Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w24 Jenụwarị p. 19
  • Ị̀ Maara?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Maara?
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Filip Emee Onye Ọchịchị Etiopia Baptism
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Izisa “Ozi Ọma Banyere Jizọs”
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
  • Filip—Onye Ji Ịnụ Ọkụ n’Obi Zisaa Ozi Ọma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Enyemaka Iji Ghọta Bible
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
w24 Jenụwarị p. 19
Ebe Filip na nwoke Etiopia nọ ọdụ n’ụgbọ ịnyịnya, ya ana-akọwara nwoke ahụ Akwụkwọ Nsọ. Ụgbọ ịnyịnya ahụ nwere ụkwụ anọ, nweekwa onye na-agba ya.

Ị̀ Maara?

Olee ụdị ụgbọ ịnyịnya nwoke onye Etiopia bụ́ nnukwu mmadụ nọ na-agba mgbe Filip bịakwutere ya?

OKWU Grik a sụgharịrị “ụgbọ ịnyịnya” na Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nwere ike ịpụta ụdị ụgbọ ịnyịnya dị iche iche. (Ọrụ 8:28, 29, 38) Ma, o yikarịrị ka ụdị ụgbọ ịnyịnya nwoke Etiopia ahụ na-agba ò buru ibu karịa nke a na-eji alụ agha ma ọ bụ nke a na-eji agba ọsọ. Ka anyị lee ihe ụfọdụ mere anyị ji kwuo otú ahụ.

Onye Etiopia ahụ bụ nnukwu mmadụ. O mekwara njem dị ezigbo anya. Ọ bụ “nnukwu mmadụ n’obí eze nwaanyị ndị Etiopia. Aha eze nwaanyị a bụ Kandesi. Ọ bụ nwoke ahụ na-elekọta akụ̀ niile eze nwaanyị a nwere.” (Ọrụ 8:27) Ebe bụ́ Etiopia n’oge ochie bụ ebe bụ́ Sudan ugbu a na ụfọdụ ebe n’ebe ndịda ebe a na-akpọ Ijipt ugbu a. Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ọ bụghị otu ụgbọ ịnyịnya ka o ji mee njem ya niile, ma ọ ga-abụrịrị na o nwere ibu ndị o ji na-aga njem ahụ dị ezigbo anya. Ụfọdụ n’ime ụgbọ ịnyịnya ndị a na-agba n’oge ndịozi Jizọs e ji ebu ndị na-eme njem na-enwe ụkwụ anọ, e jirikwa ihe kpuchie elu ya. Otu akwụkwọ aha ya bụ An Exegetical Commentary sịrị: “Ụdị ụgbọ ịnyịnya a na-enwe ohere ebe a ga-etinye akpa na ihe ndị ọzọ nke ga-eme ka njem dịrị onye ahụ mfe, meekwa ka ọ dị mfe mmadụ iji ya gaa ebe dị ezigbo anya.”

Nwoke Etiopia ahụ na-agụ akwụkwọ mgbe Filip bịakwutere ya. Baịbụl kwuru, sị: “Filip wee gbara ọsọ gaa n’akụkụ ụgbọ ahụ ma nụ ka nwoke [Etiopia] ahụ na-agụpụta akwụkwọ Aịzaya onye amụma.” (Ọrụ 8:30) Ụgbọ ịnyịnya e ji eme njem anaghị agba oké ọsọ. Otú ọ na-esi eji nwayọọ aga mere ka ọ dịrị nwoke Etiopia ahụ mfe ịnọ na ya na-agụ akwụkwọ, meekwa ka ọ dịrị Filip mfe iji ụkwụ chụkwute ya.

Nwoke Etiopia ahụ gwara “Filip ka ọ rịgota soro ya nọdụ ala.” (Ọrụ 8:31) N’ụgbọ ịnyịnya ndị nke a na-eji agba ọsọ, ndị na-anọ na ya na-akwụ ọtọ. Mana na nke a na-eji eme njem, ọ ga-abụ na e nwere ohere ebe nwoke Etiopia ahụ na Filip ga-anọdụ ala.

N’ihi ihe e kwuru n’Ọrụ Ndịozi isi 8, nakwa ihe ndị ọzọ a chọpụtarala mere eme, ihe ndị a na-ese n’akwụkwọ anyị na nso nso a na-egosi na nwoke Etiopia ahụ nọ n’ụgbọ ịnyịnya buru ibu, ọ bụghị nke obere a na-eji alụ agha ma ọ bụkwanụ nke a na-eji agba ọsọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya