Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb22 Septemba p. 5
  • Chineke Achọghị Ka Di na Nwunye Tisaa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chineke Achọghị Ka Di na Nwunye Tisaa
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2022
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Ndị Lụrụ Di na Nwunye na Ndị Na-alụghị?
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Alụmdi na Nwunye Bụ Onyinye Chineke Nwere Ịhụnanya Nyere Anyị
    “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
  • Ịkwadebe Maka Alụmdi na Nwunye Na-aga nke Ọma
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
  • Nduzi Chineke Maka Ịhọrọ Onye Òtù Ọlụlụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2022
mwb22 Septemba p. 5
Ebe di na nwunye na-arụkọ n’ozi ọma.

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Chineke Achọghị Ka Di na Nwunye Tisaa

Ọ bụrụ na Ndị Kraịst bụ́ di na nwunye ana-ebi n’udo, ọ ga-eme ka a na-eto Jehova. Ha abụọ ga na-enwekwa obi ụtọ. (Mak 10:9) Anyị chọọ ka anyị na onye anyị ga-alụ na-ebi n’udo ma ghara itisa, anyị kwesịrị ime ihe Baịbụl kwuru mgbe anyị na-ahọrọ onye anyị ga-alụ.

Tupu gị na mmadụ akpawa, ọ kacha mma ka i chere ruo mgbe ‘ị na-abụghịzi nwata,’ ya bụ, mgbe i toferela oge agụụ mmekọahụ nwere ike imegharị gị anya. (1 Kọr. 7:36) Jiri oge ị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye mee ka gị na Chineke dị n’ezigbo mma. Jirikwa oge ahụ mụta ịna-akpa àgwà e ji mara Ndị Kraịst. Ihe ndị a ga-enyere gị aka ka gị na onye ị ga-emecha lụọ na-ebi n’udo.

Tupu gị ekweta ka gị na mmadụ lụọ, wepụta oge mata ‘ụdị mmadụ ọ bụ.’ (Ihe e dere n’ala ala peeji 1 Pita 3:4.) Ọ bụrụ na i nwewe obi abụọ ma ọ̀ ka ga-adabara unu, gị na ya kwurịta ya. Ihe kwesịrị ịbụ mkpa gị bụ ihe ị ga-emere onye ị chọrọ ịlụ, ọ bụghị ihe yanwa ga-emere gị. Ọ bụkwa ihe a na-eme ka mmadụ na ibe ya dị ná mma. (Fil. 2:3, 4) I mee ihe Baịbụl kwuru mgbe ị na-ahọrọ onye ị ga-alụ, ọ ga-adịrị gị mfe ịna-eme ya mgbe unu lụchara, unu ga na-ebikwa n’udo.

LEENỤ VIDIO BỤ́ ỊKWADEBE MAKA ALỤMDI NA NWUNYE​—NKE ATỌ: “GBAKỌỌ IHE Ọ GA-EFU,” ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee otú ihe sibu na-agara nwanna nwaanyị ahụ na Shane?

  • Gịnị ka nwanna nwaanyị ahụ chọpụtara ka oge na-aga?

  • Olee otú ndị mụrụ ya si nyere ya aka? Oleekwa ihe dị mma o kpebiri ime?

Nwanna nwoke ya na nwanna nwaanyị na-akpa nwere ike ichebara ajụjụ ndị a echiche:

Olee àgwà ndị e ji mara Ndị Kraịst nwanna nwaanyị a na-akpa? Olee ihe ndị ọ na-eme gosiri na o bu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke? Ọ̀ na-eme ihe Baịbụl na nzukọ Jehova kwuru? Ọ̀ na-egosi na ọ hụrụ ndị ọzọ n’anya?

Nwanna nwaanyị ya na nwanna nwoke na-akpa nwere ike ichebara ajụjụ ndị a echiche:

Olee àgwà ndị e ji mara Ndị Kraịst nwanna nwoke a na-akpa? Ihe ka ya mkpa ọ̀ bụ ofufe Jehova na ọrụ ndị ọ na-arụ n’ọgbakọ, ka ọ̀ bụ ọrụ o ji akpata ego, ime egwuregwu, ego, na ịtụrụ ndụ? Olee otú o si emeso ndị ezinụlọ ya? Ọ̀ na-egosi na ọ hụrụ ndị ọzọ n’anya?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya