Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbv isiokwu 22
  • Jọn 16:33—“Emeriela M Ụwa”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jọn 16:33—“Emeriela M Ụwa”
  • Amaokwu Baịbụl Ndị A Kọwara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Jọn 16:33 Pụtara
  • Ihe Ndị Gbara Jọn 16:33 Gburugburu
  • Ṅomie Jizọs ma Nọgide Na-enwe Udo
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
  • “Nweenụ Obi Ike! Emeriwo M Ụwa”
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Jọn 15:13—“Ọ Dịghị Onye Ọ Bụla Nwere Ịhụnanya Karịrị nke A Ukwuu”
    Amaokwu Baịbụl Ndị A Kọwara
  • Ịkwadebe Ndị Ozi ahụ Maka Ọpụpụ Ya
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Amaokwu Baịbụl Ndị A Kọwara
ijwbv isiokwu 22

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ A KỌWARA

Jọn 16:33—“Emeriela M Ụwa”

“Agwala m unu ihe ndị a ka unu wee nwee udo n’ihi m. N’ụwa, a ga-akpagbu unu, ma nweenụ obi ike. Emeriela m ụwa.”​—Jọn 16:​33, Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.

“Agwala m ụnụ ihe ndị a, ka ụnụ wee nwee udo n’ime m. N’ụwa ụnụ ga-enwe mkpagbu. Ma nweenụ anụrị, mụ onwe m emeriela ụwa!”​—Jọn 16:33, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik.

Ihe Jọn 16:33 Pụtara

Jizọs kwuru ihe a iji mesie ndị na-eso ụzọ ya obi ike na ha ga-emeli ihe dị Chineke mma n’agbanyeghị ụdị nsogbu ha nọ na ya nakwa otú e si na-akpagbu ha.

“Agwala m unu ihe ndị a ka unu wee nwee udo n’ihi m.”a Ihe ndị ọzọ e kwuru n’amaokwu a gosiri na udo a na-ekwu gbasara ya ebe a apụtaghị na nsogbu agaghị abịara mmadụ. Kama ihe a na-ekwu gbasara ya bụ udo nke obi. Anyị ga-enweli udo a ‘n’ihi Jizọs.’ O kwere nkwa na ya ga-ezitere ndị na-eso ụzọ ya mmụọ nsọ. Mmụọ nsọ a, bụ́ “ihe inyeaka” dị ike, ga-enyere ndị na-eso ụzọ Jizọs aka imeri nsogbu ọ bụla bịaara ha.​—Jọn 14:​16, 26, 27.

“N’ụwa, a ga-akpagbu unu, ma nweenụ obi ike.” Jizọs tara ụkwa jaara ndị na-eso ụzọ ya ezé na ikpe n’ezighị ezi na mkpagbu bụ ụfọdụ n’ime nsogbu ga-abịara ha. (Matiu 24:9; 2 Timoti 3:12) Ma e nwere ezigbo ihe mere ha ga-eji ‘enwe obi ike,’ ma ọ bụ ‘enwe anụrị.’​—Jọn 16:33, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik.

“Emeriela m ụwa.” “Ụwa” a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ndị ajọ omume ha na Chineke na-adịghị ná mma.b 1 Jọn 5:19 kwuru, sị: “Ụwa niile dị n’aka ajọ onye ahụ,” ma ọ bụ Setan. Ọ bụ ya mere ọtụtụ ndị ‘n’ụwa a’ ji eche echiche, na-emekwa ihe na-adịghị Chineke mma.​—1 Jọn 2:​15-17.

Setan na ụwa ya gbara mbọ ka Jizọs ghara imezu uche Chineke, ya bụ, ịkụziri ndị mmadụ gbasara Chineke nakwa iji ndụ ya zuru okè chụọ àjà iji gbapụta ha. (Matiu 20:28; Luk 4:13; Jọn 18:37) Ma, Jizọs ekweghị ka ha gbanwee otú o si eche echiche, o kweghịkwa ka ha mee ka ọ ghara ime ihe dị Chineke mma. O rubeere Chineke isi ruo ọnwụ. Ọ bụ ya mere o ji kwuo na ya emeriela ụwa, kwuokwa na Setan, “onye na-achị ụwa,” ‘enweghị ike n’ebe ọ nọ.’​—Jọn 14:30.

Ihe ndị Jizọs mere kụziiri ndị na-eso ụzọ ya na ha ga-erubeliri Chineke isi, ọ bụrụgodi na a nwaa ha inupụrụ ya isi. Anyị nwere ike ikwu na ihe Jizọs na-ekwu bụ: “Ọ bụrụ na m meriri ụwa, ununwa ga-emerilikwa ya.”

Ihe Ndị Gbara Jọn 16:33 Gburugburu

Jizọs kwuru ihe e dere n’amaokwu a n’abali bọtara ụbọchị ọ nwụrụ. Ebe ọ ma na ya na-aga ịnwụ n’oge na-adịghị anya, o ji ohere ahụ nye ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ntụkwasị obi ndụmọdụ ikpeazụ. E nwere ihe ndị ọ gwara ha ha kwesịrị ichebara echiche. Ụfọdụ n’ime ha bụ na ha agaghịzi ahụ ya ọzọ nakwa na a ga-akpagbu ma ọ bụdị gbuo ha. (Jọn 15:20; 16:​2, 10) Ebe Jzọs ma na ihe a nwere ike ime ka egwu jide ndịozi ya, o kwuziri ihe e dere na Jọn 16:33 iji mee ka obi sie ha ike.

Ihe ndị Jizọs kwuru na ihe ndị o mere nwekwara ike ime ka obi sie ndị na-eso ụzọ ya ike taa. Ndị Kraịst nwere ike irubere Chineke isi ọ bụrụgodị na a na-akpagbu ha.

a Okwu Grik a sụgharịrị “n’ihi m” nwekwara ike ịpụta “mụ na ha dịkwa n’otu.” O gosiri na ndị na-eso ụzọ Jizọs ga-enweli udo ma ọ bụrụ na ha na ya adịrị n’otu.

b Ihe a “ụwa” pụtara n’amaokwu a ka ọ pụtakwara na Jọn 15:19 na 2 Pita 2:5.

Gụọ Jọn isi 16 na ihe ndị e dere n’ala ala peeji nakwa ihe ndị e dere n’etiti peeji ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya