Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 12/1 p. 3-5
  • N’ihi Gịnị Ka E Ji Atụ Ụjọ Apọkalips?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • N’ihi Gịnị Ka E Ji Atụ Ụjọ Apọkalips?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Akụkọ Banyere Ụjọ Apọkalips
  • Ụjọ Apọkalips Ò Ziri Ezi?
  • Apọkalips—È Kwesịrị Ịtụ Ya Egwu Ka E Kwesịrị Ile Anya Ya?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Ọgwụgwụ Ụwa Ọ̀ Dịla Nso? Gịnị Bụ Apọkalips?
    Isiokwu Ndị Ọzọ
  • “Ozi Obi Ụtọ” Sitere n’Apọkalips
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Mkpughe—Mmezu Ya nke Na-enye Obi Ụtọ!
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 12/1 p. 3-5

N’ihi Gịnị Ka E Ji Atụ Ụjọ Apọkalips?

“RUO ọtụtụ iri afọ, ndị kwenyesiri ike n’ozizi bụ́ isi nke ndị Kraịst anọwo na-ebu amụma na ụdị [ụfọdụ] nke ndakpọ zuru ọha mmadụ ga-ewere ọnọdụ n’isi nso,” ka Damian Thompson, bụ́ onye na-ede edemede banyere okpukpe, kwuru na magazin bụ́ Time. “Ugbu a, o juru ha anya na, ọ bụghị nanị na e kwenyesiwo ike n’ihe omume ndị a, kama ọ bụ kpọmkwem ndị ahụ na-akwabu ha emo na-agbasazi ha: ndị na-ede usoro kọmputa ji arụ ọrụ, ndị ndú azụmahịa na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị.” O kwuru na egwu maka ndakpọ kọmputa n’ụwa nile n’afọ 2000 “emewo ka mmadụ ndị na-enwetụghịdị mmasị n’okpukpe ghọọ ndị kwenyere na narị afọ iri ahụ n’ụzọ a na-atụghị anya ya” bụ́ ndị na-atụ egwu ọbịbịa nke ọdachi ndị dị ka “ụjọ ijide ìgwè mmadụ, ndakpọ nke gọọmenti, ọgba aghara maka nri, ụgbọelu ịkpọkanye n’ụlọ elu ndị dị oké elu.”

Tụkwasị ná nchegbu ahụ zuru ọha, e nwere ihe omume na-eweta ahụ erughị ala bụ́ nke obere òtù okpukpe dị iche iche na-eme, bụ́ ndị a na-akpọkarị “nke apọkalips.” Na January 1999, n’otu isiokwu bụ́ “Jerusalem na Opi nke Apọkalips,” akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta kwa ụbọchị na France bụ́ Le Figaro kwuru, sị: “Ndị ọrụ nchebe [Israel] na-eme atụmatụ na ọnụ ọgụgụ ‘ndị kwere na narị afọ iri’ bụ́ ndị nọ n’Ugwu Olive ma ọ bụ nọrọ ya nso na-eche ọnụnọ ahụ ma ọ bụ apọkalips, dị ihe karịrị otu narị.”

Akwụkwọ bụ́ 1998 Britannica Book of the Year bu akụkọ pụrụ iche banyere “Òtù Nzuzo Ụbọchị Ikpe.” N’ime òtù nzuzo ndị ọ na-akpọtụ aha bụ òtù nzuzo na-egbu onwe ha, dị ka Ọnụ Ụzọ Eluigwe, Ụlọ Nsọ Ndị Mmadụ, na Òtù nke Ụlọ Nsọ Anyanwụ, na Aum Shinrikyo (Eziokwu Kasịnụ), bụ́ nke haziri mwakpo ahụ e ji nsí na-egbu egbu mee n’ụzọ okpuru ala dị na Tokyo na 1995, na-egbu mmadụ 12 ma na-emerụ ọtụtụ puku ahụ. N’ịchịkọta akụkọ a, Martin E. Marty, bụ́ profesọ nke okpukpe na Mahadum Chicago, dere, sị: “Ịbanye n’afọ 2000 bụ ihe na-akpali akpali—ọ ga-afọkwa nke nta n’ezie ka ọ kpalite ụdị amụma na ihe omume nile. Ụfọdụ pụrụ ịghọ ihe dị ize ndụ. Ọ ga-abụ oge a na-ekwesịghị iche ihu n’ụzọ ejighị ihe kpọrọ ihe.”

Akụkọ Banyere Ụjọ Apọkalips

Apọkalips, ma ọ bụ Mkpughe, bụ aha akwụkwọ ikpeazụ nke Bible, nke e dere ná ngwụsị nke narị afọ mbụ O.A. N’ịbụ akwụkwọ amụma na nke ji ọtụtụ asụsụ ihe atụ mee ihe, a bịara jiri nkọwaaha bụ́ “nke apọkalips” mee ihe banyere otu ụdị akwụkwọ nke a malitere ide ogologo oge tupu e dee akwụkwọ Bible bụ́ Mkpughe. Ihe onyinyo nke akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme e ji mee ihe n’akwụkwọ a malitere ịdị laa azụ na Peasia oge ochie na ọbụna tupu oge ahụ. N’ihi ya, akwụkwọ bụ́ The Jewish Encyclopedia na-ekwu banyere “ihe ndị pụtara ìhè e ji mara Babilọn bụ́ ndị dị n’ihe ka ọtụtụ n’akụkọ ọdịbendị ahụ na-emeghị eme e debanyere n’akwụkwọ [apọkalips ndị Juu] nke a.”

Akwụkwọ apọkalips nke ndị Juu mụbara site ná mmalite narị afọ nke abụọ T.O.A. ruo n’ọgwụgwụ narị afọ nke abụọ O.A. N’ịkọwa ihe mere e ji dee ihe ndị a, otu ọkà mmụta Bible dere, sị: “Ndị Juu kewara oge nile gaa n’ọgbọ abụọ. E nwere ọgbọ dị ugbu a, bụ́ nke jọrọ njọ n’ozuzu ya . . . Ya mere, ndị Juu cheere maka ngwụsị nke ihe nile dị ka ha si dị. E nwere ọgbọ nke gaje ịbịa bụ́ nke ga-adị mma n’ozuzu ya, ọgbọ ọma nke Chineke bụ́ nke udo, ọganihu na ezi omume ga-adị na ya . . . Olee otú ọgbọ a dị ugbu a ga-esi ghọọ ọgbọ nke gaje ịbịa? Ndị Juu kwere na mgbanwe ahụ apụghị ịbịa ma ọlị site n’ike mmadụ, n’ihi ya kwa, ha tụrụ anya na Chineke ga-etinye aka kpọmkwem. . . . A kpọrọ ụbọchị Chineke ga-abịa Ụbọchị Onyenwe Anyị, ọ gajekwa ịbụ oge dị egwu nke ụjọ na mbibi na ikpe bụ́ nke ga-abụ nsogbụ nke ọgbọ ọhụrụ ahụ. Akwụkwọ apọkalips nile na-ekwu banyere ihe omume ndị a.”

Ụjọ Apọkalips Ò Ziri Ezi?

Akwụkwọ Bible bụ́ Mkpughe na-ekwu banyere “agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile,” ma ọ bụ Amagedọn, bụ́ ebe a ga-ebibi ndị ajọ omume, nke otu puku afọ ga-esochi (nke a na-akpọ Narị Afọ Iri mgbe ụfọdụ) bụ́ mgbe a ga-atụba Setan n’ime abyss, Kraịst ekpeekwa ihe a kpọrọ mmadụ ikpe. (Mkpughe 16:14, 16; 20:1-4) Mgbe Ụwa Na-emepechabeghị Anya, ụfọdụ ndị ghọtahiere amụma ndị a n’ihi na onye Katọlik bụ́ “Senti” Augustine (354-430 O.A.) kwuru na Narị Afọ Iri ahụ malitere n’ọmụmụ Kraịst nakwa na Ikpe Ikpeazụ ahụ ga-esochi ya. Ma eleghị anya, Augustine echebachaghịrị oge ọ ga-ewe echiche, ma ka 1000 afọ nọ na-abịaru nso, ụjọ biiri ọkụ. Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme ekwekọrịtaghị n’otú ụjọ apọkalips a nke mgbe ụwa na-emepechabeghị anya haruru. N’agbanyeghị otú ọ gbasaruru, o mesịrị bụrụ na o zighị ezi.

N’otu aka ahụ taa, ndị okpukpe na ndị nkịtị na-atụ egwu na afọ 2000 ma ọ bụ 2001, ga-eji apọkalips na-eyi egwu bịa. Ma egwu ndị a hà ziri ezi? Ozi dị n’akwụkwọ Bible bụ́ Mkpughe, ma ọ bụ Apọkalips, ọ̀ bụkwa ihe a ga-atụrụ egwu ka ọ̀ bụ, n’ụzọ dị iche, ihe anyị kwesịrị ile anya ya? Biko gụrụ gawa.

[Foto dị na peeji nke 4]

Ụjọ Apọkalips n’oge ụwa na-emepechabeghị anya mesịrị bụrụ nke na-ezighị ezi

[Ebe E Si Nweta Foto]

© Cliché Bibliothèque Nationale de France, Paris

[Ebe e si nweta foto dị na peeji nke 3]

Maya/Sipa Press

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya