Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mrt isiokwu 32
  • Ekwela Ka E Jiri Akụkọ Ụgha Duhie Gị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ekwela Ka E Jiri Akụkọ Ụgha Duhie Gị
  • Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụmụaka na Ebe A Na-ezirịta Ozi n’Ịntanet—Nke 1: M̀ Kwesịrị Ịhapụ Nwa M Ka Ọ Na-aga Ebe A Na-ezirịta Ozi n’Ịntanet?
    Ihe Ndị Ga-enyere Ezinụlọ Aka
  • Zere Akụkọ Ndị Na-abụghị Eziokwu
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2023
  • Ebe A Na-ezirịta Ozi n’Ịntanet Ọ̀ Na-akpa Nwa Gị Aka Ọjọọ?—Otú Baịbụl Ga-esi Nyere Ndị Nne na Nna Aka
    Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Otu Nnukwu Onye Ọrụ Ahụ́ Ike Ekwuola na Ịntanet Nwere Ike Ịkpa Ndị Na-eto Eto Aka Ọjọọ​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
    Isiokwu Ndị Ọzọ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Isiokwu Ndị Ọzọ
mrt isiokwu 32
Ebe otu nwoke na-eche akụkọ nke ọ ga-ewere n’ime akụkọ ọtụtụ ndị na-egosi ya.

Ekwela Ka E Jiri Akụkọ Ụgha Duhie Gị

Taa, ọ dịzi ezigbo mfe inweta akụkọ ma ọ bụ ozi, ma ndị nke nwere ike inyere gị aka izere nsogbu ma ndị nke na-ekwu gbasara ahụ́ ike. Ma, ka ị na-achọ ihe ndị a, i kwesịrị ịkpachara anya maka ndị nke na-abụghị eziokwu, dị ka:

  • Akụkọ na-eduhie mmadụ

  • Akụkọ na-emeghị eme

  • Akụkọ e ji emenye ndị mmadụ ụjọ

Dị ka ihe atụ, mgbe ọrịa koronavaịrọs nọ na-akpa ike, odeakwụkwọ ukwu Òtù Mba Ụwa kwuru ka ndị mmadụ kpachara anya maka akụkọ ụgha dị iche iche a nọ na-akọsa. O kwuru, sị, ‘Ọtụtụ ndị na-agwa ndị mmadụ ihe ha ga-eme ka ahụ́ dị ha mma. Ma, ihe ndị ahụ abụghị ihe ndị dọkịta kwadoro. A na-ekwu ọtụtụ ihe na-abụghị eziokwu na redio nakwa na tiivi. Ndị mmadụ na-akọ akụkọ na-abụghị eziokwu n’Ịntanet iji menye ndị ọzọ ụjọ. Ha na-ekwu ihe ndị ga-eme ka ndị mmadụ kpọọ ndị na-abụghị ndị obodo ha ma ọ bụ ndị òtù ha asị.’

N’eziokwu, ọ bụghị taa ka akụkọ ụgha malitere. Ma, Baịbụl buru amụma na n’oge anyị, “ndị ajọ mmadụ na ndị nduhie ga na-akakwu njọ, na-eduhie ndị mmadụ, ndị ọzọ ana-eduhiekwa ha.” (2 Timoti 3:​1, 13) Ịntanet na-emezi ka ọ dịrị anyị mfe inweta ozi na-abụghị eziokwu nakwa izigara ya ndị ọzọ ozugbo, si otú ahụ duhie ha n’amaghị ama. Ihe a emeela ka ọtụtụ ozi anyị na-enweta ma n’ekwentị anyị ma n’ebe ndị ọzọ bụrụ akụkọ ụgha nakwa akụkọ ndị e tinyere nnu na ose.

Gịnị ka ị ga-eme ka a ghara iji akụkọ ụgha na akụkọ e ji emenye ndị mmadụ ụjọ duhie gị? Legodị ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru ga-enyere gị aka.

  • Ebe otu nwoke na-eche banyere ihe ọ hụrụ na ihe ọ nụrụ.

    Ekwetala ihe niile ị hụrụ ma ọ bụ nụ

    Ihe Baịbụl kwuru: “Onye na-amaghị ihe na-ekweta ihe niile e kwuru, ma onye ma ihe na-echebara ihe ọ bụla ọ chọrọ ime echiche.”​—Ilu 14:15.

    E nwere ike iduhie anyị ma ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya. Dị ka ihe atụ, chegodị gbasara foto a na-ede ihe na ya ma ọ bụ obere vidio ndị a na-ekesakarị n’Ịntanet iji kpaa ndị mmadụ ọchị. Mmadụ nwere ike iwere foto ma ọ bụ vidio onye ọzọ tinyere, kpatụ ebe ụfọdụ aka ma ọ bụ mee ya otú a ga-aghọta ihe dị iche n’ihe onye mbụ tinyere ya bu n’obi. Ndị mmadụ nwedịrị ike imepụta vidio ebe mmadụ na-eme ihe ma ọ bụ na-ekwu ihe, ma ya abụrụ na onye ahụ emeghị ihe ahụ ma ọ bụ kwuo ihe ahụ n’eziokwu.

    “Ndị ọkachamara achọpụtala na ọtụtụ n’ime akụkọ ụgha ndị dị n’Ịntanet bụ foto ma ọ bụ vidio mmadụ tinyere otú ga-eme ka a ghọta ihe dị iche n’ihe onye mbụ tinyere ya bu n’obi.”​—Axios Media.

    Jụọ onwe gị, sị: ‘Ihe a ọ̀ bụ eziokwu ka ọ̀ bụ naanị ihe e ji mee soro m chịa?’

  • Enyo na-eme ka ihe buo ibu.

    Chee banyere ebe akụkọ ahụ si na ihe ọ na-ekwu

    Ihe Baịbụl kwuru: “Na-achọpụtanụ nke bụ́ eziokwu n’ihe niile.”​—1 Ndị Tesalonaịka 5:21.

    Tupu i kweta akụkọ ma ọ bụ zigawara ya onye ọzọ, ma nke ọtụtụ ndị na-akọ ma nke ị nụrụ ugboro ugboro n’ụlọ ọrụ mgbasa ozi, gbaa mbọ chọpụta ma ọ̀ bụ eziokwu. Olee otú ị ga-esi eme ya?

    Chee echiche ma ebe ị nụrụ ya ma ọ bụ onye kọọrọ gị ya ọ̀ bụ onye ị ga-atụkwasịli obi. Ụfọdụ ụlọ ọrụ mgbasa ozi na òtù dị iche iche nwere ike ịkpatụ akụkọ ha na-akọ aka ka ọ daba n’ihe ha chọrọ ma ọ bụ n’ihe ndị òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ha chọrọ. Chọpụta ma ihe a kọrọ n’otu ụlọ ọrụ mgbasa ozi ọ̀ bụ ihe ụlọ ọrụ mgbasa ozi ọzọ kọrọ gbasara otu akụkọ ahụ. Oge ụfọdụ, ndị enyi anyị nwere ike izitere anyị akụkọ na-abụghị eziokwu n’ozi iimel ma ọ bụ n’Ịntanet n’amaghị ama. N’ihi ya, ekwetala akụkọ ọ bụla mgbe ị na-achọpụtabeghị ebe akụkọ ahụ si.

    Chọpụta ma ihe e kwuru n’akụkọ ahụ ọ̀ bụ otú ihe si kwụrụ n’oge ahụ, bụrụkwa eziokwu. Lee ma ị̀ ga-ahụ ụbọchị a kọrọ akụkọ ahụ na ihe ndị gosiri na akụkọ ahụ mere eme otú e si kọọ ya. Kpachara ezigbo anya ma ọ bụrụ na otú e si kọọ gbasara ihe siri ike meziri ka ihe ahụ yie ihe dị mfe ma ọ bụ na a kọrọ akụkọ ahụ otú ọ ga-eme ka i mee ihe ndị kọrọ ya chọrọ, dị ka iwe iwe, inwe obi ụtọ ma ọ bụ ihe ndị ọzọ.

    “Ịchọpụta ma akụkọ anyị nụrụ ọ̀ bụ eziokwu dị nnọọ mkpa otú ahụ ịkwọ aka si dị mkpa.”​—Sridhar Dharmapuri, onye so ná ndị isi na-ahụ maka ichebe nri n’ụlọ ọrụ Òtù Mba Ụwa.

    Jụọ onwe gị, sị: ‘Akụkọ a ò mere eme ka ọ̀ bụ naanị ihe mmadụ chere ma ọ bụkwanụ ihe a kọrọ naanị otu akụkụ ya?’

  • Ebe e depụtara ihe ụfọdụ.

    Chọpụta nke bụ́ eziokwu, ọ bụghị ihe gịnwa chere

    Ihe Baịbụl kwuru: “Onye tụkwasịrị onwe ya obi dị nzuzu.”​—Ilu 28:26.

    Anyị na-ekwetakarị akụkọ dabara n’ihe anyị bụ n’obi. Ụlọ ọrụ Ịntanet ụfọdụ na-ezitekarịkwara anyị ozi dabara n’ihe anyị chọbụrụ n’Ịntanet ma ọ bụ ihe anyị kwuru na-amasị anyị. Ma ọtụtụ mgbe, ihe anyị chọrọ ịnụ anaghị abụ ihe anyị kwesịrị ịnụ.

    “Ndị mmadụ ga-echebarali ihe echiche. Ma ọtụtụ mgbe, ihe anyị chọrọ, ihe anyị na-atụ anya ya, na ihe anyị na-atụ ụjọ ya nwere ike ime ka anyị kweta akụkọ ọ bụla anyị nụrụ nke dabara n’ihe anyị bu n’obi.”​—Peter Ditto, onye gụrụ gbasara otú ndị mmadụ sị akpa àgwà.

    Jụọ onwe gị, sị: ‘Ihe mere m ji kweta ihe a ọ̀ bụ naanị maka na ọ bụ ụdị ihe m bu n’obi?’

  • Ebe a na-atụnye ozi ma ọ bụ akụkọ ụgha n’ihe a na-ekponye ahịhịa.

    Kwụsị ịkọsa akụkọ ụgha

    Ihe Baịbụl kwuru: “Akọsala akụkọ na-abụghị eziokwu.”​—Ọpụpụ 23:1.

    Cheta na ihe ị kọọrọ ndị ọzọ nwere ike ịgbanwe otú ha si eche echiche na ihe ha na-eme. Ọ bụrụgodi na ị maghị ụma zigara mmadụ ma ọ bụ kọọrọ mmadụ akụkọ ụgha, ọ ka nwere ike ịkpata nsogbu.

    “Ihe kacha mkpa i kwesịrị ime tupu i zigara mmadụ akụkọ ma ọ bụ kọọrọ ya mmadụ bụ ịjụ onwe gị, sị, ʻÈji m n’aka na akụkọ a bụ eziokwu nke na m ga-ezigara ya onye ọzọ?’ Ọ bụrụ na mmadụ niile na-eme ihe a, akụkọ ụgha ga-ebelata n’Ịntanet otú ga-eri onye ọ bụla ọnụ.”​—Peter Adams, onye na-arụ n’ụlọ a na-akpọ News Literacy Project.

    Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ na-akọsa akụkọ a maka na o doro m anya na ọ bụ eziokwu?’

Ihe anyị kwesịrị ịma gbasara akụkọ e ji emenye ndị mmadụ ụjọ

Otu ọkachamara n’ihe gbasara otú ndị mmadụ si akpa àgwà kwuru na ozi na akụkọ ndị a na-akọ iji menye ndị mmadụ ụjọ na-agbanwezi otú ndị mmadụ si eche echiche na ihe ha na-eme karịa otú ọ na-eme n’oge gara aga. Lee ihe i kwesịrị ịma gbasara ụdị akụkọ a.

Gịnị ka akụkọ e ji emenye ndị mmadụ ụjọ pụtara? Ụfọdụ nwere ike ikwu na e nwere òtù ọjọọ siri ezigbo ike ndị na-akpa nkata ịkpata ọgba aghara ma ọ bụ igbu ndị mmadụ.

Ihe mere ụdị akụkọ a ji dị njọ? Akụkọ a kọrọ iji menye ndị ọzọ ụjọ nwere ike ime ka ndị mmadụ nyowe ihe bụ́ eziokwu ụlọ ọrụ mgbasa ozi kwuru enyo. O nwekwara ike ime ka ụfọdụ ndị ghara ikweta ihe bara uru ndị na-ahụ maka ahụ́ ike kwuru ma ọ bụ jụ ndụmọdụ ndị ọzọ nwere ike ịzọ ha ndụ. Ụdị akụkọ a nwekwara ike ime ka a kpọọ ndị ahụ e kwuru na ha kpara nkata ọjọọ asị ma ọ bụ kpata tigbuo zọgbuo.

Gịnị mere ụdị akụkọ a ji ju ebe niile? Akwụkwọ Encyclopædia Britannica kwuru na a na-akọkarị akụkọ e ji emenye ndị mmadụ ụjọ n’oge ọtụtụ ndị na-echegbu onwe ha, oge ihe siri ike, oge ndị mmadụ na-amaghị ihe ha ga-eme. Dị ka ihe atụ, oge a na-alụ agha, oge ihe siri ike n’obodo, nakwa oge ọdachi ndị na-emere onwe ha mechara, dị ka idei mmiri, ala ọma jijiji, na ọrịa ọjọọ na-efe efe. Ebe ọ bụ na obi anaghị eru ndị mmadụ ala n’ụdị oge ndị ahụ, ha na-ekweta akụkọ ndị a maka na ọ na-akwado ihe ha bu n’obi ma ọ bụkwanụ maka na ha chere na o mere ka ha ghọta ihe mere ihe ọjọọ ji eme.

Olee otú Baịbụl ga-esi nyere gị aka izere akụkọ na-emenye ụjọ? Baịbụl kwuru ihe ndị anyị nwere ike ime ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị n’oge ihe siri ike. O kwuru ihe bụ́ isi na-akpata nsogbu ndị anyị na-enwe nakwa otú nsogbu ndị ahụ ga-esi bie. Ị chọọ ịmatakwu ihe ndị a, lee vidio bụ́ Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya