Echiche nke Bible
Ite Egwú Ọ̀ Bụ Maka Ndị Kraịst?
“APỤGHỊ m ikiri nke a. Aghaghị m ịpụ èzí,” ka otu nwa okorobịa ji olu dị nnọọ ala gwa nwunye ya ka o biliri n’oche ya ma si n’ọnụ ụlọ ahụ pụọ iji kpagharịa n’ikuku na-ajụ oyi nke abalị. Ihere mere ya.
Ndị enyi ha akpọwo ya na nwunye ya òkù ịga otu ihe omume nnọkọ ntụrụndụ. Ndị kpọrọ òkù ahụ ekpebiwo ka e tee egwú nke gụnyere ndị inyom atọ na-ete egwú. Ndị ọzọ bịaranụ eyighị ka ọ na-enye ha nsogbu. Ọ̀ na-enwe mmetụta n’ụzọ gabigara ókè? Ọ́ bụghị nanị mmetụta uche dị ha n’ime ahụ ka ndị ahụ na-ete egwú na-egosipụta, na-anụkwa ụtọ nke nnwere onwe ite egwú? Ka anyị gbalịa ịghọta ite egwú site n’ụzọ onye Kraịst si ele ihe anya.
Ite Egwú Bụ Nkwurịta Okwu
Otu n’ime ụzọ ụmụ mmadụ si ekwurịta okwu bụ site n’imegharị ahụ. Dị ka ihe atụ, mgbe ha nọ ná mba ofesi, ọtụtụ ndị na-eme nleta enwewo ijuanya ịmara na mmegharị ahụ ha chere na ọ dịghị ihe o mere nwere ihe dị iche ọ pụtara n’ebe ahụ—eleghị anya ihe na-adịghị mma. Otu onye bụbu onye ozi ala ọzọ na Solomon Islands, Malaysia, na Papua New Guinea kwuru, sị: “N’ógbè ụfọdụ a na-ejikọta ụzọ ụfọdụ e si emegharị ahụ n’ihe ndị na-atụ aro mmekọahụ. Dị ka ihe atụ, mgbe nwanyị nọ ọdụ n’ala ụlọ, a na-ele ya anya dị ka ihe na-ekwesịghị ekwesị ka nwoke zọfee ụkwụ n’elu ụkwụ nwanyị ahụ gbatịrị n’ala. N’otu aka ahụ, ọ bụkwa ihe amamihe na-adịghị ya ka nwanyị gafee n’ihu nwoke nke nọ ọdụ n’ala ụlọ. N’ọnọdụ abụọ ndị ahụ, a na-aghọta ihe na-atụ aro mmekọahụ ozugbo ahụ.” Ma ànyị maara ya ma ọ bụ na anyị amaghị, mmegharị ahụ anyị na-ekwu okwu. Ya mere o kwesịghị iju anyị anya ịnụ na n’akụkọ ihe mere eme nile, e jiriwo ite egwú mee ihe dị ka otu ụzọ nke nkwurịta okwu.
A pụrụ igosi mmetụta uche zuru ezu n’ite egwú—site n’ọṅụ na oké mkpali nke ememe gaa n’ihe omume nke ememe okpukpe na ọdịnala. (2 Samuel 6:14-17; Abụ Ọma 149:1, 3) Akwụkwọ bụ́ The New Encyclopædia Britannica na-ekwu, sị: “Onye na-ete egwú na-agwa ndị na-ekiri ya okwu n’ụzọ abụọ pụtara ìhè, ma ọ́ bụghị site ná mwụpụ nke mmetụta uche na-esite ma n’ahụ ma n’ihu, ọ bụrụ site n’asụsụ dị mgbagwoju anya nke imegharị ahụ n’ekwughị okwu na mmegharị ahụ nkịtị.” N’egwú ụfọdụ okwu ahụ pụrụ iyi ihe na-ada ụda ma doo anya. N’ụdị ite egwú ndị ọzọ, ọ bụ nanị mmadụ ole na ole maara nke a na-akọ pụrụ ịghọta ya. Dị ka ihe atụ, n’egwú ballet, aka a tụkwasịrị n’obi na-egosi ịhụnanya, ebe ịtụ aka ná mkpịsị aka nke anọ nke aka ekpe na-egosi alụmdi na nwunye. N’egwú opera ndị China, ịga ije gburugburu na-egosi ime njem, ebe iji ụtarị n’aka na-agba ebe a na-ete egwú gburugburu na-egosi ịgba ịnyịnya; ọkọlọtọ ojii a kpụfere n’ihu ebe a na-ete egwú na-egosi oké ifufe, ebe ọkọlọtọ nke na-achatụ anụnụ anụnụ na-egosi ikuku dị nro. Ahụ na-ekwu okwu n’ụzọ dị otú a site ná mmegharị ahụ nke ite egwú. Ma ozi ahụ ọ̀ na-ekwesị ekwesị mgbe nile?
Ite Egwú—Nke Kwesịrị Ekwesị na nke Na-ekwesịghị Ekwesị
Ite egwú pụrụ ịbụ ụdị dị ụtọ nke ntụrụndụ na mmega ahụ. Ọ pụrụ ịbụ ngosipụta dị ọcha ma pụta ìhè, na-egosi nzaghachi anụ ahụ nke ọṅụ n’obi ụtọ nke ịdị ndụ ma ọ bụ ekele maka ịdị mma Jehova. (Ọpụpụ 15:20; Ndị Ikpe 11:34) Ụfọdụ egwú ìgwè na nke ọdịnala pụrụ ịdị na-enye obi ụtọ. Jisọs, n’ilu ya banyere nwa mmefu ahụ, zoro aka ọbụna n’ìgwè ndị na-ete egwú, nke pụtara ìhè na ha bụ òtù egwú e goro ego, dị ka akụkụ nke oriri ahụ. (Luk 15:25) Ya mere, n’ụzọ doro anya, Bible adịghị akatọ ite egwú n’onwe ya. Otú ọ dị, ọ na-adọ aka ná ntị megide mkpali nke echiche na ọchịchọ ọjọọ. Ọ bụ n’ọnọdụ a ka egwú ụfọdụ pụrụ ịghara ịdị mma n’anya, ọbụna dị ize ndụ nye ọnọdụ ime mmụọ mmadụ. (Ndị Kọlọsi 3:5) Site n’oge ochie ọ dịwo mgbe ite egwú bụ ihe na-akpalị agụụ mmekọahụ, bụrụkwa nke e jiriwo mee ihe maka nzube ndị na-emerụ ahụ.—Tụlee Matiu 14:3-11.
Onye Iro anyị, Setan bụ́ Ekwensu, maara na ijikọ mmegharị ahụ ite egwú na echiche na-ekwesịghị ekwesị bụ ngwá ọrụ dị ike o ji eme ihe. (Tụlee Jemes 1:14, 15.) Ọ maara nke ọma banyere ndọrọ ihe ụtọ nke ahụ nwere ná mmegharị ahụ na banyere otú ọ pụrụ isi kpalie echiche mmekọahụ. Pọl onyeozi dọrọ aka ná ntị na Setan ekpebisiwo ike ịghọgbu anyị ka o wee ‘mebie uche anyị pụọ n’afọ ofufo na ịdị ọcha nke dị n’ebe Kraịst nọ.’ (2 Ndị Kọrint 11:3) Cheedị echiche otú Ekwensu ga-esi nwee obi ụtọ ma ọ bụrụ na anyị ahapụ uche anyị ka ọ dabanye n’echiche rụrụ arụ site n’ikiri ma ọ bụ n’ikere òkè n’egwú na-adịghị mma n’anya. Ọ ga-enwe obi ụtọ karị ma ọ bụrụ na a tọhapụ ọchịchọ anyị a na-achịkwaghị achịkwa, ma bụrụ ndị e jidere n’ihe ọjọọ àgwà na-ezighị ezi na-arụpụta. O jiriwo mmegharị ahụ na ite egwú mee ihe iji mezuo nke ahụ n’oge gaworo aga.—Tụlee Ọpụpụ 32:6, 17-19.
Nke Kwesịrị Ekwesị Ma Ọ Bụ nke Na-ekwesịghị Ekwesị—Ụzọ E Si Ekpebi
N’ihi nke ahụ, ma ọ̀ bụ ìgwè, ndị di na nwunye, ma ọ bụ otu mmadụ nanị na-ete egwú, ọ bụrụ na mmegharị ahụ ya na-akpali echiche na-adịghị ọcha n’ime gị, mgbe ahụ egwú ahụ na-emerụ ahụ, ọ bụ ezie na ọ pụghị ịdị otú ahụ nye ndị ọzọ.
Ụfọdụ ekwuwo na n’ọtụtụ egwú ọgbara ọhụrụ, ndị ahụ na-agbakọ egwú adịghị ọbụna emetụ onwe ha ahụ. Otú ọ dị, imetụ ahụ ọ̀ bụ ihe bụ isi n’ezie? Akwụkwọ Britannica ahụ na-achịkọta okwu ahụ site n’ikwu na “ihe ọ na-arụpụta n’ikpeazụ bụ otu ihe ahụ—ihe ụtọ anụ ahụ n’ite egwú na mkpali mmekọahụ nke onye e so ete egwú, ma à makụrụ ya ma ọ bụ na a ghọtara ya n’ụzọ dị nta.” Amamihe ọ̀ dị ná “mkpali mmekọahụ nke onye e so ete egwú” n’abụghị n’alụmdi na nwunye? Ọ bụghị dị ka ihe Jisọs kwuru, na “nwoke ọ bụla nke na-ele nwanyị anya ka agụụ ya wee gụọ ya, ọ kwasịwo ya iko n’obi ya ugbu a.”—Matiu 5:28.
Ọ bụ nhọrọ gị ikpebi ite egwú ma ọ bụ ịghara ite. Ịtụgharị uche n’ajụjụ ndị na-esonụ pụrụ inyere gị aka iji amamihe mee mkpebi. Gịnị bụ nzube nke ite egwú a? Gịnị ka e ji mara ya? Gịnị ka mmegharị ahụ ite egwú ahụ na-egosipụta? Echiche na mmetụta uche dị aṅaa ka ha na-akpali n’ime m? Ọchịchọ dị aṅaa ka ha na-akpali n’ime onye mụ na ya na-ete egwú ma ọ bụ n’ime ndị na-ekiri ya? N’ezie, mmadụ kwesịrị imeghachi omume dị ka akọ na uche ya si dị, dị ka nwa okorobịa ahụ bụ́ di mere n’okwu mmalite anyị, n’agbanyeghị ihe ndị ọzọ na-eme.
Bible na-egosi na Onye Okike chọrọ ka anyị nụ ụtọ onyinye nke ịma mma, ụda, na ịdị mma. Ee, nụ ụtọ ha—ma buru n’uche na mgbe ị na-ete egwú, ahụ gị na-ekwu okwu. Cheta ntụziaka Pọl ná Ndị Filipaị 4:8: “Ka ihe bụ eziokwu hà, ka ha hà, bụ ihe kwesịrị nsọpụrụ, ka hà ha, bụ ihe ziri ezi, ka ha hà, bụ́ ihe dị ọcha, ka ha hà, bụ́ ihe kwesịrị ịhụnanya, ka ha hà, bụ́ ihe e kwuru nke ọma; ọ bụrụ na ịdị mma ọ bụla dị, ọ bụrụkwa na otuto ọ bụla dị, na-agụkọnụ ihe ndị a.”
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 20]
Ego Ihe Osise/Site n’ikike, Museum of Fine Arts, Boston