Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
© 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
SEPTEMBA 1-7
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ILU 29
Anabatala Nkwenkwe na Omenala Ndị Akwụkwọ Nsọ Na-akwadoghị
wp16.06 6, igbe
Ọhụụ Ndị Mere Ka A Mata Ndị Bí n’Eluigwe
Nkwenkwe ụgha kere ndị mmadụ agbụ taa. Ọtụtụ ndị na-atụkwa ndị mmụọ ọjọọ ụjọ. Ọ bụ ya mere ha ji e ji ọtụmọkpọ na ihe ndị e ji eme anwansi na-echebe onwe ha. I kwesịghị iji ihe ndị a echebe onwe gị. Baịbụl kwuru ihe na-eme ka obi sie anyị ike na Chineke ga-echebe anyị. Ọ sịrị: “Anya Jehova na-ahụzu ụwa dum iji gosi ike ya maka ndị obi ha zuru ezu n’ebe ọ nọ.” (2 Ihe E Mere 16:9) Jehova Chineke ga-echebe gị ma ị tụkwasị ya obi. Ike ya karịrị nke Setan.
Ọ bụrụ na ị chọrọ ka Jehova na-echebe gị, i kwesịrị ịmụta ihe ndị na-adị ya mma, ma na-eme ha. Dị ka ihe atụ, n’oge ndịozi Jizọs, Ndị Kraịst nọ́ n’Efesọs chịkọtara akwụkwọ niile ha ji na-eme anwansi ma kpọọ ha ọkụ. (Ọrụ Ndịozi 19:19, 20) Ọ bụrụ na ị chọrọ ka Chineke na-echebe gị, i kwesịkwara ịkpọ ihe niile i nwere nke nwere ihe gbasara ya na ime anwansi ọkụ. Ha bụ ọtụmọkpọ, akwụkwọ e ji eme anwansi, mgbaaka ndị a sịrị na-echebe mmadụ, na ihe ọ bụla nwere ihe jikọrọ ya na ndị mmụọ ọjọọ.
Mata nke Bụ́ Eziokwu Banyere Ọnwụ
13 Ọ bụrụ na omenala ụfọdụ ma ọ bụ ihe ndị mmadụ na-eme edoghị gị anya, kọọrọ ya Jehova n’ekpere, rịọ ya ka o nye gị amamihe ya. (Gụọ Jems 1:5.) Meekwa nchọnchọ n’akwụkwọ anyị. I nwere ike ịkọrọ ya ndị okenye ọgbakọ. Ha agaghị agwa gị ihe ị ga-eme, kama, ha ga-enyere gị aka ịmata ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru, dị ka ndị nke anyị tụlerela n’isiokwu a. I mee ihe ndị a, ị ‘na-azụ ikike nghọta’ gị. Ikike nghọta a ga-enyekwara gị aka “ịmata ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi.”—Hib. 5:14.
“M Ga-eje Ije n’Eziokwu Gị”
12 Ememme na omenala ndị na-adịghị Chineke mma. Ndị ezinụlọ anyị, ndị ọrụ ibe anyị, nakwa ụmụ akwụkwọ ibe anyị nwere ike ịchọ ka anyị soro ha n’ememme ndị ha na-eme. Olee ihe anyị ga-eme ka anyị ghara iso ha na-eme ememme ndị ahụ na-adịghị Chineke mma? Otú anyị nwere ike isi eme ya bụ iburu n’obi ihe mere Jehova ji kwuo na ememme ndị ahụ adịghị mma. Ime nchọnchọ n’akwụkwọ anyị ndị kwuru otú ememme ndị ahụ si malite ga-enyere anyị aka. Ọ bụrụ na anyị amata ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru mere na anyị ekwesịghị ime ememme ndị ahụ, ọ ga-edo anyị anya na anyị na-eme “ihe dị Onyenwe anyị mma.” (Efe. 5:10) Ịtụkwasị Jehova obi na iji Okwu ya nke eziokwu kpọrọ ihe, ga-echebe anyị ka anyị ghara “ịtụ mmadụ egwu.”—Ilu 29:25.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it “Otuto Elu Ọnụ” ¶1
Otuto Elu Ọnụ
Ọ pụtara otuto ntogbu, ịja mmadụ mma gafee ókè, otuto aghụghọ ma ọ bụ nke na-esighị mmadụ n’obi. Ihe na-emekarị e ji eto mmadụ ụdị otuto a bụ ka e mee ka obi dị ya mma ma ọ bụ ka onwe ya buwe ya isi. N’ihi ya, ụdị otuto a na-emebiri mmadụ ihe. E ji ya enweta ihu ọma mmadụ ma ọ bụ anapụta ya ihe, jiri ya eme ka onye e toro nwee mmasị imere onye toro ya ihe ma ọ bụ jiri ya na-ebuli mmadụ elu. Ọtụtụ mgbe, e ji ya amata mmadụ n’ọnyà. (Ilu 29:5) Onye na-eto mmadụ otuto elu ọnụ na-egosi na o nweghị amamihe nke si n’eluigwe. Ọ na-egosi na mmadụ nwere amamihe nke ụwa n’ihi na onye na-eto onye ọzọ ụdị otuto a na-achọ ihe ga-abara naanị ya uru, na-ele mmadụ anya n’ihu, dịkwa ihu abụọ. (Jems 3:17) Ihu abụọ, ịgha ụgha, ịja mmadụ mma gafee ókè ma ọ bụ ito onye ahụ otuto na-esighị anyị n’obi nakwa ime ka isi buwe mmadụ adịghị Chineke mma.—2 Kọr. 1:12; Gal. 1:10; Efe. 4:25; Kọl. 3:9; Mkpu. 21:8.
SEPTEMBA 8-14
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ILU 30
“Emela Ka M Daa Ogbenye, Enyekwala M Akụnụba”
Olee Ụdị Ịhụnanya Na-eme Ka Mmadụ Na-enwe Ezigbo Obi Ụtọ?
10 Nke bụ́ eziokwu bụ na ego dị anyị niile mkpa. Ọ na-echebe anyị mgbe ụfọdụ. (Ekli. 7:12) Ma, onye nwere naanị ihe na-ezuru ya, ò nwere ike inwe obi ụtọ? Eheenụ. (Gụọ Ekliziastis 5:12.) Egọ nwa Jeke kwuru, sị: “Emela ka m daa ogbenye, enyekwala m akụnụba. Ka m rie nri e kenyere m.” Anyị nwere ike ịghọta ihe mere o ji kwuo na ya achọghị ịda ogbenye. Ọ gara n’ihu ikwu na ọ chọghị izu ohi n’ihi na ọ ga-eme ka a kpọọ Chineke aha ọjọọ. Ma, gịnị mere o ji kpee ekpere ka Chineke ghara inye ya akụnụba? O kwuru, sị: “Ka afọ ghara iju m, m wee gọnahụ gị, sị: ‘Ònye bụ Jehova?’” (Ilu 30:8, 9) O nwere ike ịbụ na ị ma ndị tụkwasịrị akụnụba ha obi kama ịtụkwasị Chineke obi.
11 Ndị hụrụ ego n’anya enweghị ike ịhụ Chineke n’anya. Jizọs kwuru, sị: “Ọ dịghị onye pụrụ ịbụ ohu nke nna ukwu abụọ; n’ihi na, ma ọ́ bụghị na ọ ga-akpọ otu asị ma hụ onye nke ọzọ n’anya, ya abụrụ na ọ ga-arapara n’otu ma leda onye nke ọzọ anya. Unu apụghị ịbụ ndị ohu Chineke na nke Akụnụba.” Ma, o bu ụzọ kwuo, sị: “Kwụsịnụ ịkpakọbara onwe unu akụ̀ n’ụwa, ebe nla na nchara na-erichapụ ihe, ebe ndị ohi na-awabakwa zuo ohi. Kama nke ahụ, na-akpakọbaranụ onwe unu akụ̀ n’eluigwe, ebe nla ma ọ bụ nchara na-adịghị erichapụ ihe, ebe ndị ohi na-adịghịkwa awaba zuo ohi.”—Mat. 6:19, 20, 24.
12 Ọtụtụ ndị ohu Chineke na-agbalị ka ha ghara ibi ndụ okomoko. Ha achọpụtala na ime otú ahụ na-eme ka ha nwekwuo oge ijere Jehova ozi, na-emekwa ka ha na-enwekwu obi ụtọ. Otu nwanna bi n’Amerịka aha ya bụ Jack rere nnukwu ụlọ ya na ụlọ ọrụ ya ka o nwee ike iso nwunye ya na-asụ ụzọ. O kwuru, sị: “Ọ dịghịrị anyị mfe ire ụlọ anyị na ihe ndị anyị nwere n’obodo anyị. Ma, afọ ndị ahụ anyị bi n’ụlọ anyị ahụ, ọ na-abụ m gachaa ọrụ lọta, ike ụwa na-agwụ m n’ihi nsogbu ndị m nwere n’ụlọ ọrụ m. Ma nwunye m bụ́ ọsụ ụzọ na-enwekarị obi ụtọ. Ọ na-ekwu, sị: ‘O nweghị ihe dị ka mmadụ ịrụrụ Jehova ọrụ.’ Ugbu a m so ya na-asụ ụzọ, mụ na ya na-arụrụ otu Onye ahụ ọrụ, ya bụ, Jehova.”
w87 5/15 30 ¶14
Tụọ Egwu Jehova, Ị Ga-enwekwa Obi Ụtọ
◆ 30:15, 16—Gịnị bụ ihe ihe atụ ndị a na-egosi?
A na-akọwa otú a na-apụghị isi mejuo ọchịchọ nke anya ukwu. Ihe ọtịta ndị na-amị ọbara na-aṅụbiga ọbara ókè, ọbụna dị ka onye anyaukwu na-achọkarị ego ma ọ bụ ike. N’otu aka ahụ, afọ adịghị eju ili, kama ọ na-anọgide na-eghere oghe ịnabatakwu ndị ọzọ ọnwụ gburu. Afọ nke na-adịghị atụ ime ‘na-eti mkpu’ maka ụmụ. (Jenesis 30:1) Ala nke okpomọkụ wakwasịrị na-amịkọrọ mmiri ozuzo, n’oge na-adịghị anya ọ na-akpọkwa nkụ ọzọ. Ọkụ nke rechapụworo ihe a tụbara n’ime ya na-ekupụkwa ire ọkụ nke na-erekwa ihe ndị na-ere ọkụ dị nso. Otú ahụ ka ọ dị banyere onye anya ukwu. Omume ịchọ ọdịmma onwe onye dị otú ahụ adịghị akwali ndị amamihe Chineke na-eduzi.
Olee Otú Mmadụ Ga-esi Amụta Ikonye Akpa Ya Ebe Aka Ya Ga-eru?
Buru ụzọ kpakọta ego tupu ị zụọ ihe. Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ndị nwere ike iche na oge agafeela mgbe mmadụ na-ebu ụzọ akpakọta ego tupu ya azụwa ihe, nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụ otu n’ime ụzọ kacha mma mmadụ ga-esi zere ịbanye n’ụgwọ. Ime otú ahụ na-eme ka ọtụtụ ndị ghara iji ụgwọ ma zere ọtụtụ nsogbu ya na iji ụgwọ so, dị ka ịkwụ nnukwu ọmụrụ nwa a na-atụkwasịrị onye zụrụ ihe n’aka. Na Baịbụl, e kwuru na ndanda ‘maara ihe’ n’ihi na ọ na-eji ‘oge owuwe ihe ubi achịkọta ihe ọ ga-eri’ n’ọdịnihu.—Ilu 6:6-8; 30:24, 25.
Bụrụ Onye Ọbịa Jehova Ruo Mgbe Ebighị Ebi
18 Ọ dị mma ka anyị na-echebara otú anyị si ele ego anya echiche. Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ na-echekarị gbasara ego na ihe a ga-eji ego azụ? Ọ bụrụ na mụ agbaziri ego, m̀ na-egbu oge ịkwụghachi ya, na-ekwu na ego ahụ adịghị onye gbazinyere m ya mkpa? Inwe ego ọ̀ na-eme ka m chee na m bara uru ma na-eme ka o siere m ike imesapụrụ ndị mmadụ aka? M̀ na-ewere ụmụnna m ka ndị hụrụ ego n’anya naanị n’ihi na ha nwere ego? M̀ na-achọkarị ka mụ na ndị bara ọgaranya bụrụ enyi ma na-eze ndị dara ogbenye eze?’ Ọ bụ nnukwu ihe ọma meere anyị na anyị nwere ohere ịbụ ndị ọbịa Jehova. Anyị nwere ike ịna-abụ ndị ọbịa Jehova ma ọ bụrụ na anyị agbalịsie ike ghara ịhụ ego n’anya. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, Jehova agaghị ahapụ anyị.—Gụọ Ndị Hibru 13:5.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
A Na-ahụ Amamihe Jehova n’Ihe Ndị O Kere
11 Ewi nkume bụ anụ ọzọ dị obere nke nwere ike ịkụziri anyị ihe bara uru. (Gụọ Ilu 30:26.) O yiri nnukwu oké bekee, ma o nwere obere ntị dị gburugburu, ụkwụ ya dịkwa mkpụmkpụ. Ọ na-ebi ebe bụ́ nkume nkume. Anya ya ndị na-enwu gbaa na-enyere ya aka, ọnụ ọ na-atụ n’ebe bụ́ nkume nkume na-eme ka ọ gbanahụ anụ ọ bụla bịara igbu ya. Ahụ́ na-erukarị ewi nkume ala n’ebe ha hiri nne. Nke a na-echebe ha ma na-eme ka ahụ́ na-ekpo ha ọkụ n’oge oyi.
12 Gịnị ka ewi nkume nwere ike ịkụziri anyị? Nke mbụ bụ na ọ naghị eme ihe ga-etinye ndụ ya n’ihe ize ndụ. Kama nke ahụ, ọ na-ahụ anụ ọ bụla nwere ike igbu ya mgbe anụ ahụ ka nọ ebe dị anya. Ọ na-anọkwa nso n’ebe ọ tụrụ ọnụ ka o wee nwee ike ịgbaba ma nsogbu bịa. Anyị kwesịkwara ịna-ahụ ụzọ nke ọma n’ụzọ ime mmụọ ka anyị wee nwee ike ịmata ebe dị iche iche ihe ize ndụ dị n’ụwa Setan. Pọl onyeozi dụrụ Ndị Kraịst ọdụ, sị: “Nweenụ uche ziri ezi, na-echenụ nche. Onye mmegide unu, bụ́ Ekwensu, na-ejegharị dị ka ọdụm na-ebigbọ ebigbọ, na-achọ onye ọ ga-eripịa.” (1 Pita 5:8) Jizọs nọ ná nche mgbe ọ bịara n’ụwa, ọ bụ ya mere mbọ niile Setan gbara iji mee ka ọ kwụsị ime uche Chineke ji kụọ afọ n’ala. (Mat. 4:1-11) Jizọs setịpụụrụ ndị na-eso ụzọ ya ezigbo ihe nlereanya!
13 Otu n’ime ụzọ anyị ga-esi egosi na anyị mụ anya bụ ime ihe dị iche iche Jehova chọrọ ka anyị na-eme, bụ́ ndị ga-enye aka mee ka anyị na ya nọgide na-adị ná mma. Anyị kwesịrị ịna-amụchi Okwu Chineke anya, kwesịkwa ịna-agachi ọmụmụ ihe anya. (Luk 4:4; Hib. 10:24, 25) Dịkwa nnọọ ka ahụ́ na-eru ewi nkume ala mgbe ha nọ n’ìgwè, anyị kwesịrị ịna-anọ ụmụnna anyị nso ka “anyị wee gbarịta ibe anyị ume.” (Rom 1:12) Ọ bụrụ na anyị anọgide na-eme ihe ndị a Jehova chọrọ ka anyị na-eme ka anyị na ya wee nọgide na-adị ná mma, anyị na-egosi na anyị kweere ihe ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid kwuru mgbe o dere, sị: “Jehova bụ nkume m dị elu na ebe m e wusiri ike na Onye na-emere m ụzọ mgbapụ. Chineke m bụ oké nkume m. M ga-agbaba n’ime ya.”—Ọma 18:2.
SEPTEMBA 15-21
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
Ihe Ndị Anyị Na-amụta na Ndụmọdụ Nwaanyị Hụrụ Nwa Ya n’Anya Nyere Ya
Kụziere Ụmụ Gị Omume Ọma
Kụziere ụmụ gị eziokwu niile banyere mmekọahụ. Ịdọ aka ná ntị dị mkpa. (1 Ndị Kọrịnt 6:18; Jems 1:14, 15) Ma, ihe ka ọtụtụ n’ihe ndị Baịbụl kwuru banyere mmekọahụ gosiri na ọ bụ onyinye si n’aka Chineke, ọ bụghị ọnyà Setan. (Ilu 5:18, 19; Abụ Sọlọmọn 1:2) Ịgwa ụmụ gị dị afọ iri na ụma naanị banyere ihe ọjọọ ndị na-esi ná mmekọahụ apụta nwere ike ime ka ha nwee echiche na-ezighị ezi, nke na-ekwekọghịkwa n’Akwụkwọ Nsọ, banyere mmekọahụ. Otu nwaanyị bi na Frans nke aha ya bụ Corrina kwuru, sị: “Ndị mụrụ m na-ekwukarị okwu banyere ịkwa iko, nke ahụ mekwara ka m lewe mmekọahụ anya ọjọọ.”
Hụ na ị gwara ụmụ gị eziokwu niile banyere mmekọahụ. Otu nne bi na Meksiko nke aha ya bụ Nadia kwuru, sị: “Ihe m na-agbalị ịkụziri ụmụ m mgbe niile bụ na mmekọahụ bụ ihe dị mma na ihe Jehova Chineke nyere ụmụ mmadụ iji mee onwe ha obi ụtọ. Ma, ọ bụ naanị maka di na nwunye. O nwere ike ime anyị obi ụtọ ma ọ bụ kpatara anyị ahụhụ, dabere n’otú anyị si mee ya.”
Ịkụziri Nwa Gị Ihe O Kwesịrị Ịma Banyere Mmanya Na-aba n’Anya
Gwa nwa gị ka gị na ya kwurịta ya. Otu nwoke bi na Briten kwuru, sị: “Okwu banyere ịṅụ mmanya na-aba n’anya nwere ike ịna-agbagwoju ụmụaka anya. M jụrụ nwa m nwoke dị afọ asatọ ma ọ̀ dị mma mmadụ ịṅụ mmanya na-aba n’anya ka ọ̀ bụ na ọ dịghị. M mere ka ahụ́ ruo ya ala, o mekwara ka o medaa obi kọọrọ m ihe o chere.”
Ị ga-aka eru nwa gị n’obi ma ọ bụrụ na gị na ya ekwurịta ihe gbasara mmanya na-aba n’anya ugboro ugboro. Dabere n’afọ ole nwa gị dị, i nwere ike ịkụziri ya banyere ịṅụ mmanya na-aba n’anya mgbe ị na-akụziri ya ihe ndị ọzọ, dị ka otú ọ ga-esi akpachara anya n’okporo ụzọ nakwa ihe banyere mmekọahụ.
Bụrụ ezigbo ihe nlereanya. Ụmụaka na-amụta ihe a na-eme gburugburu ha otú ahụ fom si amịkọrọ mmiri e tinyere ya na ya. Nchọpụta ndị e mere na-egosi na ụmụaka na-emekarị ihe ndị mụrụ ha na-eme. Ọ pụtara na ọ bụrụ na ihe mbụ ị na-eme ma e nwee ihe na-echegbu gị bụ ịṅụ mmanya na-aba n’anya, nwa gị ga-ewere ya na mmanya na-aba n’anya bụ ihe e ji akwụsị nchegbu. N’ihi ya, bụrụ ezigbo ihe nlereanya. Jide n’aka na ị na-aṅụ ya ka onye nwere uche.
Kụziere Ụmụ Gị Ịdị Umeala n’Obi
Kụziere nwa gị ịna-emesapụ aka. Mee ka nwa gị ghọta na “a na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.” (Ọrụ Ndịozi 20:35) Olee otú ị ga-esi eme ya? Gị na nwa gị nwere ike ide aha ndị chọrọ ka e nyere ha aka gaa ahịa, buga ha ebe ha na-aga, ma ọ bụ rụziere ha ihe. Gị na ya soro ma ị gawa imere ha ihe ndị ahụ. Mee ka nwa gị hụ na ọ na-atọ gị ụtọ inyere ndị ọzọ aka. Ihe a bụ otú kacha mma ị ga-esi kụziere nwa gị ịdị umeala n’obi, ya bụ, ịna-eme ya eme.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Luk 6:38.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Agụmakwụkwọ n’Oge Bible
7 N’Israel, a na-akụziri ụmụaka ihe site na mgbe ha dị nnọọ na nwata site n’aka ma nne ma nna ha. (Deuterọnọmi 11:18, 19; Ilu 1:8; 31:26) N’akwụkwọ Dictionnaire de la Bible e dere n’asụsụ French, onye mmụta Bible bụ́ E. Mangenot dere, sị: “Ngwa ngwa o nwere ike ikwu okwu, nwatakịrị na-amụ akụkụ ihe odide ole na ole site n’Iwu ahụ. Nne ya ga na-agụghachi otu amaokwu; mgbe ọ mụtara ya, ọ ga-enye ya ọzọ. E mesịa, a ga-etinye ihe odide nke amaokwu ndị ahụ ha nweworo ike ịgụ site n’isi n’aka ha. Otú a, a na-eme ka ha malite ịgụ ihe, mgbe ha mekwara okenye karị, ha pụrụ ịga n’ihu n’ozizi okpukpe ha site n’ịgụ ihe na ịtụgharị uche n’iwu nke Onyenwe anyị.”
8 Nke a na-atụ aro na ụzọ bụ́ isi e ji mee ihe bụ ịmụ ihe site n’iburu ha n’isi. Ihe ndị a mụtara banyere iwu niile nke Jehova na ụzọ o si emeso ndị ya ga-abami n’ime obi. (Deuterọnọmi 6:6, 7) A ga-atụgharị uche banyere ha. (Abụ Ọma 77:11, 12) Iji nyere ụmụaka na ndị okenye aka iburu ihe n’isi, e jiri ihe dị iche iche na-enye aka iburu ihe n’isi mee ihe. Ndị a gụnyere usoro mkpụrụ okwu, ahịrịokwu ndị na-esote onwe ha n’abụ, bụ́ ndị na-eji mkpụrụ okwu dị iche na-amalite, n’usoro mkpụrụ okwu niile (dị ka Ilu 31:10-31); okwu mgbawa ọnụ (okwu ndị ji otu mkpụrụ okwu ma ọ bụ ụda olu malite); na iji nọmba na-eme ihe, dị ka ndị e jiri mee ihe n’ọkara nke ikpeazụ nke Ilu isi nke 30. Ọ dị mma ịmara na ụfọdụ ndị mmụta lere Gezer Calendar, otu n’ime ihe atụ ndị kasị ochie nke ihe odide Hibru oge ochie, anya dị ka ihe nwa akwụkwọ ji amụ ibu ihe n’isi.
SEPTEMBA 22-28
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE EKLIZIASTIS 1-2
Akwụsịla Ịzụ Ọgbọ Na-abịanụ
“Nyefee Ya n’Aka Ndị Kwesịrị Ntụkwasị Obi”
3 Ọtụtụ n’ime anyị nwere mmasị n’ihe anyị na-arụ, chọọkwa ịrụ ya ruo mgbe ebighị ebi. Ma, ọ dị mwute na kemgbe oge Adam, ọ na-abụ otu ọgbọ na-eme agadi, ọgbọ ọzọ ana-anọchi ya. (Ekli. 1:4) Taa, ụdị mgbanwe a emeela ka ọ dị mkpa na Ndị Kraịst ga-emegharị ihe ụfọdụ. Ọrụ ndị ohu Jehova na-arụ amụbaala n’ebe o buru ibu. Ka a na-enwe ọrụ ọhụrụ, a na-enwekarịkwa otú ọhụrụ e kwesịrị isi na-arụ ya. Otú ọhụrụ a e si arụ ụfọdụ ọrụ ndị a pụtakwara na a ga-eji ngwá ọrụ ọgbara ọhụrụ na-arụ ha. Ọ na-esiri ụfọdụ ndị merela agadi ike ịrụ ọrụ ndị a otú ọhụrụ e sizi arụ ha. (Luk 5:39) Ọ bụrụgodị ndị nke ọ na-anaghị esiri ike, nke bụ́ eziokwu bụ na ndị na-akatabeghị ahụ́ nwere ume na ike karịrị nke ndị katarala ahụ́. (Ilu 20:29) N’ihi ya, ọ bara uru, kwesịkwa ekwesị, ka ndị okenye zụọ ụmụ okorobịa ka ha nwee ike ịna-arụkwu ọrụ ndị dị n’ọgbakọ.—Gụọ Abụ Ọma 71:18.
4 O nwere ike isiri ndị nọ n’ọkwá ike inyefe ndị ka bụ́ okorobịa ọrụ. Ụjọ ha bụ na e nwere ike ịnaghara ha ọrụ ha dị ha ezigbo mkpa. Ọ na-echu ndị ọzọ ụra na ọ bụghịzi hanwa ga na-ahazi otú ọrụ ahụ si aga nakwa na ọrụ ahụ agaghị aga nke ọma ma ha hapụ ya, n’ihi na ụmụ okorobịa agaghị arụtali ya nke ọma otú hanwa ga-esi arụta ya. Ụfọdụ nwere ike ịna-ekwu na ha enweghị ohere ha ga-eji azụ ndị ọzọ. Ụmụ okorobịa kwesịkwara inwe ndidi ma ọ bụrụ na e nyekwubeghị ha ọrụ.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it “Ekliziastis” ¶1
Ekliziastis
Okwu Hibru bụ́ Qo·heʹleth (nke pụtara “Onye Mkpọkọta; Onye Na-eme Ka Ndị Mmadụ Zukọta”) bụ okwu dabara adaba na-egosi ọrụ onye bụ́ eze n’ọchịchị Chineke nke na-achị ndị Izrel. (Ekli. 1:1, 12) Ọ bụ ọrụ onye eze ịchịkọta ndị Izrel, bụ́ ndị nyefere Chineke onwe ha, ka ha na-erubere onye bụ́ Eze ha n’eziokwu, bụrụkwa Chineke ha, isi. (1 Eze 8:1-5, 41-43, 66) Ọ bụ ya mere o ji bụrụ na ihe e ji amata ma eze ọ̀ bụ ezigbo eze n’Izrel ka ọ̀ bụ eze ọjọọ bụ ma ọ bụrụ na o mere ka ndị ọ na-achị fewe Jehova ma ọ bụ ghara ife ya. (2 Eze 16:1-4; 18:1-6) E nweela ọtụtụ ugboro onye mkpọkọta bụ́ Solomọn kpọkọtara ndị Izrel na ndị ibe ha, bụ́ ndị mbịarambịa, n’ụlọ nsọ. O ji akwụkwọ a bụ́ Ekliziastis na-agbalị ịkpọkọta ndị Chineke ka ha hapụ ọrụ dị iche iche na-enweghị isi na ọdụ a na-arụ n’ụwa a rụwa ụdị ọrụ Chineke, bụ́ Onye ha nyefere onwe ha, chọrọ ka ha na-arụ. E si n’okwu bụ́ Qo·heʹleth sụgharịa Ek·kle·si·a·stesʹ (Ekliziastis) na Baịbụl Grik bụ́ Septuagint. Ọ bụ ebe e si nweta aha a bụ́ Ekliziastis e dere na Baịbụl Igbo. Ọ pụtara ‘onye ọgbakọ; onye so ná nzukọ.’
SEPTEMBA 29–ỌKTOBA 5
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE EKLIZIASTIS 3-4
Na-emenụ Ka Ụdọ Unu E Ji Eriri Atọ Tụọ Na-esikwu Ike
Ihe Unu Ga-eme Ka Ekwentị Ghara Ibutere Unu Nsogbu
● Iji ekwentị na ihe ndị yiri ya eme ezigbo ihe nwere ike ịbara di na nwunye uru. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ di na nwunye na-eji ekwentị ezirịta ozi n’ụbọchị mgbe ha abụọ na-anọghị nso.
Otu nwoke aha ya bụ Jonathan sịrị: ‘Mgbe ọ bụla nwunye m ziteere m ozi n’ekwentị gwa m na ọ hụrụ m n’anya ma ọ bụ na ya na-eche banyere m, ọ na-eme ka m hụkwuo ya n’anya.’
● Ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye na-apịkarị ekwentị ya, o nwere ike ime ka ha nwewe nsogbu. Dị ka ihe atụ, o nwere ndị anya ha na-atọkarị n’ekwentị nke na ha anaghị enwe ohere gee di ha ma ọ bụ nwunye ha ntị ma ọ bụdi nwee mgbe ha na ya ji ekwurịta okwu.
Otu nwaanyị aha ya bụ Julissa sịrị: “Ama m na e nweela oge ndị di m gaara achọ ka mụ na ya kparịta ụka ma ya abụrụ na m na-apị ekwentị m.”
● Ụfọdụ ndị sị na ọ bụrụ na ha na-apịgodị ekwentị ha, ha na di ha ma ọ bụ nwunye ha nwekwara ike ịna-akparịta ụka nke ọma n’otu oge ahụ. Ma Sherry Turkle, onye bụ́ ọkachamara n’ihe gbasara mmekọrịta mmadụ na ibe ya, kwuru na nke ahụ bụ “ihe na-abụghị eziokwu gbasara mmadụ ime ọtụtụ ihe n’otu oge.” Ime ọtụtụ ihe otu oge abụghị ihe ọma, n’agbanyeghị na ndị mmadụ na-eche na ọ dị mma. Ọ sịrị na nke bụ́ eziokwu bụ na “ọ bụrụ na anyị achịkọta ọtụtụ ihe anyị chọrọ ime n’otu oge, anyị agaghị enwe ike imetacha ha nke ọma.”
Otu nwaanyị aha ya bụ Sarah sịrị: “Ọ na-atọ m ụtọ ma mụ na di m kparịtawa ụka, ma obi anaghị adị m mma mgbe ọ bụla ọ na-apị ekwentị mgbe mụ na ya na-akparịta ụka. Ihe m na-aghọta n’oge ahụ bụ na obi ga-aka adị ya ụtọ ma m hapụ ya ka ọ pịwa ekwentị ya.”
Ihe ị ga-eburu n’obi: Otú i si apị ekwentị gị nwere ike ịkpatara gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị nsogbu ma ọ bụ baara unu uru.
Ekwela Ka “Ọkụ nke Jaa” Nyụọ
12 Olee otú ndị di na nwunye nwere ike isi mee ka Akwịla na Prisila? Chee gbasara ọtụtụ ihe gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị kwesịrị ime. Ùnu nwere ike imekọ ụfọdụ n’ime ha ọnụ kama ime ha iche iche? Dị ka ihe atụ, Akwịla na Prisila kwusakọrọ ozi ọma ọnụ. Ùnu na-ahazi ka unu na-eme otú ahụ? Akwịla na Prisila rụkọkwara ọrụ ego ọnụ. O nwere ike ọ gaghị ekwe unu omume ịrụ otu ọrụ ego. Ma, ùnu nwere ike ịrụkọ ọrụ ụlọ ọnụ? (Ekli. 4:9) Ọ bụrụ na unu enyere ibe unu aka rụọ ọrụ, ọ ga-eme ka unu na-enwekwu otu obi, meekwa ka unu nwee ohere unu ga-eji na-ekwurịta okwu. Otu nwanna aha ya bụ Robert na nwunye ya Linda alụọla ihe karịrị afọ iri ise. Nwanna Robert sịrị: “N’eziokwu, anyị anaghị enwe oge buru ibu anyị abụọ ji atụrụ ndụ. Ma, ọ bụrụ na mụ ana-asa efere, nwunye m ana-ehicha ya, ma ọ bụkwanụ m nọrọ n’èzí na-abọ ahịhịa, nwunye m abịa na-enyere m aka, ọ na-eme ka obi na-atọgbu m atọgbu. Imekọ ihe ọnụ na-eme ka anyị dịkwuo ná mma, na-ahụkwukwa ibe anyị n’anya.”
13 Ma, cheta na naanị ịnọkọ ọnụ agaghị eme ka di na nwunye na-adịkwu ná mma. Otu nwanna nwaanyị bi na Brazil sịrị: “N’oge ndị a, e nwere ọtụtụ ihe na-emegharị mmadụ anya. M chọpụtala na anyị nwere ike iche na anyị na-anọkọ ọnụ mgbe niile n’ihi na anyị bi n’otu ụlọ. Amụtala m na ịnọkọ ọnụ dị mkpa, mana ọ bụghị ebe okwu biri. Ihe ọzọ dị mkpa bụ ịna-ege di m ntị.” Lee ihe Nwanna Bruno na nwunye ya Tays na-eme iji hụ na ha na-ege ibe ha ntị nke ọma. Nwanna Bruno sịrị: “Anyị abụọ nọkọọ ọnụ mgbe a na-enweghị ihe anyị na-eme, anyị na-edowe ekwentị anyị n’ebe ọzọ ka anyị nwee ike ịnọrị.”
14 Ma, olee ihe gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị ga-eme ma ọ bụrụ na ọ naghị atọ unu ụtọ ịnọkọ ọnụ? O nwere ike ịbụ na ihe kpatara ya bụ na ihe na-amasị unu dị iche iche ma ọ bụkwanụ na ihe anaghị adabara unu abụọ. Olee ihe unu ga-eme? Chegodị gbasara ọkụ ahụ anyị kwuru okwu ya ná mmalite. A kwanye ọkụ, ọ naghị enwusi ike ozugbo ahụ. A ga-eji nwayọọ nwayọọ na-etinye ya nkụ ndị bukwuru ibu ka o nwee ike ịna-enwu. Otú ahụkwa ka ọ dị di na nwunye. Otú unu nwere ike isi ebido bụ iwepụta obere oge unu ga-eji na-anọkọ kwa ụbọchị. Hụnụ na ihe unu ga-eme bụ ihe na-atọ unu ụtọ, ọ bụghị ihe ga-akpata esemokwu. (Jems 3:18) Unu bido nwayọọ nwayọọ, o nwere ike ime ka onye nke ọ bụla bidokwa ịhụ ibe ya n’anya.
Ekwela Ka “Ọkụ nke Jaa” Nyụọ
3 Ọ bụrụ na di na nwunye achọghị ka “ọkụ nke Jaa” nyụọ, ha kwesịrị ịgbasi mbọ ike ka ha na Jehova dịrị n’ezigbo mma. Olee otú ha na Jehova ịdị ná mma ga-esi enyere ha aka? Ọ bụrụ na di na nwunye ejiri adịm ná mma ha na Nna ha nke eluigwe kpọrọ ihe, ha ga-eji obi ha na-eme ihe o kwuru, nke ga-eme ka ha zere nsogbu ma ọ bụ merie nsogbu ndị nwere ike ime ka ịhụnanya ha jụọ oyi. (Gụọ Ekliziastis 4:12.) Ndị ha na Jehova dị ná mma na-agbasi mbọ ike ime ka ya ma na-akpa àgwà ka ya, dị ka inwe obiọma, inwe ndidi, na ịgbaghara ndị ọzọ. (Efe. 4:32–5:1) Di na nwunye nwee àgwà ndị a, ọ ga-adịrị ha mfe ịna-ahụ ibe ha n’anya. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Lena alụọla di ruo ihe karịrị afọ iri abụọ na ise. Ọ sịrị: “Ọ na-adị mfe ịhụ onye ji ife Jehova kpọrọ ihe n’anya nakwa ịkwanyere ya ùgwù.”
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it “Ịhụnanya” ¶39
Ịhụnanya
“Oge Ịhụ Mmadụ n’Anya.” Ọ bụ naanị ndị Jehova kwuru na anyị ekwesịghị ịhụ n’anya ka anyị na-agaghị ahụ n’anya ma ọ bụkwanụ ndị kpọrọ ekwo nkụ na-eme ihe ọjọọ. Anyị kwesịrị ịhụ mmadụ niile n’anya ruo mgbe ha gosiri na ha kpọrọ Chineke asị. Ọ bụ mgbe ahụ ka anyị na-akwụsị ịhụ ha n’anya. Ma Jehova Chineke ma Jizọs Kraịst hụrụ ezi omume n’anya ma kpọọ ajọ omume asị. (Ọma 45:7; Hib. 1:9) E kwesịghị ịhụ ndị kpọrọ ezi Chineke ezigbo asị n’anya. N’eziokwu, e nweghị uru ịnọgide na-ahụ ndị dị otú ahụ n’anya bara, n’ihi na e nweghị ihe ndị kpọrọ Chineke asị ji ịhụnanya ya kpọrọ. (Ọma 139:21, 22; Aịza. 26:10) N’ihi ya, asị Chineke kpọrọ ha kwesịrị ekwesị, o yiekwala oge ọ ga-eji ebibi ha.—Ọma 21:8, 9; Ekli. 3:1, 8.
ỌKTOBA 6-12
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE EKLIZIASTIS 5-6
Otú Anyị Si Egosi na Anyị Na-akwanyere Chineke Ukwu Anyị Ezigbo Ùgwù
Sọpụrụ Jehova Site n’Ịkpa Àgwà Dị Ùgwù
17 Anyị kwesịrị ịhụ na anyị na-akwanyere Jehova ùgwù mgbe anyị bịara ife ya ofufe. Ekliziastis 5:1 na-ekwu, sị: “Chee ụkwụ gị nche mgbe ọ bụla ị gara n’ụlọ ezi Chineke.” E nyere ma Mozis ma Jọshụa iwu ka ha yipụ akpụkpọ ụkwụ ha mgbe ha nọ n’ebe dị nsọ. (Ọpụ. 3:5; Jọsh. 5:15) Ha ga-eme nke a iji gosi na ha na-akwanyere Jehova ùgwù. A chọrọ ka ndị nchụàjà yiri uwe úkwù “iji kpuchie ahụ́ ha.” (Ọpụ. 28:42, 43) Nke a ga-eme ka ha ghara ikpughe ọtọ ha n’elu ebe ịchụ àjà mgbe ha na-eje ozi. Onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ ndị nchụàjà kwesịrị ịkwanyere ozi Jehova ùgwù otú Chineke si kwuo.
18 Ịkpa àgwà dị ùgwù mgbe anyị bịara ife ofufe gụnyere ịsọpụrụ ndị ọzọ na ịkwanyere ha ùgwù. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka a kwanyere anyị ùgwù, anyị kwesịrị ịkwanyere onwe anyị ùgwù. Anyị kwesịrị iji obi ọcha na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù, ọ bụghị ime ya ka e mezuo iwu. O kwesịrị ịkarị ihe anya mmadụ na-ahụ ma bụrụ nke Chineke na-ahụ—ya bụ, ọ ga-esi anyị n’obi. (1 Sam. 16:7; Ilu 21:2) E kwesịrị iji ịkpa àgwà dị ùgwù mara anyị, anyị kwesịkwara igosipụta ya n’otú anyị si emeso ndị ọzọ nakwa n’otú anyị si ele onwe anyị anya. N’ezie, anyị kwesịrị igosipụta ya mgbe niile nakwa n’ihe ọ bụla anyị na-ekwu ma na-eme. Mgbe a bịara n’ihe banyere àgwà na ejiji anyị, anyị kwesịrị icheta ihe Pọl onyeozi kwuru mgbe ọ sịrị: “Anyị adịghị eme ihe ịsụ ngọngọ n’ụzọ ọ bụla, ka e wee ghara ịhụta mmejọ n’ozi anyị; kama, n’ụzọ niile, anyị na-eme ka a mata anyị dị ka ndị ozi Chineke.” (2 Kọr. 6:3, 4) Anyị ‘na-achọ ozizi Onye Nzọpụta anyị, bụ́ Chineke, mma n’ihe niile.’—Taị. 2:10.
Mee Ka Ekpere Gị Ka Mma Site n’Ịmụ Baịbụl
21 Jizọs jikwa okwukwe na nkwanye ùgwù kpee ekpere. Dị ka ihe atụ, tupu Jizọs akpọlite Lazarọs n’ọnwụ, “[o] leliri anya n’eluigwe wee sị: ‘Nna, ana m ekele gị na ị nụwo olu m. N’eziokwu, amaara m na ị na-anụ olu m mgbe niile.’” (Jọn 11:41, 42) Ekpere gị ọ̀ na-egosi na ị na-asọpụrụ Chineke nakwa na i nwere okwukwe? Ọ bụrụ na i leruo ekpere ahụ Jizọs kụziiri anyị anya, ị ga-ahụ na ihe ndị bụ́ isi o kwuru bụ ka e doo aha Jehova nsọ, ka Alaeze ya bịa, nakwa ka uche ya mee. (Mat. 6:9, 10) Chebara ekpere nke gị echiche. Ọ̀ na-egosi na i nwere mmasị ka Alaeze Jehova bịa, ka e mee uche ya, nakwa ka e doo aha ya nsọ? O kwesịrị.
“Ihe I Kwere ná Nkwa, Mezuo Ya”
12 Ma, baptizim e mere gị abụghị ebe okwu biri. Anyị mechaa baptizim, anyị kwesịrị iji obi anyị niile na-ejere Chineke ozi otú ahụ anyị kwere ya ná nkwa mgbe anyị nyefere ya onwe anyị. N’ihi ya, anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘Mụ na Jehova ànyị na-adịkwu ná mma kemgbe m mere baptizim? M̀ ka ji obi m niile na-efe ya? (Kọl. 3:23) M̀ na-ekpe ekpere mgbe niile, na-agụchi Okwu Chineke anya, na-agachi ọmụmụ ihe na ozi ọma anya? Ka ime ihe ndị a ọ̀ gwụwala m ike?’ Pita onyeozi kwuru na ozi anyị na-ejere Jehova agaghị anyụ ka ọkụ ma anyị tụkwasị ihe ọmụma, ntachi obi, na nsọpụrụ Chineke n’okwukwe anyị.—Gụọ 2 Pita 1:5-8.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Ekliziastis 5:8 na-ekwu banyere onye ọchịchị na-emegbu ndị ogbenye ma na-ekpe ha ikpe arụrụala. Onye ọchịchị ahụ kwesịrị icheta na ọ ga-abụ na e nwekwara onye ka ya n’ọchịchị na-ahụ ihe ọ na-eme. E nwekwara ike inwe ndị ọzọ ka ma yanwa ma onye ahụ ka ya. Ma n’ụwa a, ọ dị mwute na ndị ọchịchị ndị a niile nwere ike ịbụcha ndị ọjọọ, ndị ha na-achị ana-ata ahụhụ ya.
Ma, n’agbanyeghị otú ihe si dịrị, obi kwesịrị ịtọ anyị ụtọ n’ihi na Jehova na-ahụ ‘ndị ahụ dị elu’ nọ n’ọchịchị. Anyị nwere ike ịrịọ Jehova ka o nyere anyị aka ma tụkwasị ya ibu arọ anyị. (Ọma 55:22; Fil. 4:6, 7) Anyị ma na “anya Jehova na-ahụzu ụwa dum iji gosi ike ya maka ndị obi ha zuru ezu n’ebe ọ nọ.”—2 Ihe 16:9.
N’ihi ya, ihe e kwuru n’Ekliziastis 5:8 na-eme ka anyị ghọta ihe na-eme n’ọchịchị ụmụ mmadụ nakwa na e nwere onye ka ndị ọchịchị ike. Nke kacha mkpa bụ na amaokwu a na-echetara anyị na Jehova bụ Onye Nwere Ikike Kasị Elu. O meekwala Ọkpara ya Eze nke Alaeze ya. Chineke, bụ́ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile na onye na-ahụ ihe niile, na-ekpe ikpe ziri ezi mgbe niile. Otú ahụ ka ọ dịkwa Ọkpara ya.
ỌKTOBA 13-19
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE EKLIZIASTIS 7-8
‘Gaa n’Ebe A Na-eru Uju’
it “Iru Uju” ¶9
Iru Uju
Oge Iru Uju. Ekliziastis 3:1, 4 kwuru na e nwere “oge ibe ákwá na oge ịchị ọchị; oge ibe ákwá arịrị na oge ịgba egwú.” Ebe ọ bụ na mmadụ niile na-anwụ anwụ, Baịbụl kwuru na obi ndị ma ihe “na-adị n’ebe a na-eru uju,” ọ bụghị n’ụlọ oriri na nkwari. (Ekli. 7:2, 4; i nwere ike ịtụle Ilu 14:13.) N’ihi ya, onye ma ihe na-eji ohere o nwere agara ndị na-eru uju mgbaru ma na-akasi ha obi, kama ilefuru ohere ahụ anya gawa ebe ọ ga na-ekpori ndụ. Ihe a na-enyere ya aka ịna-echeta na yanwa nwekwara ike ịnwụ otu ụbọchị, ọ na-emekwa ka obi ya na-adị n’ebe Onye kere ya nọ.
Nyere Ndị Ọzọ Aka Ka Ha Kwụsị Ịna-echegbu Onwe Ha
15 Nwunye otu nwoke aha ya bụ William nwụrụ afọ ole na ole gara aga. William kwuru, sị: “Obi na-adị m ụtọ ma ndị bịara ịkasi m obi na-akọ akụkọ ọma banyere nwunye m. Ọ na-emesi m obi ike na ha hụrụ ya n’anya, jirikwa ya kpọrọ ihe. Ihe a nyeere m ezigbo aka idi ọnwụ ya. Ihe ha na-agwa m na-akasi m obi n’ihi na ejighị m nwunye m egwu egwu, mụ na ya dịkwa ka nnu na mmanụ.” Otu nwanna nwaanyị di ya nwụrụ aha ya bụ́ Bianca kwuru, sị: “Obi na-eru m ala ma ụmụnna bịara ileta m kpeere m ekpere ma gụọrọ m otu ebe ma ọ bụ abụọ na Baịbụl. Obi na-adịkwa m ụtọ ma ha na-akọ banyere di m ma na-egekwa m ntị mgbe m na-akọ banyere ya.”
“Soronụ Ndị Na-akwa Ákwá Kwaa Ákwá”
16 Echefula uru ekpere gị ga-abara nwanna na-eru uju, ma nke gị na ya kpekọrọ ma nke i chetara ya n’ekpere. I kpewe ekpere mgbe gị na onye ahụ nọ, o nwere ike isiri gị ike ikwucha otú ọ dị gị n’obi. Ma, i jiri obi gị niile kpee ekpere ahụ, o nwere ike ịkasi ya ezigbo obi, ọ bụrụgodị na anya mmiri juru gị n’anya mgbe ị na-ekpe ya ma ọ bụ na ị na-ekwu ákwá ákwá. Nwanna nwaanyị ahụ aha ya bụ Dalene sịrị: “Mgbe ụfọdụ, ụmụnna nwaanyị bịa ịkasi m obi, m na-ajụ ha ma hà ga-achọ ikpe ekpere. Ha bido ikpe ekpere, ọ na-esitụrụ ha ike. Ma, ihe na-eme mgbe ọ bụla bụ na, ha kpere na-aga, olu ana-esikwu ha ike, ha ejiri obi ha niile kpee ya. Otú okwukwe ha si sie ike, otú ha si hụ m n’anya, na otú ihe gbasara m si emetụ ha n’obi emeela ka okwukwe m sie ike.”
“Soronụ Ndị Na-akwa Ákwá Kwaa Ákwá”
17 O nweghị otú anyị ga-esi amata ụbọchị ole onye ọ bụla kwesịrị iji ruo uju. Ọtụtụ ndị ikwu na ibe na-abịara onye mmadụ nwụnahụrụ mgbaru ka ha kasie ya obi. Ha na-emechakwa gaa rụwa ọrụ ndị dịịrị ha. Ma a ka kwesịrị ịna-akasi onye na-eru uju obi. N’ihi ya, wepụta onwe gị ịna-akasi ya obi. Ilu 17:17 sịrị: “Ezi enyi nwere ịhụnanya mgbe niile, ọ bụkwa nwanne a mụrụ maka oge nsogbu.” Anyị niile kwesịrị ịna-akasi ndị na-eru uju obi ruo mgbe ha nwetara onwe ha.—Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 3:7.
18 Cheta na onye na-eru uju nwere ike ịnọkata bewe ákwá. Ihe nwere ike ịkpata ya bụ ụbọchị ndị ọ na-echetakarị n’afọ, egwú ụfọdụ, foto, ihe ndị ọ na-eme, ísì, ụda, ma ọ bụkwanụ oge ụfọdụ n’afọ. Obi nwere ike ịgbawa onye di ya ma ọ bụ nwunye ya nwụrụ ma o mewe ihe ha abụọ na-emekọbu ọnụ, dị ka ịga mgbakọ ma ọ bụ Ncheta Ọnwụ Jizọs. Otu nwanna kwuru, sị: “Mgbe nwunye m nwụrụ, m tụrụ anya na obi ga-ajọ m ezigbo njọ ma o ruo n’ụbọchị anyị kwesịrị icheta agbamakwụkwọ anyị. Ọ dịghịrị m mfe. Ma, ụfọdụ ụmụnna haziri obere nnọkọ, kpọọ ndị bụ́ ezigbo enyi m ka m ghara ịnọ naanị m.”
19 Ma, cheta na ọ bụghị naanị n’oge pụrụ iche ka e kwesịrị ịna-akasi ndị na-eru uju obi. Nwanna nwaanyị ahụ aha ya bụ Junia sịrị: “Inyere onye na-eru uju aka na ịnọnyere ya n’ụbọchị na-abụghị ụbọchị pụrụ iche ga-abara ya ezigbo uru. Ụdị oge ahụ dị ezigbo mkpa. Ọ ga-akasikwa onye ahụ obi.” N’eziokwu, anyị agaghị ewepụli uju ndị mmadụ na-eru ma ọ bụkwanụ mee ka ha chefuchaa onye nwụnahụrụ ha. Ma, anyị ga-akasili ha obi ma anyị gbalịsie ike ịna-emere ha ihe ụfọdụ. (1 Jọn 3:18) Nwanna nwaanyị ahụ aha ya bụ Gaby sịrị: “M na-ekele Jehova n’eziokwu maka ndị okenye nyeere m ezigbo aka n’oge ahụ ọ na-adịghịrị m mfe. Ha mere ka ọ dị m ka Jehova ò ku m eku.”
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
“Mmadụ Niile Ga-eji Ya Mata na Unu Bụ Ndị Na-eso Ụzọ M”
18 Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike iche na anyị kwesịrị ịga ka anyị na nwanna mejọrọ anyị kwurịta okwu. Ma anyị kwesịrị ibu ụzọ jụọ onwe anyị ajụjụ ndị dị ka, ‘M̀ ma ihe niile merenụ?’ (Ilu 18:13) ‘Ọ̀ ga-abụ na nwanna a ebughị n’obi imejọ m?’ (Ekli. 7:20) ‘M̀ metụla ụdị ihe a o mere?’ (Ekli. 7:21, 22) ‘Ọ bụrụ na mụ agaa ka mụ na ya kwurịta ya, ọ̀ ga-eme ka ihe kakwuo njọ?’ (Gụọ Ilu 26:20.) Ọ bụrụ na anyị ewepụta oge chebara ajụjụ ndị a echiche, anyị nwere ike ịchọpụta na ịhụnanya ga-eme ka anyị leghara ihe ahụ merenụ anya.
ỌKTOBA 20-26
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE EKLIZIASTIS 9-10
Na-ele Ọnwụnwa Ndị Na-abịara Gị Anya Otú Kwesịrị Ekwesị
‘Ewesola Jehova Oké Iwe’
20 Mara onye e kwesịrị ịta ụta. Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ịkpatara onwe anyị nsogbu. (Gal. 6:7) Anyị ekwesịghị ikwu na ọ bụ Jehova kpatara ya. Ọ̀ bụ maka gịnị? Ka anyị were ụgbọala dị ka ihe atụ. Anyị ma na ụgbọala na-agba ezigbo ọsọ. Ọ bụrụ na onye na-anya ụgbọala ana-agba ọnwụ ọnwụ n’ebe ụzọ gbagọrọ agbagọ, ụgbọala ahụ nwere ike ịkpọka. Ì chere na onye ahụ kwesịrị ịtawa ndị rụrụ ụgbọala ahụ ụta? Mbanụ. Ọ bụ otú ahụ ka anyị na-ekwesịghị ịta Jehova ụta. O kere anyị ka anyị jiri aka anyị na-ekpebi ihe anyị ga-eme. Ma, ọ kụziiri anyị otú anyị ga-esi na-eme mkpebi dị mma. N’ihi ya, anyị mejọọ ihe, anyị ekwesịghị ikwu na ọ bụ ya kpatara ya.
21 Ma, ọ bụghị mgbe niile ka anyị na-akpata nsogbu anyị. Ihe na-akpata nsogbu anyị mgbe ụfọdụ bụ “oge ọdachi na ihe a na-atụghị anya ya.” (Ekli. 9:11) Anyị ekwesịghịkwa ichefu na ọ bụ Setan bụ́ Ekwensu kacha akpata ihe ọjọọ na-eme n’ụwa taa. (1 Jọn 5:19; Mkpu. 12:9) Ọ bụ ya bụ onye iro anyị, ọ bụghị Jehova.—1 Pita 5:8.
Jehova Ji Ndị Ohu Ya Dị Umeala n’Obi Kpọrọ Ihe
10 Ịdị umeala n’obi na-emekwa ka ọ dịrị anyị mfe idi nsogbu. Anyị nwere ike ịna-ahụ ihe ndị anyị chere na ha adịchaghị otú o kwesịrị. Eze Sọlọmọn bụ́ nwoke ma ihe sịrị: “Ahụwo m ka ndị ohu na-agba ịnyịnya ma ndị isi ejiri ụkwụ na-aga dị ka ndị ohu.” (Ekli. 10:7) Ọ bụghị mgbe niile ka a na-eto ndị ma ihe. Mgbe ụfọdụ, ọ bụ ndị na-enwechaghị nke ha ma ka a na-aka eto. Ma, Sọlọmọn kwuru na ọ ga-akara anyị mma iwere ihe otú anyị si hụ ya kama ịnọ na-echegbu onwe anyị gbasara ihe na-adịghị otú o kwesịrị. (Ekli. 6:9) Ọ bụrụ na anyị dị umeala n’obi, ọ ga-adịrị anyị mfe iwere ihe otú anyị hụrụ ya kama ịna-eche otú o kwesịrị ịdị.
Ntụrụndụ Ị Na-enwe Ọ̀ Na-abara Gị Uru?
NA BAỊBỤL, anyị na-agụta ebe ndị e kwuru ihe gosiri na Jehova chọrọ ka anyị na-atụrụ ndụ ọ bụghị naanị ịna-adị ndụ. Dị ka ihe atụ, Abụ Ọma 104:14, 15 kwuru na Jehova na-eme ka e “si n’ala nweta ihe oriri, na mmanya nke na-eme ka obi mmadụ ṅụrịa ọṅụ, iji mee ka ihu mmadụ na-egbu maramara n’ihi mmanụ, nakwa nri nke na-enye obi mmadụ ume.” N’eziokwu, Jehova na-eme ka ihe a kụrụ n’ubi mịa mkpụrụ, na-emekwa ka anyị nweta mmanụ na mmanya, bụ́ ihe ndị na-edozi anyị ahụ́. Ma, mmanya ‘na-emekwa ka obi ṅụrịa ọṅụ.’ Ọ bụghị naanị na ọ na-eme ka anyị na-adị ndụ, kamakwa, ọ na-eme ka obi na-atọkwu anyị ụtọ. (Ekli. 9:7; 10:19) N’eziokwu, Jehova chọrọ ka anyị na-aṅụrị ọṅụ, nakwa ka anyị na-enwe “obi ụtọ.”—Ọrụ 14:16, 17.
2 N’ihi ya, anyị ekwesịghị iche na ọ dị njọ ma ọ bụrụ na anyị nọtụ, anyị ‘eleruo anụ ufe nke eluigwe anya,’ leruokwa ‘okooko lili dị n’ọhịa’ anya; ọ dịghịkwa njọ ime ihe ụfọdụ e ji atụrụ ndụ bụ́ ihe ndị ga-eme ka ahụ́ gbasie anyị ike, obi adịkwa anyị ụtọ. (Mat. 6:26, 28; Ọma 8:3, 4) Inwe obi ụtọ na ịgbasi ike ná ndụ bụ “onyinye Chineke.” (Ekli. 3:12, 13) Ọ bụrụ na anyị ewere oge ntụrụndụ ka ihe so n’onyinye Chineke, ọ ga-eme ka anyị jiri oge ahụ mee ihe ga-eme ka obi dị Onye nyere anyị ya ụtọ.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it “Ịgba Asịrị, Ikwutọ Mmadụ” ¶4, 8
Ịgba Asịrị, Ikwutọ Mmadụ
E nwere ike isi n’ịgba asịrị kwutọọ mmadụ, onye gbara asịrị akpatara onwe ya nsogbu. Ihe e kwuru n’Ekliziastis 10:12-14 bụ eziokwu. Amaokwu ndị ahụ sịrị: “Onye nzuzu na-eji ọnụ ya ala onwe ya n’iyi. Okwu mbụ na-esi ya n’ọnụ apụta bụ okwu nzuzu, okwu ikpeazụ na-esi ya n’ọnụ apụta bụ okwu onye ara, nke na-akpata nsogbu. Okwu na-adị onye nzuzu n’ọnụ mgbe niile.”
N’eziokwu, ọ bụghị mgbe niile ka asịrị na-akpatara mmadụ nsogbu (ọ bụ eziokwu na e nwere ike isi n’ịgba asịrị kwutọọ mmadụ), ma o nweghị mgbe nkwutọ na-anaghị emebi ihe, na-akpasu mmadụ iwe, na-akpatakwa esemokwu. E nwere ike mmadụ agaghị ebu ihe ọjọọ n’obi kwutọọ onye ọzọ. Ma mmadụ ò bu ihe ọjọọ n’obi kwutọọ onye ọzọ ma ọ bụ na o bughị, ọ na-akpasu Chineke iwe n’ihi na “ime ka ụmụnne na-ese okwu” so n’ihe Chineke kpọrọ asị. (Ilu 6:16-19) Okwu Grik a sụgharịrị “onye nkwutọ” ma ọ bụ ‘onye na-ebo onye ọzọ ebubo’ bụ di·aʹbo·los. Na Baịbụl, ọ bụkwa aha a kpọrọ Setan “bụ́ Ekwensu,” onye kacha ekwutọ Chineke. (Jọn 8:44; Mkpu. 12:9, 10; Jen. 3:2-5) Ihe a na-eme ka anyị mata onye ikwutọ ndị ọzọ si n’aka.
ỌKTOBA 27–NỌVEMBA 2
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE EKLIZIASTIS 11-12
Gbalịa Ka Ahụ́ Sie Gị Ike Nakwa Ka Ị Na-enwe Obi Ụtọ
Ikuku Ndụ na Anwụ Hà Nwere Ike ‘Ịgwọ Mmadụ Ọrịa’?
E nwekwara ihe ndị na-adị n’ìhè anyanwụ bụ́ ndị na-enye aka eme ka ọrịa ghara ịgbasa. Akwụkwọ bụ́ Journal of Hospital Infection kọwara na “ìhè anyanwụ na-egbu ụmụ nje ndị na-akpata ọrịa ndị a na-esi n’ikuku ebute.”
Gịnị ka ị ga-eme ka ihe a baara gị uru? O nwere ike ịdị mma ka ị na-apụ n’èzí bụ́ ebe ị ga na-anọtụ ka anwụ chatụ gị, gị ekurutụkwa ikuku ndụ. O yiri ka ọ̀ ga-abara gị uru.
Jiri Ndụ Chineke Nyere Anyị Kpọrọ Ihe
6 Ọ bụ eziokwu na Baịbụl abụghị akwụkwọ na-ekwu ihe ga-eme ka ahụ́ gbasie anyị ike ma ọ bụkwanụ nke ga-agwa anyị ihe anyị ga-eri na ihe anyị na-agaghị eri, mana ọ na-agwa anyị otú Jehova si ele ihe ndị ahụ anya. Dị ka ihe atụ, ọ na-agba anyị ume ka anyị wepụ ‘ihe ọ bụla ga-akpatara anyị nsogbu’ n’ahụ́ anyị. (Ekli. 11:10) Iri oké nri na ịṅụ oké mmanya nwere ike ịkpatara anyị ọnwụ. Baịbụl katọkwara ha. (Ilu 23:20) Jehova chọrọ ka anyị na-ejide onwe anyị mgbe anyị na-ekpebi ihe ndị anyị ga-eri na ihe ndị anyị ga-aṅụ, nakwa otú ha ga-aha.—1 Kọr. 6:12; 9:25.
7 Anyị na-egosi na obi dị anyị ụtọ maka ndụ Jehova nyere anyị ma anyị na-echebara ihe echiche nke ọma. (Ọma 119:99, 100; gụọ Ilu 2:11.) Dị ka ihe atụ, anyị kwesịrị ịkpachara anya n’ihe ndị anyị na-eri. Ọ bụrụ na e nwere nri na-amasị anyị, mana ya abụrụ na ọ na-akpatara anyị ọrịa, anyị ekwesịghị iche ka mmadụ gwa anyị ka anyị kwụsị iri nri ahụ. Anyị na-egosikwa na anyị ma ihe ma ọ bụrụ na anyị ana-ehi ụra nke ọma, na-emega ahụ́ mgbe niile, na-edewekwa onwe anyị na ụlọ anyị ọcha.
“Na-emenụ Ihe Chineke Kwuru”
2 Ebe anyị bụ ndị na-efe Jehova, anyị na-enwe obi ụtọ. N’ihi gịnị? E nwere ọtụtụ ihe mere anyị ji enwe obi ụtọ. Ma otu n’ime ha anyị na-ekwesịghị ichefu bụ na anyị na-agụ Okwu Chineke mgbe niile, na-agbalịkwa ime ihe anyị mụtara.—Gụọ Jems 1:22-25.
3 E nwere ọtụtụ uru ‘ime ihe Chineke kwuru’ na-abara anyị. Nke mbụ bụ na ọ bụ otu ụzọ dị mkpa anyị si eme Jehova obi ụtọ. Ọ na-emekwa anyịnwa obi ụtọ. (Ekli. 12:13) Ọ bụrụ na anyị na-eme ihe ndị anyị na-amụta n’Okwu Chineke, ezinụlọ anyị ga na-enwekwu obi ụtọ, anyị na ụmụnna anyị ana-adịkwu ná mma. O nwere ike ịbụ na ihe a na-eme ná ndụ gị. Ihe ọzọ bụ na anyị anaghị enwe ọtụtụ nsogbu na-abịara ndị na-anaghị erubere Jehova isi. N’eziokwu, anyị kwetara ihe Eze Devid kwuru. N’abụ ọ bụrụ, mgbe o kwuchara banyere iwu Chineke, ntụziaka ya, na ihe ndị o kpebiri, ọ sịziri: “Onye na-edebe ha na-enweta ụgwọ ọrụ buru ibu.”—Ọma 19:7-11.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it “Mmụọ Nsọ Mere” ¶10
Mmụọ Nsọ Mere
Ma, e nwere ihe ndị na-egosi na ụmụ nwoke ndị Chineke mere ka ha soro dee Akwụkwọ Nsọ edeghị ya ka ndị a na-akpọpụtara okwu akpọpụta, ha ana-ede ya. Baịbụl kwuru gbasara Mkpughe “Chineke kpugheere” Jọn onyeozi. Ọ sịrị na ọ bụ mmụọ ozi ka e zigara, ya ejiri “ihe ndị nwere ihe ha nọchiri anya ha” gosi ha Jọn. O kwuziri na Jọn “gbara àmà banyere ihe niile ọ hụrụ, ya bụ, ihe Chineke na Jizọs Kraịst kwuru.” (Mkpu. 1:1, 2) Ọ bụ “mmụọ nsọ mere [na Grik, “na mmụọ”]” ka Jọn “nọrọ n’ụbọchị Onyenwe anyị,” a gwazie ya, sị: “Were akwụkwọ mpịakọta dee ihe ị na-ahụ.” (Mkpu. 1:10, 11) N’ihi ya, ọ ga-abụ na Chineke ma na ọ dị mma ka ọ hapụ ndị so dee Baịbụl ka ha jiri ike iche echiche ha họrọ okwu ndị ha ga-eji akọwa ihe ndị ha hụrụ n’ọhụụ. (Hab. 2:2) Ma, Jehova nọkwa na-eduzi ha n’oge niile ahụ ka ihe ha na-ede bụrụ eziokwu a na-etinyeghị nnu na ose ma dabakwa n’uche ya. (Ilu 30:5, 6) Ihe e dere n’Ekliziastis 12:9, 10, gosiri na onye nke ọ bụla n’ime ndị so dee Baịbụl gbakwara mbọ nke ya. Ebe ahụ kwuru na otu n’ime ha chere echiche, leba ihe dị iche iche anya, ma hazie okwu ya ahazie ka ha bụrụ “okwu ndị dị ụtọ” na “ndị e ji n’aka na ha bụ eziokwu.”—I nwere ike ịtụle Luk 1:1-4.