Otú Baịbụl Ga-esi Nyere Anyị Aka Ịna-ele Ndị Ọzọ Anya Otú Dị Mma
N’Afọ 1995, òtù UNESCO dị n’Amerịka kwuru na ihe ga-eme ka udo dị bụ ma ndị mmadụ na-ele ibe ha anya otú dị mma n’agbanyeghị na onye ọ bụla dị iche n’ibe ya.
Ọ bụrụ na ndị mmadụ anaghị ele ibe ha anya otú dị mma, ọ ga-eme ka ha ghara ịna-akwanyere ibe ha ùgwù, meekwa ka ha na-akpọ ibe ha asị. Mmadụ si otú a na-ele onye ọzọ anya, ọ ga na-ekwu ihe ndị gosiri na ọ kpọrọ onye ahụ asị, ọ gaghị ekwe ka onye ahụ bịa ya nso, o nwedịrị ike ịlụsa onye ahụ ọgụ ma ọ bụ merụọ ya ahụ́.
Ma, ndị mmadụ nwere otú dị iche iche ha si aghọta ihe ịna-ele ndị ọzọ anya otú dị mma pụtara. Ụfọdụ ndị na-ekwu na onye na-ele ndị ọzọ anya otú dị mma kwesịrị ịnabata ihe ọ bụla ndị ahụ na-eme na otú ha si akpa àgwà. Ma, ndị ọzọ na-ele ya anya otú Baịbụl si ele ya, ya bụ, na mmadụ ile ndị ọzọ anya otú dị mma pụtara onye ahụ ịghọta na ndị ọzọ nweere onwe ha ile ihe anya otú masịrị ha na ikwere ihe masịrị ha, ọ bụrụgodị na ihe ahụ adịghị yanwa mma.
Baịbụl ọ̀ ga-enyeliri ndị mmadụ aka ka ha na-ele ndị ọzọ anya otú dị mma n’oge a?
Ihe Baịbụl kwuru banyere ile ndị ọzọ anya otú dị mma
Baịbụl kwuru na anyị kwesịrị ịna-ele ndị ọzọ anya otú dị mma. Ọ sịrị: “Meenụ ka mmadụ niile mara na unu na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị.” (Ndị Filipaị 4:5) Baịbụl kwuru na anyị kwesịrị ịna-echebara ndị ọzọ echiche, na-akwanyere ha ùgwù, gharakwa ịna-emegbu ha. Mmadụ mee ihe a Baịbụl kwuru, ọ pụtaghị na ọ ga-abịa kpawa àgwà ka onye nke ọzọ, kama ọ ga-ahapụrụ onye ahụ ihe ndị o kpebiri ime.
Ma, Baịbụl mere ka o doo anya na Chineke nwere otú ọ chọrọ ka ndị mmadụ si na-akpa àgwà. Baịbụl sịrị: “Gịnwa bụ́ mmadụ, Jehovaa agwala gị ihe dị mma.” (Maịka 6:8) Baịbụl kwuru ntụziaka Chineke nyere ndị mmadụ iji nyere ha aka ibi ezigbo ndụ.—Aịzaya 48:17, 18.
Chineke enyeghị anyị ikike ikpe ndị ọzọ ikpe. Baịbụl kwuru, sị: “E nwere naanị otu onye, bụ́ Onye na-enye iwu na Onyeikpe . . . Ònye ka ị bụ mere ị ga-eji na-ekpe onye agbata obi gị ikpe?” (Jems 4:12) Chineke hapụrụ anyị ka anyị jiri aka anyị na-ekpebiri onwe anyị ihe anyị ga na-eme. Ọ bụkwa anyịnwa ga-eri uru ma ọ bụ taa ahụhụ maka mkpebi ọ bụla anyị mere.—Diuterọnọmi 30:19.
Ihe Baịbụl kwuru banyere ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù
Baibụl kwuru na anyị kwesịrị ‘ịsọpụrụ ụdị mmadụ niile.’ (1 Pita 2:17) N’ihi ya, ndị kpebiri ịna-ebi ndụ otú Baịbụl kwuru na-akwanyere mmadụ niile ùgwù, n’agbanyeghị ihe ha kweere ma ọ bụ otú ha kpebiri isi na-ebi ndụ. (Luk 6:31) Ma, ọ pụtaghị na ndị na-eme ihe Baịbụl kwuru ga-anabata ihe niile ndị ọzọ kweere ma ọ bụ ihe ha chere. Ọ pụtaghịkwa na ha ga-akwado mkpebi niile ndị ọzọ mere. Ma, ha anaghị akparị ndị ọzọ ma ọ bụ na-eleda ha anya maka mkpebi ha mere. Ha na-agbalị akpaso ha àgwà otú Jizọs si kpaso ndị mmadụ àgwà.
Dị ka ihe atụ, o nwere mgbe Jizọs hụrụ otu nwaanyị na-ekpe okpukpe yanwa na-anabataghị. Nwaanyị ahụ na nwoke na-abụghị di ya bikwa. Jizọs anabataghịkwa ụdị ndụ a. N’agbanyeghị ihe ndị a, Jizọs ji nkwanye ùgwù gwa nwaanyị ahụ okwu.—Jọn 4:9, 17-24.
Ndị Kraịst na-eme ka Jizọs. Ha na-adị njikere mgbe niile ịkọwara ndị chọrọ ige ntị ihe mere ha ji kwere ihe ndị ha kweere. Ma, ha na-akwanyere ndị ahụ “ezigbo ùgwù” mgbe ha na-akọwara ha ya. (1 Pita 3:15) Baịbụl gwara Ndị Kraịst ka ha ghara ịmanye ndị ọzọ ikwere ihe hanwa kweere. O kwuru na onye na-eso ụzọ Kraịst “ekwesịghị ịlụ ọgụ, kama o kwesịrị iji nwayọọ na-emeso mmadụ niile ihe,” ma ndị kweere ihe dị iche na nke ya.—2 Timoti 2:24.
Ihe Baịbụl kwuru banyere ịkpọasị
Baịbụl sịrị: “Na-agbanụ mbọ ka unu na mmadụ niile na-adị n’udo.” (Ndị Hibru 12:14) Onye na-agba mbọ ka ya na ndị ọzọ dịrị n’udo anaghị akpọ mmadụ asị. Ọ bụ eziokwu na ọ naghị emewe ihe ndị ọzọ na-eme na-adịghị ya mma, ma ọ na-agba mbọ ka ya na ndị ọzọ na-adị n’udo. (Matiu 5:9) Baịbụl gwadịrị Ndị Kraịst ka ha na-ahụ ndị iro ha n’anya. Otú ha ga-esi eme ya bụ iji obiọma na-emeso ndị na-akpaso ha àgwà ọjọọ ihe.—Matiu 5:44.
Nke bụ́ eziokwu bụ na Baịbụl kwuru na Chineke kpọrọ ileda ndị ọzọ anya “asị,” ma ọ bụ, na ọ “dị oké njọ n’anya ya.” (Ilu 6:16-19) N’ebe a, Baịbụl ji okwu bụ́ “asị“ kọwaa otú àgwà ọjọọ na-ewuteru Chineke. Baịbụl gosiri na Chineke ga-agbaghara ndị chọrọ ịgbanwe otú ha si ebi ndụ ma mewe ihe o kwuru, nakwa na ọ ga-enyere ha aka.—Aịzaya 55:7.
Amaokwu Baịbụl ndị kwuru gbasara ile ndị ọzọ anya otú dị mma na ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù
Taịtọs 3:2: “Na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị, jiri obi nwayọọ na-emeso mmadụ niile ihe mgbe niile.”
Onye na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị na-eji obi nwayọọ agwa ndị nwere otú dị iche ha si ele ihe anya okwu, si otú ahụ na-eme ka onye ọ bụla na-akwanyere ibe ya ùgwù.
Matiu 7:12: “Unu kwesịrị ịna-emere ndị mmadụ ihe niile unu chọrọ ka ha na-emere unu.”
Ọ na-amasị anyị niile ma ndị ọzọ kwanyere anyị ùgwù ma kweta na anyị nweere onwe anyị ile ihe anya otú dị anyị mma. Ị chọọ ịmatakwu otú ị ga-esi na-eme ihe a Jizọs kụziri ọtụtụ ndị ma, gụọ isiokwu bụ́ “Olee Otú Jizọs Kwuru Ka Anyị Si Na-emeso Ndị Ọzọ?”
Joshụa 24:15: “Họrọnụ taa onye unu ga-efe.”
Anyị hapụ ndị ọzọ ka ha jiri aka ha kpebie ihe ha ga-eme, ọ ga-eme ka udo dị.
Ọrụ Ndịozi 10:34: “Chineke anaghị ele mmadụ anya n’ihu.”
Chineke anaghị eleda mmadụ anya maka omenala onye ahụ, obodo ya, agbụrụ ya, ụdị ezinụlọ o si, ma ọ bụkwanụ maka na onye ahụ bụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị. Ndị chọrọ ime ka Chineke na-akwanyekwara ụdị mmadụ ọ bụla ùgwù.
Habakọk 1:12, 13: ‘Chineke enweghị ike ịhapụ ihe ọjọọ ka ọ dịrị na-aga.’
Chineke agaghị agba nkịtị ka onye ọ bụla na-eme otú sọrọ ya ruo ebighị ebi. Ọ gaghị ahapụ ndị mmadụ ka ha na-akpa àgwà ọjọọ ruo mgbe ebighị ebi. Ị chọọ ịmatakwu gbasara ihe a, lee vidio bụ́ Gịnị Mere Chineke Ji Kwe Ka Ahụhụ Dịrị?
Ndị Rom 12:19: “Nyenụ ọnụma [Chineke] ohere; n’ihi na e dere, sị: ‘Ọ bụ m ga-abọ ọbọ. M ga-akwụ ụgwọ.’ Ọ bụ ihe Jehova kwuru.”
Jehova Chineke enyeghị onye ọ bụla ikike ịbọ ọbọ. Ọ ga-eme ihe iji hụ na ihe ọjọọ niile kwụsịrị n’oge ya a kara aka. Ị chọọ ịmatakwu gbasara ihe a, gụọ isiokwu bụ́ “Will the Cry for Justice Be Heard?”
a Jehova bụ ezigbo aha Chineke. (Abụ Ọma 83:18) Gụọ isiokwu bụ́ “Ònye Bụ Jehova?”