Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwhf isiokwu 28
  • Otú Ị Ga-esi Abụ Ezigbo Nna

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú Ị Ga-esi Abụ Ezigbo Nna
  • Ihe Ndị Ga-enyere Ezinụlọ Aka
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị bụ ọrụ nna?
  • Olee otú ọrụ nna si pụọ iche?
  • Ndị nna na ụmụ ha ndị nwaanyị
  • Otú Ụmụ Si Agbanwe Ndụ Di na Nwunye
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Gwa Ha na Ị Hụrụ Ha n’Anya
    Ihe Ndịàmà Jehova Kọrọ
  • Ndị Nna Gbahapụrụ Ibu Ọrụ Ha—Hà Pụrụ Ịgbahapụ Ya n’Ezie?
    Teta!—2000
  • Otú Mmadụ Ga-esi Bụrụ Ezigbo Nna
    Teta!—2013
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Ndị Ga-enyere Ezinụlọ Aka
ijwhf isiokwu 28
Ebe otu nwoke na nwa ya nwaanyị na-achị ọchị ka ha na-aga n’ụzọ.

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | ỊZỤ ỤMỤ

Otú Ị Ga-esi Abụ Ezigbo Nna

Ihe ndị a ga-ekwu n’isiokwu a

  • Gịnị bụ ọrụ nna?

  • Olee otú ọrụ nna si pụọ iche?

  • Ndị nna na ụmụ ha ndị nwaanyị

  • Ndụmọdụ ga-enyere ndị nna aka

Gịnị bụ ọrụ nna?

  • Mgbe nwunye gị dị ime. Otú i si emeso nwunye gị n’oge a ga-egosi ụdị nna ị ga-abụ n’ọdịnihu. Akwụkwọ bụ́ Do Fathers Matter? kwuru, sị:

    “Ọ bụrụ na nwoke ana-enyere nwunye ya dị ime aka na-azụta ihe, na-edu ya aga ụlọ ọgwụ, nọrọkwa ya mgbe a na-ele nwunye ya ahụ́ ka a mata otú nwa o bu n’afọ si eku ume, ya na nwunye ya na nwa ahụ ga na-emekọ ihe nke ọma ma a mụọ ya.”

    “Mgbe nwunye m dị ime, m nyeere ya aka otú m nwere ike maka na achọghị m ka ọ dị ya ka ime ahụ ọ dị agbasaghị m. Ọ bụ mụ na ya gbakọrọ aka dozie ebe nwa anyị ga-anọ ma a mụọ ya. Oge ahụ mụ na nwunye m ji na-ahazi ihe maka nwa ọhụrụ anyị pụrụ nnọọ iche.”​—James.

    Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Unu achọla ihe ga-adị naanị onwe unu mma, kama na-achọkwanụ ihe ga-adị ndị ọzọ mma.”​—Ndị Filipaị 2:4.

  • Mgbe nwunye gị mụrụ nwa. Gị na nwa gị ga-adị n’ezigbo mma ma ị na-egwusa ya egwu, na-ekukwa ya. N’ihi ya, soro na-elekọta nwa gị. Otú i si enye aka na-elekọta nwa gị ga-eso ekpebi otú ọ ga-esi na-akpa àgwà ma o tolitewe. Mbọ ị na-agba ka gị na nwa gị dị ná mma na-egosi na ị hụrụ ya n’anya.

    “Soro nwa gị na-egwu egwu. Na-eme ihe ọ ga-eji chịa ọchị. Tụsara ahụ́, ekwela ka obere ihe ọ bụla wee gị iwe. Cheta na ọ bụ n’aka gị bụ ebe mbụ nwa gị ga-esi mata ihe bụ ịhụnanya.”​—Richard

    Ebe otu nwoke ku nwa ọhụrụ ya.

    Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Ụmụ bụ onyinye si n’aka Jehova. Mkpụrụ nke afọ bụ ụgwọ ọrụ Chineke na-akwụ.”​—Abụ Ọma 127:3.

  • Mgbe nwa gị na-etolite. Nchọpụta e mere gosiri na ụmụaka ndị ha na nna ha dị ná mma na-eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ, ha anaghị echegbukarị onwe ha, ha anaghịkwa esokarị ná ndị na-aṅụ ọgwụ ọjọọ ma ọ bụ ndị na-eme isi ike. Wepụta oge iji mee ka gị na nwa gị dịrị n’ezigbo mma.

    “Nwa m nwoke gwara m na o mechaa kwapụ n’ụlọ anyị, ihe ga-akacha ewute ya bụ na mụ na ya agaghịzi na-akpa nkata otú anyị na-eme ma anyị nọrọ n’ụgbọala na-aga ihe ma ọ bụ anyị riwe nri abalị. Mgbe anyị kparịtara gbasara ụfọdụ ihe ndị dị ezigbo mkpa bụdị mgbe m na-atụghị anya ya. Ihe mere anyị ji nwee ike ịkparịta ihe ndị ahụ bụ maka na mụ na ya na-anọrị ọtụtụ mgbe.”​—Dennis

    Ebe otu nwoke na nwa ya nwoke na-eto eto na-achị ọchị ka ha na-akparịta ụka n’ụgbọ epeepe.

    Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Kpacharanụ nnọọ anya ka unu ghara ịna-akpa àgwà ka ndị na-amaghị ihe, kama na-akpanụ àgwà ka ndị ma ihe. Na-ejinụ oge unu eme ihe kacha mkpa.”​—Ndị Efesọs 5:15, 16.

Olee otú ọrụ nna si pụọ iche?

Ọtụtụ ndị na-eche na ọ bụ ndị nna kwesịrị ịna-akpa afọ ezinụlọ ha ma na-echebe ha, ndị nne ana-arụ ọrụ ụlọ ma na-elekọta ndị ezinụlọ ha. (Diuterọnọmi 1:31; Aịzaya 49:15) N’ezinụlọ ụfọdụ, ndị nna nwere ike ịna-eme ihe ụfọdụ ndị nne kwesịrị ịna-eme, ndị nne ana-emekwa ihe ụfọdụ ndị nna kwesịrị ịna-eme. N’agbanyeghị otú ihe dị, ndị na-eme nchọnchọ kwuru na nna na nne nwere ọrụ pụrụ iche onye nke ọ bụla ga na-arụ n’ịzụ ụmụ.a

Otu nwaanyị aha ya bụ Judith Wallerstein, onye na-eme nchọnchọ n’okwu gbasara ezinụlọ, kọrọ ihe mere ya nke mere ka ihe a na-ekwu dokwuo anya. O dere, sị: “Mgbe ụgbọala kụturu nwa m nwaanyị dị afọ iri na abụọ, ọ gwara papa ya ka o soro ya nọrọ n’ụgbọala e ji ebu ndị merụrụ ahụ́ n’ihi na obi siri ya ike na papa ya ga-echebe ya. Ma mgbe ọ nọ n’ụlọ ọgwụ, ọ gwara m ka mụnwa nọnyere ya ka m wee lekọta ya.b

“Nna na-echebe ndị ezinụlọ ya ma na-eme ka ihe na-aga aga, o nwekwara ike isiri nne ike ime ihe ndị a. Ma, ọ bụ nne na-eme ka ụmụ ha ghọta na ha hụrụ ha n’anya, ọ na-agbakwa mbọ ịghọta otú obi dị ha. N’ihi ya, nne na nna na-arụkọ ọrụ.”​—Daniel

Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Nwa m, nabata aka ná ntị nna gị na-adọ gị, ahapụkwala ntụziaka nne gị nyere gị.”​—Ilu 1:8.

Ndị nna na ụmụ ha ndị nwaanyị

Ọ bụ gị bụ́ nna ga-akụziri nwa gị nwaanyị otú ụmụ nwoke kwesịrị isi na-emeso ya. Ọ ga-esi n’ụzọ abụọ ndị a mụta ya:

  • Otú i si emeso mama ya. Ọ bụrụ na ị na-eme ihe ndị gosiri na ị hụrụ nwunye gị n’anya, na-akwanyekwara ya ùgwù, nwa gị nwaanyị ga-amata ụdị àgwà onye ọ ga-achọ ịlụ kwesịrị inwe.​—1 Pita 3:7.

    Ebe otu nwa agbọghọ na-ele nne na nna ya anya ebe ha na-eri nri, na-achị ọchị. Nna ya jidere nne ya aka ka ha na-achị ọchị.
  • Otú i si emeso ya. Ọ bụrụ na ị na-akwanyere nwa gị nwaanyị ùgwù, ọ ga-amụta ịkwanyere onwe ya ùgwù. Ọ ga-amụtakwa na ọ bụ otú ahụ ka ụmụ nwoke ndị ọzọ kwesịrị isi na-emeso ya.

    Ma, ọ bụrụ na nna ana-akatọ nwa ya nwaanyị oge niile, ihere onwe ya ga na-eme ya. O nwekwara ike ime ka nwa ahụ chọwa ụmụ nwoke ndị ga-anabata ya, ụmụ nwoke ndị ahụ nwekwara ike ibu ihe ọjọọ n’obi.

    “Ọ bụrụ na nna hụrụ nwa ya nwaanyị n’anya ma na-akwado ya, ọ ga-esi ike nwa ya nwaanyị ekweta ịlụ nwoke na-enweghị àgwà ọma.”​—Wayne

a E nweela ọtụtụ ndị nne naanị ha zụrụ ụmụ ha, ụmụ ha ana-emekwa nke ọma.

b Akụkọ a si n’akwụkwọ bụ́ The Unexpected Legacy of Divorce.

Ndụmọdụ ga-enyere ndị nna aka

Gregory, nwunye ya bụ́ Audrey, na nwa ha nwaanyị bụ́ Olivia.

“Nwa gị nwaanyị ghọwa nwa agbọghọ, wepụtakwuo oge ka gị na ya na-anọrị. Mee ka obi sikwuo ya ike na ị ka hụrụ ya n’anya otú ahụ isi hụ ya oge ọ ka bụ nwata. Ime otú ahụ ga-eme ka obi ruo ya ala, obi esiekwa ya ike ịbịakwute gị kọọrọ gị ihe ọ bụla. Ọ bụrụ na ị naghị enwe ohere, ọ ga-achọpụta ya, chọwazie onye ọzọ ga-ege ya ntị.”​—Gregory, na nwunye ya bụ́ Audrey, na nwa ha nwaanyị bụ́ Olivia.

Nchịkọta: Olee otú m ga-esi abụ ezigbo nna?

  • Na-enyere nwunye gị aka mgbe ọ dị ime. Ihe ndị ị na-eme mgbe nwunye gị dị ime ga-egosi ụdị nna ị ga-abụ ma a mụọ nwa gị.

  • Gbalịa ka gị na nwa gị na-adị ná mma ka ọ na etolite. Ụmụaka ndị ha na nna ha dị n’ezigbo mma na-aka eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ, ha anaghị echegbukarị onwe ha, ha anaghịkwa esokarị ná ndị na-aṅụ mmanya na-aba n’anya ma ọ bụ ọgwụ ọjọọ.

  • Bụrụ ezigbo di. Ụmụ gị ndị nwaanyị ga-amụta otú ụmụ nwoke kwesịrị isi na-akpaso ha àgwà ma ọ bụrụ na ị na-eme ihe ndị gosiri na ị hụrụ nwunye gị n’anya ma na-akwanyere ya ùgwù.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya