Ihe I Nwere Ike Ikwu
Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl na Satọdee Mbụ n’Ọnwa Jun
I kelechaa onye ị bịara na nke ya, gị asị: “O nweghị onye ị ga-ajụ ma ọ chọrọ ka udo dịrị n’ụwa a, ya asị gị mba. Ma, a ka na-alụ agha. Olee ihe i chere mere o ji esi ike inwe udo?” Chere ka ọ zaa. Ya kwuchaa, gị egosi ya Ụlọ Nche Jun 1, gị na ya tụlee ihe e kwuru n’ajụjụ nke mbụ dị na peeji nke 16, gụọkwanụ ma ọ́ dịghị ihe ọzọ otu n’ime amaokwu Baịbụl ndị dị n’ebe ahụ. I mechazie, nyekọta ya Ụlọ Nche ahụ na Teta!, gị na ya yiekwa mgbe ị ga-abịaghachi ka unu tụlee ajụjụ nke abụọ.
Ihe ị ga-eburu n’obi: A ga-eme ihe ngosi a mgbe a na-enwe nzukọ ozi ubi na Jun 1.
Ụlọ Nche Jun 1
I kelechaa onye ị bịara na nke ya, gị asị: “N’ụwa taa, ọtụtụ ndị kpọrọ ibe ha asị. Ì chere na o nwere ebe ị ga-aga n’ụwa a ghara ịhụ ndị kpọrọ ndị ọzọ asị? [Chere ka ọ zaa.] Lee otú Chineke si were mmadụ niile. [Gụọ Ọrụ Ndịozi 10:34.] Ụlọ Nche a kwuru otú Chineke ga-esi akwụsị ịkpọ asị kpamkpam.”
Teta! Mee–Jun
I kelechaa onye ị bịara na nke ya, gị asị: “Ịzụ ụmụ taa adịghị mfe. Amaghị m ma ị̀ chọpụtala ya? [Chere ka ọ zaa. Kwuzie, sị:] Baịbụl enyerela ọtụtụ ndị aka ịzụ ụmụ ha. Dị ka ihe atụ, lee ihe Baịbụl kwuru. [Gụọ Ndị Kọlọsi 3:21.] Ihe a Baịbụl kwuru ebe a enyerela ọtụtụ ndị nna aka ịna-aja ụmụ ha mma. O nyekwarala ha aka ime ka obi na-eru ụmụ ha ala. Teta! a kwuru ihe ise ga-enyere ndị nna aka ịzụ ụmụ ha.”