Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
JENỤWARỊ 3-9
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | NDỊ IKPE 15-16
“Ịrara Mmadụ Nye n’Aka Ndị Iro Ya Jọgburu Onwe Ya”
Mmadụ Ịrara Ibe Ya Nye Na-egosi na Anyị Bi n’Oge Ikpeazụ!
4 Onye mbụ anyị ga-atụle bụ Delaịla onye aghụghọ, bụ́ onye Samsịn onyeikpe hụrụ n’anya. Samsịn chọsiri ike ịlụso ndị Filistia agha iji zọpụta ndị Chineke. O nwere ike ịbụ na ndị isi ndị Filistia ise chọpụtara na Delaịla ejighị obi ya niile hụ Samsịn n’anya. N’ihi ya, ha gwara ya na ha ga-enye ya ego buru ibu ma ọ chọpụtara ha ebe oké ike Samsịn si ka ha wee gbuo ya. Ebe Delaịla bụ onye anyaukwu, o kwetara. Ma, mgbalị ya kụrụ afọ n’ala ugboro atọ. Ọ nọ na-enye Samsịn nsogbu ‘site n’okwu ọ na-agwa ya mgbe dum, na-arịọsikwa ya ike.’ N’ikpeazụ, “mkpụrụ obi [Samsịn] enweghị ike idi ya ma ọlị.” N’ihi ya, ọ gwara Delaịla na a kpụtụbeghị ya isi nakwa na a kpụọ ya isi, ike ga-agwụ ya. Mgbe Delaịla matara ebe ike Samsịn si, ọ kpọrọ otu nwoke ka ọ kpụọ Samsịn isi mgbe ọ na-arahụ ụra n’ikpere ụkwụ ya. O mesịziri nyefee Samsịn n’aka ndị iro ya ka ha mee ya ihe ha chọrọ. (Ikpe 16:4, 5, 15-21) Ihe ahụ Delaịla mere jọgburu onwe ya! Anyaukwu mere ka ọ rara onye hụrụ ya n’anya nye n’aka ndị iro.
Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ndị Ikpe
14:16, 17; 16:16. Ịrụgide mmadụ site n’ibe ákwá na oké ekwurekwu pụrụ imebi mmekọrịta.—Ilu 19:13; 21:19.
Mmadụ Ịrara Ibe Ya Nye Na-egosi na Anyị Bi n’Oge Ikpeazụ!
15 Olee ihe ga-eme ka mmadụ ghara ịhapụ di ya ma ọ bụ nwunye ya? Okwu Chineke kwuru, sị: ‘Ṅụrịa ọṅụ n’ihi nwunye ị lụrụ n’okorobịa ma ọ bụ di ị lụrụ n’agbọghọbịa,’ kwuokwa, sị, “Ka gị na nwunye gị [ma ọ bụ di gị] ị hụrụ n’anya kporie ndụ.” (Ilu 5:18; Ekli. 9:9) Ka di na nwunye na-aka nká, ha kwesịrị ịna-eme ihe niile ha nwere ike ime iji hụkwuo ibe ha n’anya. Ọ pụtara na ha ga na-ege ibe ha ntị, na-ewepụta oge ha abụọ ga-eji na-anọrị, na-anọkwukwa ibe ha nso. Ha ga-elekwasị anya n’ichebe alụmdi na nwunye ha na mmekọrịta ha na Jehova. N’ihi ya, di na nwunye kwesịrị ịna-amụkọ Baịbụl ọnụ, na-agakọ ozi ọma ọnụ mgbe niile, na-ekpekọkwa ekpere ọnụ ka Jehova gọzie ha.
AHAPỤLA JEHOVA
16 E nwere ndị nọ n’ọgbakọ mere mmehie dị oké njọ, bụ́kwa ndị ‘a dọsiri aka ná ntị ike ka ha wee nọgidesie ike n’okwukwe.’ (Taị. 1:13) Ụfọdụ bụ ndị àgwà ha mere ka a chụọ ha n’ọgbakọ. Ịdọ aka ná ntị enyerela “ndị e ji ya zụọ” aka ime ka ha na Chineke dịghachi ná mma. (Hib. 12:11) Gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na o nwere onye ikwu anyị ma ọ bụ ezigbo enyi anyị a chụrụ n’ọgbakọ? Ihe ọ bụla anyị mere ga-egosi ma ànyị ji obi anyị niile na-akwado onye ahụ ka ànyị ji obi anyị niile na-akwado Chineke. Jehova na-ele ma ànyị ga-erubere iwu ya isi, bụ́ nke kwuru ka anyị na onye ọ bụla a chụrụ n’ọgbakọ ghara imekọ ihe.—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 5:11-13.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Samsin Enwee Mmeri n’Ike Jehova!
Samsin ji mkpebi siri ike chụsoo ihe mgbaru ọsọ ya, nke bụ́ ịlụso ndị Filistia ọgụ. Ihe mere o jiri nọọ n’ụlọ otu nwanyị na-akwa iko na Geza bụ iji lụsoo ndị iro Chineke ọgụ. Samsin chọrọ ebe ọ ga-ehi n’abalị ahụ n’obodo ndị iro ya, ebe ọ pụkwara ịchọta ya bụ n’ụlọ nwanyị na-akwa iko. Samsin ebughị ihe ọ bụla rụrụ arụ n’obi. Ọ hapụrụ ụlọ nwanyị ahụ n’etiti abalị, jide ibo ọnụ ụzọ obodo ahụ, jidekwa ide ya abụọ, ma buru ha rịgoro n’elu ugwu dị nso na Hibrọn, nke dị ihe dị ka kilomita 60 site n’ebe ahụ. Chineke kwadoro ihe a o mere, ọ bụkwa Ya nyere ya ike ime ya.—Ndị Ikpe 16:1-3.
JENỤWARỊ 10-16
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | NDỊ IKPE 17-19
“Ịda Iwu Chineke Na-akpata Nsogbu”
it-2 390-391
Maịka
1. Ọ bụ nwoke si n’ala Ifrem. O zuuru ego nne ya dị otu puku na otu narị (1,100) mkpụrụ ego ọlaọcha. Ihe a o mere bụ ịda iwu nke asatọ n’Iwu Iri ahụ. (Ọpụ. 20:15) Mgbe o kwetara na ọ bụ ya zuuru ego ahụ ma weghachi ya, nne ya sịrị: “M ga-edo ọlaọcha a nsọ maka Jehova ka nwa m wee jiri ya mee arụsị a pịrị apị nakwa arụsị a kpụrụ akpụ. M na-enyeghachikwa gị ya.” Nne ya weere narị mkpụrụ ọlaọcha abụọ (200) nye onye na-eji ọlaọcha akpụ ihe. Onye ahụ ji ya ‘mee arụsị a pịrị apị na arụsị a kpụrụ akpụ’ nke e mechara dowe n’ụlọ Maịka. Maịka nwere “ụlọ arụsị.” O mekwara efọd na arụsị ezinụlọ ma họpụta otu n’ime ụmụ ya ndị nwoke ka ọ bụrụ onye nchụàjà ya. Ọ bụ eziokwu na ọ sịrị na ya mere ya iji kwanyere Jehova ùgwù, ma ihe ahụ o mere jọgburu onwe ya n’ihi na ọ bụ ịda iwu Jehova nyere banyere ikpere arụsị. (Ọpụ. 20:4-6) Ọ hapụrụ ndokwa Jehova mere maka ụlọikwuu na ndị nchụàjà. (Ikpe 17:1-6; Diut. 12:1-14) Maịka mechara kpọbata otu nwa okorobịa bụ́ onye Livaị n’ụlọ ya ka ọ bụrụ onye nchụàjà ya. Aha ya bụ Jonatan, o sikwa n’ezinụlọ nwa Mosis bụ́ Geshọm. (Ikpe 18:4, 30) N’obi ya, o chere na ya emeela ihe ziri ezi. Ọ sịrị: “Amatala m na Jehova ga-emere m ihe ọma.” (Ikpe 17:7-13) Ma, Jonatan esighị n’ezinụlọ Erọn. N’ihi ya, o kwesịghịdị ịbụ onye nchụàjà. Ihe a mere ka mmehie Maịka kakwuo njọ.—Ọnụ Ọgụ. 3:10.
it-2 391 ¶2
Maịka
Mgbe obere oge gachara, Maịka na ụmụ nwoke ụfọdụ chụụrụ ndị ebo Dan gawa. Mgbe ha chụkwutere ha, ndị ebo Dan jụrụ Maịka ihe mere ha ji na-achụ ha. Maịka zara ha, sị: “Unu eburula chi m ndị m rụrụ, kpọrọkwa onye nchụàjà m lawa. Olee ihe fọọrọ m?” Ndị ebo Dan gwara ya na e nwere ike ịlụso ha ọgụ ma ha chụrụ ha na-aga ma na-abara ha mba. Maịka hụrụ na ha ka ya ike, ya atụgharịa laghachi n’ụlọ ya. (Ikpe 18:22-26) Ndị ebo Dan mechara bibie obodo Leyish ma gbaa ya ọkụ. Ha rụghachiri obodo ahụ ma biri na ya, kpọzie ya Dan. Ndị ebo Dan “dowere arụsị ahụ a pịrị apị Maịka rụrụ ka e fewe ya. Ọ dịkwa n’ebe ahụ n’ụbọchị niile ụlọ ezi Chineke [ya bụ, ụlọikwuu] dị na Shaịlo.” Jonatan na ụmụ ya bụkwa ndị nchụàjà ha.—Ikpe 18:27-31.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Nsụgharị Baịbụl nke Na-akpa Ike
6 Taa, e nweela ihe ndị ọzọ gosiri na anyị kwesịrị ịna-akpọ aha Chineke. E dere aha Chineke puku ugboro asaa na narị abụọ na iri na isii ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Bekee e degharịrị n’afọ 2013. O ji isii karịa ugboro ole e dere ya na nke e biri n’afọ 1984. Ihe mere e ji dee ise n’ime ha bụ na a hụrụ aha Chineke n’Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ. Ebe ise ndị ahụ bụ 1 Samuel 2:25; 6:3; 10:26; 23:14, 16. Nke mere ha isii bụ Ndị Ikpe 19:18. Ihe mere e ji denye ya ebe a bụ n’ihi ihe a chọpụtakwuru gbasara Akwụkwọ Nsọ ndị e dere n’oge ochie.
JENỤWARỊ 17-23
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | NDỊ IKPE 20-21
“Nọgide Na-amata Uche Jehova”
Ì Nwere Ike Ime ka Finihas ma Ọrụ Tara Akpụ Bịara Gị?
E nwere mgbe ndị ikom Gibia, bụ́ ndị si n’ebo Benjamin, dinara iko nwaanyị nke otu onye Livaị, nwaanyị ahụ anwụọ. Nke a mere ka ebo ndị ọzọ dị n’Izrel jikere ka ha buso ebo Benjamin agha. (Ikpe 20:1-11) N’agbanyeghị na ha rịọrọ Jehova ka o nyere ha aka n’agha ahụ, e meriri ha ugboro abụọ, gbuokwa ọtụtụ n’ime ha. (Ikpe 20:14-25) Hà ga-asị na ekpere ahụ ha kpere enweghị isi? Jehova ọ̀ chọrọ n’eziokwu ka ha gaa bibie ndị ahụ mere ihe ọjọọ?
Ì Nwere Ike Ime ka Finihas ma Ọrụ Tara Akpụ Bịara Gị?
Olee ihe ihe a merenụ na-akụziri anyị? Nsogbu ụfọdụ a na-enwe n’ọgbakọ anaghị ebi ngwa ngwa n’agbanyeghị mbọ ndị okenye na-agbasi ike ka nsogbu ndị ahụ bie nakwa ekpere ha na-ekpe ka Chineke nyere ha aka. Ụdị ihe a mee, ọ ga-adị mma ma ndị okenye cheta ihe Jizọs kwuru. Ọ sịrị: “Na-arịọnụ [ma ọ bụ na-ekpenụ ekpere], a ga-enye unu; na-achọnụ, unu ga-achọta; na-akụnụ aka, a ga-emeghere unu.” (Luk 11:9) Ọ bụrụgodị na ọ dị ndị nlekọta ka Jehova ọ̀ na-egbu oge ịza ekpere ha, obi kwesịrị isi ha ike na ọ ga-aza ya n’oge nke ya.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Ị̀ Maara?
Olee otú e si eji èbè alụ agha n’oge ochie?
Ọ bụ èbè ka Devid ji gbuo otu nwoke gbara ajọ dimkpa aha ya bụ Golayat. Ọ ga-abụ na Devid mụtara otú e si agba èbè n’oge ọ na-azụ atụrụ mgbe ọ bụ nwata.—1 Samuel 17:40-50.
E nwere ọtụtụ ihe ndị Ijipt na ndị Asiria kpụrụ n’ahụ́ ájá n’oge Baịbụl. Èbè so na ha. Èbè bụ obere akpụkpọ anụ ma ọ bụ obere ákwà nwere oghere e kegidere eriri n’isi ya abụọ. Onye na-agba èbè na-etinye nkume kwọrọ mụrụmụrụ ma ọ bụ dị okirikiri n’etiti obere akpụkpọ anụ ahụ ma ọ bụ obere ákwà ahụ. Nkume ahụ nwere ike ịha ka obere oroma. Ọ na-efegharị èbè ahụ n’elu isi ya ma hapụ otu n’ime eriri abụọ ahụ ka nkume ahụ gbapụ. Ọ bụrụ na ọ gbapụ, ọ na-efere gaa kụọ n’ihe a chọrọ ka ọ kụọ.
A hụla ọtụtụ nkume ndị na-agba èbè ji lụọ agha n’oge ochie. A hụrụ ha n’ihe ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie gwupụtara n’Izrel nakwa ná mba ndị gbara ya gburugburu. Ndị bụ́ aka ochie n’ịlụ agha nwere ike iji èbè ha gbapụ nkume otú ọ ga-eji oké ọsọ gaa kụọ n’ihe a chọrọ ka ọ kụọ. Ọsọ ọ ga-eji nwere ike ịkarị nke ụgbọala na-efe ọsọ. Ụfọdụ ndị ọkà mmụta ekwuola na ọ bụrụ na e jiri èbè gbapụ nkume, o nwere ike iru ebe akụ́ a gbapụrụ agbapụ ga-eru. Ma, otu ihe doro anya bụ na otú ahụ e nwere ike iji ụta gbaa mmadụ akụ́, onye ahụ anwụọ, ọ bụkwa otú ahụ ka e nwere ike iji èbè gbaa mmadụ nkume, onye ahụ anwụọ.—Ndị Ikpe 20:16.
JENỤWARỊ 24-30
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | RUT 1-2
“Na-ahụ Ndị Ọzọ n’Anya”
Na-eṅomi Ndị Ha na Jehova Bụ Ezigbo Enyi
5 Ndị ezinụlọ Rut bi na Moab. O nwere ike ịlakwuru ha, ha nwekwara ike ilekọta ya. Ọ ma ndị Moab, mara asụsụ ha, na omenala ha. Neomi agaghị ekweli ya nkwa na ihe ga-adịrị ya otú ahụ na Betlehem. Obi esighị Neomi ike na ya ga-eme ka Rut lụta di ma ọ bụ nweta ezinụlọ. N’ihi ya, Neomi gwara ya ka ọ laghachi Moab. Baịbụl gwara anyị na Ọpa ‘lakwuuru ndị ya na chi ya.’ (Rut 1:9-15) Ma Rut kpebiri na ọ gaghị alakwuru ndị ya na chi ụgha ha.
Na-eṅomi Ndị Ha na Jehova Bụ Ezigbo Enyi
6 O nwere ike ịbụ na Rut si n’aka di ya ma ọ bụ Neomi mụta banyere Jehova. Ọ mụtara na Jehova adịghị ka chi ndị Moab. Ọ hụrụ Jehova n’anya, marakwa na ọ bụ ya ka e kwesịrị ịhụ n’anya ma fee. N’ihi ya, ihe Rut kpebiri ime dị mma. Ọ sịrị Neomi: “Ndị gị ga-abụ ndị m, Chineke gị ga-abụkwa Chineke m.” (Rut 1:16) Ọ na-emetụ anyị n’ahụ́ ma anyị chee otú Rut si hụ Neomi n’anya. Ma ihe kadị mkpa bụ otú Rut si hụ Jehova n’anya. Otú ahụ o si hụ Jehova n’anya mekwara Boaz obi ụtọ, ya etoo ya maka ‘ịgbaba n’okpuru nku Jehova.’ (Gụọ Rut 2:12.) Ihe ahụ Boaz kwuru nwere ike ime ka anyị cheta otú nwa ọkụkọ si agbaba n’okpuru nku nne ya. (Abụ Ọma 36:7; 91:1-4) Otú ahụ ka Jehova si chebe Rut ma gọzie ya maka okwukwe ya. O nweghị mgbe Rut kwara ụta maka ihe ahụ o mere.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Rut
1:13, 21—Jehova ò mere ka ndụ Naomi luo ilu ma kpatara ya ihe mgbu? Ee e, Naomi eboghịkwa Chineke ebubo ihe ọjọọ ọ bụla. Otú ọ dị, n’ihi ihe nile ọ gabigara, o chere na Jehova na-emegide ya. Iwe ji ya, ya enweekwa nkụda mmụọ. E wezụga nke ahụ, n’oge ahụ, a na-ewere mkpụrụ nke afọ dị ka ngọzi Chineke, na-ewerekwa amụghị nwa dị ka nkọcha. N’ịbụ onye na-enweghị ụmụ ụmụ na onye ụmụ ya ndị nwoke abụọ nwụrụ, o nwere ike ịbụ na Naomi chere na ya ziri ezi iche na ọ bụ Jehova wedara ya ala.
JENỤWARỊ 31–FEBỤWARỊ 6
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | RUT 3-4
“Nwee Ezi Aha, Emebikwala Ya”
“Ezigbo Nwaanyị”
Boaz gwara Rut okwu. Otú o si jiri olu ọma gwa ya okwu mere ka obi ruo Rut ala. Boaz gwara ya, sị: “Ka Jehova gọzie gị, nwa m. I gosiwo obiọma gị n’ụzọ dị mma n’ihe a i mere ugbu a karịa nke mbụ i mere, ebe ị na-achụrụghị ụmụ okorobịa gawa, ma hà bụ ogbenye ma hà bụ ọgaranya.” (Rut 3:10) Ihe Boaz bu n’obi mgbe ọ sịrị ‘ihe mbụ Rut mere’ bụ otú Rut si hụ Neomi n’anya ma soro ya lọta n’Izrel ma na-elekọtakwa ya. Mgbe ọ gwara Rut “ihe a i mere ugbu a,” ihe ọ na-ekwu bụ ọbịbịa a Rut bịara ka ọ gbara ya. Boaz ma na ebe ọ bụ na Rut ka bụ nwa agbọghọ, ọ gaara adịrị ya mfe ịga chọrọ nwa okorobịa ga-alụ ya, ma onye ahụ ọ̀ bụ ogbenye ma ọ̀ bụ ọgaranya. Kama ime otú ahụ, o kpebiri imere ma Neomi ma di Neomi nwụrụ anwụ ihe ọma, ya bụ na ọ chọghị ka aha nwoke ahụ nwụrụ anwụ fuo. Ka a sịkwa ihe mere ihe a Rut mere ji masị Boaz.
“Ezigbo Nwaanyị”
Ọ ga-abụrịrị na obi tọrọ Rut ụtọ mgbe o chetara ihe Boaz gwara ya, nke bụ́ na mmadụ niile ma na ọ bụ “ezigbo nwaanyị.” O doro anya na ihe mere o ji nwee aha ọma otú a bụ maka na ọ na-enu ya enu n’obi ịmata Jehova na ife ya. Ihe ọzọkwa bụ na Rut na-enyere Neomi aka ma na-akwanyere ya na ndị obodo ya ùgwù, o jikwa obi ya niile na-erubere iwu ndị Izrel isi, ọ bụ eziokwu na iwu ha na omenala ha edochabeghị ya anya. Ọ bụrụ na anyị enwee okwukwe ka Rut, anyị ga na-akwanyere ndị mmadụ na omenala ha ùgwù. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, anyị ga-enwekwa aha ọma ka Rut.
“Ezigbo Nwaanyị”
Boaz lụrụ Rut. Baịbụl mechara kwuo, sị: “Jehova wee mee ka ọ tụrụ ime, o wee mụọ nwa nwoke.” Ụmụ nwaanyị Betlehem gọziri Neomi ma jaa Rut mma, kwuo na o meere Neomi ihe ụmụ nwoke asaa na-agaghị emeliri ya. Baịbụl mechara gwa anyị na nwa ahụ Rut mụrụ mechara bụrụ nna ochie Eze Devid. (Rut 4:11-22) Devid mechakwara bụrụ nna ochie Jizọs Kraịst.—Matiu 1:1.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Rut
4:6—N’ụzọ dị aṅaa ka onye mgbapụta pụrụ isi “bibie” ihe nketa ya site n’ịgbapụta mmadụ? Nke mbụ, ọ bụrụ na onye dara ogbenye rere ala o ketara, onye mgbapụta ga-azụtaghachi ala ahụ n’ọnụ ego a gwara ya na-adabere n’afọ ole fọdụrụnụ tupu e nwee Jubile ọzọ. (Levitikọs 25:25-27) Ime otú ahụ ga-ebelata uru nke ala na ụlọ ya. Ọzọkwa, ya bụrụ na ọ mụọrọ Rut nwa nwoke, ọ bụ nwa nwoke ahụ, ọ bụghị onye ikwu ka nọrọ onye mgbapụta ahụ nso ugbu a, ga-enwe ala ahụ a zụtaghachiri.
FEBỤWARỊ 7-13
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 1 SAMUEL 1-2
“Kọọrọ Jehova Obi Gị n’Ekpere”
Ọ Gwara Chineke Obi Ya n’Ekpere
12 Ihe a Hana mere bụ ihe ndị niile na-efe Chineke kwesịrị ịna-eme. Jehova na-agwa ndị na-efe ya ka ha na-agwa ya ihe niile dị ha n’obi otú nwatakịrị nke tụkwasịrị nna ya obi na-eme. (Gụọ Abụ Ọma 62:8; 1 Ndị Tesalonaịka 5:17.) Pita onyeozi si n’ike mmụọ nsọ dee ihe a ga-akasi anyị obi banyere ikpegara Jehova ekpere: “Na-atụkwasịnụ ya nchegbu unu niile, n’ihi na ihe banyere unu na-emetụ ya n’obi.”—1 Pita. 5:7.
Otú Hana Si Nweta Udo
Olee ihe anyị pụrụ ịmụta n’ihe a nile? Mgbe anyị na-ekpegara Jehova ekpere maka nsogbu ndị anyị nwere, anyị pụrụ ime ka ọ mara otú ọ dị anyị n’obi, ma jiri obi anyị nile rịọ ya ka o nyere anyị aka. Ọ bụrụ na ọ dịghị ihe ọzọ anyị pụrụ ime iji kwụsị nsogbu ahụ, anyị kwesịrị ịhapụrụ ya nsogbu ahụ. Ọ bụ ihe kasị mma ime.—Ilu 3:5, 6.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Samuel nke Mbụ
2:10—Gịnị mere Hana ji kpee ekpere ka Jehova ‘nye eze Ya ike’ ebe a na-enweghị eze bụ́ mmadụ nke na-achị Izrel? E buru amụma n’Iwu Mozis na ndị Izrel ga-enwe onye eze bụ́ mmadụ. (Deuterọnọmi 17:14-18) N’amụma Jekọb buru mgbe ọ nọ n’ọnụ ọnwụ, o kwuru, sị: “Mkpanaka eze [ihe na-anọchi anya ikike eze] agaghị esi n’ebe Juda nọ wezụga onwe ya.” (Jenesis 49:10) Ọzọkwa, Jehova kwuru banyere Sera—nne ochie nke ndị Izrel—sị: “Ndị eze nke ndị dị iche iche ga-esite na ya dị.” (Jenesis 17:16) Ya mere, Hana nọ na-ekpe ekpere maka eze a ga-enwe n’ọdịnihu.
FEBỤWARỊ 14-20
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 1 SAMUEL 3-5
“Jehova Na-echebara Ndị Ọzọ Echiche”
Onye Pụrụ Ime Ihe Niile nke Na-echebara Ndị Ọzọ Echiche
3 Samuel malitere ‘ijere Jehova ozi’ n’ụlọikwuu mgbe ọ bụ nwata. (1 Sam. 3:1) N’otu abalị Samuel nọ na-ehi ụra, ihe na-anaghị emekarị mere. (Gụọ 1 Samuel 3:2-10.) Ọ nụrụ ka otu olu kpọrọ aha ya. O chere na ọ bụ Ilaị, bụ́ Nnukwu Onye Nchụàjà merela agadi na-akpọ ya. Ọ gbakwuuru ya, sị ya: “Lee m, n’ihi na ị kpọrọ m.” Ilaị gwara ya na ọ bụghị ya kpọrọ ya. Mgbe olu ahụ kpọrọ ya ugboro abụọ ọzọ, Ilaị ghọtara na ọ bụ Chineke na-akpọ Samuel. N’ihi ya, ọ gwara Samuel otú ọ ga-esi aza, ya emeekwa otú ahụ. Gịnị mere Jehova agwaghị Samuel ná mmalite na ọ bụ ya na-akpọ ya? Baịbụl agwaghị anyị. Ma, ọ ga-abụ na ihe mere Jehova agwaghị ya bụ n’ihi na o chebaara otú obi dị Samuel echiche. Olee otú o si mee ya?
Onye Pụrụ Ime Ihe Niile nke Na-echebara Ndị Ọzọ Echiche
4 Gụọ 1 Samuel 3:11-18. Iwu Jehova kwuru ka ụmụaka na-erubere ndị agadi isi, nke ka nke, onyeisi. (Ọpụ. 22:28; Lev. 19:32) N’ihi ya, o siri ike iche n’echiche na Samuel ga-agakwuru Ilaị n’ụtụtụ, kata obi gwa ya ihe Chineke kwuru na ọ ga-eme ya na ndị ezinụlọ ya. Baịbụl gwara anyị na “ụjọ na-atụkwa Samuel ịkọrọ Ilaị banyere ọhụụ ahụ.” Ma, Chineke mere ka o doo Ilaị anya na ọ bụ Samuel ka ọ na-akpọ. Ọ bụ ya mere Ilaị ji gwa Samuel ka ọ gwa ya ihe Chineke gwara ya. Ọ gwara Samuel, sị: ‘Ezochirila m ihe ọ bụla n’ime ihe niile ọ gwara gị.’ Samuel rubeere ya isi ma “gwa ya okwu ahụ niile.”
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Samuel nke Mbụ
3:3—Samuel ò dinara ala n’ezie n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile? Ee e, o meghị otú ahụ. Samuel bụ onye Livaị nke sitere n’ezinụlọ ndị Kohat na-abụghị ndị nchụàjà. (1 Ihe E Mere 6:33-38) N’ihi ya, o nweghị ike ‘ịbata ịhụ ebe nsọ ahụ.’ (Ọnụ Ọgụgụ 4:17-20) Nanị akụkụ ebe nsọ ahụ nke Samuel nwere ike ịba bụ ogige ụlọikwuu ahụ. Ọ ga-abụrịrị ebe ahụ ka o dinara ala. Ihe àmà na-egosikwa na Ilaị dinara ala n’otu akụkụ nke ogige ahụ. Ihe àmà na-egosi na ahịrịokwu ahụ bụ́ “ebe igbe Chineke dị” na-ezo aka n’ebe ụlọikwuu ahụ dị.
FEBỤWARỊ 21-27
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 1 SAMUEL 6-8
“Ònye Bụ Eze Gị?”
it-2 163 ¶1
Alaeze Chineke
Ha Kwuru Ka E Nye Ha Eze Bụ́ Mmadụ. Ihe fọrọ ntakịrị ka ọ bụrụ narị afọ anọ ụmụ Izrel sichara n’Ijipt pụta, ya bụ, ihe karịrị narị afọ asatọ Chineke na Ebreham gbachara ndụ, ụmụ Izrel kwuru na ha chọrọ inwe eze bụ́ mmadụ otú ahụ mba ndị ọzọ nwere. Ihe a ha kwuru pụtara na ha achọghịzi ka Jehova bụrụ eze ha. (1 Sam. 8:4-8) Ha nọ na-atụ anya na a ga-enwe alaeze Chineke ga-ehiwe iji mezuo nkwa o kwere Ebreham na Jekọb. Ihe a ha na-atụ anya ya dabakwara adaba. Ihe ndị ọzọ mere ha ji kwetasie ike ná nkwa a bụ ihe Jekọb kwuru banyere Juda mgbe ọ nọ n’ọnụ ọnwụ (Jen. 49:8-10), ihe Jehova gwara ụmụ Izrel mgbe ha sichara n’Ijipt pụta (Ọpụ. 19:3-6), ihe e kwuru n’ọgbụgba ndụ Iwu ahụ (Diut. 17:14, 15), nakwa ihe Chineke mere ka Belam onye amụma kwuo (Ọnụ Ọgụ. 24:2-7, 17). Ihe nne Samuel bụ́ Hana kwuru mgbe ọ na-ekpe ekpere gosikwara na ọ na-atụ anya mgbe nkwa a ga-emezu. (1 Sam. 2:7-10) Ma, Jehova emebeghị ka a matachaa “ihe nzuzo dị nsọ” banyere Alaeze ahụ. O kwubeghịkwa mgbe ọ ga-ehiwe ya, otú ọchịchị ahụ ga-adị, nakwa ma ọ̀ ga-adị n’eluigwe, ka ọ̀ ga-adị n’ụwa. N’ihi ya, ụmụ Izrel ịchọwa ka e nye ha eze bụ́ mmadụ mgbe ahụ gosiri na ha dị mpako.
Ọ Tachiri Obi n’Agbanyeghị na Ihe Agaghị Otú Ọ Tụrụ Anya Ya
Lee ihe Jehova gwara Samuel mgbe Samuel gwara ya okwu ahụ n’ekpere: “Gee ntị n’olu ha n’ihe niile ha na-agwa gị; n’ihi na ọ bụghị gị ka ha jụrụ, kama ọ bụ m ka ha jụrụ ịbụ eze ha.” Okwu ahụ kasiri nnọọ Samuel obi ma gosi otú ndị Izrel ledaruru Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile anya! Jehova gwara onye amụma ya ka ọ dọọ ndị Izrel aka ná ntị banyere ihe inwe eze bụ́ mmadụ ga-efu ha. Mgbe Samuel gwara ha ihe Chineke kwuru, ha siri ọnwụ, sị: “Ee e, kama ọ bụ eze ga-achị anyị.” Ebe Samuel na-erubere Chineke isi mgbe niile, ọ gara tee eze Jehova họpụtara mmanụ.—1 Samuel 8:7-19.
Ọchịchị Jehova Kacha Mma!
9 Ihe mere ha gosiri na ihe ahụ Jehova kwuru mechara mee. Ụmụ Izrel nwere ọtụtụ nsogbu mgbe ndị eze na-achị ha, karịchaa, mgbe ọ bụla eze na-ekwesịghị ntụkwasị obi na-achị. Ihe a mere ụmụ Izrel ga-enyere anyị aka icheta na ọ bụghị ihe ijuanya na kemgbe ụwa na ndị ọchịchị na-amaghị Jehova enweghị ike ịrụpụta ihe dị mma ga-adịte aka. Ọ bụ eziokwu na ndị ọchịchị na-arịọ Chineke ka ọ gọzie mbọ ha na-agba iweta udo, ma mee ka ahụ́ ruo ndị mmadụ ala, ma, olee otú Chineke ga-esi gọzie ndị na-anaghị akwado ọchịchị ya?—Ọma 2:10-12.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Mee Baptizim?
13 Nchigharị aghaghị iwere ọnọdụ tupu e mee anyị baptizim dị ka Ndịàmà Jehova. Nchigharị bụ ihe onye jiworo obi ya dum kpebie iso Kraịst Jizọs ji obi ọcha ya eme n’abụghị ná mmanye. Ndị dị otú ahụ na-ajụ ụzọ ndụ ọjọọ mbụ ha ma kpebisie ike ime ihe ziri ezi n’anya Chineke. N’Akwụkwọ Nsọ, ngwaa Hibru na nke Grik metụtara nchigharị nwere echiche nke ịtụgharị atụgharị. Omume a na-apụta isi n’ụzọ ọjọọ chigharịkwuru Chineke. (1 Ndị Eze 8:33, 34) Nchigharị na-achọ ka a rụọ “ọrụ kwesịrị nchegharị.” (Ọrụ 26:20) Ọ chọrọ anyị ịhapụ ofufe ụgha, mee ihe kwekọrọ n’ihe ndị Chineke nyere n’iwu, ma fee Jehova ofufe a na-ekewaghị ekewa. (Deuterọnọmi 30:2, 8-10; 1 Samuel 7:3) Nchigharị na-eme ka anyị mee mgbanwe n’echiche, ebumnobi, na n’àgwà anyị. (Ezikiel 18:31) Anyị ‘na-echigharị’ ka anyị ji mmadụ ọhụrụ na-edochi àgwà asọpụrụghị Chineke.—Ọrụ 3:19; Ndị Efesọs 4:20-24; Ndị Kọlọsi 3:5-14.
FEBỤWARỊ 28–MACH 6
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 1 SAMUEL 9-11
“Sọl Dị Umeala n’Obi ná Mmalite”
Dịrị Umeala n’Obi, Matakwa Ebe Ike Gị Ruru
11 Chegodị gbasara ihe mere Eze Sọl. Mgbe ọ bụ nwa okorobịa, ọ ma ebe ike ya ruru. Ọ chọghịdị ka e nyekwuo ya ọrụ. (1 Sam. 9:21; 10:20-22) Ma ka oge na-aga, Sọl malitere ịdị mpako. Ọ malitere ịkpa àgwà ọjọọ a obere oge ọ ghọchara eze. N’otu oge, o nweghị ndidi chere Samuel onye amụma. Kama, ịtụkwasị Jehova obi na ọ ga-azọpụta ndị ya, Sọl chụụrụ Jehova àjà n’agbanyeghị na ọ bụghị ọrụ ya. N’ihi ya, Jehova jụrụ ya, mechaakwa mee ka ọ gharazie ịbụ eze. (1 Sam. 13:8-14) Ọ bụrụ na anyị amụta ihe n’ihe a mere Sọl ma mara ebe ike anyị ruru, anyị ga-abụ ndị maara ihe.
Ihe Ị Ga-eme Ka Ị Ghara Ịna-achọ Naanị Ọdịmma Onwe Gị
8 Akụkọ gbasara Eze Sọl kwesịrị ime ka anyị kpachara anya. O nwere ike ime ka anyị mata otú ịchọ naanị ọdịmma onwe anyị ga-esi mee ka anyị ghara ịna-eme ihe ga-abara ndị ọzọ uru. Mgbe e mere Sọl eze, ọ dị umeala n’obi. O bulighị onwe ya elu. (1 Sam. 9:21) Ụfọdụ ndị Izrel katọrọ ya mgbe ọ ghọrọ eze. Ma o kweghị ata ha ahụhụ n’agbanyeghị na ihe ha kwuru gosiri na eze Chineke mere ya adịghị ha mma. (1 Sam. 10:27) Mgbe Eze Sọl du ndị Izrel gaa lụso ndị Amọn agha, o kwere ka mmụọ nsọ Chineke duzie ya. Mgbe o merichara ha, o nyere Jehova otuto maka mmeri ahụ, nke gosiri na ọ dị umeala n’obi.—1 Sam. 11:6, 11-13.
Ndị Amọn Ndị Ji Ibu Iro Kwụghachi Obi Ọma
Ọzọkwa ndị Amọn ejiriwo ibu iro kwụghachi obi ọma nke Jehova. Jehova elegharaghị iyi egwu obi ọjọọ nke a anya. “Mmụọ nke Chineke wee dakwasị Sọl n’ike mgbe ọ nụrụ okwu ndị a [nke Nehash], iwe ya wee dị ọkụ nke ukwuu.” N’okpuru nduzi nke mmụọ Chineke, Sọl chịkọtara ìgwè dị 330,000 ndị ikom agha bụ́ ndị meriri ndị Amọn nke na “ọ fọdụghịkwa ndị ikom abụọ n’otu ebe n’etiti ha.”—1 Samuel 11:6, 11.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Samuel nke Mbụ
9:9—Olee ihe dị ịrịba ama banyere okwu ahụ bụ́ “onye a na-akpọ Onye amụma taa, a na-akpọ ya Onye ọhụ ụzọ na mgbe gara aga”? Okwu ndị ahụ pụrụ igosi na ka ndị amụma na-amụbawanye n’oge Samuel nakwa n’oge ndị eze n’Izrel, a bịara jiri okwu ahụ bụ́ “onye amụma” dochie anya okwu bụ́ “onye ọhụ ụzọ.” E weere Samuel dị ka onye mbụ n’usoro ndị amụma.—Ọrụ 3:24.