Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mrt isiokwu 34
  • Ò Nwere Mgbe Ime Mpụ Ga-akwụsị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ò Nwere Mgbe Ime Mpụ Ga-akwụsị?
  • Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee otú obi na-adị Chineke maka mpụ ndị mmadụ na-eme?
  • Isi ihe na-akpata ime mpụ
  • Otú ime mpụ ga-esi kwụsị
  • Ihe I Nwere Ike Ikwu
    Ozi Alaeze Anyi—2011
  • “Unu Atụla Egwu, Unu Atụkwala Ụjọ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Isiokwu Ndị dị n’Akwụkwọ a
    Teta!—2011
  • Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị A
    Ozi Alaeze Anyi—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Isiokwu Ndị Ọzọ
mrt isiokwu 34
Ebe onye na-agbanyụ ọkụ na-enyere ndị mmadụ aka ka ha si n’ụlọ dara ada pụta.

Ò Nwere Mgbe Ime Mpụ Ga-akwụsị?

Ọ bụrụ na ndị omempụ akpachaa arụ, anyị nwere ike ịjụwa, sị: ‘Ihe banyere anyị ọ̀ na-emetụkwa Chineke n’obi? Gịnị mere ihe ndị a ji eme? Ò nwere mgbe ime mpụa ga-akwụsị? Olee ihe ga-enyere m aka n’ụjọ na-atụ m?’ Baịbụl zara ajụjụ ndị a nke ọma.

Olee otú obi na-adị Chineke maka mpụ ndị mmadụ na-eme?

Chineke kpọrọ tigbuo zọgbuo na ime mpụ asị. (Abụ Ọma 11:5; Ilu 6:​16, 17) Jizọs, bụ́ onye nnọchite anya Chineke, bakwaara ndị na-eso ụzọ ya mba mgbe ha chọrọ ịlụso ndị ọzọ ọgụ. (Matiu 26:​50-52) Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ndị na-eme tigbuo zọgbuo na-ekwu na ha na-eme ya n’aha Chineke, mana ọ bụghị Chineke na-agwa ha mee ya. Ọ naghịdị ege ntị n’ekpere ha.​—Aịzaya 1:15.

Chineke na-eche banyere ndị niile na-ata ahụhụ, ma ndị nke na-ata ahụhụ n’ihi ihe ndị omempụ mere ha. (Abụ Ọma 31:7; 1 Pita 5:7) Baịbụl gosikwara na Chineke ga-eme ka tigbuo zọgbuo kwụsị.​—Aịzaya 60:18.

Isi ihe na-akpata ime mpụ

Baịbụl kwuru isi ihe na-akpata ime mpụ. Ọ sịrị: ‘Mmadụ na-achị mmadụ ibe ya ọchịchị nchịgbu.’ (Ekliziastis 8:9) Kemgbe ụwa, ndị ikike dị n’aka na-eji ike ha emekpọ ndị ọzọ ọnụ, ndị a na-emekpọ ọnụ na-ejikwanụ ime mpụ emegwara ihe e mere ha.​—Ekliziastis 7:7.

Otú ime mpụ ga-esi kwụsị

Chineke kwere nkwa na ya ga-eme ka ụjọ na tigbuo zọgbuo kwụsị ma mee ka udo dị n’ụwa. (Aịzaya 32:18; Maịka 4:​3, 4) Chineke ga-ewepụ:

  • Isi ihe na-akpata ime mpụ. Chineke ga-ewepụ ọchịchị ụmụ mmadụ ma weta ọchịchị ya ka ọ chịwa ụwa niile. Ọ bụ Jizọs Kraịst bụ Eze nke ọchịchị Chineke. Ọ ga-achị mmadụ niile nke ọma, meekwa ka mmegbu na tigbuo zọgbuo kwụsị. (Abụ Ọma 72:​2, 14) N’oge ahụ, agaghịzi enwe ndị omempụ. Obi ga na-atọkwa ndị mmadụ “ezigbo ụtọ maka na ha ga-anọ nnọọ n’udo.”​—Abụ Ọma 37:​10, 11.

  • Nsogbu niile ime mpụ kpatara. Chineke ga-ewepụrụ ụmụ mmadụ nsogbu niile ime mpụ kpataara ha, nakwa ụjọ nsogbu ndị ahụ kpataara ha. (Aịzaya 65:17; Mkpughe 21:​3, 4) O kwedịrị nkwa ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ, mee ka ha dịghachi ndụ n’ụwa nke udo ga-adị na ya.​—Jọn 5:​28, 29.

Baịbụl kwuru ezigbo ihe mere anyị kwesịrị iji kweta na Chineke ga-eme ka ime mpụ kwụsị n’oge na-adịghị anya. Ma, i nwere ike ịna-ajụ, sị: ‘Gịnị mere na Chineke emebeghị ka ime mpụ kwụsị?’ Ị chọọ ịmata azịza ya, lee vidio bụ́ Gịnị Mere Chineke Ji Kwe Ka Ahụhụ Dịrị?

a E kwuo banyere ime mpụ, ọtụtụ mgbe, ihe a na-ekwu bụ iji tigbuo zọgbuo ma ọ bụ iyi egwu emekpọ ndị mmadụ ọnụ, karịchaa ndị nkịtị. Ndị na-eme mpụ na-emekarị ya iji gbanwee ihe n’ọchịchị, n’okpukpe, ma ọ bụkwanụ n’ihe ọ bụla ọzọ. Ma, ihe otu onye weere na ọ bụ ime mpụ nwere ike ịdị iche n’ihe onye ọzọ weere na ọ bụ ime mpụ.

Baịbụl na-enyere ndị mmadụ aka idi nsogbu ime mpụ na-akpata

Lee ihe abụọ Baịbụl kwuru nwere ike inyere gị aka.

  • Kọọrọ Chineke nsogbu gị n’ekpere.​—Ndị Filipaị 4:​6, 7.

  • Na-eche banyere olileanya Baịbụl mere ka anyị nwee.​—Ndị Hibru 6:19.

Ị chọọ ịmatakwu ihe ndị ọzọ Baịbụl kwuru ga-enyere gị aka, gụọ isiokwu bụ́, “Otú Ị Ga-esi Ebelata Nchegbu.”

Ndịàmà Jehova ndị omempụ kpataara nsogbu enwetakwala enyemaka n’aka Ndịàmà Jehova ibe ha. Legodị ihe mmadụ abụọ n’ime ha kọrọ:

  • Okooko osisi ndị e dowere n’ụlọ akwụkwọ dị na Beslan, dị na Rọshịa, iji cheta ndị nwụrụ anwụ.

    Natalya na nwa ya nwoke dị afọ itoolu aha ya bụ Aslan nọ n’otu ụlọ akwụkwọ dị n’obodo Beslan, dị na Rọshịa, mgbe ndị omempụ mabatara ma jichie ihe karịrị otu puku mmadụ. Ọ dị mwute na ọtụtụ narị mmadụ n’ime ha nwụrụ, ọtụtụ n’ime ha bụkwa ụmụaka. Ọ bụ eziokwu na Natalya na Aslan nwa ya anwụghị, ma ụjọ ihe ahụ merenụ apụghị ha ngwa ngwa n’ahụ́. Lee ihe nyeere ha aka inwetakwa onwe ha (ọ dị n’asụsụ Bekee).

  • Pablo na Sophie.

    Pablo na Sophie so ná ndị mmadụ nwụnahụrụ mgbe a wakporo Ebe Azụmahịa Ụwa dị n’Amerịka. Nwa ha nwoke nwụrụ. Lee vidio a ka ị hụ ihe nyeere ha na ndị ọzọ ndị omempụ kpataara nsogbu aka.

Baịbụl na-enyere ndị mmadụ aka ịgbanwe

Obi adịghị ọtụtụ ndị mma n’ihi ikpe na-ezighị ezi na mmegbu juru n’ụwa. Ha nwere ike ịna-eche na tigbuo zọgbuo na ime mpụ bụ naanị otú ha ga-esi eme ka ihe ndị a kwụsị. Ụdị ndị a, hà nwere ike ịgbanwe? Ee. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịma otú Baịbụl sirila nyere ụfọdụ ndị aka ịgbanwe, gụọ isiokwu bụ́, “Ò Nwere Mgbe Iyi Ọha Egwu Ga-akwụsị?”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya