Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp21 nke 2 p. 10-12
  • Ihe Ị Ga-eme Ka I Nwee Ike Ibi n’Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Ị Ga-eme Ka I Nwee Ike Ibi n’Ụwa Ọhụrụ
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2021
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ‘ỊMATA’ CHINEKE GA-EME KA A GHARA IBIBI ANYỊ
  • NA-AGỤ OKWU CHINEKE BỤ́ BAỊBỤL KWA ỤBỌCHỊ
  • NA-EKPE EKPERE KA CHINEKE NYERE GỊ AKA
  • Olee Ihe Ndị Chineke Merela?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2019
  • Olee Otú Ị Ga-esi Adị Ndụ Ebighi Ebi?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ụwa Ọhụrụ Chineke nke Udo Ga-adị na Ya—Ị Pụrụ Ibi na Ya
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Mmadụ Ịdị Ndụ Ọzọ Mgbe Ọ Nwụsịrị—Ọ Ga-ekwe Omume!
    Teta!—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2021
wp21 nke 2 p. 10-12

Ihe Ị Ga-eme Ka I Nwee Ike Ibi n’Ụwa Ọhụrụ

Isiokwu bu nke a ụzọ kwuru na Chineke ga-ebibi ndị ọjọọ n’oge na-adịghị anya ma kwụsị nsogbu niile ụmụ mmadụ nwere. Obi siri anyị ike na Chineke ga-eme ya. Gịnị mere obi ji sie anyị ike? Ọ bụ n’ihi na Okwu ya bụ́ Baịbụl gwara anyị, sị:

“Ụwa na-agafe agafe.”​—1 JỌN 2:17.

Obi siri anyị ike na ọ bụghị mmadụ niile ka Chineke ga-ebibi n’ihi na amaokwu Baịbụl a kwukwara, sị:

“Onye na-eme uche Chineke ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”

N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị achọghị ka Chineke bibie anyị mgbe ọ na-ebibi ndị ọjọọ, anyị ga na-eme uche ya. Ma, anyị ga-ebu ụzọ mata onye Chineke bụ tupu anyị amata uche ya.

‘ỊMATA’ CHINEKE GA-EME KA A GHARA IBIBI ANYỊ

Foto ndị na-egosi: 1. Ebe otu nọọsụ ezigbo ike gwụrụ tukwuuru etukwu n’ụlọ ọgwụ. 2. Mgbe ọ gara n’ebe a na-ere nri ka o zutụ ike, ọ hụrụ ka onye ọrụ ibe ya ji obi ụtọ na-agụ akwụkwọ. 3. Onye ọrụ ibe ya ahụ gụụrụ ya otu amaokwu na Baịbụl, nyekwa ya kaadị jw.org.

Jizọs kwuru, sị: “Iji nweta ndụ ebighị ebi, ha ga-amata gị, onye naanị ya bụ ezi Chineke.” (Jọn 17:3) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịdị ndụ ebighị ebi, anyị kwesịrị ‘ịmata’ Chineke. Ihe ọ pụtara abụghị naanị ikweta na Chineke dị ma ọ bụ ịmata ihe ole na ole gbasara ya. Anyị na ya kwesịkwara ịbụ enyi. Otú ahụ anyị ga-ewepụta ohere ka anyị na enyi anyị na-anọrị ma anyị chọọ ka anyị na ya dịkwuo ná mma ka anyị kwesịkwara ime ma anyị chọọ ka anyị na Chineke na-abụ enyi. Ka anyị leba anya n’ụfọdụ eziokwu dị mkpa anyị mụtara na Baịbụl ga-enyere anyị aka ịbụ enyi Chineke, anyị na ya anọgidekwa na-abụ enyi.

Eziokwu Ndị Anyị Mụtara na Baịbụl

Mgbe nọọsụ ahụ lara n’ụlọ ya, baa na jw.org.

Anyị mụtara na Chineke chọrọ ka anyị biri na Paradaịs.

Chineke kere nwoke mbụ na nwaanyị mbụ aha ha bụ Adam na Iv ma mee ka ha biri n’ebe mara mma a na-akpọ ogige Iden. Ha zuru okè mgbe Chineke kere ha. O nyekwara ha ihe niile ga-eme ka ndụ na-atọ ha ụtọ. Ha agaraghị anwụ ma a sị na ha na Chineke nọgidere na-abụ enyi. Ma, ha dara iwu na-ataghị akpụ Chineke nyere ha.

Anyị mụtara ihe mere anyị ji na-ata ahụhụ ugbu a.

Isi ahụ Adam nupụụrụ Chineke mere ka ma ya ma ụmụ ya niile gharazie inwe ike ịdị ndụ ebighị ebi. Baịbụl kwuru, sị: “Mmehie si n’aka otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata, ọnwụ wee gbasaa ruo mmadụ niile.” (Ndị Rom 5:12) Ụmụ Adam niile ketara mmehie n’aka ya otú ahụ mmadụ nwere ike ibute ọrịa n’aka nne na nna ya. Ọ bụ ya mere anyị ji aka nká ma na-anwụ anwụ.

Anyị mụtara ihe Chineke merela iji nyere anyị aka.

Baịbụl kwuru, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka a ghara ibibi onye ọ bụla nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Chineke zitere Jizọs n’ụwa ka ọ nwụọ n’ihi anyị. Otu nwoke India dị afọ iri asatọ na isii kwuru gbasara ịhụnanya a, sị: “Ihe a gosiri na Jehovaa hụrụ m n’anya nke ukwuu. Ịhụnanya a emeela ka m nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi.”

Anyị mụtara otú anyị ga-esi egosi na obi dị anyị ụtọ n’ihi ihe Chineke meere anyị.

Baịbụl kwuru na otú anyị ga-esi egosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe Chineke meere anyị bụ ‘ịna-eme ihe ndị o nyere n’iwu.’ (1 Jọn 2:3) Jehova Chineke egosila anyị ihe anyị ga-eme ka ndụ na-atọ anyị ụtọ ugbu a n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya. (Aịzaya 48:​17, 18) Chineke achọghị ka anyị na-ata ahụhụ. O kwere anyị nkwa na ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe ndị o kwuru, obi ga na-atọ anyị ụtọ ugbu a, anyị ga-adịkwa ndụ ebighị ebi.

NA-AGỤ OKWU CHINEKE BỤ́ BAỊBỤL KWA ỤBỌCHỊ

Ebe nọọsụ ahụ na-eleli anya elu mgbe ọ gụchara Baịbụl n’oge ọ na-ezuru ike n’èzí n’ehihie.

Ihe ga-eme ka a ghara ibibi gị bụ ịna-ekpe ekpere ka Chineke nyere gị aka na ịna-eme uche ya

Anyị na-eri nri mgbe niile ka anyị nwee ike ịna-adị ndụ. Ma, Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụghị naanị achịcha ga-eme ka mmadụ dị ndụ, kama ọ bụ okwu niile si n’ọnụ Jehova pụta.”​—Matiu 4:4.

Taa, ọ bụ na Baịbụl ka okwu Jehova dị. Ka ị na-agụ akwụkwọ a dị nsọ, ị ga-amụta eziokwu ndị dị mkpa gbasara ihe ndị Chineke mere n’oge gara aga, ihe ndị ọ na-eme ugbu a, na ihe ndị ọ ga-eme n’ọdịnihu.

NA-EKPE EKPERE KA CHINEKE NYERE GỊ AKA

Olee ihe ị ga-eme ma ị chọọ ime ihe Chineke kwuru ma ya ana-esiri gị ike ịkwụsị ime ihe ndị ọ sịrị na ha adịghị mma? Ihe ga-enyere gị aka bụ ịmata Chineke nke ọma.

Chegodị gbasara otu nwaanyị anyị ga-akpọ Sakura. Nwaanyị a na-akwa iko. Mgbe ọ malitere ịmụ Baịbụl, ọ mụtara na Chineke kwuru ka anyị ‘gbaara ịkwa iko ọsọ.’ (1 Ndị Kọrịnt 6:18) Sakura rịọrọ Chineke ka o nyere ya aka ka ọ kwụsị ịkwa iko. O mechakwara kwụsị ya. Ma, ịkwa iko ka na-agụ ya mgbe ụfọdụ. O kwuru, sị: “Mgbe ọ bụla ime omume rụrụ arụ gbatara m n’uche, m na-ekpe ekpere kọọrọ ya Jehova, ebe m makwanụ na m gaghị akwụsịli ya n’onwe m. Otú Jehova si aza m ekpere emeela ka mụ na ya dịrịkwuo ná mma.” Ọtụtụ nde mmadụ amatala Chineke otú ahụ Sakura matara ya. Chineke na-enye ha ike ha ji na-agbanwe àgwà ha ma na-eme ihe dị ya mma.​—Ndị Filipaị 4:13.

Ọ bụrụ na ị mata Chineke nke ọma, ‘Chineke ga-amatakwu gị,’ gị abụrụkwa ezigbo enyi ya. (Ndị Galeshia 4:9; Abụ Ọma 25:14) Ime otú a ga-eme ka i biri n’ụwa ọhụrụ Chineke. Ma, olee otú ụwa ọhụrụ ahụ ga-adị? Isiokwu na-esonụ ga-eme ka anyị mata azịza ya.

a Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya