Ọgwụgwụ Ụwa Ọ̀ Dịla Nso? Gịnị Bụ Apọkalips?
Olee ihe na-agbata gị n’uche ma ị nụ okwu ahụ bụ́ “apọkalips”? Ihe na-agbata gị n’uche nwere ike ịbụ ọdachi ga-ezu ụwa niile, nke nwekwara ike ikpochapụ ihe niile dị n’ụwa. Ụfọdụ ndị chere na ụdị ọdachi a ga-eme n’oge na-adịghị anya, karịchaa ma ha gụọ akụkọ ndị dị ka ndị a:
“Agha ọgwụrụmba nwere ike ibido mgbe ọ bụla, ma à kpachara anya bido ya, ma ò mere n’ọghọm, ma ọ bụkwanụ n’ihi na a ghọtahiere ihe.”—Bulletin of the Atomic Scientists.
“N’ime afọ iri gara aga, ajọ ifufe, ọkụ ọgbụgba, ụkọ mmiri ozuzo, oké okpomọkụ, na idei mmiri emebiela ihe n’ebe dị iche iche n’ụwa.”—National Geographic.
“Otú igurube si emebisi ihe ugbu a n’Afrịka akala njọ karịa otú ọ dị n’afọ ndị gara aga.”—The Associated Press.
À na-aga inwe apọkalips ma ọ bụ mbibi zuru ụwa ọnụ? Gịnị ka Baịbụl kwuru?
À ga-ebibi ụwa nkịtị a anyị bi na ya?
Mba. Okwu Chineke bụ́ Baịbụl mere ka obi sie anyị ike na ụwa a ga-adịru mgbe ebighị ebi. (Ekliziastis 1:4) Kama Chineke ga-ebibi ụwa a o kere, ‘ọ ga-ebibi ndị na-ebibi ụwa.’—Mkpughe 11:18.
Ọgwụgwụ ụwa, ò ruwela?
Ụwa Baịbụl kwuru na a ga-ebibi bụ ụmụ mmadụ ndị na-anaghị erubere Chineke isi na ndị na-eme ihe masịrị ha. Dị ka Chineke mere n’oge Noa, ọ ga-ebibi “ụwa ndị na-anaghị asọpụrụ Chineke juru.”—2 Pita 2:5; 3:7.
1 Jọn 2:17 kwuru, sị: “Ụwa na-agafe agafe, ya na ihe na-agụ ya agụụ.” Ihe amaokwu a kwuru gosiri na Chineke agaghị ebibi ụwa nkịtị a, kama ọ ga-ebibi ndị nọgidere na-enupụrụ ya isi.
Olee mgbe ọgwụgwụ ụwa ga-abịa?
Baịbụl agwaghị anyị kpọmkwem mgbe ọgwụgwụ ụwa ga-abịa. (Matiu 24:36) Ma, o kwuru ihe ụfọdụ anyị ga-eji mara na ọgwụgwụ dịzi nso. Lee ihe ụfọdụ o kwuru:
A ga na-enwe ihe ndị dị ka agha, ụkọ nri, ọrịa na-efe efe, na oké ala ọma jijiji “n’ebe dị iche iche.”—Matiu 24:3, 7, 14; Luk 21:10, 11; Mkpughe 6:1-8.
Ọtụtụ ndị ga-abụ ndị na-achọ naanị ọdịmma onwe ha. Dị ka ihe atụ, ha ga-abụ “ndị hụrụ ego n’anya,” “ndị na-anaghị ekele onye meere ha ihe,” na “ndị na-anaghị ejideli onwe ha.”—2 Timoti 3:1-5.
Ọtụtụ ndị kweere na ihe ndị na-eme kemgbe 1914 dabara n’ihe ndị a Baịbụl kwuru, nakwa na ọgwụgwụ dịzi nso. Ị chọọ ịmatakwu gbasara ọgwụgwụ ụwa, gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Ka Ihe Ndị A Kọrọ na Baịbụl Na-egosi Banyere Afọ 1914?” na “Gịnị Ka A Ga-eji Amata ‘Oge Ikpeazụ’ ma Ọ Bụ ‘Oge Ọgwụgwụ’?”
Gịnị ka “apọkalips” pụtara na Baịbụl?
Okwu Grik a sụgharịrị “apọkalips” na Baịbụl pụtara “mkpughe” ma ọ bụ “mmeghe.” A na-ejikarị ya ekwu banyere ihe zoro ezo e mere ka a mata. Baịbụl kwukwara banyere ‘mkpughe [ma ọ bụ apọkalips] Onyenwe anyị Jizọs,’ ya bụ, mgbe a ga-eme ka a mata na ọ bụ Jizọs ka e nyere ikike ibibi ndị ọjọọ niile nọ n’ụwa na ịkwụ ndị na-efe Chineke ụgwọ.—2 Ndị Tesalonaịka 1:6, 7; 1 Pita 1:7, 13.
Aha a kpọrọ akwụkwọ ikpeazụ dị na Baịbụl bụ A·po·kaʹly·psis, ma ọ bụ Mkpughe. Ihe mere e ji kpọọ ya aha a bụ n’ihi na o kpughere ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. (Mkpughe 1:1) Ihe ndị dị n’akwụkwọ Baịbụl ahụ bụ ozi ọma nakwa ozi na-eme ka e nwee olileanya. (Mkpughe 1:3) O kwuru na Chineke ga-eme ka ihe ọjọọ niile kwụsị ma mee ka ụwa ghọọ paradaịs. N’oge ahụ, ihe mgbu, ahụhụ, ma ọ bụdị ọnwụ agaghịzi adị.—Mkpughe 21:3, 4.
Ị̀ ga-achọ ịmatakwu banyere ọmarịcha nkwa ndị a dị na Baịbụl? Ndịàmà Jehova na-enwe mmasị ịmụrụ ndị mmadụ Baịbụl n’anaghị ha ego. Ịmụ Baịbụl ga-abara gị uru. Biko, gwa Ndịàmà Jehova ka ha mụwara gị Baịbụl.