Ihe I Nwere Ike Ikwu
Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl na Satọdee Mbụ n’Ọnwa Jun
“O nweghị onye n’ime anyị ga-asị na o nwetụbeghị onye nwụrụ n’ezinụlọ ha ma ọ bụkwanụ na o nwetụbeghị enyi ya nwụrụ. Ì chere na e nwere mgbe ị ga-emecha hụ ha anya ọzọ? [Chere ka ọ zaa.] Legodị ihe a na-eme obi ụtọ e kwuru ebe a.” Gị na ya gụọ ihe e dere n’okpuru ajụjụ nke mbụ dị na peeji nke 16 n’Ụlọ Nche Jun 1. Gụọkwanụ otu n’ime amaokwu Baịbụl ndị e dere ebe ahụ. Nye ya Ụlọ Nche na Teta!, gị na yiekwa mgbe ị ga-abịaghachi ka unu tụlee ajụjụ nke abụọ.
Jun 1
“Ọtụtụ n’ime anyị na-agba mbọ kwa ụbọchị, na-achọ ihe anyị ga-eri. E nwekwara ụfọdụ ndị ụwa na-ara ezigbo ahụ́. Ma, ì chere na oge ga-abịa mgbe a na-agaghị enwe ndị ogbenye n’ụwa a? [Chere ka ọ zaa. Gụzie Abụ Ọma 9:18.] Ụlọ Nche a kwuru ihe na-akpata ịda ogbenye nakwa ihe Baịbụl kwuru na ọ bụ ya ga-eme ka ịda ogbenye kwụsị.”
Eprel–Jun
“Anyị na-ekwukarị okwu, na-eche echiche ma ọ bụkwanụ na-akpa àgwà ka ndị anyị na ha na-akpa. Ì chere na ihe a Baịbụl kwuru ebe a gbasara ndị anyị na ha na-akpa bụ eziokwu? [Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 15:33. Cherezie ka ọ zaa.] Isiokwu dị na peeji nke 24 na magazin a ga-enyere ndị na-eto eto aka ịma ihe ha nwere ike ime ka ekwe ntị na ihe ndị yiri ya ghara ịna-anapụ ha oge ha ga-eji na-eme ihe ndị ọzọ dịịrị ha. O kwukwara ihe ndị nne na nna nwere ike ime iji nyere ụmụ ha aka n’okwu a.”