Ihe I Nwere Ike Ikwu
Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl na Satọdee Mbụ n’Ọnwa Jun
“Ihe mere anyị ji bịa bụ ka anyị na gị kwuo banyere ajụjụ a dị mkpa. [Gosi ya ajụjụ mbụ dị n’azụ Ụlọ Nche Jun 1.] Gịnị ka i chere?” Chere ka ọ zaa. Ya zachaa, tụleenụ ihe dị n’okpuru ajụjụ mbụ ahụ, gụọkwanụ ma ọ́ dịghị ihe ọzọ otu amaokwu Baịbụl dị ebe ahụ. Nye ya Ụlọ Nche ahụ na Teta!, yiekwanụ mgbe ị ga-abịa ka unu tụlee ajụjụ nke abụọ.
Ụlọ Nche Jun 1
“Ihe dị ka nde mmadụ isii na-anwụ kwa afọ n’ihi na ha na-anụ sịga. Ì chere na e nwere otú a ga-esi kwụsị ihe a? [Chere ka ọ zaa. Ọ zachaa, sị ya:] Ọtụtụ ndị akwụsịla ise sịga n’ihi na e nyeere ha aka ịghọta otú Chineke si ele ya anya. Dị ka ihe atụ, ihe Baịbụl kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 10:24 emeela ka ụfọdụ chee echiche banyere nsogbu ịṅụ sịga na-akpatara ndị ọzọ. [Gụọ ya.] Magazin a kwuru otú iche banyere otú Chineke si ele ise sịga anya nwere ike isi nyere mmadụ aka ịkwụsị ịṅụ ya.”
Teta! Mee–Jun
“Anyị bịara ka anyị na unu kwuo ihe anyị nwere ike ime gbasara nsogbu ọtụtụ ezinụlọ na-enwe. Ọ na-esiziri ndị na-eto eto ike ịnabata ndụmọdụ nne na nna ha na-enye ha. Gịnị ka i chere nwere ike inyere ndị na-eto eto aka ịna-anabata ndụmọdụ? [Chere ka ọ zaa. Ọ zachaa, sị ya:] Legodị ihe Baịbụl kwuru n’Ilu 3:12. [Gụọ ya.] Magazin a kwuru ihe mere mmadụ ji kwesị ịna-anabata ịdọ aka ná ntị, n’agbanyeghị otú e si dọọ ya ya.”