Okwu Mmalite
Ị̀ chọrọ ibi n’ụwa agha na-adịghị na ya? Ọtụtụ ndị chere na ọ gaghị ekwe omume. Baịbụl kwuru ihe mere mbọ ndị mmadụ na-agba ka agha kwụsị ji akụ afọ n’ala. O kwukwara ihe mere obi ga-eji sie gị ike na udo ga-adịli n’ụwa niile nakwa na ọ ga-enwe isi n’oge na-adịghị anya.
Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị e dere ihe ha kwuru n’akwụkwọ a abụghị ezigbo aha ha.