Apọkalips—È Kwesịrị Ịtụ Ya Egwu Ka E Kwesịrị Ile Anya Ya?
“Taa Apọkalips abụghị nkọwa nkịtị e nyere na Bible kama ọ ghọwo ihe pụrụ ime nnọọ eme n’ezie.”—Javier Pérez de Cuéllar, onye bụbu odeakwụkwọ ukwu nke Mba Ndị Dị n’Otu.
OTÚ ahụ onye ọchịchị a ma ama n’ụwa si jiri okwu ahụ bụ́ “apọkalips” mee ihe na-egosipụta ụzọ ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ si aghọta ya ma na-ahụ ka e si e ji ya eme ihe n’aha ihe nkiri na akwụkwọ, isiokwu ndị dị na magazin, na akụkọ dị iche iche nke akwụkwọ akụkọ. Ọ na-enye echiche nke mbibi dị ukwuu. Ma gịnị ka okwu ahụ bụ́ “apọkalips” pụtara n’ezie? Nke kakwa mkpa, gịnị bụ ozi dị n’akwụkwọ Bible ahụ a kpọrọ Apọkalips, ma ọ bụ Mkpughe?
Okwu ahụ bụ́ “apọkalips” sitere n’okwu Grik pụtara “imeghe” ma ọ bụ “ikpughe.” Gịnị ka e meghere ma ọ bụ kpughee, ná Mkpughe nke Bible? Ọ̀ bụ nanị ozi mbibi, ihe na-ekwupụta mgbuchapụ nke ọ na-adịghị onye ga-alanarị? Mgbe a jụrụ ya ihe o chere banyere Apọkalips, ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Jean Delumeau, bụ́ onye òtù nke ụlọ akwụkwọ bụ́ Institut de France, kwupụtara, sị: “Ọ bụ akwụkwọ nke nkasi obi na olileanya. Ndị mmadụ ejiwo ihe ndị dị na ya mee ihe nkiri site n’ilekwasị anya n’akụkụ ya ndị na-ekwu banyere ọdachi.”
Chọọchị Oge Mbụ na Apọkalips
Olee otú “ndị Kraịst” oge mbụ si lee Apọkalips na olileanya ndị ọ na-esetịpụ banyere Ọchịchị Puku Afọ (Narị Afọ Iri) nke Kraịst n’elu ala anya? Otu ọkọ akụkọ ihe mere eme ahụ kwuru, sị: “O yiri m ka ndị Kraịst nile biri ndụ na narị afọ ole na ole ndị mbụ hà nakweere nkwenkwe nke narị afọ iri ahụ. . . . Ndị a maara nke ọma n’etiti ndị Kraịst nke narị afọ ndị mbụ bụ́ ndị kwere na Narị Afọ Iri ahụ bụ Papias, bụ́ bishọp nke Hierapọlis n’Asia Minor, . . . Senti Justin, bụ́ onye a mụrụ na Palestine, onye nwụrụ n’ihi okwukwe ya na Rom n’ihe dị ka 165, Senti Irenæus, bụ́ bishọp nke Lyons, onye nwụrụ na 202, Tertullian, bụ́ onye nwụrụ na 222, na . . . onye edemede ukwu bụ́ Lactantius.”
Akwụkwọ bụ́ The Catholic Encyclopedia na-ekwu banyere Papias, bụ́ onye a kọrọ na ọ nwụrụ n’ihi okwukwe ya na Pagamọm na 161 ma ọ bụ 165 O.A., sị: “Bishọp Papias nke Hierapọlis, bụ́ onye na-eso ụzọ St. Jọn, pụtara dị ka onye na-akwado olileanya nke narị afọ iri ahụ. Ọ zọọrọ na ya natara ozizi ya site n’aka ndị biri ndụ n’oge Ndị Ozi, Irenæus kọkwara na ‘ndị Okenye’ ndị ọzọ, bụ́ ndị hụworo ma nụ okwu Jọn onye ahụ na-eso ụzọ, mụtara n’aka ya ikwere na narị afọ iri ahụ dị ka akụkụ nke ozizi nke Onyenwe anyị. Dị ka Eusebius si kwuo . . . Papias kwuru n’akwụkwọ ya na otu puku afọ nke alaeze elu ala dị ebube a na-ahụ anya nke Kraịst ga-esochi mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ.”
Gịnị ka nke a na-agwa anyị banyere mmetụta nke akwụkwọ bụ́ Apọkalips, ma ọ bụ Mkpughe, nwere n’ebe ndị kwere ekwe oge mbụ nọ? Ọ̀ kpaliri egwu ka ọ̀ bụ olileanya? Ọ dị mma ịmara na ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na-akpọ ndị Kraịst oge mbụ ndị kwere na narị afọ iri, nke sitere n’okwu Grik bụ́ khiʹli·a eʹte (puku afọ). Ee, a maara ọtụtụ n’ime ha ịbụ ndị kwere n’Ọchịchị Puku Afọ Kraịst, bụ́ nke ga-ewebata ọnọdụ paradaịs n’elu ala. Nanị otu ebe e kwuru banyere olileanya narị afọ iri ahụ kpọmkwem n’ime Bible bụ n’Apọkalips, ma ọ bụ Mkpughe. (20:1-7) Ya mere, kama imenye ndị kwere ekwe ụjọ, Apọkalips nyere ha olileanya dị ebube. N’akwụkwọ ya bụ́ The Early Church and the World, onye profesọ akụkọ ihe mere eme nke chọọchị n’ụlọ akwụkwọ Oxford bụ́ Cecil Cadoux na-ede, sị: “Echiche nke ikwere na narị afọ iri, ọ bụ ezie na e mesịrị jụ ya, bụ nke e nwere n’ụzọ sara mbara na Chọọchị ruo ogologo oge, bụ́ nke ụfọdụ ndị edemede a kasị akwanyere ùgwù nọ na-akụzi.”
Ihe Mere E Ji Jụ Olileanya Apọkalips Ahụ
Ebe ọ bụ akụkọ ihe mere eme a na-apụghị ịgbagha agbagha na ọtụtụ, ma ọ bụrụ na ọ bụghị ihe ka n’ọnụ ọgụgụ, n’etiti ndị Kraịst oge mbụ nwere olileanya n’Ọchịchị Narị Afọ Iri nke Kraịst n’elu ụwa paradaịs, olee otú o si bụrụ na ‘e mesịrị jụ echiche dị otú ahụ nke ikwere na narị afọ iri’? Ụfọdụ nkatọ ziri ezi bilitere n’ihi na, dị ka ọkà mmụta bụ́ Robert Mounce si kọwaa, “n’ụzọ dị mwute, ọtụtụ ndị kwere na narị afọ iri kwere ka ihe ha na-eche n’echiche gabiga ókè ma na-akọwa oge puku afọ ahụ n’ụzọ nile nke ịhụ ihe onwunwe na ihe ụtọ n’anya n’ụzọ gabigara ókè.” Ma a pụrụ ịgbaziwo echiche nke ndị a na-emebiga ihe ókè n’ajụghị ezi olileanya nke Narị Afọ Iri ahụ.
Ihe na-eju anya n’ezie bụ ụzọ ndị iro si mee ihe iji bịanyụọ olileanya nke narị afọ iri ahụ. Akwụkwọ bụ́ Dictionnaire de Théologie Catholique na-ekwu banyere onye ụkọchukwu bụ́ onye Rom bụ́ Caius (ngwụsị nke narị afọ nke abụọ, mmalite nke atọ) na “iji bịanyụọ olileanya narị afọ iri ahụ, ọ gọnahụrụ n’ụzọ doro anya izi ezi nke Apọkalips [Mkpughe] na Oziọma nke St. John.” Akwụkwọ Dictionnaire a kwukwara na Daịọnisiọs, bụ́ bishọp narị afọ nke atọ nke Aleksandria, dere ihe odide megide olileanya nke narị afọ iri ahụ na “iji gbochie ndị kwere n’echiche a ihiwe nkwenkwe ha isi n’Apọkalips nke Senti Jọn, ọ laghị azụ n’ịgọnahụ izi ezi ya.” Oké mmegide obi ilu dị otú ahụ e nwere n’ebe olileanya nke ngọzi ndị narị afọ iri ahụ ga-eweta n’elu ala dị na-egosipụta mmetụta na-apụtachaghị ìhè nke nọ n’ọrụ n’etiti ndị ọkà mmụta okpukpe n’oge ahụ.
N’akwụkwọ ya bụ́ The Pursuit of the Millennium, Prọfesọ Norman Cohn na-ede, sị: “E mere mgbalị mbụ na narị afọ mbụ ime ka a ghara ikwere n’olileanya nke narị afọ iri ahụ, mgbe Origen, bụ́ ikekwe onye kasị nwee ikike n’ime ndị ọkà mmụta okpukpe nile nke Chọọchị oge ochie, malitere igosipụta Alaeze ahụ dị ka ihe omume na-agaghị ewere ọnọdụ n’ụzọ nkịtị kama nanị n’obi ndị kwere ekwe.” N’ịdabere na nkà ihe ọmụma ndị Gris kama ịbụ na Bible, Origen gwagburu olileanya ahụ dị ebube bụ́ ngọzi elu ala n’okpuru Alaeze Mesaịa ahụ gaa n’ịbụ ‘ihe omume a na-apụghị ịghọta aghọta n’obi nke ndị kwere ekwe.’ Onye Katọlik na-ede akwụkwọ bụ́ Léon Gry dere, sị: “Mmetụta juru ebe nile nke nkà ihe ọmụma ndị Gris . . . ji nwayọọ nwayọọ weta ọdịda nke echiche Ikwere na Narị Afọ Iri.”
“Ozi Olileanya nke Chọọchị Efunahụwo Ya”
Obi abụọ adịghị ya na Augustine bụ Nna Chọọchị nke mere ihe kasịnụ n’ijikọta nkà ihe ọmụma ndị Gris na ihe bụ nanị ihe yiri Iso Ụzọ Kraịst n’oge ya. N’ịbụ onye na-akwado olileanya narị afọ iri ahụ na mbụ, o mesịrị jụ echiche ọ bụla nke Ọchịchị Narị Afọ Iri nke Kraịst ga-achị n’ụwa n’ọdịnihu. Ọ kọwara Mkpughe isi nke 20 dị ka ihe omimi.
Akwụkwọ bụ́ The Catholic Encyclopedia na-ekwu, sị: “Augustine mesịrị kwenye na narị afọ iri ọ bụla agaghị adị. . . . Ọ na-agwa anyị na mbilite n’ọnwụ mbụ ahụ nke isiakwụkwọ a na-ekwu banyere ya, na-ezo aka n’ịmụ ọzọ n’ụzọ ime mmụọ site na baptism; ụbọchị izu ike nke otu puku afọ mgbe puku afọ isii nke akụkọ ihe mere eme gasịrị, bụ ndụ ebighị ebi dum.” The New Encyclopædia Britannica na-ekwu, sị: “Nkọwa ihe atụ nke Augustine banyere narị afọ iri ahụ ghọrọ ozizi nke chọọchị naara . . . Ndị Protestant bụ́ Ndị Mgbanwe nke ọdịnala okpukpe Lutheran, ndị òtù Calvin, na okpukpe Anglịkan . . . rapagidesiri ike n’echiche Augustine.” N’ihi ya, a napụrụ ndị òtù nke chọọchị nile nke Krisendọm olileanya nke narị afọ iri ahụ.
Ọzọkwa, dị ka ọkà mmụta okpukpe bụ́ onye Switzerland bụ́ Frédéric de Rougemont si kwuo, “site n’ịjụ okwukwe mbụ o nwere n’ọchịchị puku afọ ahụ, [Augustine] mebiri Chọọchị ahụ n’ụzọ dị nnọọ ukwuu. N’iji ikike dị ukwuu nke o nwere mee ihe, ọ kwadoro mmehie ihe nke napụrụ [Chọọchị ahụ] ihe mgbaru ọsọ elu ala ya.” Onye Germany bụ́ ọkà mmụta okpukpe bụ́ Adolf Harnack kwenyere na ọjụjụ a jụrụ nkwenkwe Narị Afọ Iri ahụ napụrụ ndị nkịtị “okpukpe ha ghọtara,” na-eji “okpukpe ha na-apụghị ịghọta” dochie “okpukpe ochie ahụ na olileanya ochie ahụ.” Chọọchị ndị tọgbọrọ chakoo taa n’ọtụtụ ala bụ ihe àmà siri ike na ndị mmadụ chọrọ okpukpe na olileanya ha pụrụ ịghọta.
N’akwụkwọ ya bụ́ Highlights of the Book of Revelation, ọkà mmụta Bible bụ́ George Beasley-Murray dere, sị: “N’ụzọ bụ́ isi, n’ihi ikike dị ukwuu nke Augustine n’otu akụkụ na nnakwere ịrọ òtù dị iche iche nakweere olileanya narị afọ iri ahụ n’akụkụ nke ọzọ, ndị Katọlik na ndị Protestant ejikọwo aka n’ịjụ ya. Mgbe a jụrụ ha olileanya ọzọ ha nwere maka mmadụ n’ụwa a, azịza bụ́ isi a na-enye bụ: Ọ dịghị ma ọlị. A ga-ebibi ụwa ná mbịarute Kraịst iji mee ohere maka eluigwe na hel ebighị ebi bụ́ ebe a ga-echefu akụkọ ihe mere eme echefu. . . . Ozi olileanya nke chọọchị efunahụwo ya.”
Olileanya Dị Ebube nke Apọkalips Ka Dị Adị!
N’akụkụ nke ha, Ndịàmà Jehova kwenyesiri ike na a ga-emezu nkwa ndị dị ebube banyere Narị Afọ Iri ahụ. Mgbe a gbara ya ajụjụ ọnụ n’ihe omume telivishọn e mere n’asụsụ French nke isiokwu ya bụ́ “Afọ 2000: Egwu Apọkalips,” onye France bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Jean Delumeau kwuru, sị: “Ndịàmà Jehova na-agbaso kpọmkwem echiche nke olileanya narị afọ iri ahụ, n’ihi na ha na-asị na n’isi nso . . . anyị ga-abanye—ọ bụ ezie na ọ bụ gabiga mbibi—n’oge nke 1,000 afọ nke obi ụtọ.”
Nke a bụ nnọọ ihe Jọn onyeozi hụrụ n’ọhụụ ma kọwaa n’akwụkwọ ya bụ́ Apọkalips, ma ọ bụ Mkpughe. O dere, sị: “M wee hụ eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ: . . . M wee nụ oké olu ka ọ na-esi n’ocheeze ahụ daa, sị, Lee, ụlọikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ, Ọ ga-ebinyekwara ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke Ya, Chineke Onwe ya ga-anọnyekwara ha, bụrụkwa Chineke ha: Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.”—Mkpughe 21:1, 3, 4.
Ndịàmà Jehova nọ n’ọrụ nkụzi Bible zuru ụwa ọnụ iji mee ka ọtụtụ ndị, dị ka ọ pụrụ ikwe mee, nwee ike ịnabata olileanya a. Ha ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka ịmụtakwu banyere ya.
[Foto dị na peeji nke 6]
Papias zọọrọ na ọ natara ozizi nke Narị Afọ Iri ahụ kpọmkwem site n’aka ndị biri n’oge ndị ozi
[Foto dị na peeji nke 7]
Tertullian kwere n’Ọchịchị Narị Afọ Iri nke Kraịst
[Ebe E Si Nweta Foto]
© Cliché Bibliothèque Nationale de France, Paris
[Foto dị na peeji nke 7]
“Site n’ịjụ okwukwe mbụ o nwere n’ọchịchị puku afọ ahụ, [Augustine] mebiri Chọọchị ahụ n’ụzọ dị nnọọ ukwuu”
[Foto dị na peeji nke 8]
Ụwa Paradaịs ahụ e kwere nkwa ya n’Apọkalips bụ ihe e kwesịrị iji ịnụ ọkụ n’obi na-ele anya ya