Ndị Filipaị 2:3 na Ilu 16:18 ga-esi nyere anyị aka ịma otú anyị kwesịrị isi na-eme egwuregwu?
5. Olee otú Ndị Filipaị 1:10 ga-esi nyere anyị aka ịghara ịna-eji oge buru ibu ele ma ọ bụ eme egwuregwu?