Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • yb15 p. 16-p. 17 para. 4
  • Ngalaba Na-ahụ Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’Ụwa Niile

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ngalaba Na-ahụ Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’Ụwa Niile
  • Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2015
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otú A Ga-esi Na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze Ngwa Ngwa
    Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2016
  • Ịrụ Ụlọ Ndị E Ji Na-eto Jehova
    Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!
  • Gịnị Mere Anyị Ji Arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze? Oleekwa Otú E Si Enweta Ego E Ji Arụ Ha?
    Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
  • Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze na Nigeria
    Ozi Alaeze Anyi—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2015
yb15 p. 16-p. 17 para. 4
Foto dị na peeji nke 16

IHE NDỊ E MERE N’AFỌ GARA AGA

Ngalaba Na-ahụ Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’Ụwa Niile

OTÚ ọtụtụ ndị si na-abata ná nzukọ Jehova taa emeela ka ọ dị mkpa na a ga-arụkwu Ụlọ Nzukọ Alaeze, Ụlọ Mgbakọ, ụlọ akwụkwọ ebe nzukọ Jehova na-azụ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị, nakwa Ọfis Ndị Nsụgharị. Nke a emeekwala ka ọ dị mkpa na a ga-arụ ihe ụfọdụ n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị iche iche. N’ihi ya, n’ọnwa Ọktoba afọ 2013, Òtù Na-achị Isi hiwere ngalaba ọhụrụ ga-eme ka a gbapụ ọrụ ise ụkpụrụ ụlọ na ịrụ ha arụ ọsọ, nakwa ịrụzigharị ndị nke a rụrụla arụ na ilekọta ha otú na-agaghị efu oké ego ma ọ bụ rie oge. Aha a kpọrọ ya bụ Ngalaba Na-ahụ Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’Ụwa Niile. Ngalaba a dị n’isi ụlọ ọrụ anyị dị na Bruklin, Niu Yọk. Ọ bụ Kọmitii Mbipụta nke Òtù Na-achị Isi na-elekọta ngalaba a.

Ngalaba Na-ahụ Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ná Mpaghara Dị Iche Iche n’Ụwa, bụ́ ndị e nwere n’alaka ụlọ ọrụ anyị ndị dị n’Ọstreleshia, Sentral Yurop, Saụt Afrịka, nakwa n’Amerịka nọ n’okpuru Ngalaba Na-ahụ Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’Ụwa Niile. Ọ bụ ngalaba ndị a na-ahụ maka ise ụkpụrụ ụlọ, ịrụ ha arụ, na ilekọta ha ná mpaghara ụwa nke ha nakwa ịhụ na a na-arụpụta Ụlọ Nzukọ Alaeze ngwa ngwa. N’oge gara aga, ọ bụ Kọmitii Na-ahụ Maka Iwu Ihe Owuwu n’Ógbè na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ná mba ụfọdụ. Ma, ná mba ndị na-abaghị ọgaranya, a na-esi ná ndokwa e mere maka mba ndị na-enweghị ego arụrụ ha nke ha. Ma ugbu a, e jikọtala ụzọ abụọ a ọnụ ka e nwee ike gbapụkwuo ọrụ a ọsọ.

E hiwere Ngalaba Na-ahụ Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’alaka ụlọ ọrụ niile iji hazie ọrụ iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze na Ụlọ Mgbakọ ngwa ngwa. Ọ bụ Kọmitii Alaka ka ngalaba a ga na-akọrọ otú ọrụ ha si aga. Otu ihe magburu onwe ya n’ihe a a gbanwere bụ na alaka ụlọ ọrụ ọ bụla nwere ike ịhọpụta ụmụnna ndị ọrụ ha ga-abụ inyere ọgbakọ dị iche iche aka ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze na Ụlọ Mgbakọ.

N’ọnwa Eprel afọ 2014, nnukwu ọrụ ndị e ji n’aka karịrị narị abụọ na iri asaa. Ụfọdụ n’ime ha bụ Ọfis Ndị Nsụgharị iri itoolu, ụlọ mgbakọ iri atọ na ise, na narị alaka ụlọ ọrụ na iri atọ a na-arụ ọrụ na ha. Ụlọ Nzukọ Alaeze dịkwa oké mkpa n’ebe dị iche iche. E nwere ihe karịrị puku Ụlọ Nzukọ Alaeze iri na anọ a na-arụ ọhụrụ ma ọ bụ na-arụzigharị arụzigharị.

N’eziokwu, okwukwe anyị na-esikwu ike ka anyị na-ahụ ka ụmụnna anyị si ná mba dị iche iche, agbụrụ dị iche iche, na asụsụ dị iche iche na-abịakọta ọnụ soro na-arụ ụlọ ndị na-ewetara aha nsọ Jehova otuto ma na-ebuli ya elu. Otu nwanna aha ya bụ Dan Molchan, onye na-arụ ọrụ n’ọfis Kọmitii Na-ahụ Maka Ndị Na-arụ Ọrụ na Betel kwuru, sị: “Ihe a ga-arụ arụ ka dị ọtụtụ. Ọ bụ ya mere obi ji atọ anyị ụtọ na ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwaanyị na-echeta anyị n’ekpere ma na-enye onyinye iji na-akwado ọrụ a. Ma, ndị anyị kacha ekele bụ ndị nke wepụtara onwe ha na-arụ ọrụ a.”

N’ỌNWA EPREL AFỌ 2014, NNUKWU ỌRỤ E JI N’AKA KARỊRỊ 270 ỤFỌDỤ N’IME HA BỤ:

  • Ọfis Ndị Nsụgharị 90

  • Ụlọ Mgbakọ 35

  • Alaka Ụlọ Ọrụ 130

Ụlọ Nzukọ Alaeze dịkwa oké mkpa n’ebe dị iche iche. E nwere ihe karịrị Ụlọ Nzukọ Alaeze 14,000 a na-arụ ọhụrụ ma ọ bụ na-arụzigharị arụzigharị.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya