Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
MACH 7-13
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 1 SAMUEL 12-13
“Mpako Na-akpata Mmechu Ihu”
Nganga Na-eduga ná Nlelị
17 E lee ya anya n’elu elu, ihe Sọl mere pụrụ iyi ihe ziri ezi. E kwuwerị, “mkpa na-akpa” ndị Chineke, “a na-achị [ha] n’ihe ike,” ha na-amakwa jijiji n’ihi ọnọdụ enweghị olileanya ha nọ na ya. (1 Samuel 13:6, 7) N’ezie, ọ dịghị njọ ime ihe ụfọdụ n’onwe anyị mgbe e nwere ihe ndị mere a ga-eji mee otú ahụ. Otú ọ dị, cheta na Jehova pụrụ ịma ihe dị anyị n’obi na ịchọpụta ebumnobi anyị ndị dị n’ime ime obi. (1 Samuel 16:7) N’ihi ya, ọ ghaghị ịhụwo ihe ụfọdụ banyere Sọl bụ́ ndị a na-ekwughị kpọmkwem n’ihe ndekọ Bible ahụ. Dị ka ihe atụ, Jehova pụrụ ịhụwo na ọ bụ nganga kpaliri enweghị ndidi Sọl. Ikekwe iwe were Sọl nke ukwuu na ya—eze Israel nile—aghaghị ichere onye o lere anya dị ka onye amụma merela agadi, nke na-eyigharị ihe! Ka o sina dị, Sọl chere na oge Samuel gburu nyere ya ikike ime ihe n’onwe ya na ileghara ntụziaka doro anya e nyeworo ya anya. Gịnị si na ya pụta? Samuel ajaghị Sọl mma maka ime ihe ahụ n’onwe ya. N’ụzọ megidere nke ahụ, ọ baara Sọl mba, na-asị: “Alaeze gị agaghị eguzosi ike . . . n’ihi na i debeghị ihe ahụ nke Jehova nyere gị n’iwu.” (1 Samuel 13:13, 14) Ọzọkwa, nganga dugara ná nlelị.
Jehova Ji Nrubeisi Gị Kpọrọ Ihe
8 Ihe Bible kọọrọ anyị banyere Eze Sọl na-egosi nnọọ mkpa ọ dị irube isi. Mgbe Sọl malitere ịchị Izrel, ọ dị umeala n’obi, ‘bụrụ onye nta n’anya ya onwe ya.’ Ma ka oge na-aga, mpako na echiche na-ezighị ezi malitere ịchịkwa mkpebi ndị ọ na-eme. (1 Samuel 10:21, 22; 15:17) N’otu oge, Sọl na-akwado ịga buso ndị Filistia agha. Samuel gwara eze ahụ ka o chere ka ya bịa chụọrọ Jehova àjà ma nye ya ntụziaka ndị ọzọ. Otú ọ dị, Samuel abịaghị mgbe a tụrụ anya ya, ndị Izrel malitekwara ịgbasa. Mgbe Sọl hụrụ nke a, o “wee suree àjà nsure ọkụ ahụ.” Ihe a o mere were Jehova iwe. Mgbe Samuel mesịrị bịarute, eze ahụ malitere ịgọpụrụ onwe ya, sị na n’ihi na Samuel abịaghị n’oge, ya ‘jisiri onwe ya ike’ chụọrọ Jehova àjà nsure ọkụ iji mee ka ihu Jehova dajụọ. Ịchụ àjà ahụ dị Eze Sọl mkpa karịa irube isi ná ntụziaka ahụ e nyere ya nke bụ́ ka o chere ka Samuel bịa chụọ àjà ahụ. Samuel gwara ya, sị: “I mewo ihe nzuzu: i debeghị ihe Jehova, bụ́ Chineke gị, nyere n’iwu, bụ́ nke O nyere gị n’iwu.” Inupụrụ Jehova isi mere ka a napụ Sọl eze.—1 Samuel 10:8; 13:5-13.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Ị̀ Ga-eso Nduzi Jehova Ji Obiọma Na-enye Gị?
15 Ndị Izrel hà chere na eze a na-ahụ anya ga-aka enyere ha aka karịa Jehova? Ọ bụrụ na ha chere otú ahụ, ha na-achụ ihe efu n’eziokwu. Nke a nwekwara ike ime ka ha chụwa ọtụtụ ihe efu ndị ọzọ si n’aka Setan. Ndị eze a na-ahụ anya nwere ike ime ka ha kpewere arụsị. Ndị na-ekpere arụsị na-eche na ihe ndị ha na-ahụ anya, dị ka chi ndị e ji osisi na nkume mee, nwere ike inyere ha aka karịa Chineke ha na-anaghị ahụ anya, bụ́ Jehova, onye kere ihe niile. Ma, dị ka Pọl onyeozi kwuru, arụsị abụghị “ihe ọ bụla.” (1 Kọr. 8:4) Ha anaghị ahụ ụzọ, ha anaghị anụ ihe, ha anaghị ekwu okwu, ha enweghịkwa ike ime ihe ọ bụla. I nwere ike ịhụ ha anya, nweekwa ike imetụ ha aka, ma, ọ bụrụ na ị na-efe nke ọ bụla n’ime ha ofufe, ihe ị na-eme bụ ịchụ ihe efu nke ga-ewetara gị ọdachi.—Ọma 115:4-8.
MACH 14-20
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 1 SAMUEL 14-15
“Ọ Ka Mma Irube Isi Karịa Ịchụ Àjà”
Jehova Ji Nrubeisi Gị Kpọrọ Ihe
4 Ebe ọ bụ Jehova kere ihe nile, ọ bụ ya nwe ihe nile anyị nwere. Ebe ọ dị otú ahụ, ọ̀ dị ihe anyị nwere ike inye ya? Ee, anyị nwere ike inye ya otu ihe dị oké ọnụ ahịa. Gịnị ka ọ bụ? Anyị ga-achọta azịza ya na ndụmọdụ na-esonụ: “Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa, ka m wee zaghachi onye na-ata m ụta okwu.” (Ilu 27:11) Anyị nwere ike inye Chineke nrubeisi anyị. Ọ bụ ezie na ọnọdụ anyị nile na nzụlite anyị abụghị otu, ọ bụrụ na onye nke ọ bụla n’ime anyị ana-erube isi, anyị ga-enye azịza maka ajọ ebubo ahụ Setan bụ́ Ekwensu boro nke bụ́ na ụmụ mmadụ agaghị anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke ma ọ bụrụ na e lee ha ule. Lee ihe ùgwù nke ahụ bụ!
it-2 521 ¶2
Nrubeisi
Nrubeisi dị ezigbo mkpa. Anyị na Chineke agaghị adịli ná mma ma ọ bụrụ na anyị anaghị erubere ya isi. Samuel jụrụ Eze Sọl, sị: “Àjà a na-esu ọkụ na àjà ndị ọzọ hà na-amasị Jehova karịa irubere [na Hibru sha·maʽʹ] Jehova isi? O doro anya na ọ ka mma irube isi [ma ọ bụ ige ntị] karịa ịchụ àjà, ige ntị nke ọma dịkwa mma karịa abụba ebule.” (1 Sam. 15:22) Ọ bụrụ na anyị erubereghị Jehova isi, ọ pụtara na anyị ajụla okwu ya, na anyị ekweghị na ihe o kwuru ga-eme, nakwa na anyị atụkwasịghị ya obi. N’ihi ya, onye na-enupụrụ Jehova isi na onye na-agba afa ma ọ bụ onye na-efe arụsị bụ otu. (1 Sam. 15:23; tụlee Rom 6:16) Anyị agaghị ekwu naanị n’ọnụ na anyị na-erubere Chineke isi, kama, anyị kwesịrị ime ya eme. Ọ bụrụ na anyị emeghị ihe anyị kwesịrị ime mgbe anyị nụchara ihe Chineke kwuru, o gosiri na anyị ekweghị na Chineke nakwa na anyị anaghị asọpụrụ ya. (Mat. 21:28-32) Ndị nụrụ ihe Chineke kwuru, kwerekwa na ọ bụ eziokwu, ma ha anaghị eme ihe ọ sị ka e mee, na-aghọgbu onwe ha. Jehova agaghị agọzikwa ha. (Jems 1:22-25) Ọkpara Chineke mere ka o doo anya na ndị na-emedị ihe yiri ihe Chineke sịrị mee, ma ha anaghị eme ihe Chineke kwuru otú kwesịrị ekwesị ma ọ bụ buru ihe ọjọọ n’obi na-eme ya, emekataghị banye n’Alaeze Chineke. Kama Chineke ga-ajụ ha kpamkpam.—Mat. 7:15-23.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 493
Ọmịiko
Mmadụ jiri maka nsogbu a na-enye ya nweere onye ọzọ ọmịiko mgbe Chineke na-achọghị ka o mee ya, o nwere ike ịkpatara ya ezigbo nsogbu. Ihe mere Eze Sọl gosiri na ihe a bụ eziokwu. Jehova gwara Sọl na oge eruola ka e bibie ndị Amalek. Mgbe ụmụ Izrel pụtachara n’Ijipt, ọ bụ ndị Amalek bụ ndị mbụ lụsoro ha agha n’agbanyeghị na o nweghị ihe ha mere ha. A gwara Sọl ka ọ ghara inwere ha ọmịiko. Ma, ọ tụrụ ụjọ ndị agha ya ma mee ihe ha kwuru, kama ime ihe niile Jehova gwara ya. Ihe a mere ka Jehova sị na ọ gaghịzi abụ eze. (1 Sam. 15:2-24) Mmadụ jiri obi ya niile kweta na ime ihe otú Jehova chọrọ kacha mma, kpebisiekwa ike ịna-erubere ya isi karịa onye ọ bụla ọzọ, onye ahụ agaghị eme ụdị ihe a Sọl mere, ihe ya ga na-adịkwa Chineke mma.
MACH 21-27
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 1 SAMUEL 16-17
“Ọ Bụ Jehova Nwe Agha A”
“Ọ Bụ Jehova Nwe Agha A”
Devid gwara Sọl gbasara otú o si gbuo ọdụm na anụ ọhịa bea. Devid ò ji ihe a o mere na-etu ọnụ? Mba. Devid ma onye nyeere ya aka igbu anụ ọhịa ndị ahụ. Ọ sịrị: “Jehova, bụ́ onye napụtara m n’aka ọdụm nakwa n’aka anụ ọhịa bea, ọ bụ ya ga-anapụta m n’aka onye Filistia nke a.” Sọl mechara kweta, gwazie Devid, sị: “Gawa, ka Jehova nọnyekwara gị.”—1 Samuel 17:37.
Ị̀ ga-achọ ka okwukwe gị sie ike ka nke Devid? Ọ bụrụ na ị ga-achọ, i kwesịrị ịghọta na okwukwe Devid adịghị ka ebe mmadụ mụ anya na-arọ nrọ. O nwere okwukwe na Chineke n’ihi na ọ ma ya nke ọma, hụkwa ihe ndị o meerela ya. Ọ ma na Jehova bụ Onye na-echebe ndị ya na Onye na-emezu nkwa ya. Ọ bụrụ na anyị chọrọ inwe ụdị okwukwe a, anyị kwesịrị ịnọgide na-amụ banyere Chineke e dere okwu ya na Baịbụl. Ọ bụrụkwa na anyị na-eme ihe ndị anyị na-amụta, ihe ọma ndị anyị ga-enweta ga-emekwa ka okwukwe anyị na-esikwu ike.—Ndị Hibru 11:1.
“Ọ Bụ Jehova Nwe Agha A”
Ma, Devid gwara Golayat, sị: “I ji mma agha na ube na árọ̀ na-abịa izute m, ma m ji aha Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke nke ndị agha Izrel, onye ị maworo aka, na-abịa izute gị.” Ruokwa taa, ndị mmadụ weere ya na ihe a Devid kwuru gosiri na o nwere okwukwe siri ike na Chineke. Devid ma na ike mmadụ na ngwá agha adịghị ezigbo mkpa n’agha ahụ. Ọ ma na Golayat akparịala Jehova, n’ihi ya, Jehova ga-eme ya ihe. Ọ bụ ya mere Devid ji kwuo “na ọ bụ Jehova nwe agha a.”—1 Samuel 17:45-47.
Devid hụrụ na Golayat gbara ajọ dimkpa, hụkwa ngwá agha o ji. Ma, Devid ekweghị ka ihe ndị a menye ya ụjọ. O kweghịkwa ka ha mee ka obi wụnye ya n’afọ otú o mere Sọl na ndị agha Izrel. Devid ejighị onwe ya tụnyere Golayat. Kama o lere Golayat lee Jehova ma hụ na o nweghị ihe Golayat bụ. Golayat dị ihe dị ka mita atọ n’ogologo. Ọ ka ndị niile ọzọ nọ ebe ahụ ogologo. Ma, Golayat ọ̀ ha ka onye ma e jiri ya tụnyere Ọkaakaa eluigwe na ụwa? N’eziokwu, n’anya Chineke, mmadụ niile dị ka ụkpara. Ọ bụkwa otú ahụ ka Golayat dị n’anya Chineke. Jehova na-agakwa imemila ya.
“Ọ Bụ Jehova Nwe Agha A”
Ma, ndị na-efe Chineke taa anaghị alụ agha. Chineke achọghịzi ka ha na-alụ agha. (Matiu 26:52) Ma, anyị ka kwesịrị iṅomi okwukwe Devid. Anyị kwesịrị iwere Jehova otú Devid si were ya. Anyị kwesịkwara ịghọta na Jehova bụ naanị Chi anyị kwesịrị ife ma na-atụ egwu ya. Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị anyị ka nsogbu bịaara anyị hà karịrị anyị, ma o nweghị nsogbu anyị Jehova na-agaghị enweli ike ịnapụta anyị na ya. Ọ bụrụ na anyị ewere Jehova ka Chineke anyị, nwee okwukwe na ya otú Devid nwere, e nweghị nsogbu ọ bụla kwesịrị imenye anyị ụjọ. O nweghị ihe nyịrị Jehova.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 871-872
Sọl
Ọ bụ mgbe ihe a mechara nakwa mgbe e techara Devid mmanụ na ọ ga-abụ eze Izrel ka mmụọ Jehova si n’ime Sọl pụọ. Malite mgbe ahụ gawa, “mmụọ na-adịghị mma nke si n’ebe Jehova nọ menyewere ya ụjọ.” Ebe ọ bụ na Jehova anapụla Sọl mmụọ ya, o kwere ka mmụọ na-adịghị mma banye Sọl n’ime. Mmụọ a meziri ka obi ghara ịna-eru Sọl ala, ya ana-echekwa ihe ndị na-adịghị mma. Ebe ọ bụ na Sọl ekweghị erubere Jehova isi, o gosiri na ihe ọjọọ juru ya n’obi. Ọ bụ ya mere Jehova ejighị mmụọ ya nyere ya aka iwepụ ihe ọjọọ ndị ahụ dị ya n’obi. Jehova kwere ka “mmụọ na-adịghị mma” banye n’ime Sọl ma na-emenye ya ụjọ. N’ihi ya, e nwere ike ịsị na ọ bụ “mmụọ na-adịghị mma nke si n’ebe Jehova nọ.” Ọ bụkwa ihe ndị na-ejere Sọl ozi kwuru. Otu n’ime ha tụụrụ ya aro ka ọ kpọọ Devid ka ọ na-akpọrọ ya ụbọ iji mee ka ahụ́ na-eru ya ala mgbe ọ bụla ‘mmụọ ahụ na-adịghị mma’ nyewere ya nsogbu. O kwetakwara.—1 Sam. 16:14-23; 17:15.
MACH 28–EPREL 3
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 1 SAMUEL 18-19
“Nọgide Na-adị Umeala n’Obi Mgbe Ihe Na-agaziri Gị”
Dabere na Mmụọ Chineke n’Ime Ihe Banyere Mgbanwe Ndị A Na-enwe ná Ndụ
4 N’oge na-adịghị anya, nwa okoro a bụ́ onye ọzụzụ atụrụ ga-aghọ dike nke mba ya. A kpọrọ ya ijere eze ozi na ịkpọrọ ya egwú. O gburu dike ahụ bụ́ Golaịat, bụ́ onye gbara agba na-eme nnọọ ihe ike nke na ọbụna ndị agha Izrel nwere ahụmahụ tụrụ egwu izute ya. N’ịbụ onye e mere onyeisi agha, Devid meriri ndị Filistia n’agha. Ndị obodo ya hụrụ ya n’anya. Ha rọrọ abụ iji too ya. Tupu mgbe ahụ, otu onye ndụmọdụ nke Eze Sọl kọwara nwa okoro a bụ́ Devid, ọ bụghị nanị dị ka “onye maara akpọ ụbọ nke ọma” kamakwa, dị ka “dike nke bụ́ dimkpa, bụrụkwa nwoke agha, o nwekwara uche n’okwu, bụrụkwa nwoke mara mma n’ahụ́.”—1 Samuel 16:18; 17:23, 24, 45-51; 18:5-7.
Ihe Dị Iche ná Ndị Na-efe Chineke na Ndị Na-anaghị Efe Ya
6 Ụfọdụ ndị na-adị mpako n’ihi na ha mara mma, bụrụ ndị a ma ama, mara otú e si akụ egwú ma ọ bụ agụ egwú, sie ike ma ọ bụkwanụ nọrọ n’ọkwá dị elu. Devid nwechara ihe niile a ma o nweghị mgbe ọ dịrị mpako ná ndụ ya niile. Mgbe o gbuchara Golayat, Eze Sọl a gwa ya ka ọ lụwa nwa ya nwaanyị, Devid kwuru, sị: “Ònye ka m bụ, ònyekwa ka ndị ikwu m na ezinụlọ nna m, bụ n’Izrel, nke na m ga-abụ ọgọ eze?” (1 Sam. 18:18) Gịnị nyeere Devid aka ịdị umeala n’obi? Devid ma na àgwà ọma o nwere, ike ya na ọkwá ọ nọ na ya bụ n’ihi na Chineke ‘weturu onwe ya ala,’ ka ya na ya mekọọ ihe. (Ọma 113:5-8) Devid ma na ọ bụ Jehova nyere ya ihe ọma ọ bụla o nwere.—Tụlee 1 Ndị Kọrịnt 4:7.
7 Ndị na-efe Jehova taa na-agbalị ka ha dịrị umeala n’obi ka Devid. Ọ na-emetụ anyị n’ahụ́ ịmara na Jehova, bụ́ Onye kacha elu n’eluigwe na ụwa, dị umeala n’obi. (Ọma 18:35) Anyị na-agbalị ime ihe a Baịbụl kwuru: “Yirinụ obi ọmịiko, obiọma, ịdị umeala n’obi, ịdị nwayọọ, na ogologo ntachi obi, dị ka uwe.” (Kọl. 3:12) Anyị makwa na ịhụnanya ‘adịghị etu ọnụ, ọ dịghị afụli onwe ya elu.’ (1 Kọr. 13:4) Ndị ọzọ hụ na anyị dị umeala n’obi, o nwere ike ime ka ha chọọ iso anyị fewe Jehova. Otú ahụ àgwà ọma ndị bụ́ nwunye nwere ike ime ka ndị di ha bịa fewe Chineke, ka ịdị umeala n’obi anyị nwere ike ịdọta ndị ọzọ ifewe Jehova.—1 Pita 3:1.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 695-696
Onye Amụma
Ọ bụ eziokwu na ọ bụ mmụọ nsọ Jehova ka e ji ahọpụta ndị amụma, ma ọ pụtaghị na ihe ọ bụla ha kwuru si n’ike mmụọ nsọ. Mmụọ nsọ Chineke ‘na-adakwasị ha’ mgbe ụfọdụ ma mee ka ha mata ozi Chineke chọrọ ka ha zie ndị mmadụ. (Ezik. 11:4, 5; Maị. 3:8) Ozi ahụ na-adị ka ọkụ na-ere ere n’ime obi ha, nke na ha agaghị agbachili nkịtị ghara izi ya. (1 Sam. 10:10; Jere. 20:9; Emọs 3:8) Ha na-emekwa ihe ndị dị ịtụnanya ma mmụọ nsọ dakwasị ha. Otú ha si ekwu okwu na otú ha si akpa àgwà na-egosi n’eziokwu na e nwere ihe na-akpa ike n’ahụ́ ha. Ọ ga-abụ ya mere e ji ekwu mgbe ụfọdụ na mmadụ ‘na-eme ka ndị amụma.’ (1 Sam. 10:6-11; 19:20-24; Jere. 29:24-32; tụlee Ọrụ 2:4, 12-17; 6:15; 7:55) Otú ha si etinye uche ha n’ihe e ziri ha na otú ha si eji ịnụ ọkụ n’obi ekwu ya nwere ike ime ka o yie ka hà ejighị anya ha ma ọ bụdị ka ara ọ̀ na-agba ha. Ọ bụ otú ahụ ka ụfọdụ ndị isi agha si were onye amụma bịara tee Jihu mmanụ. Ma mgbe ha matara na ọ bụ onye amụma, ha ji obi ha niile nabata ozi o ziri. (2 Eze 9:1-13; tụlee Ọrụ 26:24, 25.) Mgbe Sọl nọ na-achụgharị Devid, e mere ka Sọl ‘mewe ka onye amụma.’ O yipụrụ uwe ya, “gbarakwa ahụ́ ọtọ dinara ala ehihie na abalị ahụ niile.” Ọ ga-abụ n’oge ahụ ka Devid riri mbọmbọ. (1 Sam. 19:18–20:1) Ihe a merenụ apụtaghị na ndị amụma na-agbakarị ọtọ ma ha chọọ ibu amụma, n’ihi na Baịbụl ekwughị otú ahụ. N’ebe abụọ ọzọ Baịbul kwuru na ndị amụma gba ahụ́ ọtọ, o nwere ihe mere ha ji mee ya. Ọ bụ iji kọwaa ihe ụfọdụ banyere amụma ha buru. (Aịza. 20:2-4; Maị. 1:8-11) Baịbụl agwaghị anyị ihe mere Sọl ji gbara ọtọ. Anyị amaghị ma ọ̀ bụ iji gosi na ọ bụ mmadụ nkịtị, na a napụla ya uwe eze ọ na-eyi, na o nweghị ihe ọ ga-emeli onye Jehova họpụtara ka ọ chịwa, ma ọ bụkwanụ maka ihe ọ bụla ọzọ.
EPREL 4-10
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 1 SAMUEL 20-22
“Otú Ị Ga-esi Abụ Ezigbo Enyi”
Mee Ka Gị na Ụmụnna Gị Dịkwuo ná Mma Tupu Ọgwụgwụ Eruo
18 Taa, nsogbu dị iche iche na-abịara ụmụnna anyị. Dị ka ihe atụ, ọdachi na-emere onwe ya ma ọ bụ nke mmadụ kpatara na-akpa ọtụtụ ụmụnna anyị aka ọjọọ. Ụdị ihe a mee, ụfọdụ n’ime anyị nwere ike ịgwa ụmụnna ka ha bịa nọrọ n’ụlọ ha. Ndị ọzọ nwekwara ike iji ego ha nyere ha aka. Ma, anyị niile ga-arịọli Jehova n’ekpere ka o nyere ụmụnna anyị aka. Ọ bụrụ na anyị amata na e nwere nwanna dara mbà, o nwere ike anyị agaghị ama ihe anyị ga-ekwu ma ọ bụ ihe anyị ga-eme. Ma, anyị niile ga-enyeliri ya aka. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike iwepụta oge gaa nọnyere ya. Anyị nwere ike imeda obi gee ya ntị mgbe ọ na-ekwu obi ya. Anyị nwekwara ike ịgwa ya gbasara amaokwu Baịbụl kacha amasị anyị ga-akasi ya obi. (Aịza. 50:4) Ihe kacha mkpa bụ na i wepụtara oge gaa nyere ndị enyi gị aka mgbe ha chọrọ enyemaka.—Gụọ Ilu 17:17.
Na-eje Ije n’Ụzọ Jehova
7 Chineke na-atụ anya ka anyị bụrụ ndị enyi a pụrụ ịtụkwasị obi. (Ilu 17:17) Nwa Eze Sọl bụ́ Jọnatan ghọrọ enyi Devid. Mgbe Jọnatan nụrụ na Devid egbuola Golaịat, “e kekọtara mkpụrụ obi Jọnatan na mkpụrụ obi Devid, Jọnatan wee hụ ya n’anya dị ka mkpụrụ obi nke ya.” (1 Sam. 18:1, 3) Jọnatan gwadịrị Devid mgbe Sọl chọrọ igbu ya. Mgbe Devid gbapụchara, Jọnatan gakwuuru ya ha abụọ agbaa ndụ. Ọ fọdịrị obere ka Sọl gbuo Jọnatan mgbe ọ na-agwa Sọl banyere Devid, ma Jọnatan na Devid zutekwara ọzọ ma mee ka enyi ha bụ sikwuo ike. (1 Sam. 20:24-41) Mgbe ha zutere na nke ikpeazụ ya, Jọnatan mere ka obi Devid sie ike “n’ebe Chineke nọ.”—1 Sam. 23:16-18.
Otú Gị na Ndị Enyi Gị Ga-esi Na-abụ Enyi n’Ụwa A Ịhụnanya Kọrọ
11 Kwụsie ike n’akụkụ enyi gị. Sọlọmọn dere, sị: “Ezi enyi nwere ịhụnanya mgbe niile, ọ bụkwa nwanne a mụrụ maka oge nsogbu.” (Ilu 17:17) O nwere ike ihe Sọlọmọn bu n’uche mgbe o dere ihe a bụ ụdị enyi nna ya bụ́ Devid na Jọnatan bụ. (1 Sam. 18:1) Eze Sọl chọrọ ka nwa ya bụ́ Jọnatan nọchie ya. Ma, Jọnatan kwetara na Jehova ahọrọla Devid ka ọ bụrụ eze. Jọnatan emeghịrị Devid anyaụfụ dị ka Sọl mere. O wuteghị ya na a na-eto Devid, o kwereghịkwa akụkọ ọjọọ Sọl nọ na-akọsa banyere Devid. (1 Sam. 20:24-34) Ànyị dị ka Jọnatan? Ànyị na-enwe obi ụtọ mgbe e nyere ndị enyi anyị ihe ùgwù? Ànyị na-akasi ha obi ma na-enyere ha aka mgbe ihe na-esiri ha ike? Ọ bụrụ na anyị anụ ebe a na-akọta enyi anyị, ànyị na-ekwere ihe e kwuru banyere ya n’ajụghị ase? Ka ànyị na-agbachitere enyi anyị, dị ka Jọnatan mere?
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Samuel nke Mbụ
21:12, 13. Jehova na-atụ anyị anya n’aka ịdị na-eji ọgụgụ isi na nkà anyị emeri ihe isi ike nke ndụ. O nyela anyị Okwu ya e ji ike mmụọ nsọ dee, bụ́ nke na-eme ka anyị nwee uche, ihe ọmụma na ikike iche echiche. (Ilu 1:4) Anyị nwekwara enyemaka nke ndị okenye a họpụtara ahọpụta.
EPREL 18-24
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 1 SAMUEL 23-24
“Jiri Ndidi Na-echere Jehova”
Dabere na Mmụọ Chineke n’Ime Ihe Banyere Mgbanwe Ndị A Na-enwe ná Ndụ
8 Devid jụrụ imerụ Sọl ahụ́. N’igosipụta okwukwe na ndidi, o nwere afọ ojuju ịhapụrụ Jehova okwu. Mgbe eze ahụ hapụrụ ọgba ahụ, Devid kpọrọ ya òkù, sị: “Jehova kpee ikpe n’etiti mụ na gị, Jehova bọkwaara m ọbọ n’ahụ́ gị: ma aka m agaghị adị n’ahụ́ gị.” (1 Samuel 24:12) Ọ bụ ezie na ọ maara na Sọl mejọrọ ya, Devid abọrọghị onwe ya ọbọ; ọ kparịghịkwa Sọl ma ọ bụ kwuo okwu ọjọọ banyere ya. N’ọtụtụ oge ndị ọzọ, Devid zeere ịbọrọ onwe ya ọbọ. Kama nke ahụ, ọ dabeere n’ebe Jehova nọ idozi okwu.—1 Samuel 25:32-34; 26:10, 11.
Ọnọdụ Gị Ọ̀ Na-achịkwa Ndụ Gị?
Ihe mmụta nke atọ bụ na kama iji ụzọ ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị gbanwee ọnọdụ anyị, anyị kwesịrị ichere Jehova. Onye na-eso ụzọ bụ́ Jems dere, sị: “Ma ka ntachi obi rụzuo ọrụ ya, ka unu wee zuo ezu ma gbasie ike n’ụzọ nile, n’enweghị ihe ọ bụla kọrọ unu.” (Jems 1:4) Anyị kwesịrị ikwe ka ntachi obi “rụzuo ọrụ ya” site n’anyị ikwe ka ọnwụnwa ruo n’ọgwụgwụ ya n’ejighị ụzọ ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị weta ya ná njedebe ngwa ngwa. Mgbe ahụ, a ga-anwale ma nụchaa okwukwe anyị, a ga-ekpughekwa ikike o nwere ịkwagide anyị. Josef na Devid nwere ụdị ntachi obi a. Ha anwaghị ịchọ ihe ngwọta nke pụrụ ịkpasu Jehova iwe. Kama nke ahụ, ha mere ihe nile ha nwere ike ime n’ọnọdụ ha. Ha cheere Jehova, leekwa ngọzi ndị ha nwetara n’ihi ime otú ahụ! Jehova ji ha abụọ napụta ma duo ndị ya.—Jenesis 41:39-41; 45:5; 2 Samuel 5:4, 5.
Anyị onwe anyị kwa pụrụ ịdaba n’ọnọdụ ndị pụrụ ime ka a nwaa anyị ịchọ ihe ngwọta ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị. Dị ka ihe atụ, ị̀ na-enwe nkụda mmụọ n’ihi na ị chọtabeghị di ma ọ bụ nwunye kwesịrị ekwesị? Ya bụrụ otú ahụ, zere ọchịchọ nke inupụrụ iwu Chineke nke ịlụ “nanị n’ime Onyenwe anyị” isi. (1 Ndị Kọrint 7:39) Ị̀ na-enwe nsogbu n’alụmdi na nwunye gị? Kama inwe mmụọ nke ụwa bụ́ nke na-agba ndị mmadụ ume ikewa na ịgba alụkwaghịm, gị na di ma ọ bụ nwunye gị rụkọọ ọrụ ọnụ iji merie ihe isi ike ndị ahụ. (Malakaị 2:16; Ndị Efesọs 5:21-33) Ọ̀ na-esiri gị ike ilekọta ezinụlọ gị n’ihi ọnọdụ akụ̀ na ụba gị? Ichere Jehova na-agụnye izere ime ihe ndị a na-enyo enyo ma ọ bụ ihe ndị iwu na-akwadoghị iji gbalịa inweta ego. (Abụ Ọma 37:25; Ndị Hibru 13:18) Ee, anyị nile aghaghị ịrụsi ọrụ ike iji mee ihe nile anyị nwere ike ime n’ọnọdụ anyị ma tinye mgbalị iji nye Jehova ihe ọ ga-agọzi. Ka anyị na-eme otú ahụ, ka anyị kpebisie ike ichere Jehova maka ihe ngwọta kasị mma.—Maịka 7:7.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Ekwela Ka Ihe Ọ Bụla Gbochie Gị Inweta Ihe Ahụ A Na-agbata n’Ọsọ
11 Ọ bụrụ na anyị agbaa mbọ hụ ndị ọzọ n’anya ma dịrị obiọma, anyị agaghị na-enwere ha anyaụfụ. Baịbụl kwuru, sị: “Ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi na obiọma. Ịhụnanya adịghị ekwo ekworo.” (1 Kọr. 13:4) Ka anyaụfụ ghara ịgba mgbọrọgwụ n’obi anyị, anyị ga-agbalịsi ike na-ele ihe anya otú Chineke si ele ya, were ụmụnna anyị na anyị na ha bụ otu ahụ́. Nke a ga-eme ka ihe banyere ha na-emetụ anyị n’obi otú ahụ Baịbụl kwuru. O kwuru, sị: “Ọ bụrụ na e mee ka otu akụkụ ahụ́ dị ebube, akụkụ ahụ́ ndị ọzọ niile na-eso ya aṅụrị ọṅụ.” (1 Kọr. 12:16-18, 26) Ma, kama ịna-enwere ndị ọzọ anyaụfụ, obi kwesịrị ịna-atọ anyị ụtọ ma ihe ọma meere ha. Chegodị banyere nwa Eze Sọl aha ya bụ Jọnatan. O nwereghị Devid anyaụfụ mgbe Jehova họpụtara ya ka ọ bụrụ eze kama ịhọpụta ya. Kama, ọ kwadoro Devid. (1 Sam. 23:16-18) Ànyị nwere ike dịrị obiọma ma na-ahụ ndị ọzọ n’anya ka Jọnatan?
EPREL 25–MEE 1
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 1 SAMUEL 25-26
“Ị̀ Na-eme Ihe Ọ Bụla Batara Gị n’Uche Ozugbo?”
Ọ Kpara Àgwà Onye Nwere Ezi Uche
10 Olee otú ndị agha Devid si mesoo ndị na-azụrụ Nebal atụrụ? Ọ gaara adịrị ha mfe ịkpụrụ atụrụ ha gbuo mgbe ọ bụla ha chọrọ, ma ha emeghị otú ahụ. Kama nke ahụ, ha chebere ìgwè atụrụ Nebal na ndị na-ejere ya ozi. (Gụọ 1 Samuel 25:15, 16.) Ndị ọzụzụ atụrụ na atụrụ ha na-enwe ọtụtụ nsogbu n’ọhịa. Anụ ndị na-eri ibe ha jukwara eju n’ọhịa. Ebe ahụ dịkwa nso n’ebe ala Izrel jedebere n’ebe ndịda. N’ihi ya, ndị ohi na-esikarị ná mba ọzọ abịa ezu ohi ma na-emesi ndị ọzụzụ atụrụ ike n’ebe ahụ.
11 O doro anya na ọ gaghị adịrị Devid mfe inyeju ndị niile ahụ ya na ha bi n’ala ịkpa afọ. Otu ụbọchị, Devid zigara mmadụ iri ka ha gaa na nke Nebal rịọ ya ka o nye ha ihe oriri. Oge Devid zigara ha bụ oge kwesịrị ekwesị. Ọ bụ oge a na-akpacha ajị atụrụ. Ndị mmadụ na-eri oriri n’oge ahụ, ha na-enyekarịkwa ndị ọzọ onyinye. Devid chere echiche nke ọma gwa ndị ahụ o zigara ihe ha ga-agwa Nebal ka obi tọọ ya ụtọ. Ihe ndị ha ga-agwa ya gosiri na Devid na-akwanyere ya ùgwù. Devid gwadịrị ha ka ha gwa ya na ya bụ ‘nwa ya Devid.’ O nwere ike ịbụ na ihe a o kwuru gosiri na ọ ma na Nebal tọrọ ya atọ. Ma, gịnị ka Nebal mere?—1 Sam. 25:5-8.
12 O were ezigbo iwe. Mgbe nwa okorobịa ahụ e kwuru okwu ya ná mmalite na-akọrọ Abigel ihe merenụ, o kwuru na Nebal “kpọrọ ha iyi.” Nebal, onye aka ntagide, kwuru na ndị ahụ bịara ka ya nye ha achịcha, mmiri, na anụ ya chọrọ inye ndị na-arụrụ ya ọrụ. Ọ kparịrị Devid, sị na o nweghị uru ọ bara, sịkwa na ọ bụ ohu gbapụrụ n’aka nna ya ukwu. O nwere ike ịbụ na otú Nebal si were Devid bụ otú Sọl sikwa were Devid. Sọl kpọrọ Devid asị. Ma Nebal ma Sọl ewereghị Devid otú Jehova si were ya. Chineke hụrụ Devid n’anya ma were ya ka eze ga-achị Izrel n’ọdịnihu, ọ bụghị ka ohu gbapụrụ n’aka nna ya ukwu.—1 Sam. 25:10, 11, 14.
Ọ Kpara Àgwà Onye Nwere Ezi Uche
18 O kwuru na ọ bụ ya kpatara nsogbu ahụ ma rịọ Devid ka ọ gbaghara ya. O kwetara na di ya bụ onye nzuzu otú ahụ ọ zara n’aha. O nwere ike ịbụ na ihe ọ na-ekwu bụ na Devid akarịala ịga tawa nwoke dị otú ahụ ahụhụ. O kwuru na ya ma na Devid na-anọchi anya Jehova, nakwa na ọ bụ “agha Jehova” ka Devid na-alụ. O kwukwara ihe gosiri na ọ ma na Jehova kwere Devid nkwa ime ya eze, n’ihi na ọ sịrị: “Jehova . . . ga-ahọpụta gị ịbụ onye ndú Izrel.” Ọ rịọsikwara Devid arịrịọ ike ka ọ ghara ime ihe ọ bụla nwere ike ime ka ikpe ọbara ma ya ma ọ bụ ihe ga-emecha ghọọrọ ya “ihe ịma jijiji.” O nwere ike ịbụ na ihe ọ na-ekwu bụ ihe ga-eme ka obi Devid mawa ya ikpe. (Gụọ 1 Samuel 25:24-31.) N’eziokwu, okwu ọma ya ruru Devid n’obi.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Ọ Kpara Àgwà Onye Nwere Ezi Uche
16 Nke a ọ̀ pụtara na Abigel na-enupụrụ di ya isi? Mbanụ. Cheta na Nebal mesoro onye Jehova tere mmanụ omume ọjọọ. Ihe a o mere nwekwara ike ịkpatara ọtụtụ ndị aka ha dị ọcha nọ n’ezinụlọ Nebal ọnwụ. Ọ bụrụ na Abigel agba nkịtị, ọ̀ bụ na a gaghị asị na ọ bụ ya mere di ya ji mee ihe ahụ o mere? Ihe Abigel mere gosiri na irubere Chineke isi dị ya mkpa karịa irubere di ya isi.