Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
© 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
NỌVEMBA 3-9
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ABỤ SOLOMỌN 1-2
Akụkọ Nke Na-egosi Ezigbo Ịhụnanya
Ịhụnanya Ò Nwere Ike Ịdịgide?
9 Taa, di na nwunye na-efe Jehova kwesịrị ịghọta na alụmdi na nwunye apụtaghị naanị na nwoke na nwaanyị kwekọrịtara na ha ga-ebi. Onye nke ọ bụla kwesịrị ịhụ ibe ya n’anya, meekwa ka ọ mata na ya hụrụ ya n’anya. Olee ụdị ịhụnanya a na-ekwu okwu ya ebe a? Ọ̀ bụ ụdị ịhụnanya ahụ Baịbụl kwuru ka anyị na-egosi mmadụ niile? (1 Jọn 4:8) Ka ọ̀ bụ ụdị ịhụnanya anyị na-egosi ndị ezinụlọ anyị? Ka ịhụnanya ahụ ọ̀ bụ adịm ná mma enyi na enyi? (Jọn 11:3) Ọ̀ bụ ịhụnanya nwoke na nwaanyị? (Ilu 5:15-20) Nke bụ́ eziokwu bụ na di na nwunye kwesịrị inwe ụdị ịhụnanya a niile iji gosi na ịhụnanya ha bụ nke ezigbo ya. I nwere ike isi n’okwu gị nakwa n’omume gị mee ka di gị ma ọ bụ nwunye gị mata na ị hụrụ ya n’anya, obi ana-adịkwa unu abụọ ụtọ. I kwesịrị ịna-eme otú ahụ, ọ bụrụgodị na ị naghị enwe efe. N’obodo ụfọdụ, ọ bụ ndị ọzọ na-ahọtara mmadụ onye ọ ga-alụ. O nwere ike ime ka mmadụ lụọ onye ọ na-amaghị. Ọ bụrụ na mmadụ abụọ si otú ahụ lụọ, ha ga-eji nwayọọ nwayọọ na-amata ibe ha ma na-ahụkwu ibe ha n’anya. Onye nke ọ bụla kwesịrị ịna-agwa ibe ya na ya hụrụ ya n’anya. Ọ ga-eme ka ha na-adịkwu ná mma, na-ebikwa n’udo.
10 Ọ bụrụ na di na nwunye na-eme ihe gosiri na ha hụrụ ibe ha n’anya, o nwere uru ọzọ ọ na-aba. N’abụ ahụ Eze Sọlọmọn bụrụ, ọ gwara nwa agbọghọ ahụ, sị: “Anyị ga-eji ọlaedo rụọrọ gị ihe a na-ekpu n’isi, tinyere ihe ịchọ mma ọlaọcha.” O toro nwa agbọghọ ahụ, gwa ya na ọ ‘mara mma dị ka ọnwa gbazuru agbazu, dịkwa ọcha dị ka anyanwụ.’ (Abụ Sọlọ. 1:9-11; 6:10) Ma, ihe ahụ Sọlọmọn kwuru emeghị ka obi nwa agbọghọ ahụ pụọ n’ebe nwa okorobịa ahụ ọ hụrụ n’anya nọ. Gịnị kasiri ya obi, meekwa ka obi ya ghara ịpụ n’ebe nwa okorobịa ahụ nọ n’oge ahụ ha abụọ na-anọghị? Ihe o kwuru zara ajụjụ a. (Gụọ Abụ Sọlọmọn 1:2, 3.) O chetara otú obi si adị ya ụtọ ma nwa okorobịa ahụ gwa ya ihe gosiri na ọ hụrụ ya n’anya. Ihe ọ na-agwa ya na-atọ ya ụtọ “karịa mmanya” nke na-eme ka obi mmadụ ṅụrịa ọṅụ. Ọ bụ ihe kasiri ya obi mgbe ọ nọ n’obí eze. Ọ na-adị ya ka à wụsara ya ‘mmanụ na-esi ísì ụtọ’ n’isi. (Ọma 23:5; 104:15) Di na nwunye kwesịrị ịna-egosi mgbe niile na ha hụrụ ibe ha n’anya n’ihi na ọ ga-eme ka ịhụnanya ha sikwuo ike. Mgbe ọ bụla ha chetara ya, ọ ga-enyere ha aka ka ịhụnanya ha ghara ịnyụ ka ọkụ.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Ịhụnanya Ò Nwere Ike Ịdịgide?
11 Abụ Sọlọmọn na-akụzikwara Ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ezigbo ihe, nke ka nke, ndị na-achọ onye ha ga-alụ. Nwa agbọghọ ahụ ahụghị Sọlọmọn n’anya. Ọ gwasiri ụmụ nwaanyị Jeruselem ike ka ha ‘ghara ịkpọte ịhụnanya dị n’ime ya ma ọ bụ kpalie ya ruo mgbe ọ chọrọ.’ (Abụ Sọlọ. 2:7; 3:5) N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ bụghị onye ọ bụla mmadụ hụrụ ka ọ ga-ekwe ka o rie ya obi. N’ihi ya, ọ bụrụ na Onye Kraịst chọrọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye, o kwesịrị ichere ruo mgbe ọ ga-ahụ onye ọ hụrụ n’anya n’eziokwu.
NỌVEMBA 10-16
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ABỤ SOLOMỌN 3-5
gwà Ọma Bara Uru
Ịhụnanya Ò Nwere Ike Ịdịgide?
8 Onye nke ọ bụla toro ibe ya maka mma ọ mara. Ma, ha ekwughị naanị gbasara mma elu ahụ́. Dị ka ihe atụ, otú nke nwaanyị si agwa ndị ọzọ okwu tọgburu nke nwoke atọgbu. (Gụọ Abụ Sọlọmọn 4:7, 11.) O kwukwara na ‘ihe si n’egbugbere ọnụ ya na-atasị bụ mmanụ aṅụ nke si n’ụgbụgbọ ya.’ N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na mmanụ aṅụ nke si n’ụgbụgbọ ya na-atọ ụtọ, dịkwa mma karịa mmanụ aṅụ e tinyere n’ebe ọzọ. Ihe ọzọ o kwuru bụ na ‘mmanụ aṅụ na mmiri ara ehi dị n’okpuru ire nwa agbọghọ ahụ.’ Ihe a o kwuru pụtara na okwu na-esi ya n’ọnụ apụta na-atọ ụtọ ná ntị ma bụrụ okwu ọma. E nwere ike iji ya tụnyere mmanụ aṅụ na mmiri ara ehi. N’ihi ya, mgbe nwa okorobịa ahụ na-azụ atụrụ gwara nwa agbọghọ ahụ, sị, “Ị mara ezigbo mma, . . . i nweghị ntụpọ,” ihe ọ na-ekwu gbasara ya abụghị naanị mma elu ahụ́ nwa agbọghọ ahụ mara.
Ụzọ Chineke Si Ele Ịdị Ọcha n’Omume Anya
17 Onye nke atọ guzosiri ike n’ezi ihe bụ nwa agbọghọ Shunem. N’ịbụ nwa agbọghọ mara mma, ọ bụghị nanị nwa okoro bụ́ onye ọzụzụ atụrụ nwere mmetụta ịhụnanya n’ebe ọ nọ kamakwa eze Israel bara ọgaranya, bụ́ Solomọn. N’akụkọ ọma ahụ nile a kọrọ n’Abụ nke Abụ, nwa agbọghọ Shunem ahụ dịgidere ọcha, si otú a mee ka ndị gbara ya gburugburu na-akwanyere ya ùgwù. Ọ bụ ezie na ọ jụrụ Solomọn, e nyere Solomon ike mmụọ nsọ ide akụkọ banyere ya. Onye ọzụzụ atụrụ ahụ ọ hụrụ n’anya kwanyekwaara omume ya dị ọcha ùgwù. N’otu oge, o kwuru n’obi ya na nwa agbọghọ Shunem ahụ dị ka “ubi a gbara ogige nke a kpachiri akpachi.” (Abụ nke Abụ 4:12) N’Israel oge ochie, ubi ndị mara mma na-enwe akwụkwọ nri, okooko osisi ndị na-esi ísì ụtọ, na osisi ndị gbara agba, n’ụdị dịgasị iche ma maa mma. A na-ejikarị osisi ma ọ bụ mgbidi agba ubi ndị dị otú ahụ ogige, ọ bụkwa nanị n’ọnụ ụzọ ámá a na-agbachi agbachi ka a pụrụ isi banye na ya. (Aịsaịa 5:5) Nye onye ọzụzụ atụrụ ahụ, ịdị ọcha nke omume na ịma mma nke nwa agbọghọ Shunem ahụ dị ka ubi mara mma dị otú ahụ bụ́ nke dị ụkọ. Ọ dị nnọọ ọcha n’ụzọ nile. Ọ bụ nanị nwoke ga-alụ ya ka ọ ga-egosi mmetụta ịhụnanya ya.
Ụdị Mma Kasị Mkpa
Àgwà ọma ọ̀ pụrụ ime ka ndị ọzọ bụrụ ndị a dọọrọ mmasị ha? Georgina, bụ́ onye ọ fọrọ nke nta ka o ruo afọ iri ọ lụrụ di, na-ekwu, sị: “Kemgbe afọ nile ahụ, enwewo m mmasị dị ukwuu n’ebe di m nọ n’ihi ime ihe n’eziokwu ya na ezi obi o ji emeso m ihe. Ihe kasị mkpa ná ndụ ya bụ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ. Nke a emewo ka ọ bụrụ onye na-echebara ndị ọzọ echiche na onye na-ahụ n’anya. Ọ na-ebu ọdịmma m n’uche eme mkpebi, ọ na-emekwa ka m nwee mmetụta nke ịbụ onye e ji kpọrọ ihe. Amaara m na ọ hụrụ m n’anya n’ezie.”
Daniel, bụ́ onye lụrụ nwanyị n’afọ 1987, na-ekwu, sị: “Nwunye m mara mma n’anya m. Ọ bụghị nanị na ọdịdị ya dọtara m n’ebe ọ nọ kamakwa àgwà ya kadị mee ka m hụ ya n’anya. Ọ na-echebakarịrị ndị ọzọ echiche ma na-enwe mmasị n’ime ka obi dị ha mma. O nwere àgwà ọma ndị e ji mara Onye Kraịst. Nke a emewo ka mụ na ya ịnọ na-enye m obi ụtọ.”
N’ụwa a nke na-ele ihe anya elu elu, ọ dị anyị mkpa ileru ihe anya nke ọma. Ọ dị anyị mkpa ịghọta na inweta ọdịdị ahụ́ bụ́ “ịgba” bụ ihe tara akpụ—ma ọ bụrụkwarị na ọ ga-ekwe omume—uru ya anaghịkwa adịte aka. Ma, ịzụlite àgwà ọma bụ ihe kwere omume. Bible na-ekwu, sị: “Amara bụ ụgha, ịma mma bụkwa ihe efu: ma nwanyị nke na-atụ egwu Jehova, nwanyị ahụ ga-enwe otuto.” N’ụzọ dị iche na nke a, Akwụkwọ Nsọ na-adọ aka ná ntị, sị: “Dị ka mgbaaka ọlaedo n’imi ezì, otú a ka nwanyị mara mma nke na-esi n’ezi uche wezụga onwe ya dị.”—Ilu 11:22; 31:30.
Okwu Chineke na-enyere anyị aka iji “mmadụ zoro ezo nke obi n’uwe na-apụghị ire ure bụ́ mmụọ dị jụụ na nke dị nwayọọ, bụ́ nke bara oké uru n’anya Chineke,” kpọrọ oké ihe. (1 Pita 3:4) N’eziokwu, àgwà ọma dị otú ahụ dị nnọọ mkpa karịa mma nkịtị. Ọ bụkwa ihe aka mmadụ nile ga-eru.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Isi Ihe Ndị Sitere n’Abụ nke Abụ
2:7; 3:5—N’ihi gịnị ka e ji jiri “nne mgbada [na] nne ele ọhịa” gbaa ụmụ agbọghọ na-arụ n’obí eze iyi? A ma mgbada na ele ọhịa ama maka ịma mma ha. Anyị pụrụ ikwu na nwa agbọghọ Shulam ahụ ji ihe ọ bụla mara mma gbaa ụmụ agbọghọ ahụ na-arụ n’obí eze iyi ka ha ghara ime ka ịhụnanya teta n’ime ya.
NỌVEMBA 17-23
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ABỤ SOLOMỌN 6-8
Bụrụ Mgbidi, Ọ Bụghị Ibo Ụzọ
it “Abụ Solomọn” ¶11
Abụ Solomọn
Ọ ga-abụ na Solomọn hapụziri nwa agbọghọ Shulem ka ọ lawa n’ụlọ ha. Mgbe ụmụnne ya ndị nwoke hụrụ ka ọ na-alọta, ha jụrụ, sị: “Ònye bụ onye a nke si n’ala ịkpa na-abịa, nke konyere onye ọ hụrụ n’anya aka?” (Abụ Solo. 8:5) Ụmụnne ya ndị nwoke amatabeghị na e nwere otu onye nwanne ha nwaanyị hụrụ n’anya, bụ́ onye o kpebisiri ike na ọ gaghị ahapụ. Ọtụtụ afọ tupu mgbe ahụ, otu n’ime ụmụnne ya ndị nwoke kwuru gbasara ya, sị: “Anyị nwere obere nwanne nwaanyị. Ọ kpụbeghị ara. Gịnị ka anyị ga-emere nwanne anyị nwaanyị n’ụbọchị a ga-ekwu okwu ya?” (Abụ Solo. 8:8) Nwanne ya nwoke ọzọ zara, sị: “Ọ bụrụ na ọ bụ mgbidi, anyị ga-eji ọlaọcha chọọ elu ya mma. Ma, ọ bụrụ na ọ bụ ibo ụzọ, anyị ga-eji ibé osisi sida tụbichie ya.” (Abụ Solo. 8:9) Ma, ebe ọ bụ na nwa agbọghọ Shulem ekweghị ka a rata ya maka na ubi vaịn nke ya zuuru ya, ebe ọ bụkwa na o kweghị ka ihe ọ bụla mee ka ọ hapụ nwa okorobịa ọ hụrụ n’anya (Abụ Solo. 8:6, 7, 11, 12), o ji obi ike kwuo, sị: “Abụ m mgbidi, ara m dịkwa ka ụlọ elu. N’ihi ya, n’anya ya, abụ m onye obi ruru ala.”—Abụ Solo. 8:10.
yp 188 ¶2
Ọ̀ Dị Mma Mmadụ Inwe Mmekọahụ Tupu Ya Alụọ Di Ma Ọ Bụ Nwunye?
Ma, ọ bụrụ na onye na-eto eto edebe onwe ya ọcha, ọ na-ezere ọtụtụ nsogbu. Baịbụl gwara anyị gbasara otu nwa agbọghọ debere onwe ya ọcha n’agbanyeghị na ọ hụrụ enyi ya nwoke n’anya nke ukwuu. Ọ bụ ya mere o ji jiri obi ike kwuo, sị: “Abụ m mgbidi, ara m dịkwa ka ụlọ elu.” Ọ dịghị ka “ibo ụzọ” nke nwere ike imepere omume rụrụ arụ ụzọ ma ọnwụnwa bịaara ya. Kama, ọ kwụ chịm ka nnukwu mgbidi ụlọ a rụsiri ike nke mmadụ na-enweghị ike ịwụfe awụfe. O ruru eru ka a kpọọ ya “onye na-enweghị ntụpọ,” o nwekwara ike ikwu gbasara nwa okorobịa chọrọ ịlụ ya, sị, “N’anya ya, abụ m onye obi ruru ala.” Otú a obi si ruo ya ala mekwara ka obi dị ha abụọ ụtọ.—Abụ Solo. 6:9, 10; 8:9, 10.
yp2 33
Onye M Ga-eṅomi—Nwa Agbọghọ Shulem
Nwa agbọghọ Shulem ma na ya kwesịrị ịkpachara anya n’ihe banyere ịhụnanya nwoke na nwaanyị. Ọ sịrị ndị enyi ya: “Emewo m ka unu ṅụọ iyi na unu agaghị akpọte ịhụnanya dị n’ime m ma ọ bụ kpalie ya ruo mgbe ọ chọrọ.” Nwa agbọghọ Shulem ma na ịhụnanya nwere ike ịkpaghasị ya ụbụrụ. Dị ka ihe atụ, ọ ghọtara na ndị ọzọ nwere ike inyewe ya nsogbu ka o kweta ịlụ onye ihe na-agaghị adabara ya na ya. Ọbụna otú ọ dị ya n’obi nwere ike ime ka o mee ihe na-ekwesịghị ekwesị. Ọ bụ ya mere nwa agbọghọ Shulem ji guzosie ike dị ka “mgbidi.”—Abụ Sọlọmọn 8:4, 10.
Otú i si ele ịhụnanya anya ò gosiri na ị ma ihe dị ka nwa agbọghọ Shulem? Ị̀ ga-ekwe ka ezi uche duzie gị kama ime naanị ihe dị gị n’obi? (Ilu 2:10, 11) Mgbe ụfọdụ, ndị ọzọ nwere ike inyewe gị nsogbu ka gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị kpawa mgbe ị na-achọbeghị ime otú ahụ. I nwedịrị ike iji aka gị kpatara onwe gị nsogbu ahụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị hụ nwa okoro na nwa agbọghọ jidere aka na-aga n’ụzọ, ọ̀ na-agụsi gị ike ka i nwee onye gị na ya ga na-eme otú ahụ? Ị̀ ga-ekweta ka gị na onye na-ekweghị ekwe kpawa? Nwa agbọghọ Shulem tozuru okè n’ihe banyere ịhụnanya nwoke na nwaanyị. I nwere ike ime otú ahụ!
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Ịhụnanya Ò Nwere Ike Ịdịgide?
3 Gụọ Abụ Sọlọmọn 8:6. N’ebe a, Baịbụl kwuru na ịhụnanya yiri “ire ọkụ nke Jaa.” N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na àgwà kachanụ Jehova nwere bụ ịhụnanya. O kere anyị n’oyiyi ya ka anyị nwee ike ịmụta ịhụnanya ya. (Jen. 1:26, 27) Mgbe Jehova kechara nwoke mbụ bụ́ Adam, o kere ọmarịcha nwaanyị ma kpọrọ ya kpọnye Adam. Mgbe Adam hụrụ Iv, obi tọrọ ya ezigbo ụtọ. Ọ bụ ya mere o ji kwuo otú obi dị ya. Obi ruru Iv ala mgbe ya na di ya nọ. A sị ka e kwuwe, Jehova ji ọgịrịga Adam kee Iv. (Jen. 2:21-23) Ebe ọ bụ na Jehova kere ụmụ mmadụ ma mee ka ha nwee ike ịhụ ibe ha n’anya, nwoke na nwaanyị ga-ahụli ibe ha n’anya n’eziokwu, ịhụnanya ha adịgidekwa.
NỌVEMBA 24-30
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE AỊZAYA 1-2
“Ndị Mmehie Na-anyịgbu” Nwere Olileanya
Otu Nna na Ụmụ Ya Na-enupụ Isi
8 Aịsaịa gara n’ihu n’ozi ya site n’ịgwa mba Juda okwu ndị siri ike: “Ahụhụ ga-adịrị mba mmehie, ndị ajọ omume na-anyịgbu, mkpụrụ nke bụ ndị na-eme ihe ọjọọ, ụmụ nke na-ebibi onwe ha: ha ahapụwo Jehova, ha elelịwo Onye Nsọ nke Israel, ha aghọwo ndị ala ọzọ, laghachi azụ.” (Aịsaịa 1:4) A pụrụ ịnọ na-eme ajọ omume ruo n’ókè nke na ha ga-eyi ibu dị oké arọ. N’oge Abraham, Jehova kọwara mmehie Sọdọm na Gọmọra dị ka nke “dị arọ nke ukwuu.” (Jenesis 18:20) Ihe yiri nke ahụ apụtawo ìhè ugbu a n’etiti ndị Juda, n’ihi na Aịsaịa na-ekwu na “ajọ omume na-anyịgbu” ha. Tụkwasị na nke ahụ, ọ kpọrọ ha “mkpụrụ nke bụ ndị na-eme ihe ọjọọ, ụmụ nke na-ebibi onwe ha.” Ee, ndị Juda yiri ụmụaka isi ike. Ha ‘alaghachiwo azụ,’ ma ọ bụ dị ka New Revised Standard Version si tinye ya, ha “akpafuwo kpam kpam” site n’ebe Nna ha nọ.
“Ka Anyị Dozie Okwu”
15 Olu Jehova ji kwuo okwu dịwanyere ọbụna nwayọọ ma gosikwuo ọmịiko ugbu a. “Bịanụ, ka anyị [dozie okwu n’etiti anyị, NW], bụ ihe Jehova na-asị: ọ bụrụ na mmehie unu adị ka uwe uhie, ọ bụ dị ka snow ka ha ga-adị ọcha; ọ bụrụ na ha achaa uhie uhie dị ka ogho uhie, ọ bụ dị ka ajị́ ọcha ka ha ga-adị.” (Aịsaịa 1:18) A na-aghọtahiekarị ọkpụkpọ òkù ahụ e ji malite amaokwu a mara mma. Dị ka ihe atụ, Igbo Bible nke Union Version na-ekwu, sị, “Ka anyị rụrịta ụka”—dị ka à ga-asị na ma ya ma ha aghaghị ikweta ịhapụ ihe ụfọdụ iji kwekọrịta. Ọ bụghị otú ahụ! A pụghị ịta Jehova ụta ma ọlị, ma ya fọdụzie ná mmeso o mesoro ndị a na-enupụ isi, ndị dị ihu abụọ. (Deuterọnọmi 32:4, 5) Amaokwu ahụ adịghị ekwu banyere mkparịta ụka dị n’agbata mmadụ abụọ ha nhata, kama banyere nnọkọ ime udo. O yiri ka à ga-asị na Jehova na-ama Israel aka ịbịa ka e kpee ya n’ụlọikpe.
16 Nke ahụ pụrụ ịbụ echiche na-emenye ụjọ, ma Jehova bụ Onyeikpe kasị dị ebere ma nwee ọmịiko. Ókè ọ na-agbagharu mmehie enweghị oyiri. (Abụ Ọma 86:5) Nanị ya pụrụ iwere mmehie ndị Israel ndị dị ka “uwe uhie” ma sụchaa ha, mee ka ha dị ‘ọcha dị ka snow.’ Ọ dịghị mgbalị mmadụ, ọ dịghị ụdị ọrụ okpukpe ọ bụla, àjà, ma ọ bụ ekpere nke pụrụ ihichapụ ntụpọ nke mmehie. Ọ bụ nanị mgbaghara Jehova pụrụ ịsapụ mmehie. Chineke na-agbaghara mmehie otú ahụ dabere n’ihe ndị o kwuru, bụ́ ndị gụnyere ezi nchegharị, nke si n’ala ala obi.
17 Eziokwu a dị oké mkpa nke na Jehova kwughachiri ya n’ụdị uri—mmehie ndị dị ka “ogho uhie” ga-adị ka ajị́ ọcha ọhụrụ, nke a na-etejighị eteji. Jehova chọrọ ka anyị mara na ya bụ Onye Na-agbaghara mmehie n’ezie, ọbụna ndị dị oké njọ, ma ọ bụrụhaala na ọ hụ na anyị echegharịwo n’ezie. Ọ dị mma ka ndị ọ na-esiri ike ikweta na nke a bụ eziokwu banyere ha tụlee ihe atụ ndị dị ka nke Manase. O mere mmehie ndị jọgburu onwe ha—ruo ọtụtụ afọ. Ma, o chegharịrị, a gbaghakwaara ya. (2 Ihe E Mere 33:9-16) Jehova chọrọ ka anyị nile, gụnyere ndị meworo mmehie ndị dị oké njọ, mara na oge agafebeghị ka anyị na ya “dozie okwu.”
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
E Bulie Ụlọ Jehova Elu
9 Otú ọ dị, taa, ndị Chineke adịghị ezukọta n’ugwu nkịtị nke nwere ụlọ nsọ e ji okwute wuo. Ndị agha Rom bibiri ụlọ nsọ Jehova dị na Jerusalem na 70 O.A. E wezụga nke ahụ, Pọl onyeozi mere ka o doo anya na ụlọ nsọ ahụ dị na Jerusalem na ụlọikwuu dị tupu nke ahụ bụcha onyinyo. Ha nọchitere anya ihe ka ukwuu ga-ewere ọnọdụ n’ụzọ ime mmụọ, ‘ezi ụlọikwuu ahụ, nke Onyenwe anyị mara, ọ bụghị mmadụ.’ (Ndị Hibru 8:2) Ụlọikwuu ime mmụọ ahụ bụ ndokwa maka ịbịakwute Jehova n’ofufe na-adabere n’àjà mgbapụta Jisọs Kraịst. (Ndị Hibru 9:2-10, 23) N’ikwekọ na nke a, “ugwu nke ụlọ Jehova” nke e hotara n’Aịsaịa 2:2 na-anọchite anya ofufe dị ọcha e buliri elu nke Jehova n’oge anyị. Ndị na-anakwere ofufe dị ọcha adịghị ezukọta n’otu ebe ọ bụla; ha na-ezukọta n’ịdị n’otu nke ofufe.
DISEMBA 1-7
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE AỊZAYA 3-5
Jehova Chọrọ Ka Ndị Ya Na-erubere Ya Isi, O Rukwara Eru Ka E Rubere Isi
Ahụhụ Ga-adịrị Ubi Vine ahụ Na-ekwesịghị Ntụkwasị Obi!
3 Ma Aịsaịa ọ̀ gụpụtara ilu a n’ihu ndị na-ege ya ntị ma ọ bụ na ọ gụpụtaghị ya, ọ dọọrọ mmasị ha n’ezie. Ma eleghị anya ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha maara ihe banyere ọrụ ịkụ ubi vine, nkọwa Aịsaịa dokwara anya ma bụrụ ihe na-eme eme n’ezie. Dị nnọọ ka ndị na-akụ vine taa, onye nwe ubi vine ahụ kụrụ, ọ bụghị mkpụrụ vine, kama “osisi vine kachasị mma,” ma ọ bụ nke dị oké ọnụ ahịa—ogwe ma ọ bụ ome si na vine ọzọ. N’ụzọ kwesịrị ekwesị, ọ kụrụ ubi vine a “n’ugwu nta nke bụ́ ezi ókèala,” ebe ubi vine ga-eme nke ọma.
4 Ọ na-achọ ịrụsi ọrụ ike iji mee ka ubi vine mepụta ihe. Aịsaịa na-akọwa ogwugwu nke onye nwe ya ‘gwuru ala ahụ, tụtụpụ nkume ya nile’—ọrụ siri ike, nke na-agwụ ike! Ma eleghị anya o ji nkume ndị buru ibu karị “wuo ụlọ elu.” N’oge ochie, ụlọ elu ndị dị otú ahụ na-abụ ebe ndị nche na-anọ bụ́ ndị na-eche ihe a kụrụ n’ubi nche maka ndị ohi na ụmụ anụmanụ. Ọzọkwa, o jiri nkume wuo mgbidi gburugburu ókèala ubi vine ahụ. (Aịsaịa 5:5) A na-emekarị nke a iji mee ka mmiri ghara ịsachapụ elu ala ahụ dị oké mkpa.
5 Ebe ọ rụsiworo ọrụ ike otú a ichebe ubi vine ya, o kwesịrị nnọọ ekwesị na onye ahụ nwe ya ga-atụ anya na ọ ga-amị mkpụrụ. N’ịtụ anya nke a, ọ wapụtara ebe ịnara mmanya vine. Ma ò nwetara ihe ubi ahụ ọ tụrụ anya ya? Ee e, ubi vine ahụ mịrị mkpụrụ vine ọhịa.
Ahụhụ Ga-adịrị Ubi Vine ahụ Na-ekwesịghị Ntụkwasị Obi!
8 Aịsaịa kpọrọ Jehova, bụ́ onye nwe ubi vine ahụ, “onye ihe ya na-atọ m ụtọ.” (Aịsaịa 5:1) Aịsaịa pụrụ ikwu okwu banyere Chineke n’ụzọ ịhụnanya dị otú ahụ nanị n’ihi na ya na Ya nwere mmekọrịta chiri anya. (Tụlee Job 29:4; Abụ Ọma 25:14.) Otú ọ dị, ịhụnanya onye amụma ahụ nwere n’ebe Chineke nọ abụghị ihe ọ bụla ma e jiri ya tụnyere ịhụnanya Chineke gosiworo maka “ubi vine” ya—mba ọ ‘kụrụ.’—Tụlee Ọpụpụ 15:17; Abụ Ọma 80:8, 9.
9 Jehova “kụrụ” mba ya n’ala Kenean, nyekwa ha iwu ya, bụ́ nke rụrụ ọrụ dị ka mgbidi iji chebe ha pụọ n’ịbụ ndị mba ndị ọzọ merụrụ. (Ọpụpụ 19:5, 6; Abụ Ọma 147:19, 20; Ndị Efesọs 2:14) Ọzọkwa, Jehova nyere ha ndị ikpe, ndị nchụàjà, na ndị amụma izi ha ihe. (2 Ndị Eze 17:13; Malakaị 2:7; Ọrụ 13:20) Mgbe ndị agha yiri egwu ịwakpo Israel, Jehova mere ka e nwee ndị mgbapụta. (Ndị Hibru 11:32, 33) O nwere ihe kpatara Jehova ji na-ajụ, sị: “Gịnị ka a ga-eme ubi vine nke m ọzọ, nke m na-emeghị n’ime ya?”
“Letakwa Osisi Vaịn A”!
Aịzaịa ji “ụlọ Izrel” tụnyere ubi vaịn nke jiri nwayọọ nwayọọ malite ịmị “mkpụrụ vaịn ọhịa,” ma ọ bụ mkpụrụ vaịn rere ure. (Aịsaịa 5:2, 7) Mkpụrụ vaịn ọhịa na-adị nnọọ obere karịa nke vaịn a kụrụ akụ, uru ya na-adị ntakịrị, mkpụrụ dị n’ime ya na-ebukwa ibu. Vaịn ọhịa abaghị uru maka iji mee mmanya na ịra ya ara—nke ahụ bụ ihe dabara adaba e kwesịrị iji mee ihe atụ nke mba si n’ezi ofufe dapụ bụ́ ndị mkpụrụ ha na-amị bụ mmebi iwu kama ịbụ ezi omume. Mkpụrụ a na-abaghị uru nke vaịn a na-amị esighị Onye kụrụ ya n’aka. Jehova emewo ihe nile o nwere ike ime iji hụ na mba ahụ mịrị mkpụrụ. Ọ jụrụ, sị: “Gịnị ka a ga-eme ubi vaịn nke m ọzọ, nke m na-emeghị n’ime ya?”—Aịsaịa 5:4.
“Letakwa Osisi Vaịn A”!
Ebe ọ bụ na osisi vaịn nke bụ́ Izrel amịghị mkpụrụ, Jehova dọrọ ha aka ná ntị na ya ga-akwatu mgbidi ya wuru gburugburu ndị ya bụ́ nke na-echebe ha. Ọ gaghịzi na-akwachasị ubi ihe atụ ya ma ọ bụ na-abọ ya ahịhịa. Mmiri ozuzo ikpeazụ nke ga-eme ka ihe ọkụkụ ahụ mee nke ọma agaghị ezo, ahịhịa na ogwu ga-etojukwa ubi vaịn ahụ.—Aịsaịa 5:5, 6.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Ahụhụ Ga-adịrị Ubi Vine ahụ Na-ekwesịghị Ntụkwasị Obi!
18 N’Israel oge ochie ala nile bụ Jehova nwe ha kpam kpam. Ezinụlọ nke ọ bụla nwere ihe nketa nke Chineke nyere ya, nke ha pụrụ inye ná ngo ma ha apụghị ‘ire ya kpam kpam.’ (Levitikọs 25:23) Iwu a gbochiri iji ike eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, dị ka otu onye inwekọrọ ala na ụlọ nile. O chebekwara ezinụlọ dị iche iche pụọ n’ịda ogbenye ọnụ ntụ. Otú ọ dị, ụfọdụ ndị nọ na Juda ji anyaukwu na-emebi iwu Chineke n’ihe banyere ala. Maịka dere, sị: “Ha wee tụkwasị anyaukwu n’ubi, nara ha n’ike; ha tụkwasị anyaukwu n’ụlọ, buru ha: ha emegbuwokwa ma nwoke ma ụlọ ya, bụ́ onye ọ bụla na ala nketa ya.” (Maịka 2:2) Ma Ilu 20:21 na-adọ aka ná ntị, sị: “Ihe nketa nke a na-anara [n’anyaukwu, NW] na mbụ; a gaghị agọzikwa ikpeazụ ya.”
19 Jehova na-ekwe nkwa ịnapụ ndị a dị anyaukwu uru ndị ha nwetara n’ụzọ na-ezighị ezi. Ụlọ ndị ha pụnaara n’ike agaghị enwe “onye ọ bụla na-ebi n’ime ha.” Ala ndị ha na-enwere anyaukwu agaghị emepụta nri otú ha na-emepụtabu. E kwughị kpọmkwem otú na mgbe ọbụbụ ọnụ a ga-emezu. Ma eleghị anya ọ na-ezo aka, ma ọ dịghị ihe ọzọ n’otu akụkụ, n’ọnọdụ ndị ije biri n’ala ọzọ na Babilọn kpatara.—Aịsaịa 27:10.
DISEMBA 8-14
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE AỊZAYA 6-8
“Lee M, Ziga M”
Jehova Chineke Nọ n’Ụlọukwu Ya Dị Nsọ
13 Ka anyị soro Aịsaịa gee ntị. “M wee nụ olu Onyenwe anyị, ka ọ na-asị, Ònye ka M ga-eziga, ònye ga-ejekwara anyị? M wee sị, Lee m; ziga m.” (Aịsaịa 6:8) O doro anya na ajụjụ ahụ Jehova jụrụ bụ iji nweta azịza site n’ọnụ Aịsaịa, ebe ọ na-adịghị onye amụma ọzọ bụ́ mmadụ e kwuru maka ya n’ọhụụ ahụ. O doro anya na ọ bụ òkù a na-akpọ Aịsaịa ka ọ bụrụ onye ozi Jehova. Ma gịnị mere Jehova ji jụọ, sị, “Ònye ga-ejekwara anyị?” (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.) Site n’ịgbanwe ojiji o ji nnọchiaha na-egosi otu onye bụ́ “mụ” mee ihe gaa n’iji nnọchiaha na-egosi ọtụtụ ndị bụ́ “anyị” mee ihe, Jehova na-agụnyezi otu onye ọzọ ma ọ dịkarịa ala tinyere onwe ya? Ònye? Nke a ọ́ bụghị Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, onye mesịrị ghọọ nwoke ahụ bụ́ Jisọs Kraịst? N’ezie, ọ bụkwa Ọkpara a ka Chineke sịrị, “Ka anyị kpụọ mmadụ n’onyinyo anyị.” (Jenesis 1:26; Ilu 8:30, 31) Ee, Ọkpara ọ mụrụ nanị ya nọ n’akụkụ Jehova n’ogige eluigwe.—Jọn 1:14.
14 Aịsaịa egbughị oge n’ịzaghachi! N’agbanyeghị ihe ozi ahụ pụrụ ịbụ, ọ zara ozugbo, sị: “Lee m; ziga m.” Ọ jụwaghịkwa uru ọ ga-erite site n’ịnakwere ọrụ ahụ. Mmụọ ya nke ịdị njikere iwepụta onwe ya bụ ezi ihe nlereanya nye ndị ohu Chineke nile taa, bụ́ ndị e nyere ọrụ ikwusa ‘ozi ọma nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi.’ (Matiu 24:14) Dị ka Aịsaịa, ha ji ikwesị ntụkwasị obi na-anọgidesi ike n’ọrụ ha ma na-arụzu ọrụ ịgba “àmà nye mba nile,” n’agbanyeghị egeghị ntị zuru ebe nile. Ha jikwa obi ike na-aga n’ihu dị ka Aịsaịa mere, mara na ọ bụ onye kachasịnụ nyere ha ọrụ ahụ.
Jehova Chineke Nọ n’Ụlọukwu Ya Dị Nsọ
15 Jehova kọwapụtaziri ihe Aịsaịa ga-ekwu nakwa otú a ga-esi meghachi omume: “Jee, sị ndị nke a, Na-anụnụ, ma unu aghọtala; na-ahụnụ, ma unu amatala. Mee ka obi ndị nke a maa abụba, meekwa ka ntị ha dị arọ, techiekwa anya ha; ka ha ghara iwere anya ha hụ ụzọ, gharakwa iwere ntị ha nụ ihe, gharakwa iwere obi ha ghọta, gharakwa ichigharị, ka a gharakwa ime ka ahụ dị ha ike.” (Aịsaịa 6:9, 10) Nke a ọ̀ pụtara na Aịsaịa ga-agwa ha okwu n’ejighị akọ ma ọ bụ n’ụzọ enweghị mmetụta, na-achụkwa ndị Juu ahụ achụ, na-eme ka ha na Jehova ghara ịdị ná mma? Ọ dịghị ma ọlị! Ndị a bụ ndị obodo Aịsaịa bụ́ ndị o weere dị ka ụmụnne ya. Ma ihe ndị Jehova kwuru na-egosi otú ndị ahụ ga-esi meghachi omume n’ozi ya, n’agbanyeghị otú Aịsaịa jiruru ikwesị ntụkwasị obi rụọ ọrụ ya.
16 Ọ bụ ndị ahụ ka ụta dịịrị. Aịsaịa ga-agwa ha okwu “ugboro ugboro,” ma ha agaghị anakwere ozi ahụ ma ọ bụ ghọta ya. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ga-ekwesi olu ike ma jụ ige ntị, dị ka à ga-asị na ha kpuru ìsì, bụrụkwa ndị ntị chiri kpam kpam. Site n’ịgakwuru ha ugboro ugboro, Aịsaịa ga-enye “ndị nke a” ohere igosi na ha achọghị ịghọta ihe. Ha ga-egosipụta na ha na-emechi uche na obi ha n’ozi Aịsaịa—ozi Chineke—na-ezi ha. Lee ka nke a si bụrụ eziokwu banyere ndị mmadụ taa! Ọtụtụ n’ime ha na-ajụ ige Ndịàmà Jehova ntị mgbe ha na-ekwusa ozi ọma banyere Alaeze Chineke nke na-abịanụ.
Jehova Chineke Nọ n’Ụlọukwu Ya Dị Nsọ
23 N’ihota ihe e kwuru n’Aịsaịa, Jisọs na-egosi na amụma ahụ mezuru n’oge ya. Ndị ahụ n’ozuzu ha nwere obi yiri nke ndị Juu nọ n’oge Aịsaịa. Ha mere onwe ha ka ha kpuo ìsì nakwa ka ntị ha kpọchie akpọchie n’ebe ozi ya dị, n’otu aka ahụ, e bibikwara ha. (Matiu 23:35-38; 24:1, 2) Nke a weere ọnọdụ mgbe ndị agha Rom bịakwasịrị Jerusalem na 70 O.A. n’okpuru Ọchịagha Titus ma bibie obodo ahụ na ụlọukwu ya. Ma, ụfọdụ gere Jisọs ntị ma ghọọ ndị na-eso ụzọ ya. Jisọs sịrị na “ngọzi na-adịrị” ndị a. (Matiu 13:16-23, 51) Ọ gwawo ha na mgbe ọ bụla ha hụrụ “Jerusalem ka a chị usuu ndị agha nọgide ya gburugburu,” na ha kwesịrị ‘ịgbalaga n’ugwu.’ (Luk 21:20-22) N’ụzọ dị otú a, a zọpụtara “mkpụrụ nsọ” ahụ nwere okwukwe, ndị e mewokwara ka ha ghọọ mba ime mmụọ, bụ́ “Israel nke Chineke.”—Ndị Galetia 6:16.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Aịsaịa—Akụkụ nke Mbụ
7:3, 4—Gịnị mere Jehova ji zọpụta ajọ Eze Ehaz? Ndị eze Siria na Izrel mere atụmatụ ịkwatu ọchịchị Eze Ehaz nke Juda, ma were onye ha ga na-atụrụ ihe ọ ga na-eme dochie ya, ya bụ, nwa Tabeel—nwoke na-esighị n’eriri Devid. Atụmatụ aghụghọ a nke Setan bụ́ Ekwensu mere ga-emebi ọgbụgba ndụ Alaeze ahụ nke Jehova na Devid gbara. Jehova napụtara Ehaz iji mee ka usoro ọmụmụ a ga-esi mụta “Onyeisi Udo” ahụ e kwere ná nkwa dịgide.—Aịsaịa 9:6.
DISEMBA 15-21
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE AỊZAYA 9-10
E Buru Amụma na A Ga-ahụ “Ezigbo Ìhè”
Nkwa Maka Onyeisi Udo
16 Ee, “mgbe ikpeazụ” ahụ Aịsaịa buru n’amụma bụ oge ije ozi Kraịst n’elu ala. Jisọs biri ihe ka ukwuu ná ndụ ya n’elu ala na Galili. Ọ bụ n’ógbè Galili ka ọ malitere ozi ya ma malite ikwusa, sị: “Alaeze eluigwe dị nso.” (Matiu 4:17) Na Galili, o ziri Ozizi Elu Ugwu ya ahụ a ma ama, họrọ ndị ozi ya, rụọ ọrụ ebube ya mbụ, ma gosi ihe dị ka ụmụazụ dị 500 onwe ya mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ. (Matiu 5:1–7:27; 28:16-20; Mak 3:13, 14; Jọn 2:8-11; 1 Ndị Kọrint 15:6) N’ụzọ dị otú a Jisọs mezuru amụma Aịsaịa site n’ịsọpụrụ “ala Zebulun na ala Naftali.” Otú ọ dị, ọ bụghị nanị ndị bi na Galili ka Jisọs ziri ozi ya. Site n’ikwusa ozi ọma n’ala ahụ nile, Jisọs ‘mere ka a sọpụrụ’ mba Israel dum, gụnyere Juda.
17 Otú ọ dị, gịnị banyere nhota Matiu hotara “oké ìhè” n’ime Galili? Nke a bụkwa ihota ihe e kwuru n’amụma Aịsaịa. Aịsaịa dere, sị: “Ndị na-ejegharị n’ọchịchịrị hụrụ ìhè ukwu: ndị bi n’ala onyinyo ọnwụ, ìhè amụkwasịwo ha.” (Aịsaịa 9:2) Ka ọ na-erule na narị afọ mbụ O.A., ụgha dị iche iche nke ndị na-ekpere arụsị ekpuchiwo ìhè nke eziokwu ahụ. Ndị ndú okpukpe ndị Juu emewo ka nsogbu ahụ ka njọ site n’ijigidesi ọdịnala okpukpe ha ike bụ́ nke ha jiworo ‘mee okwu Chineke ka ọ bụrụ ihe efu.’ (Matiu 15:6) E megburu ndị dị umeala n’obi, ha nọkwa ná mgbagwoju anya, ka ha nọ na-agbaso “ndị ndú [kpuru] ìsì.” (Matiu 23:2-4, 16) Mgbe Jisọs, bụ́ Mesaịa ahụ, bịara, e mepere anya nke ọtụtụ ndị dị umeala n’obi n’ụzọ na-atụ n’anya. (Jọn 1:9, 12) A kọwara ọrụ Jisọs rụrụ mgbe ọ nọ n’elu ala na ngọzi ndị si n’àjà ya pụta nke ọma n’amụma Aịsaịa dị ka “ìhè ukwu.”—Jọn 8:12.
Nkwa Maka Onyeisi Udo
18 Ndị nabatara ìhè ahụ nwere ihe dị ukwuu mere ha ga-eji na-aṅụrị ọṅụ. Aịsaịa gara n’ihu ikwu, sị: “I mewo ka mba ahụ baa ụba, I mewo ka ọṅụ dịịrị ya ukwuu: ha aṅụrịwo n’ihu Gị dị ka ọṅụ nke dị n’owuwe ihe ubi, dị ka mmadụ si etegharị egwú ọṅụ mgbe ha na-ekesa ihe a kwatara n’agha.” (Aịsaịa 9:3) N’ihi ọrụ nkwusa nke Jisọs na ụmụazụ ya, ndị nwere obi eziokwu pụtara, na-egosi na ọ na-agụ ha agụụ ife Jehova n’ime mmụọ na eziokwu. (Jọn 4:24) N’ihe na-erughị afọ anọ, ọtụtụ ìgwè mmadụ nakweere Iso Ụzọ Kraịst. E mere mmadụ 3,000 baptism n’ụbọchị Pentikọst 33 O.A. Ntakịrị oge mgbe nke ahụ gasịrị, “ọnụ ọgụgụ ndị ikom ahụ wee ruo ihe ha ka [puku mmadụ ise].” (Ọrụ 2:41; 4:4) Ka ndị na-eso ụzọ ya ji ịnụ ọkụ n’obi na-egbukepụ ìhè ahụ, “ọnụ ọgụgụ nke ndị na-eso ụzọ Jisọs na-abakwa ụba na Jerusalem hie nne; oké ìgwè ndị nchụàjà na-aṅakwa okwukwe ahụ ntị.”—Ọrụ 6:7.
19 Dị ka ndị na-aṅụrị ọṅụ n’owuwe ihe ubi bara ụba ma ọ bụ ndị na-aṅụrị ọṅụ n’ihi ikesa ihe ndị bara uru a kwatara n’agha mgbe e nwesịrị oké mmeri, ụmụazụ Jisọs ṅụrịrị ọṅụ n’ihi mmụba ahụ. (Ọrụ 2:46, 47) Ka oge na-aga, Jehova mere ka ìhè chakwasị ndị mba ọzọ. (Ọrụ 14:27) Ya mere ndị si n’agbụrụ nile ṅụrịrị ọṅụ na e megheworo ha ụzọ ịbịakwute Jehova.—Ọrụ 13:48.
Nkwa Maka Onyeisi Udo
20 Ihe ndị si n’ọrụ Mesaịa ahụ pụta ga-adịgide adịgide, dị ka anyị na-ahụ site n’ihe ndị Aịsaịa kwuziri: “Yoke nke ibu ya, na mkpanaka nke ubu ya, bụ́ ndele nke onye na-achị ya n’ihe ike, Ị nyajiwo ha, dị ka n’ụbọchị nke Midian.” (Aịsaịa 9:4) Ihe karịrị otu narị afọ tupu oge Aịsaịa, ndị Midian na ndị Moab gbara izu ịraba ndị Israel ná mmehie. (Ọnụ Ọgụgụ 25:1-9, 14-18; 31:15, 16) Ka e mesịrị, ndị Midian menyere ndị Israel ụjọ site n’ịdị na-awakpo na ịkwakọrọ ihe n’ime ime obodo ha na n’ubi ha ruo afọ asaa. (Ndị Ikpe 6:1-6) Ma Jehova, site n’aka ohu ya bụ́ Gideọn, meriri ndị agha Midian ajọ mmeri. Mgbe ‘ụbọchị nke Midian’ ahụ gasịrị, e nweghị ihe àmà na-egosi na ndị Midian nyere ndị Jehova nsogbu ọzọ. (Ndị Ikpe 6:7-16; 8:28) N’ọdịnihu dị nso, Jisọs Kraịst, bụ́ Gideọn ka ukwuu, ga-eti ndị iro nke oge a nke ndị Jehova ihe otiti na-eweta ọnwụ. (Mkpughe 17:14; 19:11-21) Mgbe ahụ “dị ka n’ụbọchị nke Midian,” a ga-enwe mmeri zuru ezu, nke na-adịgidekwa adịgide, ọ bụghị site n’ike agha nke mmadụ, kama site n’ike Jehova. (Ndị Ikpe 7:2-22) Ndị Chineke agaghị atakwa ahụhụ ọzọ n’okpuru yoke nke mmegbu!
21 Ngosipụta nke ike Chineke abụghị iji too agha. Jisọs ahụ e mere ka o si n’ọnwụ bilie bụ Onyeisi Udo, sitekwa n’ibibi ndị iro ya, ọ ga-eweta udo ebighị ebi. Aịsaịa kwuziri okwu ugbu a banyere ejiji agha ịbụ ndị ọkụ repịara kpam kpam: “Akpụkpọ ụkwụ ọ bụla nke ndị agha na-eyi akpụkpọ ụkwụ n’ụzụ agha, na uwe a tụrụrụ n’ọbara, ha nile ga-abụ ihe isure ọkụ, ọbụna nri ọkụ.” (Aịsaịa 9:5) A gakwaghị enwe ịma jijiji nke akpụkpọ ụkwụ nke ndị agha na-azọ ije na-akpata. A gakwaghị ahụ uwe agha nke ndị bụ́ dike n’ịlụ agha bụ́ ndị jupụtara n’ọbara. Agha agaghị adịkwa ọzọ!—Abụ Ọma 46:9.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Nkwa Maka Onyeisi Udo
23 Onye ndụmọdụ bụ onye na-adụ ọdụ, ma ọ bụ na-adọ aka ná ntị. Mgbe ọ nọ n’elu ala, Jisọs Kraịst nyere ndụmọdụ magburu onwe ya. N’ime Bible anyị na-agụ na “ibobo ozizi Ya nwụrụ ìgwè mmadụ nile n’ahụ.” (Matiu 7:28) Ọ bụ Onye Ndụmọdụ nwere amamihe, nke nwekwara ọmịiko, onye ghọtara ọdịdị mmadụ n’ụzọ na-enweghị atụ. Ndụmọdụ ya adịghị abụ nanị ịba mba ma ọ bụ inye ahụhụ. Ọtụtụ mgbe karị, ọ na-abụ n’ụdị ntụziaka na ndụmọdụ ịhụnanya. Ndụmọdụ Jisọs magburu onwe ya n’ihi na ọ na-abụ nke amamihe dị na ya mgbe nile, nke zuru okè, na nke na-adịghị ada ada. Mgbe e ji ya mee ihe, ọ na-eduga ná ndụ ebighị ebi.—Jọn 6:68.
24 Ndụmọdụ Jisọs adịghị esite nanị n’inwe uche dị nkọ. Kama nke ahụ, ọ na-asị: “Ozizi m abụghị nke m, kama ọ bụ nke Onye zitere m.” (Jọn 7:16) Dị ka ọ dị n’ihe banyere Solomọn, Jehova Chineke bụ Isi Iyi nke amamihe Jisọs. (1 Ndị Eze 3:7-14; Matiu 12:42) Ihe nlereanya nke Jisọs kwesịrị ịkpali ndị na-ezi ihe na ndị na-enye ndụmọdụ n’ọgbakọ ndị Kraịst ime mgbe nile ka ntụziaka ha dabere n’Okwu Chineke.—Ilu 21:30.
DISEMBA 22-28
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE AỊZAYA 11-13
Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Onye Ga-abụ Mezaya?
Nzọpụta na Ịṅụrị Ọṅụ n’Oge Ọchịchị Mesaịa
4 Ọtụtụ narị afọ tupu oge Aịsaịa, ndị Hibru ndị ọzọ so dee Bible zoro aka n’ọbịbịa nke Mesaịa, bụ́ ezi Onye Ndú ahụ, onye Jehova ga-ezigara Israel. (Jenesis 49:10; Deuterọnọmi 18:18; Abụ Ọma 118:22, 26) Ugbu a site n’ọnụ Aịsaịa, Jehova na-enyekwu nkọwa sara mbara. Aịsaịa na-ede, sị: “Ome ga-esikwa n’ogwe osisi Jesi pụta, otu alaka nke sitere na mkpọrọgwụ ya ga-amịkwa mkpụrụ.” (Aịsaịa 11:1; tụlee Abụ Ọma 132:11.) “Ome” na “alaka” na-egosicha na Mesaịa ahụ ga-abụ nwa Jesi site na nwa ya nwoke bụ́ Devid, bụ́ onye e tere mmanụ dị ka eze Israel. (1 Samuel 16:13; Jeremaịa 23:5; Mkpughe 22:16) Mgbe ezigbo Mesaịa ahụ bịara, “ome” a, nke sitere n’ụlọ Devid, ga-amị ezi mkpụrụ.
5 Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa bụ Jisọs. Matiu, bụ́ onye so dee oziọma, zoro aka n’ihe ndị e kwuru n’Aịsaịa 11:1 mgbe ọ sịrị na ọkpụkpọ a kpọrọ Jisọs “onye Nazaret” mezuru ihe ndị amụma kwuru. N’ihi na a zụlitere ya n’obodo Nazaret, a kpọrọ Jisọs onye Nazaret, aha nke yiri ka ò nwere ihe jikọrọ ya na okwu Hibru e ji mee ihe n’Aịsaịa 11:1 maka “ome.”—Matiu 2:23, nkọwa ala ala peji nke NW; Luk 2:39, 40.
Nzọpụta na Ịṅụrị Ọṅụ n’Oge Ọchịchị Mesaịa
6 Ụdị onye ọchịchị dị aṅaa ka Mesaịa ahụ ga-abụ? Ọ̀ ga-adị ka Asiria ahụ nwere obi ọjọọ, nke na-eme nanị uche ya, onye bibiri alaeze ebo iri dị n’ebe ugwu nke Israel? Ọ dịghị ma ọlị. Banyere Mesaịa ahụ, Aịsaịa na-ekwu, sị: “Mmụọ nke Jehova ga-enwekwa ọnọdụ Ya n’ahụ ya, bụ́ Mmụọ nke amamihe na nghọta, Mmụọ nke ndụmọdụ na ịdị ike, Mmụọ nke ihe ọmụma na egwu Jehova; ọzọ, ihe na-atọ ya ụtọ bụ egwu Jehova.” (Aịsaịa 11:2, 3a) E ji mmụọ nsọ Chineke tee Mesaịa ahụ mmanụ, ọ bụghị mmanụ nkịtị. Nke a mere n’oge e mere Jisọs baptism, mgbe Jọn Onye Na-eme Baptism hụrụ mmụọ nsọ Chineke ka ọ na-efedakwasị Jisọs n’ụdị nduru. (Luk 3:22) Mmụọ Jehova ‘weere ọnọdụ n’ahụ’ Jisọs, o nyekwara ihe àmà na-egosi nke a mgbe o ji amamihe, nghọta, ndụmọdụ, ịdị ike, na ihe ọmụma mee ihe. Lee àgwà mara nnọọ mma ha bụ nye onye ọchịchị!
Nzọpụta na Ịṅụrị Ọṅụ n’Oge Ọchịchị Mesaịa
8 Gịnị bụ egwu Jehova nke Mesaịa ahụ na-egosipụta? N’ezie Jisọs adịghị atụ Chineke ụjọ, na-atụ ụjọ na ọ ga-ama ya ikpe. Kama nke ahụ, Mesaịa ahụ na-atụ Chineke egwu nsọpụrụ, na-asọpụrụ ya n’ịhụnanya. Onye na-atụ egwu Chineke na-achọ mgbe nile ‘ime ihe na-atọ Ya ụtọ’ dị ka Jisọs na-eme. (Jọn 8:29) Site n’okwu na n’omume, Jisọs na-akụzi na ọ dịghị ọṅụ karịrị ịdị na-ebi ndụ kwa ụbọchị n’egwu ziri ezi nke Jehova.
Nzọpụta na Ịṅụrị Ọṅụ n’Oge Ọchịchị Mesaịa
Aịsaịa bukwuru amụma banyere àgwà Mesaịa ahụ: “Ọ bụghịkwa dị ka anya ya abụọ si ahụ ka ọ ga-ekpe ikpe, ọ bụghịkwa dị ka ntị ya abụọ si anụ ka ọ ga-aba mba.” (Aịsaịa 11:3b) Ka e were ya na ị ga-apụta zara ọnụ gị n’ụlọikpe, ị́ gaghị enwe ekele inwe onyeikpe dị otú ahụ? N’ọkwá ya dị ka Onyeikpe nke ihe nile a kpọrọ mmadụ, arụmụka na-ezighị ezi, aghụghọ ụlọikpe, asịrị, ma ọ bụ ihe ndị a na-ahụ anya, dị ka akụ̀ na ụba adịghị emegharị Mesaịa ahụ anya. Ọ na-achọpụta aghụghọ nile ma na-ele anya gabiga ọdịdị elu ahụ na-adịghị mma, na-achọpụta “mmadụ zoro ezo nke obi,” “nwoke ahụ zoro ezo.” (1 Pita 3:4, nkọwa ala ala peji nke NW) Ihe nlereanya magburu onwe ya nke Jisọs bụ ihe kwesịrị nṅomi nye ndị nile a na-akpọ ka ha kpee ikpe n’ọgbakọ ndị Kraịst.—1 Ndị Kọrint 6:1-4.
Nzọpụta na Ịṅụrị Ọṅụ n’Oge Ọchịchị Mesaịa
11 Mgbe ọ dị mkpa inye ụmụazụ ya mgbazi, Jisọs na-enye ya n’ụzọ na-akasị abara ha uru—ihe nlereanya magburu onwe ya nye ndị Kraịst bụ́ okenye. N’aka nke ọzọ, ndị na-emebi iwu pụrụ ịtụ anya inweta amamikpe dị njọ. Mgbe Chineke ga-ajụ usoro ihe a ajụjụ, Mesaịa ahụ ga-eji olu ya dị ike “tigbuo ụwa,” na-ekwupụta amamikpe mbibi nye ndị ajọ omume nile. (Abụ Ọma 2:9; tụlee Mkpughe 19:15.) N’ikpeazụ, a gaghị enwe ndị mmebi iwu ga-afọdụ imebi udo nke ihe a kpọrọ mmadụ. (Abụ Ọma 37:10, 11) Jisọs, ebe o kere ezi omume na ikwesị ntụkwasị obi n’úkwù ya na n’ume ya, o nwere ike imezu nke a.—Abụ Ọma 45:3-7.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Nzọpụta na Ịṅụrị Ọṅụ n’Oge Ọchịchị Mesaịa
16 E busoro ofufe dị ọcha agha nke mbụ ya n’Iden mgbe Setan mere ka Adam na Iv nupụrụ Jehova isi. Ruo taa, ike agwụbeghị Setan n’ebumnobi ya nke bụ́ ime ka ọtụtụ mmadụ, ole o kwere ya mee, si n’ebe Chineke nọ pụọ. Ma ọ dịghị mgbe Jehova ga-ekwe ka ofufe dị ọcha kwụsị ịdị n’ụwa. O metụtara aha ya, ọ na-echekwa banyere ndị na-ejere ya ozi. N’ihi ya, o kwere nkwa dị ịrịba ama site n’ọnụ Aịsaịa, sị: “Ọ ga-erukwa, n’ụbọchị ahụ, na mkpọrọgwụ Jesi, nke na-eguzo ịbụ ọkọlọtọ ndị nile dị iche iche, ya ka mba nile ga-ajụ ase; ebe izu ike ya ga-abụkwa ebube.” (Aịsaịa 11:10) Laa azụ na 537 T.O.A., Jerusalem, bụ́ obodo Devid mere ka ọ bụrụ isi obodo mba ahụ, bụ ọkọlọtọ, na-akpọku ndị fọdụrụnụ kwesịrị ntụkwasị obi ná ndị Juu gbasasịrịnụ ka ha laghachi ma wughachi ụlọukwu ahụ.
17 Otú ọ dị, amụma ahụ na-ezo aka n’ihe karịrị nke ahụ. Dị ka anyị hụwororịị, ọ na-ezo aka n’ịchịisi Mesaịa ahụ, onye nanị ya bụ ezi Onye Ndú nke mba nile. Pọl onyeozi hotara ihe e kwuru n’Aịsaịa 11:10 iji gosi na a ga-anabata ndị mba ọzọ n’ọgbakọ ndị Kraịst n’oge ya. N’ihota ihe e kwuru n’amaokwu a dị ka e si sụgharịa ya na Septuagint, o dere, sị: “Aịsaịa sị, Mkpọrọgwụ ahụ nke Jesi ga-adị, na Onye ahụ Nke na-ebili ịbụ onyeisi mba nile; Onye ahụ ka ndị mba ọzọ ga-ele anya Ya.” (Ndị Rom 15:12) Ọzọkwa, amụma ahụ gakwuru ọbụna n’ihu—ruo n’oge anyị mgbe ndị mba ọzọ na-egosi ịhụnanya ha n’ebe Jehova nọ site n’ịkwado ụmụnna Mesaịa ahụ bụ́ ndị e tere mmanụ.—Aịsaịa 61:5-9; Matiu 25:31-40.
18 Ná mmezu ya nke oge a, ‘ụbọchị ahụ’ nke Aịsaịa zoro aka na ya malitere mgbe e mere ka Mesaịa ahụ nọkwasị n’ocheeze dị ka Eze nke Alaeze eluigwe Chineke na 1914. (Luk 21:10; 2 Timoti 3:1-5; Mkpughe 12:10) Kemgbe ahụ, Jisọs Kraịst anọwo na-abụ ọkọlọtọ a na-ahụ anya nke ọma, ebe a ga-ezukọta, nye Israel ime mmụọ na ndị si ná mba nile bụ́ ndị agụụ ọchịchị ezi omume na-agụsi ike. Ná nduzi nke Mesaịa ahụ, e kwusawo ozi ọma nke Alaeze ahụ ná mba nile, dị ka Jisọs buru n’amụma. (Matiu 24:14; Mak 13:10) Ozi ọma a na-enwe mmetụta dị ike. “Oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-apụghị ịgụta ọnụ, ndị si ná mba nile” na-edo onwe ha n’okpuru Mesaịa ahụ site n’isonyere ihe ahụ fọdụrụnụ e tere mmanụ n’ofufe dị ọcha. (Mkpughe 7:9) Ka ọtụtụ ndị ọhụrụ nọgidere na-esonyere ihe ahụ fọdụrụnụ “n’ụlọ ekpere” ime mmụọ nke Jehova, ha na-atụkwasị ihe n’ebube nke “ebe izu ike” Mesaịa ahụ, bụ́ oké ụlọ nsọ ime mmụọ nke Chineke.—Aịsaịa 56:7; Hagaị 2:7.
DISEMBA 29–JENỤWARỊ 4
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE AỊZAYA 14-16
A Ga-atarịrị Ndị Iro Ndị Na-efe Chineke Ahụhụ
Jehova Ewedaa Obodo Dị Mpako Ala
16 Nke a emeghị ozugbo na 539 T.O.A. N’agbanyeghị nke ahụ, taa o doro anya na ihe nile Aịsaịa buru n’amụma banyere Babilọn emezuwo. Babilọn “bụ ugbu a, ọ nọwokwa na-abụ kemgbe ọtụtụ narị afọ, ebe tọgbọrọ nnọọ n’efu, ọ bụkwa mkpọmkpọ ebe,” ka otu onye na-akọwa Bible kwuru. Ọ gbakwụnyeziri, sị: “Ọ gaghị ekwe omume ịhụ ebe a ma ghara icheta otú amụma Aịsaịa na Jeremaịa buru siworo nnọọ mezuo kpọmkwem.” O doro anya na ọ dịghị mmadụ ọ bụla nọ n’oge Aịsaịa nke pụrụ ibuworị amụma banyere ọdịda Babilọn na mbibi ya n’ikpeazụ. E kwuwerị, mmeri ndị Midia na Peasia meriri Babilọn weere ọnọdụ ihe dị ka afọ 200 mgbe Aịsaịa desịrị akwụkwọ ya! Mbibi ya n’ikpeazụ weere ọnọdụ ọtụtụ narị afọ ka e mesịrị. Nke a ọ́ dịghị eme ka okwukwe anyị nwere na Bible bụ Okwu Chineke nke sitere n’ike mmụọ nsọ, sie ike? (2 Timoti 3:16) Ọzọkwa, ebe Jehova mezuru amụma dị iche iche n’oge gara aga, anyị pụrụ inwe obi ike zuru ezu na amụma Bible ndị na-emezubeghị ga-emezu n’oge nke Chineke.
Jehova Ewedaa Obodo Dị Mpako Ala
24 N’ime Bible, e ji ndị eze sitere n’usoro ndị eze Devid tụnyere kpakpando. (Ọnụ Ọgụgụ 24:17) Malite na Devid gaa n’ihu, “kpakpando” ndị ahụ chịrị site n’elu Ugwu Zaịọn. Mgbe Solomọn wusịrị ụlọukwu ahụ na Jerusalem, aha ahụ bụ́ Zaịọn ghọrọ aha obodo ahụ dum. N’okpuru ọgbụgba ndụ Iwu ahụ, iwu ji ụmụ nwoke nile bụ́ ndị Israel ịga Zaịọn ugboro atọ n’afọ. Otú a, ọ ghọrọ ‘ugwu nzukọ.’ Site n’ikpebi ido ndị eze Juda n’okpuru ya nakwa isi n’ugwu ahụ wepụ ha, Nebukadneza na-ekwupụta ebumnobi ya nke bụ́ ibuli onwe ya elu karịa “kpakpando” ndị ahụ. O nyeghị Jehova otuto maka mmeri o meriri ha. Kama nke ahụ, n’ezie, o ji mpako na-etinye onwe ya n’ọnọdụ Jehova.
Ndụmọdụ Jehova Megide Mba Dị Iche Iche
JEHOVA pụrụ iji mba ndị ọzọ nye ndị ya ahụhụ maka ajọ omume ha. O megodị otú ahụ, ọ dịghị agbaghara mba ndị ahụ obi ọjọọ ha na-ekwesịghị ekwesị, mpako ha, na obi ilu ha nwere n’ebe ezi ofufe dị. N’ihi ya, ogologo oge tupu o mee, ọ kpaliri Aịsaịa idekọ “ibu e boro Babilọn.” (Aịsaịa 13:1) Otú ọ dị, Babilọn ga-abụ ihe iyi egwu n’ọdịnihu. N’oge Aịsaịa, Asiria na-emegbu ndị ha na Chineke nọ n’ọgbụgba ndụ. Asiria bibiri alaeze ebe ugwu nke Israel, bibiekwa akụkụ dị ukwuu nke Juda. Ma mmeri Asiria nwere ebe ọ ga-ejedebe. Aịsaịa na-ede, sị: “Jehova nke usuu nile nke ndị agha aṅụwo iyi, sị, N’ezie dị ka M cheworo, otú a ka ọ ga-adị . . . na M ga-etipịa Asiria n’ala m, ọ bụkwa n’elu ugwu m nile ka M ga-azọ ya ụkwụ: yoke ya ga-esikwa n’olu ha wezụga onwe ya, ibu ya ga-esi n’elu ubu ha wezụga onwe ya.” (Aịsaịa 14:24, 25) Oge na-adịghị anya ka Aịsaịa busịrị amụma a, e wepụrụ ihe iyi egwu nke Asiria n’obodo Juda.
Ndụmọdụ Jehova Megide Mba Dị Iche Iche
12 Olee mgbe a ga-emezu amụma a? N’oge na-adịghị anya. “Nke a bụ okwu ahụ nke Jehova kwuru banyere Moab na mgbe gara aga. Ma ugbu a Jehova ekwuwo, sị, N’afọ atọ, dị ka afọ onye e goro ọrụ, ka a ga-elelị nsọpụrụ Moab, ya na ìgwè mmadụ ya nile bara ụba; ndị fọdụrụ ga-adịkwa nta nke ukwuu, n’adịghị ike.” (Aịsaịa 16:13, 14) N’ikwekọ na nke a, e nwere ihe ochie ndị e gwupụtara n’ala, ndị bụ́ ihe àmà na-egosi na Moab tara nnukwute ahụhụ na narị afọ nke asatọ T.O.A., nakwa na mmadụ ebighị n’ọtụtụ n’ime obodo ya. Tiglat-pilesa nke Atọ gụnyere Salamanu nke Moab ná ndị ọchịchị tụọrọ ya ụtụ. Senakerib natara ụtụ site n’aka Kammusunadbi, bụ́ eze Moab. Ndị eze Asiria bụ́ Isa-hadọn na Ashurbanipal zoro aka n’ebe ndị eze Moab bụ́ Musuri na Kamashaltu nọ dị ka ndị ha na-achị. Ọtụtụ narị afọ gara aga, ndị Moab kwụsịrị ịdị adị dị ka otu ndị. A chọtawo obodo ndị e bibiri ebibi bụ́ ndị e chere na ha bụ nke Moab, ma e gwupụtabeghị ọtụtụ ihe àmà a na-ahụ anya banyere onye a bụ́ onye iro dị ike nke Israel n’otu oge.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Aịsaịa—Akụkụ nke Mbụ
14:1, 2—Olee otú ndị Jehova si ghọọ “ndị na-adọta ndị na-adọta ha rịị n’agha n’agha,” ndị “ga-enwekwa ike n’ahụ́ ndị na-achị ha rịị n’ihe ike”? Nke a mezuru n’ahụ́ ndị dị ka Daniel, bụ́ onye nọ n’ọkwà dị elu na Babilọn n’ọchịchị ndị Midia na ndị Peshia; Esta, bụ́ onye ghọrọ eze nwanyị Peshia; nakwa Mọdekaị, bụ́ onye e mere praịm minista n’Alaeze Ukwu Peshia.