OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Otú Ị Ga-esi Eme Ka Gị na Di Gị ma Ọ Bụ Nwunye Gị Dịkwuo ná Mma
Ebreham na Sera bụ di na nwunye e kwesịrị iṅomi. Ha hụrụ ibe ha n’anya ma na-akwanyere ibe ha ùgwù. (Jen. 12:11-13; 1 Pita 3:6) Ma, alụmdi na nwunye ha ezughị okè. E nwekwara oge ndị ọnwụnwa bịaara ha. Gịnị ka ndị di na nwunye nwere ike ịmụta n’aka Ebreham na Sera?
Unu kwesịrị ịna-ekwurịta okwu. Ọ bụrụ na di gị ma ọ bụ nwunye gị ejiri iwe kwuo okwu, meda obi zaghachi ya. (Jen. 16:5, 6) Hazienụ oge unu ga-eji na-anọrị. Jiri okwu ọnụ na omume gị mee ka obi sie di gị ma ọ bụ nwunye gị ike na ị hụrụ ya n’anya. Ihe kacha mkpa unu ga-eme bụ ime ka unu na Jehova dịrị ná mma. Ihe ga-enyere unu aka bụ ịmụ ihe, ikpe ekpere na ime ofufe ezinụlọ. (Ekli. 4:12) Alụmdi na nwunye siri ike na-ewetara Jehova, bụ́ Onye hiwere alụmdi na nwunye, otuto.
LEENỤ VIDIO BỤ́ OTÚ Ị GA-ESI EME KA GỊ NA DI GỊ MA Ọ BỤ NWUNYE GỊ DỊKWUO NÁ MMA, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
Na vidio ahụ, olee ihe ụfọdụ gosiri na Shaan na Kiara adịchaghịzi ná mma?
Gịnị mere di na nwunye kwesịrị iji na-agwa ibe ha otú obi dị ha?
Olee otú akụkọ Ebreham na Sera si nyere Shaan na Kiara aka?
Gịnị ka Shaan na Kiara mere iji maliteghachi ịdị ná mma?
Gịnị mere di na nwunye ekwesịghị iche na ihe niile ga-agacha nke ọma n’alụmdi na nwunye ha?
I nwere ike ime ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị na-adịkwu ná mma