Ihe I Nwere Ike Ikwu
Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl na Satọdee Mbụ n’Ọnwa Jun
Gụọ Aịzaya 42:8. Kwuzie, sị: “Amaokwu Baịbụl a m gụrụ gosiri na Chineke nwere aha. Ì chere na ọ dị mkpa ka anyị na-akpọ Chineke aha ya mgbe ọ bụla anyị na-agwa ya okwu? [Chere ka ọ zaa.] Legodị ihe akwụkwọ a kwuru.” Nye ya Ụlọ Nche Jun 1, gị na ya tụleekwa ihe e kwuru n’ajụjụ nke mbụ dị na peeji nke 16. I mechazie, nyekọta ya Ụlọ Nche ahụ na Teta!, gị na ya yiekwa mgbe ị ga-abịaghachi ka unu tụlee ajụjụ nke abụọ.
Ụlọ Nche Jun 1
“O nwere ihe dị mkpa mụ na ndị mmadụ na-ekwurịta taa. M ga-achọkwa ịma ihe gịnwa chere gbasara ya. [Sapeta peeji nke 3 ma gosi ya ụzọ ihe anọ ahụ a sụrụ kpọm kpọm na peeji ahụ.] N’ime ihe anọ a e kwuru, olee nke kwuru otú i si were Baịbụl? [Chere ka ọ zaa.] Legodị ihe Baịbụl kwuru. [Gụọ Ndị Rom 15:4.] Magazin a kwuru ihe ise mere Baịbụl ji bụrụ akwụkwọ pụrụ iche. O kwukwara uru ịgụ ya ga-abara anyị.”
Teta! Eprel–Jun
“Ọtụtụ ndị na-asị na ọ bụrụ na mmadụ na-akwụwa aka ọtọ mgbe niile, ihe agaghị agazichara ya. Ì chere na ihe ahụ ha na-ekwu bụ eziokwu? [Chere ka ọ zaa.] Legodị ihe amaokwu Baịbụl a kwuru. [Gụọ Luk 12:15.] Magazin a kwuru uru ọ bara mmadụ ịkwụwa aka ọtọ.”